Ihe E Kere Eke Na-asị, ‘Ha Enweghi Ngọpụ’
“Ihe ya anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi ya na ụdị Chineke ya; ka ha ghara inwe ngọpụ.”—NDỊ ROM 1:20.
1, 2. (a) Mkpesa dị ilu dị aṅaa ka Job kpesaara Jehova? (b) Nchegharị dị aṅaa n’okwu ọnụ ka Job mesịrị mee?
JOB, nwoke nke oge ochie bụ́ onye nwere iguzosi ike n’ezi ihe a na-apụghị ibibi ebibi nye Jehova Chineke, abụwo onye Setan lere ule n’ụzọ dị njọ. Ekwensu emewo ka ihe onwunwe ya nile funarị ya, weta ọnwụ nke ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, o tiwokwa ya ihe otiti nke ọrịa jọgburu onwe ya. Job chere na ọ bụ Chineke na-ewetara ya ihe ọdachi ndị a nile, o kpesaara Jehova mkpesa n’ụzọ dị ilu, sị: “Ọ̀ dị gị mma ka i megbue mmegbu, . . . na ị na-achọ ajọ omume m, na-ajụkwa ase mmehie m? Ọ bụ ezie na ị maara na adịghị m emebi iwu?”—Job 1:12-19; 2:5-8; 10:3, 6, 7.
2 Oge ụfọdụ ka nke a gasịrị, okwu Job gwara Chineke gosipụtara mgbanwe zuru ezu kpam kpam: “M gosiworo ihe nke m na-adịghị aghọta, ihe dịkarịrị m ebube, nke m na-adịghị amata. Site n’ọnụnụ ntị ka m nụrụ gị; ma ugbu a anya m ahụwo gị. N’ihi nke a ka m na-ajụ onwe m ajụ, wee chegharịa n’elu ájá na ntụ.” (Job 42:3, 5, 6) Gịnị mere nke gbanwere omume Job?
3. Echiche ọhụrụ dị aṅaa ka Job nwetara banyere okike?
3 N’agbata ihe ndị a, Jehova ezutewo Job site n’oké ifufe. (Job 38:1) Ọ nọgidewo na-agba Job ọtụtụ ajụjụ. ‘Olee ebe ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa? Ònye ji ibo ọnụ ụzọ mechibido oké osimiri ma setịpụ ókè nke ebili mmiri ya ga-abịaru? Ị̀ pụrụ ime ka igwe ojii zoo mmiri ha n’elu ala? Ị̀ pụrụ ime ka ahịhịa ndụ topụta? Ị̀ pụrụ ikekọta ìgwè kpakpando dị iche iche ma duzie ha n’ụzọ ha nile?’ N’isi nke 38 ruo 41 nke akwụkwọ Job, Jehova zokwasịrị Job ajụjụ ndị a dị ka mmiri nakwa ọtụtụ ndị ọzọ banyere ihe O kere eke. O mere ka Job hụ ọdịiche dị ukwuu dị n’etiti Chineke na mmadụ, na-eji ụzọ siri ike echetara Job banyere amamihe na ike nke e gosipụtara n’ihe ndị Chineke kere, ihe ndị karịrị Job nke ukwu ime ma ọ bụ ọbụna ịghọta. Job, n’ịbụ onye na-enweghị ọnụ okwu n’ihi ike dị ebube na amamihe na-enweghị atụ nke Chineke onye pụrụ ime ihe nile dị ka e kpughere ya site n’ihe ndị O kere eke, bụ onye e mere ka ọ tụọ egwu nke ukwuu iche na ya enwewo ike isoro Jehova rụrịta ụka. Ya mere o kwuru, sị: “Site n’ọnụnụ ntị ka m nụrụ gị, ma ugbu a anya m ahụwo gị.”—Job 42:5.
