À ‘Na-edozi Ekpere Gị Dị Ka Ihe Nsure Ọkụ Na-esi Ísì Ụtọ’?
“Ka e dozie ekpere m dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Gị.”—ABỤ ỌMA 141:2.
1, 2. Gịnị ka isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nọchitere anya ya?
JEHOVA CHINEKE nyere onye amụma ya bụ́ Mosis iwu ka o dozie ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ dị nsọ maka iji ya eme ihe n’ụlọikwuu ofufe nke Israel. Ndepụta ahụ sitere n’aka Chineke chọrọ ụzọ ihe anọ a gwakọtara ọnụ nke na-esi ísì ụtọ. (Ọpụpụ 30:34-38) O siri ísì ụtọ n’ezie.
2 Ọgbụgba ndụ Iwu ahụ nke e webatara mba Israel n’ime ya, nwere ndokwa maka isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ kwa ụbọchị. (Ọpụpụ 30:7, 8) Iji ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ eme ihe ò nwere ihe pụrụ iche ọ pụtara? Ee, n’ihi na ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ka e dozie ekpere m dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Gị [Jehova Chineke]; ka nchịli ọbụ aka m bụrụ onyinye ịnata ihu ọma nke anyasị.” (Abụ Ọma 141:2) N’akwụkwọ Mkpughe, Jọn onyeozi na-akọwa ndị ahụ nọ gburugburu ocheeze eluigwe Chineke dị ka ndị nwere ọkwa ndị e ji ọlaedo mee ndị jupụtara n’ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. ‘Ihe nsure ọkụ ahụ na-esi ísì ụtọ,’ ka ihe ndekọ ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee na-asị, ‘bụ ekpere ndị nsọ.’ (Mkpughe 5:8) Ya meziri, isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nọchitere anya ekpere ndị a na-anara nke ọma bụ́ nke ndị ohu Jehova na-ekpe ehihie na abalị.—1 Ndị Tesalọnaịka 3:10; Ndị Hibru 5:7.
3. Gịnị kwesịrị inyere anyị aka ‘idozi ekpere anyị dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Chineke’?
3 Ọ bụrụ na ekpere anyị ga-abụ nke Chineke ga-anara nke ọma, anyị aghaghị ikpegara ya ekpere n’aha Jisọs Kraịst. (Jọn 16:23, 24) Ma olee otú anyị pụrụ isi mee ka ekpere anyị ka mma? Ịtụle ihe atụ ụfọdụ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ kwesịrị inyere anyị aka idozi ekpere anyị dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Jehova.—Ilu 15:8.
Jiri Okwukwe Na-ekpe Ekpere
4. Olee otú okwukwe na ekpere a na-anara nke ọma si nwee njikọ?
4 Ọ bụrụ na ekpere anyị ga-arịgokwuru Chineke dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, anyị aghaghị iji okwukwe na-ekpe ya. (Ndị Hibru 11:6) Mgbe ndị Kraịst bụ́ ndị okenye hụrụ na onye na-arịa ọrịa ime mmụọ na-anabata enyemaka ha dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, “ekpere nke okwukwe [ha] ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ na-adịghị ike.” (Jemes 5:15) Ekpere ndị e ji okwukwe kpee na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ, otú ahụ ka iji ekpere na-amụ Okwu Chineke na-atọkwa ya. Ọbụ abụ ahụ gosipụtara àgwà dị mma mgbe ọ bụrụ, sị: “M ga-achịlikwara ihe nile I nyere n’iwu ọbụ aka m, bụ́ ihe nke m hụworo n’anya; m ga-atụgharịkwa uche n’ụkpụrụ Gị nile. Zi m ịdị mma nke ezi uche na ihe ọmụma; n’ihi na ọ bụ n’ihe nile I nyere n’iwu ka m kwerewooro.” (Abụ Ọma 119:48, 66) Ka anyị ‘gbasaa ọbụ aka anyị’ n’ekpere obi umeala ma gosipụta okwukwe site n’ime ihe kwekọrọ n’ihe ndị Chineke nyere n’iwu.
5. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị enweghị amamihe?
5 Ka e were ya na anyị enweghị amamihe dị mkpa iji guzogide otu ọnwụnwa. Ikekwe anyị ejighị n’aka na otu amụma Bible na-emezu ugbu a. Kama ikwe ka nke a mee ka anyị ghara ịkwụrụ chịm n’ụzọ ime mmụọ, ka anyị kpee ekpere maka amamihe. (Ndị Galetia 5:7, 8; Jemes 1:5-8) N’ezie, anyị apụghị ịtụ anya ka Chineke zaa anyị n’ụzọ dị ịrịba ama. Ọ dị anyị mkpa igosi na ekpere anyị sitere n’ezi obi site n’ime ihe ọ na-atụ anya ka ndị ya nile na-eme. Ọ dị mkpa ka anyị tinye aka n’ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ nke na-ewulite okwukwe site n’enyemaka nke mbipụta ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” wepụtara. (Matiu 24:45-47; Joshụa 1:7, 8) Ọ dịkwa anyị mkpa ịmụbakwu n’ihe ọmụma site n’ikerechi òkè anya ná nzukọ ndị Chineke.—Ndị Hibru 10:24, 25.
6. (a) Anyị nile kwesịrị ịghọta gịnị banyere ụbọchị anyị na mmezu nke amụma Bible? (b) Tụkwasị n’ikpe ekpere maka ido aha Jehova nsọ, gịnị ka anyị kwesịrị ime?
6 Taa, ụfọdụ ndị Kraịst na-achụso ọdịmma onwe onye na ọrụ ndị na-enye echiche na ha amaghịzi na anyị nọ ugbu a n’ime ime “mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a.” (Daniel 12:4) Ndị kwere ekwe ibe ha pụrụ ikpe ekpere n’ụzọ kwesịrị ekwesị ka ndị dị otú ahụ tụteghachi ma ọ bụ kwalite okwukwe ha nwere n’ihe àmà ahụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke bụ́ na ọnụnọ Kraịst malitere na 1914 mgbe Jehova chiri ya echichi dị ka Eze eluigwe nakwa na ọ na-achị n’etiti ndị iro ya. (Abụ Ọma 110:1, 2; Matiu 24:3) Anyị nile kwesịrị ịghọta na ihe omume ndị ahụ e buru n’amụma dị ka mbibi nke okpukpe ụgha—“Babilọn ukwu ahụ,”—mwakpo Setan nke Gọg nke Megọg ga-awakpo ndị Jehova, na nnapụta Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ga-anapụta ha n’agha Amagedọn pụrụ itiwapụ nnọọ na mberede, ha nile pụkwara ime n’ime oge dị nnọọ mkpirikpi. (Mkpughe 16:14, 16; 18:1-5; Ezikiel 38:18-23) Ya mere ka anyị na-ekpe ekpere maka enyemaka Chineke iji mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ. Ka anyị nile kpesie ekpere ike ka e doo aha Jehova nsọ, ka Alaeze ya bịa, nakwa ka e mee ihe ọ na-achọ n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe. Ee, ka anyị nọgide na-enwe okwukwe, na-enyekwa ihe àmà na ekpere anyị si n’ezi obi. (Matiu 6:9, 10) N’ezie, ka ndị nile hụrụ Jehova n’anya buru ụzọ chọọ Alaeze ya na ezi omume ya, na-ekerekwa òkè kasị ukwuu dị ka o kwere mee n’ikwusa ozi ọma ahụ tupu ọgwụgwụ ihe nile abịa.—Matiu 6:33; 24:14.
Too ma Kelee Jehova
7. Gịnị na-amasị gị banyere ekpere Devid nke e dekọrọ akụkụ ya ụfọdụ na 1 Ihe E Mere 29:10-13?
7 Otu ụzọ dị mkpa isi ‘dozie ekpere anyị dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ’ bụ site n’ikwupụta otuto na obi ekele sitere n’ala ala obi nye Chineke. Eze Devid kpere ekpere dị otú ahụ mgbe ya na ndị Israel nyere onyinye maka iwu ụlọ nsọ Jehova. Devid kpere, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Ị bụ, Jehova, bụ́ Chineke Israel nna anyị, site na mgbe ebighị ebi wee ruo mgbe ebighị ebi. Jehova, Gị nwe ịdị ukwuu, na ịdị ike, na ịma mma, na mmeri, na ebube: n’ihi na ihe nile dị n’eluigwe na n’ụwa bụ nke Gị; Jehova, Gị nwe alaeze, Gị bụkwa Onye a na-eweli elu ịbụrụ ihe nile onyeisi. Ma akụ̀ ma nsọpụrụ na-esite n’ebe Ị nọ bịa, Gị onwe gị na-achịkwa ihe nile; ọ bụkwa n’aka Gị ka ume na ịdị ike dị; n’aka Gị ka ọ dịkwa ime ukwuu, na ime ka ihe nile dị ike. Ma ugbu a, Chineke anyị, anyị onwe anyị na-ekele Gị, na-etokwa aha Gị mara mma.”—1 Ihe E Mere 29:10-13.
8. (a) Olee okwu otuto ndị dị n’Abụ Ọma nke 148 ruo 150 nke na-emetụ gị n’obi karịsịa? (b) Ọ bụrụ na anyị na-enwe mmetụta ahụ e kwupụtara n’Abụ Ọma 27:4, gịnị ka anyị ga-eme?
8 Lee okwu otuto na ekele mara mma ọ bụ! Ọ pụrụ ịbụ na ekpere anyị agaghị adị were were otú ahụ, ma ha pụrụ nnọọ isite n’ezi obi otú ahụ. Ekpere ekele na otuto jupụtara n’akwụkwọ Abụ Ọma. A na-achọta okwu otuto ndị dị ụtọ n’Abụ Ọma nke 148 ruo 150. E kwupụtara obi ekele nye Chineke n’ọtụtụ abụ ọma. “Otu ihe ka m rịọworo n’aka Jehova,” ka Devid bụrụ n’abụ. “Nke ahụ ka m na-achọ; ọ bụ ka m biri n’ụlọ Jehova ụbọchị nile nke ndụ m, ịhụ ịdị ụtọ Jehova, na ịjụta ihe n’ụlọukwu Ya.” (Abụ Ọma 27:4) Ka anyị na-eme ihe kwekọrọ n’ekpere ndị dị otú ahụ site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ihe omume nile nke mkpọkọta mmadụ nile nke Jehova. (Abụ Ọma 26:12) Ime nke a na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke kwa ụbọchị ga-enye anyị ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji jiri otuto na obi ekele sitere n’ala ala obi gakwuru Jehova.
Jiri Obi Umeala Na-achọ Enyemaka Jehova
9. Olee otú Eze Esa si kpee ekpere, gịnịkwa si na ya pụta?
9 Ọ bụrụ na anyị ji obi anyị dum na-ejere Jehova ozi dị ka Ndịàmà ya, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ na-anụ ekpere ndị anyị na-ekpegara ya maka enyemaka. (Aịsaịa 43:10-12) Tụlee Eze Esa nke Juda. E ji udo mara afọ 10 mbụ nke ọchịchị afọ 41 ya (977-937 T.O.A.). Mgbe ahụ, usuu ndị agha dị otu nde mmadụ wakporo Juda ná nduzi Zera bụ́ onye Etiopia. Ọ bụ ezie na a karịrị ha n’ọnụ ọgụgụ nke ukwuu, Esa na ndị ikom ya pụtara izute ndị mwakpo ahụ. Otú ọ dị, tupu ọgụ ahụ, Esa kpesiri ekpere ike. O kwetara n’ike Jehova nwere inye mgbapụta. N’ịrịọ maka enyemaka, eze ahụ kwuru, sị: “Ọ bụ na Gị ka anyị dabeere, ọ bụkwa n’aha Gị ka anyị bịaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke anyị ka Ị bụ; ekwela ka ihe a kpọrọ mmadụ gbochigide Gị.” Ọ rụpụtara mmeri zuru ezu ka Jehova zọpụtara Juda n’ihi aha ukwu ya. (2 Ihe E Mere 14:1-15) Ma Chineke ọ̀ gbapụtara anyị n’ọnwụnwa ma o wusiri anyị ike ịtachi obi na ya, ajụjụ ọ bụla adịghị ya na ọ na-anụ arịrịọ anyị maka enyemaka ya.
10. Mgbe anyị na-amaghị otú anyị ga-esi mee ihe banyere otu nsogbu, olee otú ekpere Eze Jehoshafat pụrụ isi nyere anyị aka?
10 Ọ bụrụ na anyị amaghị otú anyị ga-esi mee ihe banyere otu nsogbu, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-anụ arịrịọ anyị maka enyemaka. E gosipụtara nke a n’ụbọchị Eze Jehoshafat nke Juda, bụ́ onye ọchịchị afọ 25 ya malitere na 936 T.O.A. Mgbe ndị agha Moab, Amọn, na ógbè ebe ugwu Sia ahụ jikọtara onwe ha ọnụ yiri Juda egwu, Jehoshafat rịọrọ, sị: “Chineke anyị, Ị́ gaghị ekpe ha ikpe? n’ihi na ike adịghị n’ime anyị n’ihu ìgwè mmadụ a bara ụba nke na-abịa imegide anyị; anyị onwe anyị amaghịkwa ihe anyị ga-eme: kama ọ bụ Gị ka anya anyị na-adịkwasị.” Jehova zara ekpere ahụ e ji obi umeala kpee, na-alụrụ Juda ọgụ site n’itinye ndị iro ahụ n’ọgba aghara nke mere na ha gburịtara onwe ha. N’ihi ya, mba ndị gbara ha gburugburu tụrụ egwu, udo jupụtakwara na Juda. (2 Ihe E Mere 20:1-30) Mgbe anyị na-enweghị amamihe dị mkpa iji mee ihe banyere otu nsogbu, dị ka Jehoshafat anyị pụrụ ikpe ekpere, sị: ‘Anyị amaghị ihe anyị ga-eme: kama ọ bụ Gị ka anya anyị na-adịkwasị, Jehova.’ Mmụọ nsọ pụrụ ime ka anyị cheta isi ihe ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị dị mkpa iji dozie nsogbu ahụ, ma ọ bụ Chineke pụrụ inyere anyị aka n’ụzọ karịrị echiche mmadụ.—Ndị Rom 8:26, 27.
11. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere ekpere site n’ihe Nehemaịa mere n’ihe metụtara mgbidi Jerusalem?
11 Ọ pụrụ ịbụ na anyị aghaghị ịnọgidesi ike n’ekpere maka enyemaka Chineke. Nehemaịa ruru újú, kwaa ákwá, buo ọnụ, kpeekwa ekpere ruo ọtụtụ ụbọchị banyere mgbidi e mebiri emebi nke Jerusalem na ọnọdụ ọjọọ nke ndị bi na Juda. (Nehemaịa 1:1-11) Ihe àmà na-egosi na ekpere ya rịgokwuuru Chineke dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Otu ụbọchị Eze Ataksakses nke Peasia jụrụ Nehemaịa ihu gbarụrụ, sị: “Ọ̀ bụ gịnịkwa ka gị onwe gị na-achọ?” Nehemaịa na-akọ, sị: “M wee kpeere Chineke nke eluigwe.” A zara ekpere ahụ dị mkpirikpi e kpere n’ime obi, n’ihi na e nyere Nehemaịa ohere imezu ọchịchọ obi ya site n’ịga Jerusalem iji wughachi mgbidi ya mebiri emebi.—Nehemaịa 2:1-8.
