Ị̀ Na-achụso Ịdị Mma?
“Ọ bụrụ na ịdị mma ọ bụla dị, ọ bụrụkwa na otuto ọ bụla dị, na-agụkọnụ ihe ndị a.”—NDỊ FILIPAỊ 4:8.
1. Gịnị bụ omume ọjọọ, n’ihi gịnịkwa ka o ji na-emerụbeghị ofufe Jehova?
OMUME ọjọọ bụ ịrụ arụ ma ọ bụ ịkpa àgwà na-ezighị ezi. O jupụtara ụwa anyị bi n’ime ya. (Ndị Efesọs 2:1-3) Otú ọ dị, Jehova Chineke agaghị ekwe ka e merụọ ofufe ya dị ọcha. Mbipụta, nzukọ, na mgbakọ nile nke ndị Kraịst na-enye anyị ịdọ aka ná ntị bịara n’oge ya megide àgwà ajọ omume. Anyị na-anata enyemaka Akwụkwọ Nsọ dị mma iji “na-arapara ezi ihe n’ahụ” n’anya Chineke. (Ndị Rom 12:9) Ya mere, dị ka otu nzukọ, Ndịàmà Jehova na-agba mbọ ịdị ọcha, ime ihe dị mma. Ma Gịnị banyere anyị n’otu n’otu? N’ezie, ị̀ na-achụso ịdị mma?
2. Gịnị bụ ịdị mma, n’ihi gịnịkwa ka o ji chọọ mgbalị ịnọgide na-akpa àgwà dị mma?
2 Ịdị mma bụ mma omume, ịma mma, omume na echiche ziri ezi. Ọ bụghị àgwà na-adịghị irè kama nke na-arụ ọrụ, nke dị mma. Ịdị mma na-agụnye ihe karịrị izere mmehie; ọ pụtara ịchụso ihe dị mma. (1 Timoti 6:11) Pita onyeozi gbara ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Nyezuokwanụ ịdị mma n’okwukwe unu.” N’ụzọ dị aṅaa? Site ‘n’ịtụkwasị [nkwa dị oké ọnụ ahịa nke Chineke] ịnụ ọkụ n’obi nile.’ (2 Pita 1:5) N’ihi ọdịdị anyị nke ime mmehie, ọ na-ewe ezigbo mgbalị iji nọgide na-enwe àgwà dị mma. Ma, ndị na-atụ egwu Chineke n’oge gara aga emewo otú ahụ, ọbụna n’ihu ihe mgbochi dị ukwuu.
Ọ Chụsoro Ịdị Mma
3. Ikpe ime ajọ omume ndị dị aṅaa mara Eze Ehaz?
3 Akwụkwọ Nsọ nwere ọtụtụ akụkọ nke ndị chụsoro ịdị mma. Dị ka ihe atụ, tụlee Hezekaịa nwere àgwà dị mma. Ihe àmà na-egosi na nna ya, bụ́ Eze Ehaz nke Juda, fere Mọlek. “[Afọ iri abụọ] ka Ehaz gbara mgbe ọ malitere ịbụ eze; o wee bụrụ eze afọ iri na isii n’ime Jerusalem: ma o meghị ihe ziri ezi n’anya Jehova, bụ́ Chineke ya, dị ka Devid nna ya. Ma o jere ije n’ụzọ ndị eze Israel. Ọzọkwa, o mere ka nwa ya nwoke gabiga n’ime ọkụ, dị ka ihe arụ nile nke mba ọzọ si dị, bụ́ ndị Jehova napụrụ ala ha n’ihu ụmụ Israel. Ọ chụọ àjà, sureekwa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ebe nile dị elu, na n’elu ugwu nta nile, na n’okpuru osisi ndụ ọ bụla.” (2 Ndị Eze 16:2-4) Ụfọdụ na-azọrọ na ‘ịgabiga n’ime ọkụ’ na-egosipụta ihe dị ka ememe okpukpe ido ọcha, ọ bụghị iji mmadụ achụ àjà. Otú ọ dị, akwụkwọ bụ́ Molech—A God of Human Sacrifice in the Old Testament, nke John Day dere, na-ekwu, sị: “E nwere ihe àmà site n’akwụkwọ ndị Punic [nke ndị Carthage], nakwa ihe àmà nke ihe mgbe ochie, maka ịdị adị nke iji mmadụ achụ àjà . . . n’ụwa ndị Kenean, ya mekwara e nweghị ihe mere a ga-eji nwee obi abụọ n’aka Agba Ochie zoro [n’iji mmadụ achụ àjà].” Ọzọkwa, 2 Ihe Emere 28:3 kwuru kpọmkwem na Ehaz ‘surere ụmụ ya n’ọkụ.’ (Tụlee Deuterọnọmi 12:31; Abụ Ọma 106:37, 38.) Lee ajọ omume ha bụ!
4. Olee otú Hezekaịa si kpaa àgwà n’ebe omume ọjọọ juru?
4 Olee otú ihe si gaara Hezekaịa n’ebe a omume ọjọọ juru? Abụ Ọma nke 119 na-adọrọ mmasị, n’ihi na ụfọdụ kwenyere na Hezekaịa rọrọ ya, na-eme nke a mgbe ọ ka bụ nwa eze. (Abụ Ọma 119:46, 99, 100) Ya mere okwu ndị a pụrụ igosi ọnọdụ ya: “Ndị isi nọdụrụ ala kwurịta okwu imegide m: ma ohu Gị na-atụgharị uche n’ụkpụrụ Gị nile. Mkpụrụ obi m atụpụwo dị ka mmiri site n’iru újú.” (Abụ Ọma 119:23, 28) N’ịbụ onye ndị na-ekpe okpukpe ụgha gbara gburugburu, ọ pụrụ ịbụ na Hezekaịa abụrụwo onye e ji mere ihe ọchị n’etiti ndị òtù obí eze, nke na ịrahụ ụra na-esi ike. Ma, ọ chụsoro ịdị mma, ka oge na-aga bụrụ eze, “mee ihe ziri ezi n’anya Jehova . . . Ọ bụ na Jehova, bụ́ Chineke Israel, ka ọ tụkwasịrị obi.”—2 Ndị Eze 18:1-5.
Ha Jigidere Ịdị Mma
5. Ule ndị dị aṅaa ka Daniel na ndị enyi ya atọ chere ihu?
5 Ndị ọzọ bụkwa ihe ilereanya n’ịdị mma bụ Daniel na ndị enyi ya atọ bụ́ ndị Hibru, ndị a kpọrọ Hananaịa, Mishael, na Azaraịa. E ji ike kpụrụ ha site n’obodo ha wee dọrọ ha n’agha gaa Babilọn. E nyere ndị ntorobịa anọ ahụ aha Babilọn—Belteshaza, Shedrak, Mishak, na Abednego. E nyere ha “ihe oriri ọma eze,” tinyere nri ndị Iwu Chineke machibidoro. Ọzọkwa, a manyere ha ịnara ọzụzụ ga-ewe afọ atọ banyere ime “ka ha mụta akwụkwọ na asụsụ nke ndị Kaldea.” Nke a gụnyere ihe karịrị nanị ịmụta asụsụ ọzọ, n’ihi na ọ ghaghị ịbụ na okwu ahụ bụ́ “ndị Kaldea” n’ebe a pụtara ndị gụrụ akwụkwọ. Otú a, e kpughere ndị ntorobịa Hibru a nye ozizi rụrụ arụ nke Babilọn.—Daniel 1:1-7.
6. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Daniel chụsoro ịdị mma?
6 N’agbanyeghị nrụgide dị ukwuu ime ka ibe ha, Daniel na ndị enyi ya atọ họọrọ ịdị mma karịa omume ọjọọ. Daniel 1:21 na-asị: “Daniel wee nọgide ruo afọ mbụ nke Saịrọs, bụ́ eze.” Ee, Daniel “wee nọgide” dị ka ohu Jehova nwere àgwà dị mma ruo ihe karịrị afọ 80—gabiga mbili na ọdịda nke ọtụtụ ndị eze dị ike. Ọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’agbanyeghị ụzọ aghụghọ na atụmatụ nke ndị ọrụ ọchịchị rụrụ arụ na omume mmekọahụ ọjọọ jupụtara okpukpe Babilọn. Daniel nọgidere na-achụso ịdị mma.
7. Gịnị ka a pụrụ ịmụta site n’ụzọ nke Daniel na ndị enyi ya atọ gbasoro?
7 Anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’aka Daniel na ndị enyi ya tụrụ egwu Chineke. Ha chụsoro ịdị mma ma jụ ịbụ ndị e mikpuru n’ọdịbendị Babilọn. Ọ bụ ezie na e nyere ha aha ndị Babilọn, ọ dịghị mgbe ha mere ka a ghara ịmara ha dị ka ndị ohu Jehova. Leenụ, ihe dị ka afọ 70 mgbe nke a gasịrị, eze Babilọn kpọrọ Daniel n’aha Hibru ya! (Daniel 5:13) N’ime ogologo ndụ ya nile, Daniel jụrụ imebi okwukwe ya ọbụna n’ihe ndị dị nta. Dị ka onye na-eto eto, o ‘tinyewo nke a n’obi ya na ọ gaghị ewere ihe oriri ọma eze mee onwe ya ka ọ ghara ịdị nsọ.’ (Daniel 1:8) Nguzo emebighị okwukwe a nke Daniel na ndị enyi ya atọ weere n’ezie wusiri ha ike ịlanarị ule ndụ na ọnwụ ha mesịrị chee ihu.—Daniel, isi nke 3 na 6.
Ịchụso Ịdị Mma Taa
8. Olee otú ndị Kraịst bụ́ ntorobịa pụrụ isi jụ ịbụ ndị e mikpuru n’ụwa Setan?
8 Dị ka Daniel na ndị enyi ya atọ, ndị Chineke taa na-eguzogide ịbụ ndị e mikpuru n’ajọ ụwa Setan. (1 Jọn 5:19) Ọ bụrụ na ị bụ onye Kraịst bụ́ ntorobịa, i nwere ike ịdị na-enweta nrụgide siri ike site n’aka ndị ọgbọ gị iṅomi ihe gabigara ókè na-amasị ha n’uwe, ejiji, na egwú. Otú ọ dị, kama ịgbaso ụzọ ejiji ọ bụla nke bịaranụ, guzosie ike, ekwekwala ka ị bụrụ onye ‘e mere ka o yie ajọ oge a.’ (Ndị Rom 12:2) “Jụ asọpụ[rụ]ghị Chineke na agụụ ihe ọjọọ dị n’ụwa . . . , dị ndụ uche zuru okè na nke ezi omume na nke ịsọpụrụ Chineke n’oge dị ugbu a.” (Taịtọs 2:11, 12) Ihe dị mkpa bụ nnwapụta nke Jehova, ọ bụghị nke ndị ọgbọ gị.—Ilu 12:2.
9. Nrụgide ndị dị aṅaa ka ndị Kraịst nọ n’achụmnta ego nwere ike iche ihu, oleekwa otú ha kwesịrị isi kpaa àgwà?
9 Ndị Kraịst meworo okenye na-echekwa nrụgide ihu, ha aghaghịkwa inwe àgwà dị mma. A pụrụ ịnwa ndị Kraịst na-achụ nta ego iji ụzọ a na-enyo enyo eme ihe ma ọ bụ ileghara iwu gọọmenti na iwu ụtụ isi anya. Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú ndị achụmnta ego na-asọ mpi ma ọ bụ ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ si akpa àgwà, “anyị na-achọ ibi obi nke ọma n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18) Akwụkwọ Nsọ chọrọ ka anyị na-akwụwa aka ọtọ ma na-emeso ndị were anyị n’ọrụ, ndị anyị were n’ọrụ, ndị ahịa, na ndị gọọmenti omume n’ụzọ dị mma. (Deuterọnọmi 25:13-16; Matiu 5:37; Ndị Rom 13:1; 1 Timoti 5:18; Taịtọs 2:9, 10) Ka anyị gbalịakwa na-akpa àgwà ọma n’ihe omume achụmnta ego anyị. Site n’ime ndekọ ziri ezi ma na-ede nkwekọrịta ede, anyị pụrụ ịdị na-egbochikarị nghọtahie.
Na-elezi Anya!
10. N’ihi gịnị ka e ji nwee mkpa ‘ịdị na-elezi anya’ mgbe a bịara n’egwú anyị na-ahọrọ?
10 Abụ Ọma 119:9 na-emesi ike akụkụ ọzọ nke ịnọgide na-akpa àgwà dị mma n’anya Chineke. Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Gịnị ka okorobịa ga-eji mee ka ụzọ ya dị ọcha? Ọ bụ n’ilezi ya anya dị ka okwu Gị si dị.” Otu n’ime ngwá agha Setan kasị akpa ike bụ egwú, bụ́ nke nwere ike ịkpali mmetụta uche. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị Kraịst adịghị ‘elezi anya’ mgbe a bịara n’egwú, ha achọtawokwa onwe ha ịbụ ndị a dọọrọ gaa n’ụdị ya gafere ókè, dị ka egwú rap na egwú rock na-ada oké ụda. Ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka na ụdị egwú ndị ahụ adịghị emerụ ha ahụ ma ọ bụ na ha adịghị ege ntị n’ihe ha na-agụ. Ndị ọzọ na-ekwu na nanị ihe ha na-eme bụ ịnụrụ ụtọ ụda ya na-adasi ike ma ọ bụ ụda nke ụbọ akwara na-ada oké ụda. Otú ọ dị, nye ndị Kraịst, ihe dị na ya abụghị ma ihe ọ̀ dị ụtọ. Nchegbu ha bụ ma ọ “dị Onyenwe anyị ezi mma.” (Ndị Efesọs 5:10, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Mee elu mee ala, egwú rock na-ada oké ụda na rap na-akwalite omume ọjọọ ndị dị otú ahụ dị ka okwu rere ure, ịkwa iko, na ọbụna ofufe Setan—ihe ndị na-enwetụghị ọnọdụ n’etiti ndị Chineke.a (Ndị Efesọs 5:3) Ma ndị na-eto eto ma ndị okenye, onye nke ọ bụla n’ime anyị ga-eme nke ọma ịtụgharị uche n’ajụjụ a, Site n’egwú m na-ahọrọ, m̀ na-achụso ịdị mma ka ọ̀ bụ omume ọjọọ?
11. Olee otú onye Kraịst pụrụ isi na-elezi anya n’ihe banyere ihe omume telivishọn, ihe nkiri vidio, na ihe nkiri sịnịma?
11 Ọtụtụ ihe omume telivishọn, ihe nkiri vidio, na ihe nkiri sịnịma na-akwalite omume ọjọọ. Dị ka otu ọkà n’ahụ ike uche a ma ama si kwuo, ‘ibi ndụ ihe ụtọ, mmasị inwe mmekọahụ, ime ihe ike, anyaukwu, na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị’ jupụtara n’ihe ka ọtụtụ n’ihe nkiri sịnịma ndị a na-emepụta taa. Ya mere, ịdị na-elezi anya gụnyere ịdị na-eme nhọrọ nke ihe na-amasị anyị ikiri. Ọbụ abụ ahụ kpere ekpere, sị: “Mee ka anya m abụọ si n’ile ihe efu gabiga.” (Abụ Ọma 119:37) Otu onye Kraịst bụ́ ntorobịa aha ya bụ Joseph tinyere ụkpụrụ a n’ọrụ. Mgbe otu ihe nkiri malitere igosi mmekọahụ na ime ihe ike a na-ezoghị ihe ọ bụla, ọ hapụrụ ebe ahụ a na-ekiri ihe. Ihere ò mere ya ime nke a? “Mba, ọ dịghị ma ọlị,” ka Joseph na-ekwu. “Eburu m ụzọ chee banyere Jehova na banyere ime ihe na-atọ ya ụtọ.”
Òkè Ọmụmụ Ihe na Ntụgharị Uche Na-ekere
12. N’ihi gịnị ka ọmụmụ ihe na ntụgharị uche onwe onye ji dị mkpa iji na-achụso ịdị mma?
12 O zughị ezu izere ihe ọjọọ. Ịchụso ịdị mma na-agụnyekwa ịmụ ihe na ịtụgharị uche n’ihe ndị dị mma e dekọrọ n’Okwu Chineke ka e wee nwee ike itinye ụkpụrụ ezi omume ya n’ọrụ ná ndụ. “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya!” ka ọbụ abụ ahụ kwuru n’olu dara ụda. “Ogologo ụbọchị nile ka nke ahụ bụ ihe m na-atụgharị n’uche.” (Abụ Ọma 119:97) Ọmụmụ ihe onwe onye nke Bible na mbipụta ndị Kraịst ọ̀ bụ akụkụ nke usoro ihe omume gị kwa izu? N’eziokwu, iwepụta oge maka iji ịdị uchu amụ Okwu Chineke na iji ekpere na-atụgharị uche na ya pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Ma mgbe mgbe ọ na-ekwe omume ịzụchapụta oge site n’ihe omume ndị ọzọ. (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ikekwe hour isi ụtụtụ ga-adị gị mma dị ka oge maka ekpere, ọmụmụ ihe, na ntụgharị uche.—Tụlee Abụ Ọma 119:147.
13, 14. (a) N’ihi gịnị ka ntụgharị uche ji na-aba oké uru? (b) Ịtụgharị uche n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị aṅaa pụrụ inyere anyị aka ịkpọ mmekọahụ rụrụ arụ asị?
13 Ntụgharị uche na-aba oké uru, n’ihi na ọ na-enyere anyị aka ibugide ihe anyị mụtara n’isi. Nke ka mkpa, ọ pụrụ inye aka ịkwalite echiche Chineke. Iji maa atụ: Ọ bụ otu ihe ịma na Chineke machibidoro ịkwa iko iwu ma bụrụ nnọọ ihe ọzọ ‘ịkpọ ajọ ihe asị ma na-arapara ezi ihe n’ahụ.’ (Ndị Rom 12:9) Anyị pụrụ n’ezie iwere mmekọahụ rụrụ arụ otú Jehova weere ya site n’ịtụgharị uche n’akụkụ Bible ndị gbara ọkpụrụkpụ, dị ka Ndị Kọlọsi 3:5, nke na-agba ume, sị: “Ya mere, meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọọ, na anyaukwu ahụ, n’ihi na nke a bụ ikpere arụsị.” Jụọ onwe gị: ‘Ụdị agụụ mmekọahụ dị aṅaa ka m na-aghaghị ime ka ọ nwụọ? Gịnị ka m kwesịrị izere nke pụrụ ịkpali ọchịchọ na-adịghị ọcha? È nwere mgbanwe ndị dị mkpa ka m mee n’ụzọ m si emeso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe m?’—Tụlee 1 Timoti 5:1, 2.
14 Pọl na-agba ndị Kraịst ume ịjụ ịkwa iko na inwe njide onwe onye ka “onye ọ bụla ghara ịghọgbu na irigbu nwanna ya n’ihe a.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-7) Jụọ onwe gị: ‘N’ihi gịnị ka ịkwa iko ji bụrụ ihe na-emerụ ahụ? Mmebi ihe dị aṅaa ka m ga-akpatara onwe m ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ma m jehie n’akụkụ a? Olee otú ọ ga-esi emetụta m n’ụzọ ime mmụọ, n’ụzọ mmetụta uche, na n’ụzọ anụ ahụ? Gịnị banyere ndị nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị mebiworo iwu Chineke, ghara ichegharị? Olee otú ihe siworo gaara ha?’ Iburu n’uche ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ụdị àgwà dị otú ahụ pụrụ ime ka asị anyị kpọrọ ihe dị njọ n’anya Chineke dịkwuo ukwuu. (Ọpụpụ 20:14; 1 Ndị Kọrint 5:11-13; 6:9, 10; Ndị Galetia 5:19-21; Mkpughe 21:8) Pọl sịrị na onye na-akwa iko “na-ajụ, ọ bụghị mmadụ . . . , kama ọ bụ Chineke.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:8) Olee ezi onye Kraịst ga-ajụ Nna ya nke eluigwe?
Ịdị Mma na Mkpakọrịta
15. Òkè dị aṅaa ka mkpakọrịta na-ekere ná nchụso anyị na-achụso ịdị mma?
15 Enyemaka ọzọ iji nọgide na-akpa àgwà dị mma bụ ezi mkpakọrịta. Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Onye e kekọtaworo mụ na ndị nile na-atụ egwu [Jehova] n’otu ka m bụ, onye e kekọtaworo mụ na ndị na-edebe ihe ịrịba ama Gị nile n’otu.” (Abụ Ọma 119:63) Mkpakọrịta na-ewuli elu nke a na-enwe ná nzukọ ndị Kraịst dị anyị mkpa. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ bụrụ na anyị ekewapụ onwe anyị, anyị pụrụ ịdị na-achọ ọdịmma nanị onwe anyị n’echiche anyị, omume ọjọọ pụkwara irikpu anyị n’ụzọ dị mfe. (Ilu 18:1) Otú ọ dị, mmekọrịta ndị Kraịst na-ekpo ọkụ pụrụ ime ka mkpebi anyị ịnọgide na-akpa àgwà dị mma sie ike. N’eziokwu, anyị aghaghịkwa ịnọ na nche megide mkpakọrịta ọjọọ. Anyị pụrụ igosi ndị agbata obi, ndị ọrụ ibe anyị, na ụmụ akwụkwọ ibe anyị obiọma. Ma ọ bụrụ na anyị na-eje ije n’amamihe n’ezie, anyị ga-ezere ịkpa ndị na-adịghị achụso ịdị mma ndị Kraịst nso gabiga ókè.—Tụlee Ndị Kọlọsi 4:5.
16. Olee otú itinye 1 Ndị Kọrint 15:33 n’ọrụ pụrụ isi nyere anyị aka ịchụso ịdị mma taa?
16 Pọl dere, sị: “Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” Site n’ikwu okwu a, ọ na-adọ ndị kwere ekwe aka ná ntị na ha pụrụ ịtụfu okwukwe ha site n’iso ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst bụ́ ndị jụrụ ozizi Akwụkwọ Nsọ banyere mbilite n’ọnwụ na-akpakọrịta. Ụkpụrụ nọ n’azụ ịdọ aka ná ntị Pọl metụtara mkpakọrịta anyị ma n’èzí ma n’ime ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 15:12, 33) N’ezie, anyị achọghị ịjụ ụmụnna anyị nwoke na ụmụnna anyị nwanyị ime mmụọ n’ihi na ha ekwenyeghị n’ụfọdụ echiche onwe onye kpọmkwem nke anyị nwere. (Matiu 7:4, 5; Ndị Rom 14:1-12) Ka o sina dị, ọ dị mkpa ịkpachara anya ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ na-akpa àgwà a na-enyo enyo ma ọ bụ na-egosipụta mmụọ dị ilu ma ọ bụ nke ime mkpesa. (2 Timoti 2:20-22) Ọ bụ ihe amamihe ịnọ ndị a pụrụ isoro nwee ‘nkasirịta obi’ nso. (Ndị Rom 1:11, 12) Nke a ga-enyere anyị aka ịchụso ụzọ ịdị mma ma nọgide ‘n’ụzọ ndụ.’—Abụ Ọma 16:11.
Nọgide Na-achụso Ịdị Mma
17. Dị ka Ọnụ Ọgụgụ isi nke 25 si kwuo, ọdachi dị aṅaa dakwasịrị ndị Israel, ihe mmụta dịkwa aṅaa ka nke a na-enye anyị?
17 Nwa mgbe nta tupu ndị Israel ebichie Ala Nkwa ahụ, ọtụtụ puku n’ime ha họọrọ ịchụso omume ọjọọ—nwetakwa ọdachi. (Ọnụ Ọgụgụ, isi nke 25) Taa, ndị Jehova na-eguzo n’ụsọ ụwa ọhụrụ ezi omume ahụ. Ịbanye n’ime ya ga-abụ ihe ùgwù a gọziri agọzi nke ndị nọgidere na-ajụ omume ọjọọ nke ụwa nke a. Dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị pụrụ inwe ọchịchọ na-ezighị ezi, ma Chineke pụrụ inyere anyị aka ịgbaso idu ndú ezi omume nke mmụọ nsọ ya. (Ndị Galetia 5:16; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:3, 4) Ya mere ka anyị ṅaa ntị n’agbamume Joshua nyere Israel: “Na-atụnụ egwu Jehova, na-efekwanụ Ya ofufe n’izu okè na n’eziokwu.” (Joshua 24:14) Iji nsọpụrụ atụ egwu imejọ Jehova ga-enyere anyị aka ịchụso ụzọ ịdị mma.
18. Banyere omume ọjọọ na ịdị mma, gịnị kwesịrị ịbụ mkpebisi ike nke ndị Kraịst nile?
18 Ọ bụrụ na ọ bụ ọchịchọ obi gị ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, kpebisie ike ịṅa ntị n’agbamume Pọl: “Ka ihe bụ eziokwu hà, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị nsọpụrụ, ka ha hà, bụ́ ihe ziri ezi, ka ha hà, bụ́ ihe dị ọcha, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị ịhụnanya, ka ha hà, bụ́ ihe e kwuru nke ọma; ọ bụrụ na ịdị mma ọ bụla dị, ọ bụrụkwa na otuto ọ bụla dị, na-agụkọnụ ihe ndị a.” I mee nke a, gịnị ka ọ ga-arụpụta? Pọl sịrị: “Na-emenụ ihe ndị a: Chineke nke udo ga-anọnyerekwa unu.” (Ndị Filipaị 4:8, 9) Ee, site n’enyemaka Jehova ị pụrụ ịjụ omume ọjọọ ma chụsoo ịdị mma.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Ụlọ Nche, April 15, 1993, peji nke 19-24, na usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” na Teta! nke July 8, August 8, na March 22, 1993 (Bekee), na November 22, 1996 (Bekee).
Isi Ihe Ndị A Ga-atụleghachi
◻ Gịnị ka a chọrọ iji chụsoo ịdị mma?
◻ N’okpuru ọnọdụ ndị dị aṅaa ka Hezekaịa, Daniel, na ndị Hibru atọ ahụ nọgidere na-akpa àgwà dị mma?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi dịrị ka Daniel n’iguzogide atụmatụ ọjọọ Setan?
◻ N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-aghaghị iji na-elezi anya banyere ntụrụndụ?
◻ Òkè dị aṅaa ka ọmụmụ ihe, ntụgharị uche, na mkpakọrịta na-ekere n’ịchụso ịdị mma?
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Hezekaịa na-eto eto chụsoro ịdị mma ọ bụ ezie na ndị na-efe Mọlek gbara ya gburugburu
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Ndị Kraịst aghaghị ịdị na-elezi anya ma a bịa n’ihe banyere ntụrụndụ