4. Gịnị ka anyị kwesịrị ịhụta site n’ihe Jehova kere eke, gịnịkwa bụ ọnọdụ nke ndị jụrụ ịhụ ya?
4 Ọtụtụ narị afọ mgbe nke a gasịrị, onye so dee Bible n’okpuru ike mmụọ nsọ kwadoro na a pụrụ ịhụ àgwà Jehova site n’ihe ndị o kere. Pọl onyeozi dere ná Ndị Rom 1:19, 20, sị: “Ihe a pụrụ ịmata banyere Chineke na-apụta ìhè n’ime ha; n’ihi na Chineke mere ka ọ pụtara ha ìhè. N’ihi na ihe ya anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi ya na ụdị Chineke ya; ka ha ghara inwe ngọpụ.”
5. (a) Mkpa dị aṅaa e kenyere n’ime ka mmadụ nwere, oleekwa otú ụfọdụ si na-emeju ya n’ụzọ na-ezighị ezi? (b) Gịnị bụ aro Pọl nye ndị Grik n’Atens?
5 E kenyere n’ime mmadụ mkpa nke ife ike ka ya elu ofufe. Dr. C. G. Jung, n’akwụkwọ ya bụ́ The Undiscovered Self, hotara mkpa nke a dị ka “omume ebumpụta ụwa nke nanị mmadụ nwere, a pụkwara ịhụ ngosipụta ya ogologo akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ.” Pọl onyeozi kwuru banyere ọchịchọ ife ofufe nke e kenyere mmadụ n’ime, bụ́ nke kọwara ihe mere ndị Grik n’Atens ji mee ihe a kpụrụ akpụ na ebe ịchụàjà nye ọtụtụ chi, ndị a maara na ndị a na-amaghị. Pọl mekwara ka ha mara ezi Chineke ahụ ma gosi na ha kwesịrị imezu ọchịchọ a siri ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị site n’ịchọ Jehova bụ́ ezi Chineke ahụ, “ma eleghị anya ha ga-asọ ìsì, wee chọta ya, ọ bụ ezie na ọ nọghị n’ebe dị anya n’ahụ onye ọ bụla n’ime anyị.” (Ọrụ 17:22-30) Ka anyị na-anọ ihe ndị o kere nso, otú ahụ ka anyị na-ahụ àgwà na omume ya dị iche iche.
Nrugharị Mmiri Dị Ịtụnanya
6. Àgwà Jehova ndị dị aṅaa ka anyị na-ahụ site n’usoro nrugharị mmiri?
6 Olee àgwà Jehova ndị anyị na-ahụ, dị ka ihe atụ, n’ike urukpuru dị ka owu nwere ijide ọtụtụ tọn mmiri? Anyị na-ahụ ịhụnanya na amamihe ya, n’ihi na ọ na-esi otú a eweta mmiri ozuzo maka ngọzi elu ala. Ọ na-eme nke a site na nkà dị ebube dị ná nrugharị mmiri, nke a kpọtụrụ uche n’Eklisiastis 1:7: “Osimiri nile na-erudaru oké osimiri, ma oké osimiri ejughị eju, ruo ebe osimiri na-eruda, ruo ebe ahụ ka osimiri ahụ na-erughachi ọzọ.” Akwụkwọ Job nke Bible kwuru kpọmkwem otú o si eme.
7. Olee otú mmiri na-esi aga n’igwe ojii site n’oké osimiri, oleekwa otú igwe ojii na-esighị ike pụrụ isi jide ọtụtụ tọn mmiri?
7 Mgbe mmiri ozuzo oge oyi na-asọba n’oké osimiri, ha adịghị anọ n’ebe ahụ. Jehova “na-esepụ mkpụrụ mmiri n’osimiri ahụ ma na-eji aluluu ahụ o meworo na-eme mmiri ozuzo.” N’ihi na mmiri ahụ dị n’ụdị úzu ọkụ ma mesịa na-aghọ aluluu mara mma, “urukpuru na-anọ na njikere n’elu, ọrụ dị ebube nke nkà ya zuru okè.” (Job 36:27; 37:16; The New English Bible) Urukpuru ahụ na-erugharị oge nile ha nwere aluluu: “Ọ na-ekechi mmiri ahụ n’urukpuru ya—aluluu anaghị adọkasị n’ịdị arọ ha.” Ma ọ bụ dị ka nsụgharị ọzọ kwuru, sị: “Ọ na-akpọchigide mmiri ụzọ n’urukpuru gbachiri agbachi, ma urukpuru ahụ adịghị agbawa n’ihi ịdị arọ ha.”—Job 26:8, The Jerusalem Bible; NE.
8. Site ná nzọụkwụ dị iche iche dị aṅaa ka “karama akpụkpọ nile nke eluigwe” na-esi awụpụ ihe dị n’ime ha ma mezuo usoro nrugharị mmiri?
8 ‛Karama akpụkpọ nile nke eluigwe’ ndị a—onye ga-agbapụ mmiri ha’ iji mee ka mmmiri zoo n’elu ala? (Job 38:37) Onye “nkà ya zuru okè” tinyere ha ebe ahụ ná mbụ, bụ́ onye “na-eji aluluu ahụ o meworo na-eme mmiri ozuzo.” Olee ihe dị mkpa iji site n’aluluu mee mmiri ozuzo? A ghaghị inwe irighiri ihe siri ike anya nkịtị na-adịghị ahụ, dị ka uzuzu ma ọ bụ nnu—site n’ọtụtụ puku ruo n’ọtụtụ narị puku ihe ndị a n’otu kubik inch nke ikuku—ịrụ ọrụ dị ka ihe bụ isi maka mkpụrụ mmiri ịkpụkọ. A na-eme atụmatụ na ọ na-ewe otu nde nke ntakịrị mkpụrụ mmiri dị n’urukpuru iji mepụta otu ntasa mmiri ozuzo buturu ibu. Ọ bụ nanị mgbe ihe ndị a nile mezuru, ka urukpuru pụrụ ịwụpụ mmiri ozuzo ha n’elu ala iji ghọọ iyi nke na-eweghachi mmiri ahụ n’osimiri. Otú a nrugharị na-ezu okè. Ihe ndị a nile hà na-eme n’enweghị nduzi ọ bụla? ‘E nweghị ngọpụ’ n’ezie!
Otu Ebe Amamihe Solomọn Sitere
9. Gịnị ka Solomọn hụrụ dị ka ihe pụrụ iche banyere ụmụ ndanda?
9 N’ụwa mgbe ochie, amamihe nke Solomọn enweghị atụ. Ihe ka ọtụtụ n’ime amamihe ahụ metụtara ihe Jehova kere eke: “[Solomọn] kwukwara okwu banyere osisi, site na cedar nke dị na Lebanọn wee ruo hyssop nke na-epupụta ná mgbidi: o kwukwara okwu banyere anụ, banyekwara anụ ufe, banyekwara ihe na-akpụ akpụ, banyekwara azụ̀.” (I Ndị Eze 4:33) Ọ bụkwa otu Eze Solomọn a bụ́ onye dere, sị: “Jekwuru ndanda, onye umengwu; lee ụzọ ya nile, wee mara ihe: nke na-enweghị onye isi, ma ọ bụ onye na-ele anya n’ọrụ, ma ọ bụ onye na-achị achị, ma o na-edozi nri ya na mgbe okpomọkụ, na-ekpokọtakwa ihe oriri ya na mgbe owuwe ihe ubi.”—Ilu 6:6-8.
10. Olee otú e si wepụ ihe atụ Solomọn banyere ndanda na-ewe ihe ubi n’ụta?
10 Ònye ziri ụmụ ndanda ka ha na-akwakọba nri ha ná mgbe okpomọkụ iji mee ka ha nwee nri n’oyi nke oge oyi? Ruo ọtụtụ narị afọ a rụrụ izi ezi nke ndekọ Solomọn banyere ndanda nke na-ewe ihe ubi nke mkpụrụ osisi ma kwakọba ya ụka. O nweghị onye ọ bụla nke huworo ihe ngosi nke ịdị adị ha. Otú ọ dị, na 1871, onye Britain bụ́ ọkà n’ihe ndị e kere eke chọpụtara ụlọ ndebe ihe oriri ha dị n’okpuru ala, izi ezi nke Bible n’ịkọ banyere ha ewee bụrụ ihe e wepụrụ n’ụta. Ma olee otú ụmụ ndanda ndị a si nọrọ n’oge okpomọkụ mara na oyi nke oge oyi na-abịa, nakwa amamihe nke ịmara ihe a ga-eme banyere ya? Bible n’onwe ya kọwara na ọtụtụ n’ime ihe Jehova kere nwere amamihe nke e kenyere ha n’ime maka nlanarị. Ndanda ndị na-ewe ihe ubi bụ ndị natara ngọzi nke a site n’aka Onye Okike. Ilu 30:24 kwuru okwu banyere ya, sị: “Ihe ahụ maara ihe nke ukwuu.” Ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ikwu na amamihe dị otú ahụ pụrụ ịpụta na mberede; ịghara ịhụ Onye Okike maara ihe dị ka onye mere ya bụ ihe na-enweghị ngọpụ.
11. (a) N’ihi gịnị ka osisi ukwu sequoia ji dị egwu? (b) Gịnị dị ịtụnanya banyere ihe omume mbụ nke photosynthesis?
11 O kwere nghọta na nwoke nọ n’ala ala nke osisi ukwu sequoia, onye nwere ihe ijuanya n’ịdị ukwuu ya, nwere mmetụta nke ịdị ka ntakịrị ndanda. Ịdị ukwuu nke osisi ahụ na-atụ ụjọ: 90 mita n’ogologo, mita 11 n’ibu, mkpo ya dị 0.6 mita n’ikputu, mkpọrọgwụ ya na-agbasapụ ruo acre atọ ma ọ bụ anọ. Ma, nke dị egwu karịsịa bụ usoro nke ụdị mmiri ọgwụ na ìhè na okpomọkụ dị n’otuto ya. Akwụkwọ ya na-ewere mmiri site ná mkpọrọgwụ ya, carbon dioxide site n’ikuku, ume ọrụ site n’anyanwụ iji mepụta shuga ma wepụ ikuku ndụ oxygen—usoro nke a kpọrọ photosynthesis (usoro nke osisi ndụ na-eji emepụta nri ha site n’ìhè anyanwụ) nke gụnyere 70 mmeghachi omume mmiri ọgwụ dị iche iche, nke a na-aghọtaghị ụfọdụ n’ime ha. N’ụzọ na-eju anya, mmeghachi omume mbụ dabere n’ìhè sitere n’anyanwụ nke tụrụ nnọọ àgwà kwesịrị ekwesị, ịdị anya nke usoro ngagharị nke ìhè na ike ịrụ ọrụ kwesịrị ekwesị; ma ọ bụghị otú ahụ irighighi chlorophyll ahụ agaghị amịkọrọ ya iji malite usoro nke photosynthesis.
12. (a) Gịnị dị ịrịba ama banyere ojiji nke osisi sequoia na-eji mmiri eme ihe? (b) N’ihi gịnị ka nitrogen ji dị mkpa n’uto osisi, oleekwa otú a na-esi emezu usoro nrugharị ya?
12 Eziokwu dịkwa ịtụnanya bụ na osisi ahụ pụrụ ịdọrọ mmiri dị ukwu site na mkpọrọgwụ gaa n’elu nke osisi ukwuu a dị 90 mita n’ogologo. A na-adọrọ mmiri dị ukwuu karịa ihe dị mkpa maka photosynthesis. A na-esite n’akwụkwọ ha ewepụ ndị mapụtaranụ site n’usoro nke ikupụ ya dị ka úzù banye n’ikuku. Ọ na-eji mmiri eme ka ahụ jụọ osisi ahụ oyi, dị ka ahụ ịjụ anyị oyi n’ihi ọsụsọ ịgba anyị. Iji mepụta ihe ahụ chọrọ maka uto bụ́ protein, ọ dị mkpa ka e tinyekwa nitrogen n’ime shuga, ma ọ bụ carbohydrate ndị ahụ. Akwụkwọ ya apụghị iji nitrogen nke sitere n’ikuku mee ihe, ma ụmụ ahụhụ ndị bi n’ala pụrụ ime ka ikuku nitrogen ahụ dị n’ime ala ghọọ nitrate na nitrite ndị pụrụ ịgbari ná mmiri, ndị na-esite ná mkpọrọgwụ gbagoo n’akwụkwọ ndị ahụ. Mgbe ahịhịa ndụ na anụmanụ jiworo nitrogen ndị a dị na protein ha mee ihe nwụrụ ma rekasịa, a na-ewepụ nitrogen ahụ, na-emezu usoro ngagharị nitrogen. N’ihe ndị a nile, mgbagwoju anya na-adị na ya na-awụ akpata oyi n’ahụ, o yitụghị ka ọ bụ ihe a ga-emezu n’enweghị nduzi ma ọ bụ nkà mmepụta ihe.
Ha Na-ekwu Okwu n’Ejighị Ụda Okwu, Mkpụrụ Okwu ma ọ bụ Ụda Olu!
13. Gịnị ka eluigwe jupụtara na kpakpando kwupụtaara Devid, gịnịkwa ka ha na-anọgide na-agwa anyị?
13 Lee ihe ngosipụta dị egwu nke Onye Okike ahụ ọ bụ nke na-abịa site n’ihu igwe n’abali nke jupụtara na kpakpando nke na-eme ka ndị na-ahụ ha jupụta ná nsọpụrụ! N’Abụ Ọma 8:3, 4, Devid kwupụtara mmetụta egwu nke o nwere: “Mgbe m hụrụ eluigwe gị, bụ́ ọrụ mkpịsị aka gị, ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; gịnị ka mmadụ bụ, na ị na-echeta ya?” N’ebe ndị nwere anya ịhu ụzọ, ntị ịnụ ihe, na obi nke inwe mmetụta nọ, eluigwe ndị a jupụtara na kpakpando na-ekwu okwu, dị ka ha mere n’ebe David nọ: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke.”—Abụ Ọma 19:1-4.
14. N’ihi gịnị ka ịba ụba nke ike otu kpakpando ji dị anyị oké mkpa?
14 Ka anyị na-ama banyere kpakpando karị, otú a ha na-agwa anyị okwu n’olu dara ụda karị. N’Aịsaịa 40:26, a na-akpọ anyị òkù ịrịba ama oké ume ọrụ ha nwere: “Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ onye kere ihe ndị a? Ọ bụ Onye ahụ nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka ọ na-akpọ; site n’ịba ụba nke ike ya, na n’ihi na ọ nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị.” Ike ndọda na ume dị ike nke otu n’ime ha, anyanwụ anyị, na-ejide elu ala n’ọnọdụ nke ịgba okirikiri ya, na-eme ahịhịa ka o too, na-eme ka ahụ kpoo anyị ọkụ, na-eme ka ndụ bụrụ ihe kwere omume n’elu ala. Pọl onyeozi kwuru n’okpuru ike mmụọ nsọ, sị: “Otu kpakpando dị iche n’ahụ kpakpando ọzọ n’ebube.” (1 Ndị Kọrint 15:41) Nkà mmụta sayensị maara banyere kpakpando ndị na-acha edo edo dị ka anyanwụ anyị, nakwa kpakpando ndị na-acha anụnụ anụnụ, ndị buru ibu nke ukwuu bụ́ ndị na-acha uhie uhie, ndị dị ntakịrị na-acha ọcha, kpakpando iberibe ndị sitere ná ndị nnukwu gbariri agbari, na oké mgbọwa kpakpando ndị buru ibu bụ́ nke na-awụpụta ike dị egwu.
15. Gịnị ka ọtụtụ ndị nchọpụta mụtaworo site n’okike ma gbalịa iṅomi?
15 Ọtụtụ ndị na-eme nchọpụta amụtawo ihe site n’ihe ndị e kere eke ma gbalịa iṅomi ike ọrụ dị iche iche nke ihe ndị e kere eke dị ndụ. (Job 12:7-10) Rịba ama nanị akụkụ ole na ole nke okike. Nnụnụ mmiri nwere isi iyi mmiri ọgwụ ahụ nke na-ewepụ nnu dị na mmiri osimiri; azụ na azụ agwọ ndị na-emepụta ike eletrik; azụ, òkpò, na ụmụ ahụhụ ndị na-eke ọkụ; ụsụ na anụ dolphin ndị na-eji usoro iji ụzarị mara ebe ihe dị; evu ndị na-eme akwụkwọ; ndanda ndị na-ewu àkwà mmiri; oke beaver ndị na-ewu ihe mgbochi mmiri; agwọ ndị nwere ígwè na-agụkọ ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ n’ime ahụ ha; ahụhụ na-anọ n’ọdọ mmiri ndị na-eji ígwè mmikpu n’ime mmiri eme ihe; octopus na-eji usoro mmali dị ngwa eme ihe; ududo na-eme ụdị asaa nke ọnyà ududo ma na-emekwa ụzọ ngechi, ụgbụ na ụdọ ndị e ji amata ihe n’ọnyà ma nweekwa ụmụ na-aga n’akpa ududo, na-eje ọtụtụ puku maịlụ n’ịdị elu dị ukwuu; azụ na ụdị nsịkọ na ayịya dị iche iche ndị na-ebu ihe e ji ese n’elu mmiri dị ka ụgbọ agha mmiri; na nnụnụ, ụmụ ahụhụ, mbe mmiri, azụ, na anụ ndị na-enye nwa ara ndị na-eme ihe ịtụnanya nke ime njem site n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ—ikike ime ihe nke ike sayensị na-apụghị ịkọwa.
16. Eziokwu nkà mmụta sayensị dị aṅaa ka Bible dekọrọ ọtụtụ puku afọ tupu sayensị achọpụta ha?
16 Bible dekọrọ eziokwu nke sayensị ọtụtụ puku afọ tupu sayensị amara ha. Iwu Mosis (narị afọ nke 16 T.O.A.) na-egosipụta ọmụma nke nje ndị na-akpata ọrịa ọtụtụ narị afọ tupu Pasteur amata banyere ya. (Levitikọs, isi nke 13, 14) Na narị afọ nke 17 T.O.A., Job kwuru, sị: “Ọ na-ekokwasịkwa ụwa n’ihe na-abụghị ihe.” (Job 26:7) Ọtụtụ puku afọ tupu Kraịst, Solomọn dere banyere oruru ọbara; nkà mmụta sayensị banyere ahụ ike aghaghị ichere ruo narị afọ nke 17 iji mụta banyere ya. (Eklisiastis 12:6) Tupu nke ahụ, Abụ Ọma 139:16 gosipụtara ihe ọmụma nke mkpụrụ ndụ ebumpụta ụwa: “Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ ka ezughị okè, ọ bụkwa n’akwụkwọ gị ka e dere ihe nile dị m n’ahụ, nke a kpụrụ kwa ụbọchị, mgbe ọ dịghị otu ihe dị n’ime ha.” Na narị afọ nke 7 T.O.A., tupu ndị ọkà mmụta ihe banyere okike aghọta banyere isi n’otu ebe aga ebe ọzọ, Jeremaịa dere dị ka e dekọrọ na Jeremaịa 8:7, sị: “Ụgbala n’elu igwe maara oge ọ ga-eme njem, nduru na eleke na okwoli maara mgbe ha ga-alọghachi.”—NE.
“Onye Okike” nke Ndị Evolushọn Na-ahọrọ
17. (a) Gịnị ka Ndị Rom 1:21-23 kwuru banyere ụfọdụ ndị jụrụ ịhụ Onye Okike nwere ọgụgụ isi nọ n’azụ ihe ndị e kere eke dị ịtụnanya? (b) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, gịnị ka ndị evolushọn na-ahọrọ dị ka “onye okike” ha?
17 Otu akụkụ akwụkwọ nsọ kwuru banyere ụfọdụ ndị jụrụ ịghọta Onye Okike nke nọ n’azụ ihe e kere eke ndị a dị ịtụnanya: “E mere ha ihe efu n’ihe nile ha na-atụle n’obi ha, obi ha nke na-enweghị nghọta gbakwara ọchịchịrị. Mgbe ha na-ekwu na ha bụ ndị maara ihe, ha wee ghọọ ndị nzuzu, wee were ebube nke Chineke a na-apụghị imebi gbanwere oyiyi nke onyinyo mmadụ a pụrụ imebi, na nke anụ ufe na anụ ụkwụ anọ na ihe na-akpụ akpụ dị iche iche.” Ha “weere eziokwu nke Chineke gbanwere ụgha ha, ha wee sọpụrụ na-ekpekwara ihe e kere eke kama Onye kere eke.” (Ndị Rom 1:21-23, 25) O yikwara ndị ọkà mmụta evolushọn, bụ́ ndị, n’eziokwu, na-eto usoro e chepụtara echepụta nke ịrị elu nke ihe ndị dị ndụ nwere nanị otu mkpụrụ ndụ-òkpò-azụ-anụ ndị na-ebi ma n’ime mmiri ma n’elu ala-anụ ndị na-akpụ akpụ-anụ ndị na-enye ụmụ ha ara-“adaka yiri mmadụ” dị ka “onye okike” ha. Otú ọ dị, ha maara na e nweghị ihe dị ndụ nwere nanị otu mkpụrụ ndụ n’eziokwu ịmalite usoro ahụ. Ihe dị ndụ dịkarịsịrị nta a maara nwere otu narị nde atọm na ọtụtụ puku nke mmeghachi mmiri ọgwụ na-eme n’ime ya otu mgbe ahụ.
18, 19. (a) Ònye bụ Onye ahụ ziri ezi a ga-enye otuto maka ịmalite ndụ? (b) Ókè ha aṅaa nke ihe Jehova kere ka anyị pụrụ ịhụ?
18 Jehova Chineke bụ Onye Okike nke ndụ. (Abụ Ọma 36:9) Ọ bụ oké Onye Mbụ Na-eme Ihe. Aha ya, bụ́ Jehova, pụtara “Onye na-eme ihe.” Anyị apụghị ịgụ ihe o kere ọnụ. N’ezie e nwere ọtụtụ nde karịa ka mmadụ maara. Abụ Ọma 104:24, 25 kwuru okwu banyere nke a, sị: “Lee ka ọrụ gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! N’amamihe ka i meworo ha nile.” Job 26:14 pụtara ìhè na nke a: “Lee, ndị a bụ nanị nsọtụ ụzọ ya nile: leekwa otú ọ dị nta, bụ́ ntakwu okwu a nụworo banyere ya! Ma égbè eluigwe nke ịdị ike ya nile, ònye ga-aghọta ya?” Anyị na-ahụ nsọtụ ole na ole, anyị na-anụ ntakwu ole na ole, ma ọ gaghị ekwe anyị omume ịghọta ihe oké égbè eluigwe ya pụtara n’ụzọ zuru ezu.
19 Otú ọ dị, anyị nwere isi iyi ka mma anyị pụrụ isi hụ ya karịa site n’ihe ndị o kere eke anya na-ahụ. Isi iyi ahụ ka mma bụ Okwu ya, Bible. N’isi iyi ahụ ka anyị ga-elega anya ugbu a n’isiokwu na-esonụ.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Gịnị ka Job mụtara mgbe Jehova gwara ya okwu site n’oké ifufe?
◻ N’ihi gịnị ka Pọl ji kwuo na ụfọdụ ndị enweghị ngọpụ?
◻ Olee otú usoro nrugharị mmiri si arụ ọrụ?
◻ Ihe ndị dị mkpa dị aṅaa ka ìhè anyanwụ na-emere anyị?
◻ Eziokwu nkà mmụta sayensị dịgasị aṅaa ka Bible kpughere tupu sayensị achọpụta ha?