Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ànyị kwesịrị ịghọta site na Job 1:8, na n’oge ahụ mgbe Job dị ndụ, nanị ya bụ mmadụ nke kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova?
Ee e. Nkwubi okwu ahụ ezighị ezi site n’ihe e kwuru na Job 1:8, nke na-asị:
“Jehova wee sị Setan, Ị̀ tụkwasịwo obi gị n’ahụ ohu m, bụ́ Job? na ọ dịghị onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” Chineke kwuru otu okwu ịja mma ahụ na Job 2:3, na-ajụ Setan, sị: “Ị̀ tụkwasịwo obi gị n’ahụ ohu m, bụ́ Job? na ọ dịghị onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.”
Akwụkwọ Job n’onwe ya na-egosi na ọ bụghị nanị Job bụ mmadụ dị ndụ nke Chineke nabatara dị ka onye kwesịrị ntụkwasị obi. Na-amalite n’isi nke 32, anyị na-agụ banyere Elaịhu. Ọ bụ ezie na ọ ka bụ nwa okorobịa, Elaịhu gbaziri Job olu maka ụzọ na-ezighị ezi o si ele ihe anya, buliekwa ezi Chineke ahụ elu.”—Job 32:6-33:6, 31-33; 35:1-36:2.
N’ihi nke ahụ, okwu Chineke nke bụ na ‘ọ dịghị onye dị ka Job n’ụwa’ aghaghị ịpụta na Job pụtara ìhè karịsịa dị ka nwoke ziri ezi. Eleghị anya, Job dịrị ndụ na-agbata oge Josef nwụrụ n’Ijipt na ná mmalite nke ije ozi Mosis dị ka onye amụma nke Chineke. N’oge ahụ, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị Israel bi n’Ijipt. Ọ dịghị ihe mere a ga-eji chee na ha nile bụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi na ndị Chineke na-anabataghị; ma eleghị anya, e nwere ọtụtụ ndị tụkwasịrị obi na Jehova. (Ọpụpụ 2:1-10; Ndị Hibru 11:23) Ma, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha mere ihe pụtara ìhè, dị ka Josef mere, ọ dịghịkwa nke ọ bụla n’ime ndị ofufe ahụ pụtara ìhè n’ihe banyere ezi ofufe, dị ka Mosis gaje ịdị n’iduru mba Israel pụọ n’Ijipt.
Otú ọ dị, e nwere nwoke kwesịrị ntụkwasị obi dị ịrịba ama nke bi n’ebe ọzọ. “Otu nwoke dị n’ala Uz, Job bụ aha ya; nwoke ahụ zuru okè, ziekwa ezi, ọ na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.”—Job 1:1.
Otú a, Jehova pụrụ ihota Job dị ka ihe nlereanya doro anya ma ọ bụ nke pụtara ìhè nke okwukwe na nsọpụrụ. N’otu aka ahụ, ndị so dee Bible bụ́ Ezikiel na Jemes n’ileghachi anya azụ, kpọtụrụ Job aha dị ka onye setịpụrụ ihe nlereanya nke ezi omume na ntachi obi.—Ezikiel 14:14; Jemes 5:11.