Echiche nke Bible
Sayensị na Bible Hà Na-ekwekọ?
MALITE n’ụgbọelu na bọmbụ atọm ruo ná mkpụrụ ndụ ndị a gbanwere ọdịdị ihe nketa ha na iji otu mkpụrụ ndụ mụpụta atụrụ abụọ, narị afọ nke 20 anyị abụwo ọgbọ jupụtara na sayensị. Ndị ọkà mmụta sayensị ebugawo ndị mmadụ n’ọnwa, kpochapụ kịtịkpa, weta mgbanwe n’ọrụ ugbo, ma weta usoro nzirịta ozi n’otu ntabi anya nke zuru ụwa nile nye ọtụtụ ijeri mmadụ. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na mgbe ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu okwu, ndị mmadụ na-ege ntị. Ma gịnị, ma ọ bụrụ na ọ dị, ka ndị ọkà mmụta sayensị nwere ikwu banyere Bible? Gịnịkwa, n’aka nke ọzọ, ka Bible na-agwa anyị banyere sayensị?
Ọrụ Ebube Hà Bụ Ihe Ndị Na-ekwekọghị na Sayensị?
“Ndị ji sayensị kpọrọ ihe kwenyere ná mmekọrịta bụ na ‘ihe ọ bụla merenụ nwere ihe kpatara ya.’ Ha na-eche na e nwere nkọwa sitere nnọọ n’okike maka ihe ọ bụla,” ka otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma nke oge a na-ekwu. Ndị mmụta Bible na-anakwerekwa ụkpụrụ sayensị ndị doro anya. Otú ọ dị, ha matara na Bible na-ekwukarị okwu banyere ihe omume ọrụ ebube ndị a na-apụghị ịkọwa n’ụzọ sayensị n’ikwekọ n’ihe ọmụma e nwere ugbu a. Ihe atụ ụfọdụ bụ anyanwụ iguzoro otu ebe n’ụbọchị Joshua na Jisọs ije ije n’elu mmiri. (Joshua 10:12, 13; Matiu 14:23-34) Otú ọ dị, a kọrọ banyere ọrụ ebube ndị a dị ka ndị sitere n’ike Chineke ịrụ ọrụ n’ụzọ karịrị ike mmadụ.
Isi ihe a dị oké mkpa. Ọ bụrụ na Bible kwusiri ike na ndị mmadụ pụrụ ije ije n’elu mmiri n’enweghị enyemaka Chineke ma ọ bụ na a pụrụ igbochitụ ngagharị doro anya nke anyanwụ n’eluigwe n’enweghị ihe kpatara ya, ọ pụrụ iyi ihe na-emegide eziokwu sayensị. Otú ọ dị, mgbe ọ na-ekwu na ọ bụ ike Chineke mere ihe ndị ahụ, ọ dịghị emegide sayensị, kama nke ahụ ọ na-ewere nkwurịta okwu ahụ gaa n’akụkụ ebe sayensị na-erubeghị.
Bible Ọ̀ Na-emegide Sayensị?
N’aka nke ọzọ, gịnị banyere ọnọdụ ndị ahụ ebe Bible na-ekwu banyere ihe omume nkịtị ná ndụ ndị mmadụ ma ọ bụ na-ekwutatụ okwu banyere ihe ọkụkụ, anụmanụ, ma ọ bụ ihe omume ndị sitere n’okike? N’ụzọ na-adọrọ mmasị, e nweghị ihe atụ ọ bụla a nwapụtara anwapụta ebe Bible na-emegide eziokwu sayensị a ma ama n’ọnọdụ ndị ahụ mgbe a tụlere ihe ndị gbara okwu ahụ gburugburu.
Dị ka ihe atụ, Bible na-ejikarị okwu uri ndị na-egosi nghọta nke ndị biri ndụ ọtụtụ puku afọ gara aga eme ihe. Mgbe akwụkwọ Job na-ekwu banyere Jehova iti ma ọ bụ ịkpụsi mbara igwe “ike dị ka enyo a wụrụ awụ,” ọ na-akọwa mbara igwe nke ọma dị ka enyo ígwè nke na-egbukepụ egbukepụ. (Job 37:18) Ọ dịghị mkpa iwere ihe atụ ahụ n’ụzọ nkịtị, dịkwa ka ị na-agaghị ewere ihe atụ nke ala inwe “ụkwụ” ma ọ bụ inwe “nkùkù.”—Job 38:4-7.
Nke a dị mkpa n’ihi na ọtụtụ ndị na-enye nkọwa ewerewo ihe atụ ndị dị otú ahụ n’ụzọ nkịtị. (Lee 2 Samuel 22:8; Abụ Ọma 78:23, 24.) Ha ekwubiwo na Bible na-akụzi ihe dị ka ihe na-esonụ, nke e hotara site na The Anchor Bible Dictionary.
“A na-ewere ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ bi n’elu ya dị ka ihe dị gburugburu, nke siri ike, ikekwe ihe mbadamba, nke sere n’elu mbara mmiri n’enweghị nsọtụ. E nwere mbara mmiri nke abụọ yiri ya n’elu, bụ́ nke na-enweghị nsọtụ n’otu aka ahụ, bụ́ ebe mmiri si na-awụdata dị ka mmiri ozuzo site n’oghere na ọwa mmiri ndị si n’ọdọ eluigwe pụta. E tinyere ọnwa, anyanwụ, na ihe ndị ọzọ na-enye ìhè n’ihe gbara ngọ nke tụhiere n’elu ụwa. Ihe a bụ ‘mbara igwe’ (rāqîa‛) ahụ a ma ama nke dị n’ihe ndekọ ndị nchụàjà.”
N’ụzọ doro anya, nkọwa a ekwekọghị na sayensị ọgbara ọhụrụ. Ma nke a ọ̀ bụ ụzọ ziri ezi isi were ihe Bible na-akụzi banyere eluigwe? Ọ dịghị ma ọlị. The International Standard Bible Encyclopaedia na-ekwu na nkọwa ndị dị otú ahụ nke eluigwe na ụwa nke ndị Hibru “dabeere n’ụzọ ka ukwuu n’ezie n’echiche ndị jupụtara na Europe n’Oge Ụwa Nọ n’Ìsì karịa n’okwu ọ bụla e kwuru n’ezie n’A[gba] O[chie].” Olee ebe echiche ndị ahụ nke Oge Ụwa Nọ n’Ìsì sitere? Dị ka David C. Lindberg na-akọwa n’akwụkwọ bụ́ The Beginnings of Western Science, ha dabeere n’ụzọ dị ukwuu na nkà mmụta mbara ụwa nke ọkà ihe ọmụma oge ochie bụ́ onye Gris, bụ́ Aristotle, onye ọrụ ya bụ ebe ndabere nke ihe dị ukwuu ná mmụta nke oge ụwa nọ n’ìsì.
Chineke iji asụsụ ga-amasị onye ọkà mmụta sayensị nke narị afọ nke 20 dee Bible gaara abụworị ihe na-abaghị uru na ihe na-adọpụ uche. Kama ụkpụrụ sayensị, Bible jupụtara n’ihe atụ doro anya ndị e wetara site ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị nke ndị bu ụzọ detuo ha—onyinyo ndị na-enwe mmetụta na-adịru oge nile ọbụna taa.—Job 38:8-38; Aịsaịa 40:12-23.
Ihe Ọmụma Si n’Ebe Ka Elu
Otú ọ dị, n’ụzọ na-adọrọ mmasị, izo aka ụfọdụ nke Bible yiri ka ha na-egosipụta ihe ọmụma sayensị nke ndị dị ndụ n’oge ahụ na-enweghị. Job na-akọwa Chineke dị ka onye “na-esetị Ugwu n’elu ebe tọgbọrọ n’efu, Ọ na-ekokwasịkwa ụwa n’ihe na-abụghị ihe.” (Job 26:7) Echiche nke ụwa ịbụ nke e konyere n’elu “ihe na-abụghị ihe” dị nnọọ iche n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke ihe ka ukwuu ná ndị oge ochie, bụ́ ndị dọkwasịrị ya n’elu enyi ma ọ bụ mbekwu oké osimiri. Iwu Mosis nwere ihe ndị a chọrọ maka ịdị ọcha ndị karịrị nnọọ ihe ọmụma nkà ọgwụ na ahụ ike nke oge ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na iwu nduzi maka imechibido ndị a na-enyo enyo na ha bu ọrịa ekpenta ụzọ na mmachibido megide imetụ ndị nwụrụ anwụ aka zọpụtara ọtụtụ ndị Israel. (Levitikọs 13; Ọnụ Ọgụgụ 19:11-16) N’ụzọ dị nnọọ iche, a na-akọwa omume nkà ọgwụ na ahụ ike nke ndị Asiria dị ka “ngwakọta nke okpukpe, ịjụ ndị mmụọ ase, na nkweta ná ndị mmụọ ọjọọ” ma gụnye iji nsị nkịta na mamịrị mmadụ agwọ ọrịa.
Dị ka mmadụ pụrụ ịtụ anya ya n’aka akwụkwọ sitere n’aka Onye Okike, Bible nwere ihe ọmụma ziri ezi n’ụzọ sayensị bụ́ ndị a na-amaghị n’oge ahụ, ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe ọ na-etinye uche ná nkọwa nkà mmụta sayensị ndị gaara abụ ihe na-enweghị isi ma ọ bụ ndị dị mgbagwoju anya nye ndị oge ochie. Bible enweghị ihe ọ bụla na-emegide eziokwu sayensị ndị a maara. N’aka nke ọzọ, Bible nwere ihe dị ukwuu ndị na-ekwekọghị n’ozizi ndị a na-anwapụtaghị anwapụta, dị ka ozizi evolushọn.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 23]
Okwu Job bụ́ na ụwa ‘na-ekokwasị n’ihe na-abụghị ihe’ na-egosi ihe ọmụma nke ndị ya na ha biri ndụ na-enweghị
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 22]
NASA