Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 3/1 p. 24-25
  • O Jezuo Ozi Ya n’Ụlọ Nsọ ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • O Jezuo Ozi Ya n’Ụlọ Nsọ ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ije Ozi Ya n’Ụlọ Nsọ ahụ Agwụsịa
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ụbọchị Ikpeazụ Jizọs Nọrọ n’Ụlọ Nsọ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • “Oge Awa Abịawo!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Jizọs Esoro Onye Farisii Rie Ihe
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 3/1 p. 24-25

Ndụ na Ije Ozi Jisọs

O Jezuo Ozi Ya n’Ụlọ Nsọ ahụ

JISỌS na-abịa nke ikpeazụ ya n’ụlọ nsọ ahụ. N’ezie, ọ na-eweta ije ozi ihụ ọha ya n’elu ụwa ná ngwụsi ma e wezụga ihe omume ndị metụtara ọnwụnwa na ogbugbu ya n’ụbọchi atọ na-abia abia. Ugbụ a ọ nọgidere na-akatọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii.

Ugbo atọ ọzọ o kwupụtara, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ!” Na nke mbụ, ọ kpọsara ahụhụ n’isi ha n’ihi na ha na-eme “ka azụ iko na efere dị ọcha, ma n’ime ha jupụtara site n’ịpụnara mmadụ ihe na ejideghị onwe [onye].” Ya mere o nyere ha ndụmọdụ, sị: “Mee ka ime iko na efere dị ọcha, ka azụ ha wee ghọọkwa ọcha.”

Ọzọ ọ kpọsara ahụhụ n’isi ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii maka inwe obi rụrụ arụ na nke e metọrọ emetọ nke na ha na-agbaiị izochi ya site n’iyikwasị ọdịdị nke ịdị nsọ. “Unu yiri ili e teworo nzụ́,” ka o kwuru, “nke na-egosi onwe ha dị ka ihe ọma n’ìhè, ma n’ime ha jupụtara n’ọkpụkpụ nke ndị nwụrụ anwụ, na adịghị ọcha nile.’’

N’ikpeazụ, ihu abụọ ha pụtara ìhè n’ịdị njikere ha dị iwu ili maka ndị amụma ma chọọ ha mma iji dọrọ uche gaa n’ebe ọrụ obi ebere ha dị. Ma, dị ka Jisọs kpụghere, ha “bụ ụmụ nke ndị gburu ndị amụma.” N’ezie, onye o bụla nke nwara ikpughe ihu abụọ ha nọ n’ihe ize ndụ!

N’ịga n’ihu, Jisos kwupụtara okwu ya ndị kasị dị ike nke ọmụma ikpe. “Unu agwọ, unu ajụala,” ka o kwuru, “ùnu ga-esi aṅaa gbanarị ikpe nke [Gehena, NW]?” Gehena bụ ndagwurugwu e ji eme ihe dị ka ebe mkpofu ahịhịa na Jerusalem. Ya mere Jisọs na-ekwu na n’ihi ịnọgide n’ajọ ụzọ ha, ndị odeakwụkwo ahụ na ndị Farisii ga-ata ahụhụ mbibi ebighị ebi.

Banyere ndị ahụ o zitere dị ka ndị nnọchianya ya, Jisọs kwuru, sị: “Ụfọdụ n’ime ha ka unu ga-egbu, kpọgidekwa ha [N’elu osisi, NW]; ụfọdụ n’ime ha ka unu ga-apịakwa ihe n’ụlọ nzukọ unu, sikwa n’otu obodo na-esogbu ha gaa n’obodo ọzọ: ka ọbara ndị ezi omume nile a wụsiworo n’elu ụwa wee bịakwasị unu, site n’ọbara Ebel onye ezi omume ahụ ruo ọbara Zakaraịa nwa Barakaịa [onye a kpọrọ Jehọịada na 2 Ihe Emere], onye unu gburu n’agbata ụlọ nsọ na ebe ịchụàjà unu. N’ezie asị m unu, lhe ndị a nile ga-abịakwasị ọgbọ a.’’

N’ihi na Zakaraịa ji obi ike katọọ ndị ndú lsrael, “ha wee kekọta onwe ha imegide ya, were nkume tụgbuo ya, n’ihi ihe eze nyere n’iwu, n’ogige ụlọ Jehova.” Ma, dị ka Jisos buru n’amụma, Israel ga-akwụ ụgwọ mwụsị ọbara ndị ezi omume nile dị otú ahụ ọ wụsiri. Mgbe e mesịrị ha kwụrụ ụgwo ahụ na 37 afọ, n’afọ 70 O.A., mgbe ndị agha ndị Rom bibiri Jerusalem, ihe karịrị otu nde ndị Juu nwụkwara.

Ka Jisos na-atụle ọnọdụ nke a na-atụ egwu, obi adịghị ya mma. “Jerusalem, Jerusalem,” ka o kwupụtara ọzọ, “ọtụtụ mgbe ole ka m chọrọ ịchịkọ ụmụ gị, ọbụna dị ka nnekwụ ọkụkọ na-achịkọ ụmụ ya n’okpuru nkụ ya abụọ, ma unu achọghị! Lee, a na-ahapụrụ ụnụ ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ n’efu.”

Mgbe ahụ Jisọs kwukwara, sị: “Unu agaghị ahụ m ọzọ site n’ugbu a ma ọlị, ruo mgbe unu ga-asị, Onye a goziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa n’aha [Jehova, NW]!” Ụbọchị ahụ ga-abụ n’ọnụnọ Kraịst mgbe ọ ga-abanye n’Alaeze eluigwe ya, ndị mmadụ ga-ejikwa anya nke okwukwe wee hụ ya.

Ugbụ a Jisọs gara n’otu ebe ọ ga-anọ nwee ike ikiri ebe ndebe ụtụ ahụ dị n’ụlọ ukwu ahụ nakwa ìgwè mmadụ ndị na-atụnye ego n’ime ha. Ndị ọgaranya na-atụbanye ọtụtụ mkpụrụ ego. Ma mgbe ahụ otu nwanyị di ya nwụrụ nke bụ ogbenye bịara ma tụbanye obere mkpụrụ ego abụo nke na-enweghị uru dị ukwuu.

N’ịkpọkọta ndị na-eso ụzo ya, Jisos kwuru, sị: “N’ezie asị m unu, Nwanyị a, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ, ọ tụbara karịa ndị nile na-atụba n’ime ebe ụtụ ahụ.” Ọ ghaghị ijụworị ha anya otú nke a pụrụ isi dị otú ahụ. Ya mere Jisọs kọwara, sị: “Ha nile sitere n’inwebiga akụ okè ha tụba; ma nwanyị ahụ sitere n’ụko ya tụba ka ihe nile nke o nwere hà, bụ́ ihe dum o ji biri.” Mgbe o kwusịrị ihe ndị a, Jisos pụrụ n’ụlo ukwu ahụ na nke ikpeazụ ya.

N’ịbụ ndị ibu ibu na ịma mma nke ụlo ukwu ahụ tụrụ n’anya, ndị na-eso ụzọ ya kwupụtara, sị: “Onye ozizi, lee aha nkume na aha owuwu ụlọ ndị a bụ!’’ N’ezie, e kwụwo na nkume ndị ahụ dị ihe karịrị

35 amaụkwụ [11 mita] n’ogologo, dịkwa ihe karịrị 15 amaụkwụ [5 mita] n’obosara, nakwa ihe karịrị 10 amaụkwụ [3 mita] n’ịdị elu!

“Ị̀ hụrụ okè owuwu ụlo ndị a?” ka Jisọs zaghachiri. “A gaghị ahapụ otu nkume ma olị n’ebe a n’elu nkume ibe ya, nke a na-agaghị akwatu n’ala.”

Mgbe o kwusịrị ihe ndị a, Jisọs na ndị ozi ya gafere Ndagwurugwu Kidrọn ma rịgoo n’Ugwu Olive. site n’ebe ahụ ha pụrụ ilepụ anya gaa n’ụlo ukwu ahụ dị ebube. Matiu 23:25-24:3; Mak 12:41-13:3; Luk 21:1-5; 2 Ihe Emere 24:20-22.

◆ Gịnị ka Jisọs mere mgbe ọ gara n’ụlọ ukwu ahụ na nke ikpeazụ ya?

◆ Olee otú ihu abụọ nke ndị odeakwọkwọ na ndị Farisii si pụta ìhè?

◆ Gịnị ka ‘ikpe nke Gehena,’ pụtara?

◆ N’ihi gịnị ka Jisọs ji kwuo na nwanyị ahụ di ya nwụrụ tụnyere ihe karịrị nke ndị ọgaranya ahụ tụnyere?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya