-
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụỤlọ Nche—1991 | Febụwarị 15
-
-
Mgbe o yiri ka Job ọ̀ ga-anwụ, Elaịhu tụlere ọnọdụ ọjọọ Job nọ na ya wee tọọ ntọala maka inwe olileanya, na-asị: “Anụ ahụ ya na-agwụsị, e wee ghara ịhụ ya anya; . . . Mkpụrụ obi ya wee na-abịaru nso olulu, ndụ ya na-abịarukwa nso ndị na-eme ka a nwụọ. Ọ bụrụ na mmụọ ozi anọọ n’akụkụ ya, bụ́ onye nsụgharị, otu onye n’etiti [otu puku ndị mmụọ ozi], igosi mmadụ izi ezi ya; ọ ga-emekwara ya amara, sị, Dọpụta ya n’ịrịda n’olulu, achọtawo m ihe mgbapụta. Anụ ahụ ya ga-adị ọhụrụ karị nke nwata.”—Job 33:21-25.
-
-
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụỤlọ Nche—1991 | Febụwarị 15
-
-
Nke ahụ bụ ihe merenụ. Job ‘chegharịrị n’elu ájá na ntụ́.’ Mgbe ahụ, gịnị meziri? “Jehova mekwara ka ndọta n’agha Job lata . . . Ọzọ, Jehova gọziri ikpeazụ Job karị mmalite ya . . . Job wee dị ndụ mgbe ihe ndị a gasịrị [otu narị na iri afọ anọ] o wee hụ ụmụ ya, na ụmụ ụmụ ya, bụ́ ọgbọ anọ.” N’eziokwu, ihe mgbapụta ahụ emeghị ka Job nwere onwe ya pụọ ná mmehie, ya mere, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọ nwụrụ. Ma, ime ka ndụ ya dịwanye ogologo nwapụtara na, n’ụzọ dị irè, ‘anụ ahụ ya dịrị ọhụrụ karịa nke nwata, ọ laghachikwukwaara ụbọchị okorobịa ya.’—Job 33:25; 42:6, 10-17.
-