Ka Jisọs Kụziere Gị Otú E Si Ekpe Ekpere
12. N’okwu nke aka gị, ị̀ ga-esi aṅaa chịkọta isi ihe ndị dị n’ekpere nlereanya Jisọs?
12 N’ime ekpere nile e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ, nke kasị akụzi ihe bụ ekpere nlereanya ahụ nke Jisọs Kraịst kpere dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Oziọma Luk na-asị: “Otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ [Jisọs] sị Ya, Onyenwe anyị, zi anyị ikpe ekpere, dị ka Jọn zikwara ndị na-eso ụzọ ya. O wee sị ha, Mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere, sịnụ, Nna, Ka e doo aha Gị nsọ. Ka alaeze Gị bịa. Na-enye anyị nri kwa ụbọchị nke ga-ezuru anyị n’ụbọchị taa. Gbagharakwa anyị mmehie nile anyị; n’ihi na anyị onwe anyị na-agbagharakwa onye ọ bụla nke ji anyị ụgwọ. Ewebakwala anyị n’ime ọnwụnwa.” (Luk 11:1-4; Matiu 6:9-13) Ka anyị tụlee ekpere a, bụ́ nke a na-ebughị n’uche ka a na-agụgharị ya kama nke e zubere ka ọ bụrụ ihe nduzi.
13. Ị̀ ga-esi aṅaa kọwaa ihe okwu ndị ahụ bụ́, “Nna, Ka e doo aha Gị nsọ” pụtara?
13 “Nna, Ka e doo aha Gị nsọ.” Ịkpọ Jehova Nna bụ ihe ùgwù pụrụ iche nke ndị ohu ya raara onwe ha nye nwere. Dị ka ụmụntakịrị si adị njikere iji nchegbu ọ bụla gakwuru nna nwere obi ebere, anyị kwesịrị itinye oge n’ikpegara Chineke ekpere nwere ùgwù na nsọpụrụ n’oge nile. (Abụ Ọma 103:13, 14) Ekpere anyị kwesịrị igosipụta nchegbu anyị nwere banyere ido aha Jehova nsọ n’ihi na ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịhụ ka e wepụrụ ya ná nkọcha nile a wụkwasịworo ya. Ee, anyị chọrọ ka e debe aha Jehova iche, ka e leekwa ya anya dị ka ihe dị nsọ.—Abụ Ọma 5:11; 63:3, 4; 148:12, 13; Ezikiel 38:23.
14. Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ikpe ekpere, sị, “Ka alaeze Gị bịa”?
14 “Ka alaeze Gị bịa.” Alaeze ahụ bụ ịchịisi Jehova nke e gosipụtara site n’ọchịchị eluigwe nke Mesaịa nke dị n’aka Ọkpara ya na “ndị nsọ” bụ́ ndị na-esonyere Jisọs. (Daniel 7:13, 14, 18, 27; Mkpughe 20:6) Ọ ‘ga-abịa’ n’isi nso megide ndị nile na-emegide ọbụbụeze Chineke n’ụwa, na-eme ka ha pụọ n’anya. (Daniel 2:44) Mgbe ahụ a ga-eme ihe Jehova na-achọ n’ụwa, ọbụna dị ka e si eme ya n’eluigwe. (Matiu 6:10) Lee ọṅụ nke ahụ ga-ewetara ihe nile e kere eke ndị ji iguzosi ike n’ihe na-ejere Eze Eluigwe na Ala ozi!
15. Ịrịọ Jehova maka “nri kwa ụbọchị” na-egosi gịnị?
15 “Na-enye anyị nri kwa ụbọchị nke ga-ezuru anyị n’ụbọchị taa.” Ịrịọ Jehova maka nri “kwa ụbọchị” na-egosi na anyị adịghị arịọ ihe n’ụba kama nanị ihe dị anyị mkpa kwa ụbọchị. Ọ bụ ezie na anyị tụkwasịrị Chineke obi inye anyị ihe, anyị na-arụkwa ọrụ ma na-eji ụzọ ọ bụla kwesịrị ekwesị nke pụtaara anyị na-eme ihe iji nweta nri na ihe ndị ọzọ dị mkpa. (2 Ndị Tesalọnaịka 3:7-10) N’ezie, anyị kwesịrị ikele Onye Na-enye anyị ihe nke bi n’eluigwe n’ihi na ihe ndị a sitere n’ịhụnanya, amamihe, na ike ya.—Ọrụ 14:15-17
16. Olee otú anyị pụrụ isi nweta mgbaghara Chineke?
16 “Gbagharakwa anyị mmehie nile anyị; n’ihi na anyị onwe anyị na-agbagharakwa onye ọ bụla nke ji anyị ụgwọ.” Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè ma na-emehie emehie, anyị apụghị iru ụkpụrụ zuru okè nke Jehova n’ụzọ zuru ezu. N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ikpe ekpere maka mgbaghara ya ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs. Ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka “Onye na-anụ ekpere” tinye uru nke àjà ahụ n’ọrụ ná mmehie anyị, anyị aghaghị ichegharị ma dị njikere ịnabata ahụhụ ọ bụla ọ na-enye anyị. (Abụ Ọma 65:2; Ndị Rom 5:8; 6:23; Ndị Hibru 12:4-11) Ọzọkwa, anyị pụrụ ịtụ anya ka Chineke gbaghara anyị nanị ma ọ bụrụ na anyị ‘agbagharawo ndị ji anyị ụgwọ,’ bụ́ ndị na-emehie megide anyị.—Matiu 6:12, 14, 15.
17. Gịnị ka okwu ndị ahụ bụ́, “Ewebakwala anyị n’ime ọnwụnwa,” pụtara?
17 “Ewebakwala anyị n’ime ọnwụnwa.” Mgbe ụfọdụ Bible na-ekwu na Jehova na-eme ihe mgbe ọ bụ nanị nhapụ ka ọ hapụrụ ka ha na-eme. (Rut 1:20, 21) Chineke adịghị anwa anyị ọnwụnwa ime mmehie. (Jemes 1:13) Ọnwụnwa ime mmehie sitere n’aka Ekwensu, ahụ anyị na-emehie emehie, na ụwa a. Setan bụ Onye Ọnwụnwa nke na-anwa ịkwaga anyị n’imehie megide Chineke. (Matiu 4:3; 1 Ndị Tesalọnaịka 3:5) Mgbe anyị rịọrọ arịrịọ ahụ bụ́, ‘Ewebala anyị n’ime ọnwụnwa,’ anyị na-arịọ Chineke ka ọ ghara ikwe ka anyị daa mgbe a nwara anyị ọnwụnwa inupụrụ ya isi. Ọ pụrụ iduzi anyị ka anyị ghara ịda, ka Setan, bụ́ “ajọ onye ahụ” gharakwa imeri anyị.—Matiu 6:13; 1 Ndị Kọrint 10:13.
Rụọ Ọrụ Kwekọrọ n’Ekpere Gị
18. Olee otú anyị pụrụ isi rụọ ọrụ kwekọrọ n’ekpere anyị maka alụmdi na nwunye na ndụ ezinụlọ obi ụtọ?
18 Ekpere nlereanya Jisọs metụtazuru isi ihe ndị bụ́ isi, ma anyị pụrụ ikpe ekpere banyere ihe ọ bụla. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ikpe ekpere banyere ọchịchọ anyị maka alụmdi na nwunye obi ụtọ. Iji nọgide n’enweghị mmekọahụ ruo oge anyị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, anyị pụrụ ikpe ekpere maka njide onwe onye. Ma mgbe ahụ ka anyị rụọ ọrụ kwekọrọ n’ekpere anyị site n’izere akwụkwọ ọgụgụ na ntụrụndụ rụrụ arụ. Ka anyị kpebisiekwa ike ‘ịlụ nanị n’ime Onyenwe anyị.’ (1 Ndị Kọrint 7:39; Deuterọnọmi 7:3, 4) Mgbe anyị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ọ ga-adị anyị mkpa ịrụ ọrụ kwekọrọ n’ekpere anyị maka obi ụtọ site n’itinye ndụmọdụ Chineke n’ọrụ. Ọ bụrụkwa na anyị nwere ụmụ, o zughị ezu ikpe ekpere ka ha bụrụ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi. Anyị aghaghị ime ihe nile anyị pụrụ ime iji kụnye eziokwu Chineke n’uche ha site n’ọmụmụ Bible nakwa site n’ịkpọrọ ha na-agachi nzukọ ndị Kraịst anya.—Deuterọnọmi 6:5-9; 31:12; Ilu 22:6.
19. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere banyere ozi anyị?
19 Ànyị na-ekpe ekpere maka ngọzi n’ozi ahụ? Mgbe ahụ ka anyị na-eme ihe kwekọrọ n’ekpere dị otú ahụ site n’ikere òkè dị mkpa n’ọrụ nkwusa Alaeze. Ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere maka ohere inyere ndị ọzọ aka ịbanye n’ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi, ọ dị anyị mkpa inwe ihe ndekọ dị mma nke ndị nwere mmasị ma dị njikere ịgụnye iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi ná ndokwa anyị. Gịnị ma ọ bụrụ na anyị nwere ọchịchọ iwere ọrụ nkwusa oge nile dị ka ọsụ ụzọ? Mgbe ahụ ka anyị were nzọụkwụ ndị kwekọrọ n’ekpere anyị site n’ịmụba ọrụ nkwusa anyị nakwa site n’isoro ndị ọsụ ụzọ na-ekere òkè n’ozi. Iwere nzọụkwụ ndị dị otú ahụ ga-egosi na anyị na-arụ ọrụ kwekọrọ n’ekpere anyị.
20. Isiokwu na-esonụ ga-atụle gịnị?
20 Ọ bụrụ na anyị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi, anyị pụrụ inwe obi ike na ọ ga-aza ekpere anyị ndị kwekọrọ n’uche ya. (1 Jọn 5:14, 15) N’ezie, e nwetawo isi ihe ndị bara uru site ná nnyocha nke ụfọdụ n’ime ekpere ndị e dekọrọ n’ime Bible. Isiokwu anyị na-esonụ ga-atụle ụkpụrụ nduzi ndị ọzọ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ maka ndị na-achọ ‘idozi ekpere ha dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ihu Jehova.’
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji jiri okwukwe na-ekpe ekpere?
◻ Òkè dị aṅaa ka otuto na ekele kwesịrị ikere n’ekpere anyị?
◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jiri obi ike na-achọ enyemaka Jehova n’ekpere?
◻ Gịnị bụ isi ihe ụfọdụ ndị dị n’ekpere nlereanya ahụ?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi rụọ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ n’ekpere anyị?
[Foto dị na peeji nke 12]
Dị ka Eze Jehoshafat, mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ikpe ekpere, sị: ‘Anyị amaghị ihe anyị ga-eme: kama ọ bụ Gị ka anya anyị na-adịkwasị, Jehova’
[Foto dị na peeji nke 13]
Ị̀ na-ekpe ekpere n’ụzọ kwekọrọ n’ekpere nlereanya Jisọs?