“Chineke nke Udo” Na-eche Banyere Ndị Nọ ná Mkpagbu
BIBLE na-eme ka o doo anya na Devid oge ochie maara nke ọma banyere mkpagbu. Ruo ọtụtụ afọ o biri dị ka onye na-agba ọsọ ndụ, onye ajọ eze isi ike, bụ́ onye siri ọnwụ igbu ya, chụrụ ọsọ ụkwụ eru ala. N’oge a nke mkpagbu, Devid zoro onwe ya n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ. Ma o mere ihe karịrị nke ahụ. O kpesiri ekpere ike gwa Jehova banyere ahụhụ ya. “Olu m ka m ji etiku Jehova,” ka o mesịrị dee banyere ahụmahụ ọjọọ ya. “Ana m ekwukwa okwu ntamu m n’ihu Ya; ahụhụ m ka m na-egosi n’ihu Ya.”—Abụ Ọma 142:1, 2.
Taa, ụfọdụ ndị ga-eme ndabere Devid dabeere n’ebe Chineke nọ akaje. Ha ga-asị na ekpere bụ nanị ụzọ e si eme ka uche dajụọ, nakwa na ọ bụ igbu oge ma o ruo n’omume. Ma, obi ike Devid nwere n’ebe Chineke nọ ehieghị ụzọ, n’ihi na e mesịrị merie ndị iro ya. N’ileghachi anya azụ n’ahụmahụ ya, Devid dere, sị: “Onye e wedara n’ala kpọrọ òkù, Jehova wee nụrụ ya, wee si ná mkpagbu ya nile zọpụta ya.” (Abụ Ọma 34:6) Ezi Chineke ahụ onye Devid chigharịkwuuru ka a kpọrọ n’ebe ọzọ “Chineke nke udo.” (Ndị Filipaị 4:9; Ndị Hibru 13:20) Ọ̀ ga-eweta ahụ efe pụọ ná mkpagbu, na-arụpụta udo nye anyị?
Jehova Na-eche Banyere Gị
Jehova adịghị eleghara ahụhụ nke ndị ya anya. (Abụ Ọma 34:15) Ọ na-aṅa ntị ná mkpa ọ bụghị nanị nke ndị ohu ya dị ka otu ìgwè kamakwa nke onye ọ bụla na-atụ egwu ya. Mgbe ọ na-arara ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem oge ochie nye, Solomọn rịọrọ Jehova ka ọ ṅaa ntị ‘n’ekpere ọ bụla, arịrịọ amara ọ bụla, nke ga-adịrị mmadụ ọ bụla, ma ọ bụ nke ga-adịrị ndị Gị nile, bụ́ Israel, ndị ga-amara, nwoke ọ bụla ihe otiti ya na ihe mgbu ya.’ (2 Ihe Emere 6:29) Dị ka Solomọn kwenyere, onye ọ bụla nwere mkpagbu nke ya dịwagara iche ọ ga-edi. Nye otu onye ọ pụrụ ịbụ nrịanrịa anụ ahụ. Nye onye ọzọ, nsogbu mmetụta uche. Ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya pụrụ iti ụfọdụ ihe otiti. Enweghị ọrụ, ihe isi ike akụ̀ na ụba, na nsogbu ezinụlọ bụkwa mkpagbu dị ebe nile n’oge ndị a siri ike.
Chetụ echiche nke nta banyere ‘ihe otiti gị na ihe mgbu gị.’ Eleghị anya ọ dịwo oge ndị i nwere mmetụta yiri nke ọbụ abụ bụ́ Devid, onye dere, sị: “M wee lee anya onye ga-egosi m ebere o ji n’ahụ m, ma ọ dịghị onye ọ bụla; m lekwara anya ndị nkasi obi, ma achọtaghị m onye ọ bụla.” Otú ọ dị, ị pụrụ ijide n’aka na Chineke na-eche banyere ọnọdụ gị, n’ihi na ka e mesịrị n’otu abụ ọma ahụ, Devid dere, sị: “Jehova na-ege ntị ndị ogbenye, O ledaghịkwa ndị mkpọrọ Ya.”—Abụ Ọma 69:20, 33.
N’ịkọwa okwu Devid n’ụzọ sara mbara, anyị pụrụ ijide n’aka na Onye Okike ihe a kpọrọ mmadụ na-ege ntị n’ekpere nke ndị mkpagbu ha mere ndị mkpọrọ, dị ka a pụrụ ikwu ya. Karịa nke ahụ, ọ na-emeghachi omume n’ebe ajọ ọnọdụ ha dị. Tụlee okwu na-esonụ ndị na-ekpughe ọmịiko Jehova maka ndị nọ ná mkpagbu.
“Nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ, ma ọ bụ nwa mgbei, unu ewedala ya n’ala. Ọ bụrụ na i wedaa ya n’ala ma ọlị, o wee tikuo m n’ụzọ ọ bụla n’ezie, aghaghị m ịnụ ntiku ya; iwe m ga-adị ọkụ.”—Ọpụpụ 22:22-24.
“Chineke, Ọ́ gaghị ekpepụta ndị nke Ya a họpụtara, ndị na-akpọku Ya ehihie na abalị, O nwekwara ntachi obi n’ebe ha nọ?”—Luk 18:7.
“Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; Ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.”—Abụ Ọma 72:12-14.
“Onye na-emetụ unu [ndị Chineke n’elu ala] aka na-emetụ nwa anya [m].”—Zekaraịa 2:8.
Ihe atụ ole na ole ndị a na-egosi n’ụzọ doro anya mmasị dị omimi nke Onye Okike anyị nwere n’ọdịmma nke ndị ya. N’ihi ya, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji gbasoo ndụmọdụ Pita onyeozi: “Na-atụkwasịnụ Ya nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ Ya n’obi.” (1 Pita 5:7) Ma olee otú Chineke ga-esi nyere anyị aka n’oge mkpagbu?
Otú Chineke Si Enyere Ndị Nọ ná Mkpagbu Aka
Dị ka anyị hụworo, mgbe Devid nọ ná mkpagbu, o kpesiri ekpere ike gwa Chineke maka nduzi. N’otu mgbe ahụ, o butere ụzọ n’idozi ọnọdụ ahụ, na-eji ọgụgụ isi eme ihe iji gbanahụ ndị na-achụso ya. Otú a, ndabere na Jehova tinyere mgbalị onwe onye mere ka Devid nwee ike idi ahụhụ ya. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta na nke a?
Mgbe mkpagbu na-eche anyị ihu, o doro anya na ọ dịghị njọ ka anyị bute ụzọ n’ụzọ ezi uche dị na ya iji dozie nsogbu ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye Kraịst achọpụta na ya enweghị ọrụ, ọ́ gaghị etinye mgbalị iji chọta ọrụ? Ma ọ bụ ọ bụrụ na ọ na-arịa ọrịa anụ ahụ, ọ́ gaghị achọ nlekọta e ji ọgwụ enye? N’ezie, ọbụna Jisọs, bụ́ onye nwere ike ịgwọ ụdị ọrịa ọ bụla, kwenyere na ‘mkpa dibịa na-akpa ndị ahụ na-adịghị mma.’ (Matiu 9:12; tụlee 1 Timoti 5:23.) Otú ọ dị, a pụghị iwepụ ahụhụ ụfọdụ; a ghaghị nnọọ idi ha. Otú o sina dị, ezi onye Kraịst adịghị ele ahụhụ anya dị ka ihe ọma n’onwe ya, dị ka ụfọdụ ndị si ele ya. (Tụlee 1 Ndị Eze 18:28.) Kama nke ahụ, ọ na-ewere nzọụkwụ ọ bụla o nwere ike iji nagide mkpagbu ya.
Otú ọ dị, n’otu mgbe ahụ, ezi uche dị na ya iwegara Jehova okwu ahụ n’ekpere. N’ihi gịnị? Nke mbụ, site n’ịdabere n’Onye Okike anyị, a na-enyere anyị aka ‘ịnwa ihe ha na ibe ha dị iche.’ (Ndị Filipaị 1:10) Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-achọ ọrụ, iji ekpere dabere na Chineke ga-enyere anyị aka ịghara ịnara ọrụ na-emegide ụkpụrụ Bible. Anyị ga-ezerekwa ịbụ ndị ịhụ ego n’anya ‘duhiere n’okwukwe.’ (1 Timoti 6:10) N’ezie, mgbe a na-eme mkpebi ndị dị oké mkpa—banyere ọrụ ma ọ bụ akụkụ ọ bụla ọzọ nke ndụ—ọ dị anyị mkpa ịgbaso ndụmọdụ Devid: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 55:22.
Ekpere na-enyekwara anyị aka ijigide nguzozi uche anyị, ka mkpagbu anyị wee ghara irikpu anyị. Pọl onyeozi dere, sị: “N’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ.” Gịnị ga-esi na ya pụta? “Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ee, udo, udo nke Chineke. Udo ahụ “kachasị uche nile,” n’ihi ya ọ pụrụ ime ka anyị kwụsie ike mgbe mmetụta uche na-enye nsogbu na-anyịgbu anyị. Ọ ‘ga-eche obi na echiche uche anyị nche,’ wee si otú ahụ na-enyere anyị aka izere imeghachi omume n’echeghị echiche na n’ụzọ amamihe na-adịghị ya, nke pụrụ ịtụkwasị ihe ná mkpagbu anyị.—Eklisiastis 7:7.
Ekpere ka pụrụ imekwu ihe. Ọ pụrụ imetụta otú otu ọnọdụ si aga. Tụlee otu ihe atụ Bible. Mgbe a tụrụ Pọl onyeozi mkpọrọ na Rom, ọ gbara ndị Kraịst ibe ya ume ka ha kpee ekpere maka ya. N’ihi gịnị? “Ana m arịọbiga unu ókè karị ime nke a,” ka o degaara ha, “ka e wee were m nyeghachi unu ọsọ ọsọ karị.” (Ndị Hibru 13:19) Pọl maara na ekpere ndị kwere ekwe ibe ya na-ekpe n’esepụghị aka pụrụ inwe mmetụta n’ihe banyere mgbe a ga-atọhapụ ya.—Faịlimọn 22.
Ekpere ọ̀ ga-agbanwe ihe ga-esi ná mkpagbu gị pụta? Ọ pụrụ. Otú ọ dị, anyị kwesịrị ịghọta na Jehova adịghị aza ekpere anyị mgbe nile n’ụzọ ahụ anyị nwere ike ịtụ anya ya. Dị ka ihe atụ, Pọl kpere ekpere ugboro ugboro banyere “ogwu n’anụ ahụ” ya—ikekwe nsogbu anụ ahụ nke metụtara ịhụ ụzọ ya. Kama iwepụ mkpagbu ahụ, Chineke gwara Pọl, sị: “Amara m ezuworo gị: n’ihi na e mewo ka ike m zuo okè n’adịghị ike.”—2 Ndị Kọrint 12:7-9.
Ya mere mgbe ụfọdụ a gaghị ewepụ ahụhụ anyị. Kama nke ahụ, anyị ga-enwe ohere iji nwapụta ndabere anyị n’ebe Onye Okike anyị nọ. (Ọrụ 14:22) Ọzọkwa, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ bụrụgodị na Jehova ewepụghị mkpagbu ahụ, ọ “ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka [anyị] wee nwee ike ịnagide ya.” (1 Ndị Kọrint 10:13) Ee, e nwere ezi ihe mere e ji kpọọ Jehova “Chineke nke nkasi obi nile; Onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile.” (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Ọ na-enye anyị ihe dị anyị mkpa iji udo dị ukwuu tachie obi.
N’isi Nso—Ụwa nke Mkpagbu Na-adịghị!
Onye Okike na-ekwe nkwa na site n’Alaeze ya, ọ ga-ewepụ mkpagbu nke ihe a kpọrọ mmadụ n’isi nso. Olee otú ọ ga-esi mezuo nke a? Site n’iwepụ Setan Ekwensu, onyeisi na-akpalite mkpagbu na onyeiro kasịnụ nke udo, onye Bible na-akọwa dị ka “chi nke oge a.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Ma ịchịisi ya n’elu ihe a kpọrọ mmadụ ga-akwụsị n’isi nso. Mwepụ ya ga-emeghe ụzọ maka ngọzi a na-apụghị ịgụta ọnụ ịbịara ndị na-atụ Chineke egwu. Bible na-ekwe nkwa na Jehova ‘ga-ehichapụ anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.’—Mkpughe 21:1-4.
Ụwa nke mkpagbu na-adịghị, ọ̀ na-ada ka ihe dị mma nke ukwuu nke na ọ pụghị ịbụ eziokwu? Ọ marawo anyị ahụ nke ukwuu ịdị ndụ n’ahụhụ nke na ọ na-esiri anyị ike ichetụ adịghị adị ya n’echiche. Ma nnwere onwe pụọ n’egwu, nchegbu, na ọdachi bụ kpọmkwem ihe Chineke zubere maka ihe a kpọrọ mmadụ malite n’okike, nzube ya ga-agakwa nke ọma.—Aịsaịa 55:10, 11.
Nke a bụ olileanya nke Sonia, Fabiana, na Ana, a kpọtụrụ aha n’isiokwu mmalite, chọtara. Sonia, onye ọrịa AIDS gburu ụmụ ndị ikom ya abụọ, nwetara udo dị ukwuu site n’olileanya nke Bible na-esetịpụ—mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na ndị ajọ omume. (Ọrụ 24:15) “Otu ihe doro anya,” ka ọ na-ekwu, “olileanya anyị karịrị ihe mgbu ọ bụla dịnụ.”
Mgbe ọ ka bi n’ogige ụmụ mgbei, otu n’ime Ndịàmà Jehova letara Ana. “O gosiri m aha Jehova n’ime Bible,” ka Ana na-ekwu, “ebekwara m ákwá ọṅụ. Enyemaka dị m mkpa nke ukwuu, amụtakwara m na e nwere Chineke nke na-eche banyere anyị.” Mgbe ọ hapụsịrị ogige ụmụ mgbei, Ana nakweere ọmụmụ Bible ma mụtakwuo banyere nkwa Jehova. Mgbe ahụ ọ raara ndụ ya nye Jehova ma gosipụta ya site na baptism. “Kemgbe ahụ anọgidewo m na-adabere na Jehova site n’ekpere, mmesi obi ike bụ na ọ ga-enyere m aka na-akasikwa m obi.”
Fabiana kwa achọtawo nkasi obi na udo nke uche dị ukwuu ná mkpagbu ya site n’ịmụta banyere nkwa Chineke maka ọdịnihu. “Ịmụ eziokwu sitere na Bible dị ka isi n’ebe gbara oké ọchịchịrị pụọ ma banye n’ọnụ ụlọ gbachapụrụ agbachapụ, na-enwu zaa, ma maa mma.”—Tụlee Abụ Ọma 118:5.
Ma olee mgbe, oleekwa otú udo nkịtị zuru ụwa ọnụ ga-esi bịa? Ka anyị hụ n’isiokwu ndị na-esonụ?
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ọtụtụ Akụkụ nke Mkpagbu
▪ Ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi n’ụwa bi n’ogbenye ọnụ ntụ, ọtụtụ nde ndị ọzọ kwa bi n’ọnọdụ na-ekwesịghị ekwesị maka ụmụ mmadụ bụ́ nke na-eyi ịdịgide ndụ ha egwu.
▪ Ihe karịrị nde ụmụaka 200 adịghị eri ihe na-edozi ahụ.
▪ Kwa afọ otoro na-egbu ihe dị ka nde ụmụaka atọ na-erubeghị afọ ise.
▪ Ọrịa ndị na-efe efe gburu ihe dị ka nde mmadụ 16.5 na 1993 nanị. Ebe ọ bụ na mba ụfọdụ na-agụ ihe bụ nrịanrịa n’ụzọ dịgasị iche iche, ọnụ ọgụgụ bụ ezie pụrụ ịka nnọọ elu.
▪ Ndị mmadụ a na-eme atụmatụ ha ịbụ nde 500 nwere ụdị ụfọdụ nke nsogbu uche.
▪ Ọ̀tụ̀tụ̀ igbu onwe onye na-amụba ngwa ngwa karị n’etiti ndị ntorobịa karịa ná ndị nọ n’ọgbọ ọ bụla ọzọ.
▪ “Agụụ na enweghị ọrụ aghọwo apa n’ahụ ụwa,” ka akwụkwọ bụ́ The Unesco Courier na-ekwu. “E nwere nde 35 na-enweghị ọrụ ná mba asaa kasị baa ọgaranya n’ụwa, na Brazil nanị kwa e nwere nde ndị ọrụ 20, ndị inwe ọrụ na-apụtaghịdị na ha ga-enwe ike iriju afọ.”
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ekpere pụrụ inyere anyị aka ilekwasị anya ná nkwa Chineke banyere ụwa nke mkpagbu na-adịghị