Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp18 nke 1 p. 14-15
  • Uru Ihe Baịbụl Kwuru Ga-abara Gị n’Ọdịnihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Uru Ihe Baịbụl Kwuru Ga-abara Gị n’Ọdịnihu
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 1 IME KA NDỤ ANYỊ NWEE ISI
  • 2 ANYỊ NA CHINEKE GA-ABỤ ENYI
  • Olee Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Nọrọ Jehova Nso
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Oleedị ihe Chineke bu n’obi kee anyị?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ònye Bụ Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
wp18 nke 1 p. 14-15
Ebe otu nwaanyị nọ n’ụgbọ okporo ígwè na-agụ Baịbụl

Uru Ihe Baịbụl Kwuru Ga-abara Gị n’Ọdịnihu

WEREGODỊ YA na ị na-aga n’ụzọ gbara ọchịchịrị n’abalị. Ọ bụ eziokwu na ezigbo ọchịchịrị agbaala, mana ụjọ anaghị atụ gị maka na i ji tọọchị na-enwusi ike. Ị gbaa ya n’ala, ị ga-ahụ ihe dị gị n’ihu nke ọma. Ị gbaa ya n’ihu, ụdị ìhè si na ya apụta ga-eme ka ị na-ahụ ihe dị n’ebe dị anya.

E nwere ike iji Baịbụl tụnyere tọọchị a. N’isiokwu ndị bu nke a ụzọ, anyị kwuru na Baịbụl nwere ike inyere anyị aka imeri nsogbu ndị na-abịara anyị kwa ụbọchị, n’ụwa a nke ọ na-abụ chi bọọ a nụ ọzọ. E nwere ike iji nsogbu ndị ahụ tụnyere ihe ndị dị anyị n’ihu. Uru ọzọ Baịbụl na-abara anyị bụ na ọ na-enyere anyị aka ịmata otú ihe ga-adị n’ọdịnihu. Ọ na-emekwa ka anyị mata ụzọ ọ ga-abụ anyị soro, anyị enwee obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi, ihe ndị anyị nwere ejukwa anyị afọ. (Abụ Ọma 119:105) Olee otú o si eme ya?

Ka anyị tụlee uru abụọ ihe ndị Baịbụl na-akụziri anyị ga-abara anyị n’ọdịnihu: 1 Ọ na-akụziri anyị ihe ga-eme ka ndụ anyị nwee isi, nakwa 2 ọ na-ezi anyị otú anyị na Chineke ga-esi bụrụ enyi.

1 IME KA NDỤ ANYỊ NWEE ISI

Baịbụl na-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi dozie nsogbu ọ bụla anyị nwere. Ma, Baịbụl karịrị akwụkwọ nkịtị na-enyere mmadụ aka ma o nwee nsogbu. Baịbụl anaghị akụziri anyị ka anyị na-eche naanị gbasara onwe anyị, kama, ọ na-akụziri anyị ka anyị na-eche otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka. Anyị mee ya, ọ ga-eme ka ndụ anyị nwee isi.

Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru sị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) Ì chetara mgbe i nyeere onye nọ ná mkpa aka? Ma ọ bụkwanụ mgbe i medara obi gee otu enyi gị ntị ka ọ na-akọrọ gị otú ọ dị ya n’obi? Ị̀ naghị enwe obi ụtọ ma i cheta na i nyeere mmadụ aka ya enwee obi ụtọ?

Anyị ga-aka enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị enye ndị ọzọ ihe ma ghara ilewe anya ka ha nyeghachi anyị ihe ọ bụla. Otu onye na-ede akwụkwọ sịrị: “Ọ ga-esi ike inye mmadụ ihe ma ghara inweta nke karịrị nke ahụ i nyere, ma ọ bụrụhaala na i nyere ma ghara ịtụwa anya ka e nyeghachi gị ihe ọ bụla.” Mana, ọ bụrụ na anyị ewepụta onwe anyị nyere ndị ọzọ aka, karịchaa ndị na-agaghị enyeghachịli anyị ihe ọ bụla, anyị na-enweta ụgwọ ọrụ. Anyị na-eme ihe dị Chineke mma. Anyị na Jehova ga na-arụkọ ọrụ, bụ́ onye na-ewere ihe ọma ọ bụla anyị meere ndị ọzọ dị ka ịgbazinye ya ihe. (Ilu 19:17) Ọ naghị eji ihe ọma ọ bụla anyị meere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha egwu egwu, o kwekwara nkwa iji ndụ ebighị ebi na paradaịs kwụọ anyị ụgwọ. Olileanya a anyị nwere magburu onwe.—Abụ Ọma 37:29; Luk 14:12-14.a

Nke kachanụ bụ́ na Baịbụl na-akụziri anyị na ndụ anyị ga-aka enwe isi ma ọ bụrụ na anyị ejiri ya fee Jehova Chineke. Okwu ya na-agba anyị ume ka anyị na-eto ya, na-asọpụrụ ya ma na-erubere ya isi. (Ekliziastis 12:13; Mkpughe 4:11) Ọ bụrụ na anyị emee ya, anyị ga-eme ihe ga-akacha aba uru, nke bụ na ọ ga-eme ka Chineke nwee obi ụtọ. Ọ gwara anyị sị: “Mara ihe . . . wee mee ka obi m ṅụrịa.” (Ilu 27:11) Chegodị echiche. Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe Baịbụl kwuru mee mkpebi, ọ na-eme ka Nna anyị nke eluigwe nwee obi ụtọ. Maka gịnị? Ọ na-eche banyere anyị, ọ chọkwara ka anyị rubere ya isi ka ihe nwee ike gaziere anyị. (Aịzaya 48:17, 18) Ò nwere ihe ga-aka eme ka ndụ anyị nwee isi karịa na anyị na-efe Ọkaakaa eluigwe na ụwa nakwa na otú anyị si ebi ndụ na-eme ya obi ụtọ?

2 ANYỊ NA CHINEKE GA-ABỤ ENYI

Baịbụl na-akụzikwara anyị ka anyị na Chineke bụrụ enyi. Baịbụl sịrị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịna-eche na ọ gaghị ekweli omume anyị na onye kere anyị ịbụ enyi. Mana, Baịbụl gwara anyị na ọ bụrụ na anyị ‘achọọ Chineke,’ na anyị ‘ga-achọta ya n’ezie,’ maka na “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ Ndịozi 17:27) Ndụmọdụ a Baịbụl nyere anyị ka anyị bụrụ enyi Chineke ga-abara anyị ezigbo uru n’ọdịnihu. Olee otú ọ ga-esi baara anyị uru?

Chetụgodị echiche: O nweghị ihe anyị ga-emeli n’onwe anyị iji gbanahụ onye iro anyị kachanụ bụ́ ọnwụ. (1 Ndị Kọrịnt 15:26) Mana, Chineke na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ naghị anwụ anwụ, ọ chọkwara ka ndị enyi ya dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Baịbụl ji okwu ndị a na-eru n’obi ma dị mfe nghọta gosi ihe Jehova bu n’obi maka ndị niile na-achọ ya. Ọ sịrị: “Onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

Olee ihe ndị ị ga-eme ka gị na Chineke bụrụ enyi ruo mgbe ebighị ebi? Nọgide na-amụ gbasara ya n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. (Jọn 17:3; 2 Timoti 3:16) Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịghọta Okwu ya. Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na anyị anọgide “na-arịọ Chineke” maka amamihe, ọ ga-enye anyị ya.b (Jems 1:5) N’ikpeazụ, gbaa mbọ na-eme ihe ị mụtara. Kwee ka Okwu Chineke bụrụ “oriọna nke na-enye ụkwụ [gị] ìhè” na “ìhè na-enwu n’okporo ụzọ [gị]” ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 119:105.

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nkwa Chineke kwere maka ndụ ebighị ebi na Paradaịs, gụọ isi nke 3 n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

b Ndịàmà Jehova na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl na-anaghị ha ego. Ha ga-enyere gị aka ịghọta Baịbụl nke ọma. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma otú ha na ndị mmadụ si amụ Baịbụl, biko lee vidio aha ya bụ́ Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl? Ị ga-ahụ vidio a ma ị gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa VIDIO, pịzie ỌMỤMỤ IHE ANYỊ NA OZI ANYỊ.

Chineke anaghị anwụ anwụ, ọ chọkwara ka ndị enyi ya dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya