Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 11/15 p. 10-14
  • Job Tachiri Obi—Anyị Pụkwara!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Job Tachiri Obi—Anyị Pụkwara!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Oké Ihe Iseokwu
  • Setan Emee Mwakwasị!
  • Ọdachi Ka Ukwuu Emee
  • Ihe Iseokwu ahụ Atawanye Akpụ
  • Ndị Aghụghọ Atọ Dị Nganga
  • Ndị Na-ebo Job Ebubo Emee Mwakwasị
  • Anyị Pụrụ Ịtachi Obi
  • Job Toro Aha Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Job
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Nwee Olileanya n’Ebe Jehova Nọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Job—Nwoke Nwere Ntachi Obi Ma Kwesị Ntụkwasị obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 11/15 p. 10-14

Job Tachiri Obi​—⁠Anyị Pụkwara!

“Lee, anyị na-akpọ ha ndị ngọzi dịịrị, bụ́ ndị tachiri obi.”​—⁠JEMES 5:11.

1. Gịnị ka otu onye Kraịst meworo agadi kwuru banyere ule ya dị iche iche?

‘EKWENSU na-achụ m! Ọ dị m nnọọ otú ọ dị Job!’ Okwu ndị ahụ ka A. H. Macmillan ji kọwaara otu ezigbo enyi ya n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova mmetụta ya. Nwanna Macmillan jesịrị ozi elu ala ya mgbe ọ dị 89 afọ n’August 26, 1966. Ọ maara na ịja mma maka ozi ikwesị ntụkwasị obi nke ndị Kraịst e tere mmanụ ndị dị ka ya “na-eso ha gaa.” (Mkpughe 14:13) N’ezie, ha ga-anọgide na-aga n’ihu n’ozi Jehova site ná mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. Ndị enyi ya ṅụrịrị ọṅụ na Nwanna Macmillan nwetara ụgwọ ọrụ ahụ. Otú ọ dị, n’oge ngwụsị afọ ndụ ya n’elu ụwa, o nwetara ọnwụnwa dị iche iche, gụnyere nsogbu ahụ ike nke mere ka ọ mara nnọọ banyere mgbalị nile nke Setan imebi nguzosi ike ya n’ezi ihe nye Chineke.

2, 3. Ònye bụ Job?

2 Mgbe Nwanna Macmillan kwuru na ọ dị ya nnọọ otú ọ dị Job, ọ na-ezo aka n’ebe otu nwoke nke tachiworo obi n’oké ule dị iche iche nke okwukwe. Job biri “n’ala Uz,” nke yiri ka ọ bụ n’ebe ugwu Arebia. Onye sitere n’usoro ọmụmụ nke nwa Noa bụ́ Shem, ọ bụ onye na-efe Jehova ofufe. Ule dị iche iche nke Job yiri ka ha weere ọnọdụ n’agbata oge ọnwụ Josef na mgbe Mosis gosipụtara onwe ya dị ka onye ziri ezi. N’oge ahụ ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’elu ala nke dị ka Job ná nsọpụrụ Chineke. Jehova lere Job anya dị ka nwoke zuru okè, ziekwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke.​—⁠Job 1:​1, 8.

3 Dị ka onye “dị ukwuu karị ụmụ Ihu anyanwụ nile,” Job nwere ọtụtụ ndị ohu, ụmụ anụ ya dịkwa 11,500 n’ọnụ ọgụgụ. Ma ụba ime mmụọ kasị mkpa nye ya. Dị ka ndị nna na-atụ egwu Chineke taa, o yikarịrị ka Job ọ kụziiri ụmụ ya ndị ikom asaa na ndị inyom atọ banyere Jehova. Ọbụna mgbe ha na-ebikwaghị n’ụlọ ya, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nchụàjà nke ezinụlọ site n’ịchụrụ ha àjà, nanị ma adịghị ama ama ọ bụrụ na ha emehiewo.​—⁠Job 1:​2-⁠5.

4. (a) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst a na-akpagbu kwesịrị iji chee banyere nwoke ahụ bụ́ Job? (b) Banyere Job, ajụjụ dịgasị aṅaa ka anyị ga-atụle?

4 Job bụ onye ndị Kraịst a na-akpagbu ga-atụle iji wusie onwe ha ike maka iji ndidi tachie obi. “Lee,” ka Jemes bụ́ onye na-eso ụzọ dere. “Anyị na-akpọ ha ndị ngọzi dịịrị, bụ́ ndị tachiri obi: unu nụrụ ihe banyere ntachi obi nke Job, hụkwa ihe Onyenwe anyị zubere, na Onyenwe anyị bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.” (Jemes 5:11) Dị ka Job, ntachi obi dị ụmụazụ Jisọs e tere mmanụ na “oké ìgwè mmadụ” nke oge a mkpa iji nagide ule dị iche iche nke okwukwe. (Mkpughe 7:​1-⁠9) Ya mere, ule ndị dị aṅaa ka Job tachiri obi na ha? Gịnị mere ha ji mee? Oleekwa otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ahụmahụ ya dị iche iche?

Oké Ihe Iseokwu

5. N’ịbụ nke Job na-amaghị, gịnị na-ewere ọnọdụ n’eluigwe?

5 N’ịbụ nke Job na-amaghị, a na-ejikere ịkpalite otu oké ihe iseokwu n’eluigwe. Otu ụbọchị, “ụmụ Chineke bịara iguzo onwe ha n’ihu Jehova.” (Job 1:6) Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya, bụ́ Okwu ahụ, nọ ya. (Jọn 1:​1-⁠3) Ndị mmụọ ozi ezi omume na ‘ụmụ mmụọ ozi nke Chineke’ ndị nupụrụ isi nọkwa ya. (Jenesis 6:​1-⁠3) Setan nọ n’ebe ahụ, n’ihi na nchụpụ ya site n’eluigwe agajeghị ịbịa ruokwa mgbe e guzobesịrị Alaeze ahụ na 1914. (Mkpughe 12:​1-⁠12) N’ụbọchị Job, Setan gaje ịkpalite otu oké ihe iseokwu. Ọ na-ejikere ịma izi ezi nke ọkaaka Jehova n’elu ihe nile O kere eke aka.

6. Gịnị ka Setan na-agbalị ime, oleekwa otú o si kwutọọ Jehova?

6 “Olee ebe i si bịa?” ka Jehova jụrụ. Setan zaghachiri: “Site n’ịgagharị n’ụwa, na site n’ijegharị n’ime ya.” (Job 1:7) Ọ nọwo na-achọ onye ọ ga-elomi. (1 Pita 5:​8, 9) Site n’imebi iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị na-ejere Jehova ozi, Setan gaje ịgbalị igosi na ọ dịghị onye ọ bụla gaje irubere Chineke isi n’ụzọ zuru ezu n’ihi ịhụnanya. N’ikwu okwu banyere ihe iseokwu ahụ, Jehova jụrụ Setan, sị: “Ị̀ tụkwasịwo obi gị n’ahụ ohu m, bụ́ Job? na ọ dịghị onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” (Job 1:8) Job ruru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke Chineke nke nyere ohere maka ezughị okè ya nile. (Abụ Ọma 103:​10-⁠14) Ma Setan zaghachiri n’ike, sị: “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke? Ọ́ bụghị Gị onwe gị gbawooro ya, gbakwaara ụlọ ya, gbakwaara ihe nile o nwere, ogige gburugburu? Ị gọziwo ọrụ aka ya abụọ, ihe nnweta ya agbasawokwa n’ala.” (Job 1:​9, 10) Ekwensu si otú a kwutọọ Jehova site n’ikwu na ọ dịghị onye hụrụ Ya n’anya ma na-efe Ya n’ihi ihe Ọ bụ, kama na Ọ na-enye ihe O kere eke aka azụ iji jeere Ya ozi. Setan kwuru na Job na-ejere Chineke ozi n’ihi uru onwe onye, ọ bụghị n’ihi ịhụnanya.

Setan Emee Mwakwasị!

7. N’ụzọ dị aṅaa ka Ekwensu si maa Chineke aka, oleekwa otú Jehova si zaghachi?

7 “Ma otú ọ dị,” ka Setan sịrị, “biko, setịpụ aka Gị, metụ ihe nile o nwere, ọ ghaghịkwa ịgbakụta Gị azụ n’ihu Gị.” Olee otú Chineke gaje isi zaghachi ụdị ịma aka mkparị dị otú ahụ? “Lee,” ka Jehova sịrị. “Ihe nile o nwere dị n’aka gị; nanị esetịla aka gị metụ ahụ ya.” Ekwensu ekwuworị na a gọziri, mụbaa, ma gbaa ihe nile Job nwere ogige gburugburu. Chineke gaje ikwe ka Job taa ahụhụ, ọ bụ ezie na a gaghị emetụ ahụ ya aka. N’ikpebisi ike ime ihe ọjọọ, Setan hapụrụ nzukọ ahụ.​—⁠Job 1:​11, 12.

8. (a) Mfu ihe onwunwe dịgasị aṅaa ka Job nwere? (b) Gịnị bụ eziokwu banyere “ọkụ nke Chineke”?

8 N’oge na-adịghị anya, mwakpo Setan malitere. Otu n’ime ndị ohu Job nyere ya akụkọ ọjọọ nke a: “Ìgwè ehi na-adọ ihe e ji gwuo ala ubi, ìgwè nne ịnyịnya ibu na-ata nri n’akụkụ ha: ndị Sheba wee dakwasị ha, chịrị ha; ọzọkwa, ha ewerewo ọnụ mma agha tigbuo ndị na-ejere gị ozi.” (Job 1:​13-⁠15) E wepụwo ogige ahụ dị gburugburu ihe onwunwe Job. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ, e ji ike ndị mmụọ ọjọọ kpọmkwem mee ihe, n’ihi na ohu ọzọ kọrọ, sị: “Ọkụ nke Chineke esiwo n’eluigwe daa, rechapụ ìgwè ewu na atụrụ, na ndị na-ejere gị ozi, ripịa ha.” (Job 1:16) Lee ka o si bụrụ ihe jọgburu onwe ya ime ka o yie ka ọ bụ Chineke kpatara ọdachi dị otú ahụ ọbụna n’ahụ onye na-ejere ya ozi! Ebe àmụ̀mà na-esite n’eluigwe, a pụrụ ịtaworị Jehova ụta n’ụzọ dị mfe, ma n’ezie ọkụ ahụ sitere n’aka ndị mmụọ ọjọọ.

9. Olee otú ndakpọ akụ na ụba si metụta mmekọrịta Job na Chineke?

9 Ka Setan nọgidere na-eme mwakwasị, ohu ọzọ kọrọ na ndị Kaldea achịkọrọwo camel Job ma gbuo ndị ohu ndị ọzọ nile. (Job 1:17) Ọ bụ ezie na Job si otú a nweta ndakpọ akụ̀ na ụba, nke a emebighị mmekọrịta ya na Chineke. Ị̀ pụrụ ịtachi obi n’oké mfu nke ihe onwunwe n’emebighị iguzosi ike gị n’ezi ihe nye Jehova?

Ọdachi Ka Ukwuu Emee

10, 11. (a) Gịnị mere ụmụ iri nke Job? (b) Ka ọnwụ ọdachi nke ụmụ Job gasịrị, olee otú o si lee Jehova anya?

10 Ekwensu akwụsịbeghị ịwakwasị Job. Ohu ọzọ kọkwara, sị: “Ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom na-eri ihe na-aṅụkwa mmanya vine n’ụlọ nwanne ha, bụ́ ọkpara: ma, lee, oké ifufe siri n’ofe ọzara bịa, tie nkuku anọ nke ụlọ ahụ, o wee dakwasị ụmụ okorobịa ahụ, ha wee nwụọ; nanị mụ onwe m wee gbapụ, nanị m, igosi gị.” (Job 1:​18, 19) Onye na-aghọtaghị ihe merenụ pụrụ ikwu na mbibi ahụ nke ifufe kpatara bụ ‘ọrụ aka Chineke.’ Otú ọ dị, ike ndị mmụọ ọjọọ emetụwo Job n’ebe ga-akasị ruo ya n’ahụ.

11 N’ịbụ onye nọ ná mwute, Job ‘dọwara uwe mwụda ya, kọpụ isi ya, daa n’ala kpọọ isiala.’ Otú ọ dị, gee ntị n’ihe ndị o kwuru. “Jehova nyere, Jehova anarawokwa; ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi.” Ihe ndekọ ahụ gbakwụnyere: “N’ihe a nile Job emehieghị, ọ sịghịkwa na Chineke mere ihe nzuzu.” (Job 1:​20-⁠22) E merikwara Setan ọzọ. Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ anwụnahụ anyị, anyị nweekwa mwute dị ka ndị ohu Chineke? Nraranye na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nye Jehova na ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ pụrụ inyere anyị aka ịtachi obi dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe, dị nnọọ ka Job mere. Ndị e tere mmanụ na ndị na-esonyere ha bụ́ ndị nwere olileanya elu ala pụrụ n’ezie inweta nkasi obi na ume site n’ihe ndekọ a nke ntachi obi Job.

Ihe Iseokwu ahụ Atawanye Akpụ

12, 13. Ná nzukọ ọzọ n’eluigwe, gịnị ka Setan rịọrọ maka ya, oleekwa otú Chineke si zaghachi?

12 Jehova kpọrọ nzukọ ọzọ n’ụlọ ikpe nke eluigwe n’egbughị oge. Job aghọọla onye na-enweghị nwa, nke dara ogbenye, onye yiri ka Chineke o tiri ya ihe otiti, ma a kpaghị iguzosi ike ya n’ezi ihe aka. Otú ọ dị, Setan agaghị ekweta na ebubo ya nile megide Chineke na Job bụ ụgha. Ugbu a ‘ụmụ Chineke’ gaje ịnụrụ ịrụ ụka nile ka Jehova mere ihe iji nweta Ekwensu, ka onye ọ bụla wee hụ ihe bụ́ eziokwu.

13 N’ịkpọ Setan ịbịa zara ọnụ ya, Jehova jụrụ, sị: “Olee ebe i si bịa?” Gịnị bụ azịza ya? “Site n’ịgagharị n’ụwa, na site n’ijegharị n’ime ya.” Ọzọ Jehova dọọrọ uche gaa n’ebe ohu ya zuru okè, ziekwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke, bụ́ Job nọ, bụ́ onye ka na-ejisi nguzosi ike ya n’ezi ihe ike. Ekwensu zaghachiri, sị: “Akpụkpọ ahụ laara akpụkpọ ahụ, ọbụna ihe nile nke mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ ndụ ya. Otú ọ dị, biko, setịpụ aka Gị, metụ ọkpụkpụ ya metụkwa anụ ahụ ya, ọ ghaghịkwa ịgbakụta Gị azụ n’ihu Gị.” Ya mere Chineke sịrị: “Lee, ọ nọ n’aka Gị; nanị debe ndụ ya.” (Job 2:​2-⁠6) Na-egosi na Jehova ewepụsịbeghị ogige nchebe nile, Setan rịọrọ maka ịkpatụ ọkpụkpụ na anụ ahụ Job aka. A gaghị ekwe ka Ekwensu gbuo Job; ma Setan maara na ọrịa anụ ahụ ga-egbu ya mgbu ma mee ka o yie ka ọ na-anata ntaramahụhụ sitere n’aka Chineke n’ihi mmehie nzuzo.

14. Gịnị ka Setan ji tie Job ihe otiti, n’ihi gịnịkwa ka mmadụ ọ bụla na-apụghị inye onye ahụ na-arịa ya ngwọta?

14 N’ịbụ onye a chụpụrụ site ná nzukọ ahụ, Setan jiri ọṅụ obi ọjọọ gaa n’ihu. O weere “ihe ofifi ọjọọ tie Job, site n’ọbụ ụkwụ ya ruo opu n’isi ya.” Lee oké nhụsi anya Job tachiri obi na ya ka ọ na-anọdụ ala n’ikpo ntụ ma jiri mpekere éjùjù na-akọ onwe ya ọkọ! (Job 2:7, 8) Ọ dịghị dibịa bụ́ mmadụ nke pụrụ ime ka o nwere onwe ya pụọ n’ihe otiti a na-egbu oké mgbu, a na-asọ oyi, nke mweda n’ala, n’ihi na ọ bụ ike Setan kpatara ya. Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ịgwọ Job. Ọ bụrụ na ị bụ ohu Chineke nke na-arịa ọrịa, echezọla mgbe ọ bụla na Chineke pụrụ inyere gị aka ịtachi obi, ọ pụkwara inye gị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ nke ọrịa na-adịghị.​—⁠Abụ Ọma 41:​1-⁠3; Aịsaịa 33:24.

15. Gịnị ka nwunye Job gbara ya ume ime, gịnịkwa bụ mmeghachi omume ya?

15 N’ikpeazụ, nwunye Job sịrị: “Ị̀ nọ na-ejide izu okè gị? gbakụta Chineke azụ, nwụọ.” “Izu okè” na-egosi nraranye na-enweghị ntụpọ, ọ pụkwara ịbụ na o kwuru okwu n’ụzọ ịkwa emo iji mee ka Job kọchaa Chineke. Ma ọ zaghachiri: “Dị ka otu n’ime ndị inyom nzuzu si ekwu, otú a ka ị na-ekwu. Ànyị ga-anarakwa ezi ihe n’aka Chineke, ghara ịnara ihe ọjọọ?” Ọbụna aghụghọ nke a nke Setan kụrụ afọ n’ala, n’ihi na a gwara anyị, sị: “N’ihe a nile Job ejighị egbugbere ọnụ ya mehie.” (Job 2:​9, 10) Ọ bụrụkwanụ na ndị òtù ezinụlọ na-emegide emegide gaje ikwu na anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ ná nchụso ndị Kraịst n’ụzọ nzuzu ma gbaa anyị ume ka anyị gbakụta Jehova Chineke azụ. Dị ka Job, anyị pụrụ ịtachi obi n’ule dị otú ahụ n’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya ma nwee ọchịchọ ito aha ya dị nsọ.​—⁠Abụ Ọma 145:​1, 2; Ndị Hibru 13:15.

Ndị Aghụghọ Atọ Dị Nganga

16. Ònye bịara, dị ka e chere ịbịa kasie Job obi, ma olee otú Setan si jiri ha mee ihe?

16 N’ihe mesịrị ghọọ atụmatụ ọzọ nke Setan, ndị “enyi” atọ bịara, dị ka e chere ịbịa kasie Job obi. Otu n’ime ha bụ Elifaz, bụ́ onye yiri ka o sitere n’usoro ọmụmụ Abraham site n’Ịsọ. Ebe ọ bụ na Elifaz butere ụzọ n’ikwu okwu, eleghị anya ọ bụ ya kasị mee okenye. Bildad nọkwa ya, bụ́ onye sitere n’usoro ọmụmụ Shua, bụ́ otu n’ime ụmụ ndị ikom Ketura mụụrụ Abraham. Onye nke atọ bụ Zofa, bụ́ onye a kpọrọ onye Neama iji mee ka a mata ezinụlọ ya ma ọ bụ ebe o bi, ma eleghị anya n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke ebe ugwu Arebia. (Job 2:11; Jenesis 25:1, 2; 36:4, 11) Dị ka ndị ahụ na-agbalị ime ka Ndịàmà Jehova gbakụta Chineke azụ taa, mmadụ atọ a bụ ndị Setan ji mee ihe ná mgbalị ime ka Job kweta na ikpe ebubo ụgha dị iche iche mara ya wee mebie iguzosi ike ya n’ezi ihe.

17. Gịnị ka mmadụ atọ ahụ bịara nleta mere, gịnịkwa ka ha na-emeghị ruo ụbọchị asaa ehihie na abalị?

17 Mmadụ atọ ahụ mere oké ngosi nke obi ebere site n’ibe ákwá, ịdọwa uwe ha, na ikpokwasị ájá n’isi ha. Ma ha na Job nọrọ ụbọchị asaa ehihie na abalị n’ekwughị otu mkpụrụ okwu nkasi obi! (Job 2:​12, 13; Luk 18:​10-⁠14) Ndị aghụghọ atọ ndị a dị nganga nọ n’oké ụkọ ihe ime mmụọ nke na ha enweghị ihe nkasi obi ọ bụla ikwu banyere Jehova na nkwa ya dị iche iche. Ma, ha na-eru nkwubi okwu ndị na-ezighị ezi ma na-ejikere iji ha mee ihe megide Job ozugbo ha mezuru iwu iru újú ihu ọha. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, tupu ụbọchị asaa ahụ nke idere duu agwụsịa, nwa okorobịa ahụ bụ́ Elaịhu weere oche n’ebe ọ pụrụ ịnọ na-anụ ihe a na-ekwu.

18. N’ihi gịnị ka Job ji chọọ udo n’ọnwụ?

18 N’ikpeazụ, Job kwụsịrị idere duu ahụ. Ebe ọ na-enwetaghị nkasi obi ọ bụla site n’aka mmadụ atọ ahụ bịara nleta, ọ kọchara ụbọchị a mụrụ ya ma jụọ ihe mere e ji na-agbatị ndụ nhụjuanya ya. Ugbu a ọ na-adịghị ihe o nwere, bụrụ onye mmadụ nwụnahụrụ, ma na-arịasi ọrịa ike, ọ chọrọ udo n’ọnwụ, n’echetụdịghị n’echiche na ọ dị mgbe ọ bụla ya pụrụ inwe ezi ọṅụ ọzọ tupu ọ nwụọ. Ma Chineke agaghị ekwe ka a kpaa Job aka ruo n’ókè nke ịnwụ.​—⁠Job 3:​1-⁠26.

Ndị Na-ebo Job Ebubo Emee Mwakwasị

19. N’akụkụ dịgasị aṅaa ka Elifaz boro Job ebubo ụgha?

19 Elifaz buru ụzọ kwuo okwu na nke ọ bụla n’ime àgbà atọ ahụ nke ịrụ ụka nke lekwuru nguzosi ike nke Job n’ezi ihe ule. N’okwu ya nke mbụ, Elifaz jụrụ, sị: “Olee ebe e zipụworo ndị ziri ezi?” O kwubiri na ọ ghaghị ịbụ na Job emeworị ihe ọjọọ iji nata ntaramahụhụ Chineke. (Job, isi nke 4, 5) N’okwu ya nke abụọ, Elifaz kwara amamihe Job emo ma jụọ, sị: “Gịnị ka ị maara nke anyị na-amaghị?” Ihe Elifaz na-ekwu bụ na Job na-anwa igosi na ya dị elu karịa Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Na-emechi mwakpo ya nke abụọ, o mere ka Job yie onye ikpe ịdapụ n’ezi ofufe, iri ngo, na aghụghọ mara. (Job, isi nke 15) N’okwu ya nke ikpeazụ, Elifaz n’ụzọ na-abụghị eziokwu boro Job ebubo nke ọtụtụ mpụ​—⁠mpụnara ihe n’ike, enyeghị ndị nọ ná mkpa nri na mmiri, na imegbu ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei.​—⁠Job, isi nke 22.

20. Gịnị bụ ọdịdị nke mwakwasị Bildad wakwasịrị Job?

20 N’ịbụ onye nke abụọ n’ime àgbà ọ bụla nke arụmụka ahụ, Bildad na-agbasokarị otu isiokwu ahụ nke Elifaz setịpụrụ. Okwu ndị nke Bildad dị mkpirikpi karị ma na-eru n’ahụ karị. O boro ọbụna ụmụ Job ebubo ime ihe ọjọọ sikwa otú ahụ kwesị ọnwụ. N’echiche na-ezighị ezi, o jiri ihe atụ a mee ihe: Dị ka papyrus na amị̀ si akpọnwụ mgbe mmiri na-adịghị, otú a ka ọ dị n’ebe “ndị nile na-echezọ Chineke” nọ. Okwu ahụ bụ eziokwu, ma ọ dabaghị n’ọnọdụ Job. (Job, isi nke 8) Bildad weere nsogbu Job nile dị ka ndị na-abịara ndị ajọ omume. (Job, isi nke 18) N’okwu ya nke atọ nke dị mkpirikpi, Bildad rụrụ ụka na mmadụ bụ “ikpuru” na “idide,” n’ihi ya kwa ha adịghị ọcha n’ihu Chineke.​—⁠Job, isi nke 25.

21. Gịnị ka Zofa boro Job ebubo ya?

21 Zofa bụ onye nke atọ kwuru okwu n’arụmụka ahụ. N’ozuzu ya ịrụ ụka ya yiri nke Elifaz na Bildad. Zofa boro Job ebubo nke ime ajọ omume ma gbaa ya ume iwezụga omume mmehie ya nile. (Job, isi nke 11, 20) Ka àgbà abụọ gasịrị Zofa kwụsịrị ikwu okwu. O nweghị ihe ọ ga-atụkwasị n’àgbà nke atọ. Otú ọ dị, kemgbe a nile, Job ji obi ike zaghachi ndị na-ebo ya ebubo. Dị ka ihe atụ, o kwuru n’otu mgbe, sị: “Ndị nkasi obi na-eweta ọnọdụ ọjọọ ka unu nile bụ. Okwu nke bụ́ nanị ifufe [ọ̀] ga-enwe ọgwụgwụ?”​—⁠Job 16:​2, 3.

Anyị Pụrụ Ịtachi Obi

22, 23. (a) Dị ka ọ dị n’ọnọdụ nke Job, olee otú Ekwensu pụrụ isi gbalịa imebi iguzosi ike anyị n’ezi ihe nye Jehova Chineke? (b) Ọ bụ ezie na Job na-atachi obi n’ule dị iche iche, gịnị ka anyị pụrụ ịjụ banyere omume ya?

22 Dị ka Job, anyị pụrụ iche ihe karịrị otu ule ihu n’otu mgbe, Setan pụkwara iji nkụda obi ma ọ bụ ihe ndị ọzọ mee ihe ná mgbalị ya imebi nguzosi ike anyị n’ezi ihe. Ọ pụrụ ịgbalị ime ka anyị chigharịa megide Jehova ma ọ bụrụ na anyị na-enwe nsogbu akụ̀ na ụba. Ọ bụrụ na onye a hụrụ anya anwụọ ma ọ bụ anyị nwee ahụ adịghị ike, Setan pụrụ ịgbalị inunye anyị ịta Chineke ụta. Dị ka ndị enyi Job, mmadụ pụrụ ọbụna ibo anyị ebubo ụgha. Dị ka Nwanna Macmillan gosiri, Setan pụrụ ịdị ‘na-achụ anyị,’ ma anyị pụrụ ịtachi obi.

23 Dị ka anyị hụworo rute ugbu a, Job na-atachi obi n’ule ya dị iche iche. Otú ọ dị, ọ̀ bụ nanị ntakịrị ntachi obi ka o nwere? Ò nwere n’ezie mmụọ tiwara etiwa? Ka anyị lee ma ọ bụ na Job enwekwaghị olileanya ọ bụla n’ezie.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaghachi?

◻ Oké ihe iseokwu dị aṅaa ka Setan kpalitere n’ụbọchị Job?

◻ Site na gịnị ka e ji nwaruo Job n’isi?

◻ Gịnị ka “ndị enyi” atọ nke Job boro ya ebubo ya?

◻ Dị ka ọ dị n’ọnọdụ nke Job, olee otú Setan pụrụ isi gbalịa imebi iguzosi ike anyị n’ezi ihe nye Jehova?

[Foto dị na peeji nke 10]

A. H. Macmillan

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya