Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
© 2024 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
SEPTEMBA 2-8
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 79-81
Gosi na Ị Hụrụ Aha Jehova Dị Ebube n’Anya
Ihe Mgbapụta Bụ ‘Onyinye Zuru Okè’ Nna Anyị nke Eluigwe Nyere Anyị
5 Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ejighị aha Jehova egwu egwu? Anyị ga-egosi ya n’àgwà anyị. Jehova chọrọ ka anyị dị nsọ. (Gụọ 1 Pita 1:15, 16.) Ọ pụtara na ọ bụ naanị Jehova ka anyị ga na-efe, jirikwa obi anyị niile na-erubere ya isi. Ọ bụrụgodị mgbe a na-emegide anyị, anyị na-agbalị ịna-erubere ụkpụrụ ya na iwu ya isi. Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Jehova chọrọ, anyị na-eme ka ìhè anyị nwuo, si otú ahụ na-eme ka e too aha Jehova. (Mat. 5:14-16) Ebe anyị bụ ndị dị nsọ, otú anyị si ebi ndụ kwesịrị igosi na iwu Jehova nyere dị mma nakwa na Setan bụ onye ụgha. Anyị niile na-emehie. Anyị mehie, anyị kwesịrị iji obi anyị niile chegharịa ma kwụsị àgwà ndị na-eme ka e kwụtọọ aha Jehova.—Ọma 79:9.
Ndị Rom 10:13—“Na-akpọku Aha Onyenwe Anyị”
Na Baịbụl, mmadụ ‘ịna-akpọku aha Jehova’ apụtaghị naanị onye ahụ ịma aha Chineke na ịna-akpọ ya aha mgbe ọ na-efe ya. (Abụ Ọma 116:12-14) Ọ pụtakwara na onye ahụ ga-atụkwasị Chineke obi, obi esiekwa ya ike na Chineke ga-enyere ya aka.—Abụ Ọma 20:7; 99:6.
Jizọs Kraịst ji aha Chineke kpọrọ ihe. Ihe ndị mbụ o kwuru n’ekpere Onyenwe anyị ọ kụziiri anyị bụ: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ,” ma ọ bụ “ka otito dịrị aha Gị.” (Matiu 6:9) Jizọs kụzikwaara anyị na ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ndụ ebighị ebi, anyị kwesịrị ịmata Jehova, na-erubere ya isi, hụkwa ya n’anya.—Jọn 17:3, 6, 26.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 111
Josef
E Mere Ka Aha Josef Dee Ude. Ebe ọ bụ na Josef bụ onye a ma ama n’ime ụmụ nwoke ndị Jekọb mụrụ, ọ dabara nnọọ adaba na a na-akpọ aha ya mgbe ụfọdụ ma e kwuwe gbasara ebo niile e nwere n’Izrel (Ọma 80:1) ma ọ bụkwanụ ma e kwuwe gbasara ebo niile mechara bụrụ alaeze Izrel nke dị n’ebe ugwu. (Ọma 78:67; Emọs 5:6, 15; 6:6) Aha Josef gbakwara n’amụma ndị e buru na Baịbụl. N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, e kenyere Josef ibé ala abụọ. (Eze. 47:13). Otu n’ime ọnụ ụzọ ámá ndị e nwere n’obodo a kpọrọ “Jehova Nọ Ebe Ahụ” na-aza aha Josef. (Ezik. 48:32, 35) Mgbe a na-ekwukwa gbasara ime ka ndị Jehova bụrụ otu, e kwuru na Josef ga-abụ onyeisi otu akụkụ ná mba ahụ, Juda abụrụ onyeisi akụkụ nke ọzọ. (Ezik. 37:15-26) Amụma Obedaya buru gosiri na “ụlọ Josef” ga-eso bibie “ụlọ Ịsọ.” (Obed. 18) Amụma Zekaraya buru gosikwara na Jehova ga-azọpụta “ụlọ Josef.” (Zek. 10:6) Josef bụ otu n’ime ebo ndị so n’Izrel nke Chineke, ọ bụghị Ifrem.—Mkpu. 7:8.
Ebe ọ bụ na Josef so n’ebo ndị a kpọrọ aha ná Mkpughe 7:8, ọ pụtara na amụma ahụ Jekọb buru mgbe ọ na-aga ịnwụ ga-emezu n’isi Izrel nke Chineke. N’ihi ya, ọ dị mma ịmara na Dike na-enyere Jekọb aka, bụ́ Jehova Chineke, nyere Kraịst Jizọs ka ọ bụrụ ezigbo Onye Ọzụzụ Atụrụ, onye nwụrụ maka “atụrụ ya.” (Jọn 10:11-16) Kraịst Jizọs bụkwa nkume ji ụlọ e ji tọọ ntọala ụlọ nsọ Chineke nke bụ́ Izrel nke Chineke. (Efe. 2:20-22; 1 Pita 2:4-6) Onye ọzụzụ atụrụ a na Nkume a na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nọ.—Jọn 1:1-3; Ọrụ 7:56; Hib. 10:12; i nwere ike ịtụle Jen. 49:24, 25.
SEPTEMBA 9-15
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 82-84
Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ihe Ndị Ị Na-eme n’Ozi Jehova
Ihe Anyị Na-amụta n’Aka Anụ Ufe nke Eluigwe
Ndị bi na Jeruselem ma nnụnụ a na-akpọ elekentịọba nke ọma. Ọ na-arụ akwụ́ n’elu ụlọ. Ụfọdụ n’ime ha rụrụ akwụ́ n’ogige ụlọ nsọ Chineke nke Sọlọmọn rụrụ. Ọ ga-abụ na e nweghị ihe na-eme elekentịọba ndị ahụ na-arụ akwụ́ ha n’ogige ụlọ nsọ Chineke kwa afọ n’ihi na ebe ahụ na-adị ha mma ịnọ zụọ ụmụ ha.
Ọ bụ otu n’ime ụmụ Kora dere Abụ Ọma nke 84. Ọ na-eje ozi n’ụlọ nsọ Chineke otu izu n’ọnwa isii ọ bụla. Ọ na-ahụkwa akwụ́ ndị ahụ elekentịọba rụrụ n’ogige ụlọ nsọ Chineke. Ọ chọsiri ike ibi n’ụlọ Jehova mgbe niile ka elekentịọba ndị ahụ rụrụ akwụ́ ha ebe ahụ. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha. Lee ka m si hụ ụlọikwuu gị dị ebube n’anya. Agụụ ogige ụlọ Jehova agụkatala mkpụrụ obi m ike gwụ ya. Jehova nke ụsụụ ndị agha, Eze m na Chineke m, ọbụna nnụnụ enwetawo ebe obibi, elekentịọba kpakwara akwụ́, ná nnukwu ebe ịchụàjà gị, bụ́ ebe o debeworo ụmụ ya.’ (Abụ Ọma 84:1-3) Ọ̀ na-agụsi anyị na ụmụ anyị agụụ ike ịga ọmụmụ ihe, ma na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ọmụmụ ihe anyị na-aga?—Abụ Ọma 26:8, 12.
Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ị Ga-eruli ma Nwee Ọṅụ
Nká na ọrịa nwere ike igbochi anyị ime ihe anyị ga-achọ ime n’ozi Jehova. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, o nwere ike ịdị gị ka ị naghị eritecha uru otú kwesịrịnụ n’ọmụmụ ihe onwe onye ma ọ bụ n’ọmụmụ ihe ọgbakọ n’ihi na i ji oge na ume gị na-elekọta ụmụ gị. Ma, ọ̀ ga-abụ na ilekwasị nnọọ anya n’ihe ndị ị na-agaghị emeli na-egbochi gị ịhụ ihe ndị ị ka nwere ike ime?
Ọtụtụ puku afọ gara aga, otu onye Livaị kwupụtara ọchịchọ ya ime otu ihe na-agaghị ekwe ya omume. O nwere ohere ije ozi n’ụlọ nsọ izu abụọ n’afọ ọ bụla. Ma o kwupụtara ọchịchọ mara mma o nwere ibirizi ebiri n’akụkụ ebe ịchụàjà. (Ọma 84:1-3) Gịnị nyeere nwoke a kwesịrị ntụkwasị obi aka ikwe ka ihe ùgwù nke o nwere ju ya afọ? Ọ chọpụtara na ọbụna ịnọ otu ụbọchị n’ogige ụlọ nsọ bụ ihe ùgwù pụrụ iche. (Ọma 84:4, 5, 10) N’otu aka ahụ, kama ịnọ na-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị anyị na-agaghị emeli, anyị kwesịrị ịgbalị ịma ihe ndị anyị ga-emeli ma nwee ekele maka ha.
Jehova Bụ́ Chineke Gị Ji Gị Kpọrọ Ihe
12 Ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa, obi sie gị ike na Jehova ma ihe gị na ya na-alụ. Rịọ ya ka o nyere gị aka ka ị na-ele nsogbu gị anya otú kwesịrị ekwesị. Gụọ Baịbụl ka ị hụ ihe ndị Jehova kwuru ga-akasi gị obi. Na-eche gbasara amaokwu ndị gosiri otú Jehova si jiri ndị ohu ya kpọrọ ihe. Ka ị na-eme ihe ndị a, ị ga-ahụ na Jehova na-emere ndị ji obi ha na-efe ya ihe ọma.—Ọma 84:11.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 816
Nwa Na-enweghị Nna
Jehova ji okwu bụ́ “nwa na-enweghị nna” kọwaa otú ndị Izrel meruru ezi omume ma ọ bụ otú ha kparuru àgwà ọjọọ n’ihi na ọ na-adị mfe ileghara ndị a nna ha nwụnahụrụ anya, bụ́ ndị na-enweghị onye na-echebe ha. Mgbe ndị Izrel na Jehova dị n’ezigbo mma, a na-elekọta ụmụ na-enweghị nna. Ma, mgbe ha nọ na-emegbu ibe ha, e leghaara ụmụ na-enweghị nna anya. Ihe a gosiri na omume ndị bi ná mba ahụ retọrọ eretọ. (Ọma 82:3; 94:6; Aịza. 1:17, 23; Jere. 7:5-7; 22:3; Ezik. 22:7; Zek. 7:9-11; Mal. 3:5) Jehova bụrụ ndị na-emegbu nwa na-enweghị nna ọnụ. (Diut. 27:19; Aịza. 10:1, 2) O kwuru na ya bụ Onye na-agbachitere ụmụ na-enweghị nna (Ilu 23:10, 11), Onye na-enyere ha aka (Ọma 10:14), nakwa Nna (Ọma 68:5) ha. Ọ bụ ya na-ekpechitere ha ọnụ ha (Diut. 10:17, 18), na-emere ha ebere (Hos. 14:3), na-anapụta ha (Ọma 146:9), na-echebekwa ha ndụ.—Jere. 49:11.
Otu ihe e ji amata ezigbo Ndị Kraịst bụ na ha na-elebara ndị di ha ma ọ bụ nne na nna ha nwụrụ anya. Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems dere, sị: “Ofufe dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’anya Chineke Nna anyị bụ: mmadụ inyere ụmụ na-enweghị nne na nna na ụmụ nwaanyị isi mkpe na-ata ahụhụ aka, nakwa mmadụ ịhụ na ụwa a emebighị ya.”—Jems 1:27.
SEPTEMBA 16-22
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 85-87
Ekpere Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi
Ị̀ Na-egbukepụ Ebube Jehova?
10 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-egbukepụ ebube Chineke, anyị kwesịkwara ‘ịnọgidesi ike n’ekpere.’ (Rom 12:12) Anyị kwesịrị ikpe ekpere ka Jehova nyere anyị aka ijere ya ozi otú ọ chọrọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịrịọ ya ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, nyekwuo anyị okwukwe, nyekwa anyị ike imeri ọnwụnwa na ‘ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’ (2 Tim. 2:15; Mat. 6:13; Luk 11:13; 17:5) Otú ahụ nwatakịrị na-atụkwasị nna ya obi, anyị kwesịrị ịtụkwasị Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, obi. Ọ bụrụ na anyị arịọ ya ka o nyere anyị aka imekwu nke ọma n’ozi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-eme ya. Ka anyị ghara iche mgbe ọ bụla na anyị na-enye ya nsogbu! Kama nke ahụ, ka anyị jiri ekpere na-eto ya, na-ekele ya, na-arịọ ka o duzie anyị karịchaa mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa, na-arịọkwa ya ka o nyere anyị aka ife ya otú ga-ewetara aha nsọ ya otuto.—Ọma 86:12; Jems 1:5-7.
Otú Jehova Si Aza Ekpere Anyị
17 Gụọ Abụ Ọma 86:6, 7. Obi siri ọbụ abụ bụ́ Devid ike na Jehova nụrụ ekpere ya ma za ya. Obi kwesịkwara isi gị ike otú ahụ. Ndị a kọrọ akụkọ ha n’isiokwu a na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova na-enye anyị amamihe na ike anyị ga-eji die nsogbu ndị na-abịara anyị. O nwere ike iji ụmụnna anyị ma ọ bụ ndị na-anaghị efe ya ugbu a si n’ụzọ ụfọdụ nyere anyị aka.
18 O nwere ike ọ bụghị mgbe niile ka Jehova ga-aza ekpere anyị otú anyị tụrụ anya ya. Mana, anyị ma na ọ ga-aza ya. Ọ ga-enye anyị ihe dị anyị mkpa nakwa n’oge ọ dị anyị mkpa. N’ihi ya, akwụsịla ikpe ekpere. Nwee okwukwe na Jehova ga-aza ekpere gị. Ka obi siekwa gị ike na ọ ga na-elekọta gị ugbu a, nakwa na n’ụwa ọhụrụ ya, ọ ga-ewere “ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.”—Ọma 145:16.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 1058 ¶5
Obi
Mmadụ Iji ‘Obi Ya Niile’ Efe Chineke. Obi mmadụ ga-ezurịrị ezu tupu ya enwee ike ịrụ ọrụ nke ọma. Ma, obi ihe atụ anyị nwere ike ikewa ekewa. Devid kpere ekpere, sị: “Mee ka m jiri obi m niile na-atụ egwu aha gị.” Ihe a o kwuru gosiri na a bịa n’ihe gbasara ịhụnanya na ịtụ egwu, obi mmadụ nwere ike ikewa ekewa. (Ọma 86:11) E nwere ike onye ahụ agaghị eji ‘obi ya niile’ na-efe Chineke, kama, ọ ga-adị ṅaraṅara n’ofufe ọ na-efe ya. (Ọma 119:113; Mkpu. 3:16) Obi mmadụ nwekwara ike ịdị ‘abụọ’ (otú e si dee ya na Hibru bụ “otu obi nakwa otu obi”), ya bụ, na onye ahụ na-agbalị ijere nna ukwu abụọ ozi, ma ọ bụ na ọ na-aghọ aghụghọ, ya na-ekwu otu ihe, ya ana-eche ihe ọzọ n’obi ya. (1 Ihe 12:33; Ọma 12:2) Jizọs katọrọ ndị na-eme ụdị ihu abụọ a.—Mat. 15:7, 8.
SEPTEMBA 23-29
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 88-89
Ọ Bụ Ọchịchị Jehova Kacha Mma
Na-akwado Ọchịchị Jehova
5 E nwere ihe ọzọ mere o ji bụrụ Jehova kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. O kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Onye na-egosi obiọma, na-ekpekwa ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume n’ụwa; n’ihi na ọ bụ ihe ndị a na-atọ m ụtọ.” (Jere. 9:24) Ọ naghị eji iwu ụmụ mmadụ na-ezughị okè mere ekpebi ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Ọ na-eji uche ya amata ihe dị mma ọ ga-eme, jirikwa ya nye ụmụ mmadụ iwu ha ga na-erubere isi. Baịbụl kwuru na “ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala nke ocheeze” ya. N’ihi ya, ka obi sie anyị ike na iwu ya niile, ụkpụrụ ya, na ihe ndị o kpebiri ime ziri ezi. (Ọma 89:14; 119:128) Setan agaghị emeli ka ikpe ziri ezi dịrị n’ụwa n’agbanyeghị na o kwuru na otú Jehova si achị adịghị mma.
Na-akwado Ọchịchị Jehova
10 Jehova anaghị achị ọchịchị aka ike. Ọ na-eme ka ndị ọ na-achị nwere onwe ha, meekwa ka ha na-enwe obi ụtọ. (2 Kọr. 3:17) Devid kwuru banyere Chineke, sị: “Ebube na ịma mma dị n’ihu ya, ike na ọṅụ dịkwa n’ebe ọ nọ.” (1 Ihe 16:7, 27) Ọbụ abụ bụ́ Itan dere, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eti mkpu ọṅụ. Jehova, ọ bụ n’ìhè nke ihu gị ka ha na-eje ije. Ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihi aha gị ogologo ụbọchị dum, a na-ebuli ha elu site n’ezi omume gị.”—Ọma 89:15, 16.
11 Ichebara ihe ọma Jehova na-emere anyị echiche ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na ọ bụ ọchịchị ya kacha mma. Obi ga-adị anyị otú ahụ ọ dị otu ọbụ abụ, bụ́ onye kwuru, sị: “Otu ụbọchị n’ogige gị dị mma karịa otu puku ụbọchị n’ebe ọzọ.” (Ọma 84:10) A naghị ajụ ajụ ma ihe a ọ̀ bụ eziokwu. Ebe ọ bụ Jehova kere anyị ma nye anyị ndụ, ọ ma ihe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ. Ọ na-enyekwa anyị ọtụtụ ihe ga-eme anyị obi ụtọ. Ihe ọ bụla ọ sịrị anyị mee ga-abara anyị uru, bụrụkwa ihe ga-emecha mee ka anyị na-enwe obi ụtọ, ọ bụrụgodị na ọ pụtara na anyị ga-ahapụ ihe ụfọdụ.—Gụọ Aịzaya 48:17.
Nwee Okwukwe Siri Ike n’Alaeze Chineke
14 Chegodị banyere nkwa Jehova kwere Eze Devid chịrị Izrel n’oge ochie. A kpọrọ nkwa ahụ ọgbụgba ndụ Devid. (Gụọ 2 Samuel 7:12, 16.) Ọ bụ mgbe Devid na-achị na Jeruselem ka ya na Jehova gbara ndụ a. Jehova kwere ya nkwa na Mesaya ga-esi n’agbụrụ ya. (Luk 1:30-33) Jehova si otú a mee ka a matakwuo ezinụlọ a ga-esi na ya mụta Mesaya. O kwukwara na ọ bụ nwa Devid bụ “onye o ruuru” ịnọkwasị n’ocheeze nke Alaeze Mesaya. (Ezik. 21:25-27) Ọchịchị Devid ga-adịru mgbe ebighị ebi n’ihi na Jizọs bụ́ nwa Devid “ga-anọru mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa dị ka anyanwụ.” (Ọma 89:34-37) Obi kwesịrị isi anyị ike na ime wuru wuru agaghị abata n’ọchịchị Mesaya. Ihe ọma ọchịchị ya ga-eweta ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
“Onye Àmà nke Nọ na Mbara Igwe Kwesịrị Ntụkwasị Obi”
Ọnwa na-agba ụwa gburugburu kwa ụbọchị 27 na awa atọ. N’ihi ya, ikwu na ọnwa na-ekwesị ntụkwasị obi nwere ike ịdị na-egosi na ọ bụ ihe a pụrụ ịdabere na ya. Otú ọ dị, ọbụ abụ ahụ nwere ike ibu ihe ka mkpa ọ pụtara n’uche. N’abụ amụma ọ bụrụ banyere Alaeze ahụ Jizọs kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere maka ya, ọ kpọrọ ọnwa “onye àmà kwesịrị ntụkwasị obi.”—Matiu 6:9, 10.
Ihe karịrị puku afọ atọ gara aga, Jehova Chineke gbara ndụ inye Eze Devid nke Izrel oge ochie Alaeze. (2 Samuel 7:12-16) Nzube nke ọgbụgba ndụ ahụ bụ ime ka Jizọs Kraịst, bụ́ onye nketa nke ocheeze Devid, nwee ikike iwu kwadoro ịnọkwasị n’ocheeze ahụ ruo mgbe ebighị ebi. (Aịsaịa 9:7; Luk 1:32, 33) Mgbe ọbụ abụ ahụ na-ekwu banyere ocheeze nke “mkpụrụ” Devid, ọ bụrụ, sị: “Dị ka ọnwa ka ọ ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi; ọzọ onye àmà nke nọ na mbara igwe kwesịrị ntụkwasị obi.”—Abụ Ọma 89:36, 37.
‘Ihe ukwu ahụ na-enye ìhè n’abalị’—ọnwa—bụ nnọọ ihe na-echetara anyị na ịchịisi Kraịst ga-adịgide adịgide. (Jenesis 1:16) Daniel 7:14 kwuru banyere Alaeze ya, sị: “Ọchịchị Ya bụ ọchịchị ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga, ọ bụkwa alaeze Ya bụ nke a na-agaghị emebi.” Ọnwa bụ onye àmà nke na-echetara anyị Alaeze ahụ na ngọzi ndị ọ ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ.
SEPTEMBA 30–ỌKTOBA 6
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 90-91
Ị Chọọ Ịdị Ogologo Ndụ, Tụkwasị Jehova Obi
Mbọ Ndị Mmadụ Na-agba Ka Mmadụ Na-adị Ogologo Ndụ
Ọ bụghị ndị sayensị niile kwetara na ọgwụ ndị na-egbochi ịka nká ngwa ngwa ga-eme ka ndị mmadụ na-adị ogologo ndụ karịa ka ha na-adị. N’eziokwu, kemgbe ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga, ndị mmadụ na-adịkwu ogologo ndụ karịa ka ha na-adịbu. Ihe kpatara ya bụ na ndị mmadụ na-adịkwu ọcha, e nweekwala ọgwụ ndị e ji agwọ ọrịa nakwa ndị e ji egbochi ọrịa. Ụfọdụ ndị na-amụ banyere ahụ́ mmadụ kwuru na ụmụ mmadụ agaghị adị ndụ ogologo karịa ka ha na-adị taa.
N’ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga, otu onye so dee Baịbụl, aha ya bụ Mozis, kwuru, sị: “Afọ ndụ anyị na-adị afọ iri asaa; ọ bụrụkwa na anyị enwee ike pụrụ iche, ha na-adị afọ iri asatọ, ma ha jupụtara ná nsogbu na ihe ọjọọ; n’ihi na ha ga-agafe ngwa ngwa, anyị ewee ghara ịnọkwa.” (Abụ Ọma 90:10) N’agbanyeghị mbọ ndị mmadụ na-agba iji mee ka anyị na-adị ogologo ndụ, afọ ndụ anyị ka na-adị otú ahụ Mozis kwuru.
Ma, e nwere ihe ndị bi ná mmiri na-anọfe narị afọ abụọ, nweekwa osisi ndị na-anọ ọtụtụ puku afọ. Ọ bụrụ na anyị ejiri afọ ole anyị na-adị ndụ tụnyere nke ihe ndị a na ihe ndị ọzọ dị ndụ, anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ndụ a anyị na-adị afọ iri asaa ma ọ bụ iri asatọ nwụọ, ọ̀ bụ ebe okwu biri?’
wp19.1 5, igbe
Gịnị Bụ Aha Chineke?
Ònye Kere Chineke?
Ihe a bụ ajụjụ ọtụtụ ndị cherela gbasara ya. O nwere ike ịbụ na gịnwa echetụkwala ya. Otú ọzọ anyị nwere ike isi jụọ ajụjụ ahụ bụ: Ọ bụrụ na eluigwe na ụwa na ihe niile dị na ha nwere onye kere ha, ònyezi kere Chineke?
Ndị sayensị kwetara na eluigwe na ụwa nwere mmalite. Ihe a ha kwuru dabara n’ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl kwuru, sị: “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.”—Jenesis 1:1.
Eluigwe na ụwa agaghị ekeli onwe ha. Ọ gaghịkwanụ anọkatalị dịrị. Ihe dị adị agaghị esili n’ihe na-adịghị adị pụta. Ọ bụrụ na e nweghị onye dị adị tupu eluigwe na ụwa, a garaghị enwe eluigwe na ụwa taa. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-esiri anyị ike ịghọta na e nwere onye dị adị, a na-ekeghị eke, kere eluigwe na ụwa. Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke, onye bụ́ mmụọ kacha ike, kere ihe niile.—Jọn 4:24.
Baịbụl kwuru gbasara Chineke, sị: “Tupu a mụọ ugwu dị iche iche, ma ọ bụ, tupu ị mụpụta ụwa na elu ala dị ka à ga-asị na ime mere gị, ọbụna site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi, ị bụ Chineke.” (Abụ Ọma 90:2) N’eziokwu, e nweghị onye kere Chineke, ọ dị adị mgbe niile. “Ná mmalite,” o kere eluigwe na ụwa.—Mkpughe 4:11.
Otú Ịhụ Chineke n’Anya Si Eme Ka Anyị Kwụsị Ịtụ Ụjọ
16 Setan ma na ndụ anyị dị anyị ezigbo mkpa. Ma, o kwuru na anyị nwere ike ịhapụ ihe ọ bụla, ma adịm ná mma anyị na Jehova, iji mee ka anyị dịrị ndụ n’ụwa ochie a. (Job 2:4, 5) Ihe a Ekwensu kwuru bụ okpookpo ụgha. Ma, ebe o “nwere ikike ịkpata ọnwu,” ọ na-agbalị iji ụjọ ọnwụ a anyị na-atụ eme ka anyị kwụsị ife Jehova. (Hib. 2:14, 15) Mgbe ụfọdụ, ndị Ekwensu ji arụ ọrụ na-eyi ndị Jehova egwu na ha ga-egbu ha ma ọ bụrụ na ha akwụsịghị ife Chineke. Mgbe ụfọdụkwa, Ekwensu nwere ike iji ọrịa na-arịasi anyị ike gbalịa ime ka anyị nupụrụ Chineke isi. Ndị dọkịta ma ọ bụ ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova nwere ike ịna-enye anyị nsogbu ka anyị kweta ka a mịnye anyị ọbara, bụ́kwanụ ihe Jehova sịrị anyị emela. Mmadụ nwekwara ike ịgbalịwa ka anyị kweta ka e si n’ụzọ Baịbụl na-akwadoghị gwọọ anyị ọrịa.
17 Ọ bụ eziokwu na anyị achọghị ịnwụ, ma, anyị ma na Jehova agaghị akwụsị ịhụ anyị n’anya ọ bụrụgodị na anyị anwụọ. (Gụọ Ndị Rom 8:37-39.) Ọ bụrụ na enyi Jehova anwụọ, ọ ka na-echeta ya. N’anya ya, onye ahụ ka dị ndụ. (Luk 20:37, 38) Ọ na-agụsi ya agụụ ike ịkpọlite onye ahụ n’ọnwụ. (Job 14:15) Jehova kwụrụ nnukwu ụgwọ ka anyị “nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Anyị ma na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, na-elekọtakwa anyị. N’ihi ya, kama ịhapụ Jehova ma ọrịa bịa anyị ma ọ bụkwanụ ma e yie anyị egwu ọnwụ, anyị ga-atụkwasị ya obi na ọ ga-akasi anyị obi, nyekwa anyị amamihe na ike anyị ga-eji die ya. Ọ bụ ihe a ka Nwanna Nwaanyị Valérie na di ya mere.—Ọma 41:3.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ì Nwere Mmụọ Ozi Na-eche Gị Nche?
Baịbụl anaghị akụzi na onye ọ bụla nwere mmụọ ozi na-eche ya nche. Ma, e nwere mgbe Jizọs sịrị: “Hụnụ na unu eledaghị otu n’ime ndị a dị nta [ya bụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst] anya, n’ihi na ana m asị unu na ndị mmụọ ozi ha ndị nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe mgbe niile.” (Matiu 18:10) Ihe a o kwuru apụtaghị na onye ọ bụla nwere mmụọ ozi na-eche ya nche. Kama, ihe Jizọs na-ekwu bụ na ndị mmụọ ozi nwere mmasị n’ebe onye ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ ya nọ. N’ihi ya, ndị na-efe Chineke otú ọ chọrọ anaghị eme ihe ga-emerụ ha ahụ́ ma ọ bụ ihe ga-ata isi ha, na-eche na ndị mmụọ ozi Chineke ga-echebe ha.
Ọ̀ pụtara na ndị mmụọ ozi anaghị enyere ndị mmadụ aka? Mba. (Abụ Ọma 91:11) Ụfọdụ ndị kwetasiri ike na Chineke ejitụla ndị mmụọ ozi ya chebe ha ma ọ bụ duzie ha. Kenneth anyị kwuru gbasara ya ná mbido Ụlọ Nche a bụ otu n’ime ha. Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị asịrịrị na ọ bụ ndị mmụọ ozi mere ka Kenneth kpọọ nwaanyị ahụ n’ekwentị, ma ihe o kwuru nwere ike ịbụ eziokwu. Ndịàmà Jehova na-ahụkarị ihe gosiri na ndị mmụọ ozi na-enyere ha aka mgbe ha na-ekwusa ozi ọma. Ma, ebe ọ bụ na anyị anaghị ahụ ndị mmụọ ozi anya, anyị agaghị ekwuli ihe niile banyere otú Chineke si eji ha enyere ndị mmadụ aka n’ihe dị iche iche. N’ihi ya, ọ gaghị adị njọ ma anyị kelee Onye Pụrụ Ime Ihe Niile maka otú ọ bụla o si nyere anyị aka.—Ndị Kọlọsi 3:15; Jems 1:17, 18.
ỌKTOBA 7-13
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 92-95
Ife Jehova Bụ Ihe Kacha Mma Mmadụ Nwere Ike Iji Ndụ Ya Eme
Ndị Na-eto Eto, Ùnu Na-elekwasị Anya n’Ihe Unu Kpebiri Ime n’Ozi Jehova?
5 Ihe kacha mkpa mere anyị ji ekpebi ihe ndị anyị ga-eme n’ozi Jehova bụ ka anyị gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka otú o si hụ anyị n’anya, nakwa n’ihi ihe ndị o meere anyị. Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Ọ dị mma ikele Jehova ekele . . . N’ihi na gị onwe gị, Jehova, emewo ka m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi ọrụ gị; m na-eti mkpu ọṅụ n’ihi ọrụ aka gị.” (Ọma 92:1, 4) Ebe ị bụ onye na-eto eto, chee gbasara ihe niile Jehova meerela gị. O nyere gị ndụ, Baịbụl, ọgbakọ ya, mee ka ị mụta eziokwu Baịbụl, meekwa ka i nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. I kpebie ihe ndị ị ga-eme n’ozi Jehova, ị na-egosi Jehova na obi dị gị ụtọ maka ihe ọma ndị a. Nke a ga-eme ka ị bịarukwuo ya nso.
Ònye Na-akpụgharị Echiche Gị?
8 Jehova bụ ezigbo Nna. Ọ chọrọ ka ihe gaziere ụmụ ya. (Aịza. 48:17, 18) Ọ bụ ya mere o ji akụziri anyị ime omume ọma na ịna-akpaso ndị ọzọ àgwà ọma. Ọ chọrọ ka anyị na-eche echiche ka ya ma na-ele ihe anya otú o si ele ya. Ihe ndị a anaghị ekegide anyị, kama ha na-enyere anyị aka ịna-eche echiche nke ọma. (Ọma 92:5; Ilu 2:1-5; Aịza. 55:9) Iche echiche ka Chineke agaghị egbochi anyị iji aka anyị na-ekpebiri onwe anyị ihe ụfọdụ na-amasị anyị, kama ọ ga-eme ka anyị na-eme mkpebi ndị ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. (Ọma 1:2, 3) N’eziokwu, iche echiche ka Jehova ga-abara anyị ezigbo uru.
Jehova Bụ́ Chineke Gị Ji Gị Kpọrọ Ihe
18 Ka anyị na-aka nká, obi kwesịrị isi anyị ike na a ka nwere ọrụ Jehova chọrọ ka anyị rụọ. (Ọma 92:12-15) Jizọs kụziiri anyị na Jehova ji ihe ọ bụla anyị ga-emeli n’ozi ya kpọrọ ihe n’agbanyeghị otú ike anyị hà ma ọ bụ otú o si dị anyị ka ihe ahụ ọ̀ dị obere. (Luk 21:2-4) N’ihi ya, na-eme ihe ndị ị ga-emeli. Dị ka ihe atụ, ị ga-agwali ndị ọzọ gbasara Jehova, chetakwa ụmụnna gị n’ekpere ma gbaa ndị ọzọ ume ka okwukwe ha sie ike. Jehova weere gị ka onye ya na ya na-arụkọ ọrụ maka na ị na-erubere ya isi, ọ bụghị maka ihe ị rụrụ.—1 Kọr. 3:5-9.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
‘Lee Ịdị Omimi nke Amamihe Chineke!’
18 Rịba ama otú Pọl onyeozi si kọwaa ịpụ iche nke amamihe Jehova: “Lee ịdị omimi nke akụ̀ na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke! Lee otú ikpe ya si bụrụ ndị a na-apụghị inyochapụta enyochapụta na otú ụzọ ya si bụrụ ndị a na-apụghị ịchọpụta achọpụta!” (Ndị Rom 11:33) Site n’iji okwu iti mkpu bụ́ “Lee,” meghee amaokwu a, Pọl gosipụtara oké mmetụta o nwere—n’ebe a, egwu nsọpụrụ dị omimi. Okwu Grik ọ họọrọ iji mee ihe maka “ịdị omimi” na okwu e ji eme ihe maka “abis” nwere njikọ chiri anya. N’ihi ya, okwu ya na-akpali mmadụ iji anya nke uche ya na-ese onyinyo doro anya. Mgbe anyị na-atụgharị uche n’amamihe Jehova, ọ na-adị ka à ga-asị na anyị na-enyobanye anya n’olulu nke na-enweghị nsọtụ, nke na-enweghị njedebe, ógbè miri nnọọ emi, nke sara nnọọ mbara nke na ọ dịghị mgbe anyị ga-enwe ike ịghọta otú o bururu n’ibu, ka ọ fọdụzie ịkọwa ya ma ọ bụ isepụta ya nke ọma. (Abụ Ọma 92:5) Nke ahụ ọ́ bụghị echiche na-eme ka mmadụ wetuo onwe ya ala?
ỌKTOBA 14-20
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 96-99
“Na-ekwusanụ Ozi Ọma”
Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?
NDỊ KRAỊST ga-ekwusa “ozi ọma . . . nke alaeze” site n’ịgwa ndị ọzọ maka ya, na-akọwara ha na Alaeze ahụ bụ ọchịchị nke ga-achị ụwa dum n’ezi omume n’ọdịnihu. Ma, e kwukwara okwu banyere ụdị “ozi ọma” ndị ọzọ na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, e kwuru banyere “ozi ọma banyere nzọpụta” (Abụ Ọma 96:2); “ozi ọma banyere Chineke” (Ndị Rom 15:16); na “ozi ọma banyere Jizọs Kraịst.”—Mak 1:1.
Ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ihe ndị so n’ozi ọma ahụ bụ eziokwu niile Jizọs kwuru okwu ha na ndị ndị na-eso ụzọ ya dere banyere ha. Tupu Jizọs arịgoro eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ya mere, ọrụ ezi Ndị Kraịst abụghị naanị ịgwa ndị mmadụ banyere Alaeze ahụ; ha ga-agbarịrị mbọ ime ndị na-eso ụzọ.
Gịnị Ga-eme n’Ụbọchị Ikpe?
Dị ka foto dị n’aka nri na peeji a na-egosi, ọtụtụ ndị chere na n’Ụbọchị Ikpe, ọtụtụ ijeri mkpụrụ obi ga-ezukọta n’ihu ocheeze Chineke, e kpee ha ikpe maka ihe ndị ha mere n’oge gara aga. Mgbe e kpechara ha ikpe, ụfọdụ n’ime ha ga-aga eluigwe, ebe ndị ọzọ ga-aga ọkụ mmụọ gaa tawa ahụhụ. Ma Baịbụl gosiri na ihe mere a ga-eji enwe Ụbọchị Ikpe bụ ka a napụta ndị mmadụ n’ahụhụ niile ha na-ata. (Abụ Ọma 96:13) Chineke ahọpụtala Jizọs ka ọ bụrụ Onyeikpe nke ga-eme ka ụmụ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ.—Gụọ Aịzaya 11:1-5; Ọrụ 17:31.
Udo Nke Ga-adịru Otu Puku Afọ Nakwa Mgbe Ebighị Ebi!
18 Mgbe Setan mere ka ụmụ mmadụ nupụrụ ọchịchị Jehova isi, udo adịghịzi n’etiti Chineke na ihe niile o kere eke. Ma, kemgbe afọ 1914, Alaeze Mesaya amalitela iji nwayọọ nwayọọ na-eweghachi udo na ịdị n’otu ahụ dịbu n’etiti Chineke na ndị o kere eke. (Efe. 1:9, 10) N’Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, ọtụtụ ihe ndị magburu onwe ha “a na-adịghị ahụ anya” ugbu a ga-eme. Mgbe ahụzi, “ọgwụgwụ ga-abịa,” ya bụ, ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ Kraịst. Gịnị ga-eme mgbe ahụ? N’agbanyeghị na e nyere Jizọs “ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa,” o nweghị oké ọchịchọ. Ọ dịghị mgbe o bu n’obi ịnara Jehova ọkwá ya. Ọ ga-eji obi umeala ‘nyefee alaeze ahụ n’aka Chineke na Nna ya.’ Ọ ga-eji ọkwá pụrụ iche na ikike e nyere ya ‘wetara Chineke otuto.’—Mat. 28:18; Fil. 2:9-11.
19 N’oge ahụ, ndị Alaeze ahụ na-achị n’ụwa ga-ezu okè. Ha ga-eṅomi Jizọs ma jiri obi umeala na-erubere ọchịchị Jehova isi. Ha ga-egosi na ha ji obi ha niile na-erubere Jehova isi ma ha gafee ule ikpeazụ ahụ. (Mkpu. 20:7-10) Mgbe nke ahụ gachara, a ga-ebibi ndị nnupụisi niile, ma ụmụ mmadụ ma ndị mmụọ ọjọọ, ruo mgbe ebighị ebi. Oge ahụ ga-abụ oge oké ọṅụ! Ndị niile nọ n’ezinụlọ Jehova ma n’eluigwe ma n’ụwa ga-eji obi ụtọ too Jehova, ọ ga-abụkwa “ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.”—Gụọ Abụ Ọma 99:1-3.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 994
Abụ
Ọ bụghị naanị n’Abụ Ọma ka e kwuru gbasara “abụ ọhụrụ.” E kwukwara gbasara ya n’akwụkwọ Aịzaya dere nakwa nke Jọn onyeozi dere. (Ọma 33:3; 40:3; 96:1; 98:1; 144:9; 149:1; Aịza. 42:10; Mkpu. 5:9; 14:3) Mmadụ leba anya n’ihe e kwuru gburugburu ọtụtụ ebe e dere “abụ ọhụrụ” na Baịbụl, ọ ga-achọpụta na a na-abụ abụ a mgbe e nwere ihe ọhụrụ merenụ na-egosi na Jehova bụ ọkaakaa eluigwe na ụwa. Ọ bụ ya mere e ji jiri obi ụtọ kwuo n’Abụ Ọma 96:10, sị: “Jehova abụrụla Eze.” Ọ ga-abụ na isi ihe “abụ ọhụrụ” a na-ekwu bụ na e nweela ihe ọhụrụ ndị merenụ na-egosi na ọchịchị Jehova agbasakwuola nakwa na e nwere otú ihe ọhụrụ ndị ahụ si gbasa eluigwe na ụwa.—Ọma 96:11-13; 98:9; Aịza. 42:10, 13.
ỌKTOBA 21-27
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 100-102
Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ịhụnanya Pụrụ Iche nke Jehova
Otú Ị Ga-esi Jikere Ime Baptizim
18 Ịhụ Jehova n’anya bụ àgwà magburu onwe ya i nwere ike inwe. (Gụọ Ilu 3:3-6.) Ịhụ Jehova n’anya nke ukwuu nwere ike inyere gị aka imeri nsogbu ndị ga-abịara gị. Baịbụl na-ekwukarị gbasara ịhụnanya pụrụ iche Jehova nwere n’ebe ndị ohu ya nọ. Ihe a pụtara na Jehova agaghị ahapụ ndị ohu ya ma ọ bụkwanụ kwụsị ịhụ ha n’anya. (Ọma 100:5) Jehova kere gị n’oyiyi ya. (Jen. 1:26) Olee otú ị ga-esi gosi ụdị ịhụnanya ahụ?
19 Obi kwesịrị ịdị gị ụtọ maka ihe ọma ndị Jehova na-emere gị. (1 Tesa. 5:18) Kwa ụbọchị, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú Jehova si gosi na ọ hụrụ m n’anya?’ Gbaakwa mbọ kelee Jehova n’ekpere. Kpọọ ihe ndị o meere gị aha, keleekwa ya maka ha. Were ya na Jehova na-emere gịnwa ihe ọma n’ihi na ọ hụrụ gị n’anya otú ahụ Pọl onyeozi ghọtara na Jehova hụrụ ya n’anya. (Gụọ Ndị Galeshia 2:20.) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ chọrọ igosi Jehova na m hụrụ ya n’anya otú o si hụ m n’anya?’ Ịhụ Jehova n’anya nwere ike inyere gị aka imeri ọnwụnwa na nsogbu ndị na-abịara gị. Ọ ga-eme ka anyị na-emechi ihe ndị gbasara ofufe Chineke anya, na-egosi ụbọchị niile na anyị hụrụ Nna anyị nke eluigwe n’anya.
“Na-echenụ Echiche Nke Ọma, Na-echekwanụ Nche”
10 Ihe ụfọdụ anyị kwesịrị izere bụ ịchụ nwoke ma ọ bụ ịchụ nwaanyị, ịṅụ oké mmanya, iwe iwe ọkụ, ikwu okwu ọjọọ, ile ndị na-eme tigbuo zọgbuo, ile ndị gba ọtọ, na ihe ndị ọzọ yiri ha. (Ọma 101:3) Ekwensu bụ́ onye iro anyị na-agbasi mbọ ike mgbe niile ka ọ hụ na anyị mere ihe ga-eme ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. (1 Pita 5:8) Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, Ekwensu nwere ike ime ka anyaụfụ, aghụghọ, anyaukwu, ịkpọ ndị mmadụ asị, mpako, ma ọ bụkwanụ iburu ndị mmadụ iwe n’obi batawa anyị n’obi. (Gal. 5:19-21) Na mbụ, anyị nwere ike iche na o nweghị ihe ihe ndị a mere. Ma, ọ bụrụ na anyị agbaghị mbọ ozugbo wepụ ha n’obi anyị, ha nwere ike ịgbanye mgbọrọgwụ n’obi anyị ma kpatara anyị nsogbu.—Jems 1:14, 15.
Ị̀ Ga-ege Ntị n’Ịdọ Aka ná Ntị Doro Anya Jehova Na-enye Anyị?
7 Olee ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime ka anyị nwee ike izere ndị ozizi ụgha? Anyị ekwesịghị ịnabata ha n’ụlọ anyị ma ọ bụ kelee ha. Anyị ekwesịghịkwa ịgụ akwụkwọ ha, ma ọ bụ kirie ihe ndị ha na-eme na tiivi, ma ọ bụ gaa ebe ndị ha na-edebe ihe n’Ịntanet, ma ọ bụkwanụ gaa n’Ịntanet dee ihe anyị chere banyere ihe ha dere n’Ịntanet. Gịnị mere anyị ji kwesị ikpebisi ike na anyị agaghị eme ihe ndị a? Ọ bụ n’ihi na anyị hụrụ “Chineke nke eziokwu” n’anya, anyị achọghịkwa ige ntị n’ozizi ndị gbagọrọ agbagọ, bụ́ ndị na-emegide eziokwu nke Okwu Chineke. (Ọma 31:5; Jọn 17:17) Anyị hụkwara nzukọ Jehova n’anya. Ọ bụ ebe anyị nọ mụta eziokwu ndị na-enye anyị obi ụtọ, ndị dị ka, aha Jehova na ihe ọ pụtara, nzube Chineke maka ụwa, ihe bụ́ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, na olileanya mbilite n’ọnwụ. Ị̀ ga-echetali otú obi dị gị mgbe mbụ ị mụtara eziokwu ndị a na eziokwu ndị ọzọ bara ezigbo uru? Oleezi ihe mere ị ga-eji kwe ka ndị na-ekwutọ nzukọ Jehova mee ka i soro ha na-ekwutọ ebe ị nọ mụta eziokwu ndị a niile?—Jọn 6:66-69.
8 Ihe ọ sọkwara ndị ozizi ụgha ha kwuo, anyị agaghị eso ha! O nweghị ihe kwesịrị ime ka anyị gewe ndị dị ka olulu mmiri nke mmiri na-adịghị ntị. Kama igewe ha ntị, ka anyị kpebisie ike iguzosi ike n’ebe Jehova nọ na ịnọsi ike ná nzukọ nke nọ kemgbe ụwa na-enye anyị mmiri dị ọcha si n’Okwu Chineke, bụ́ nke na-eme ka anyị nwee ume.—Aịza. 55:1-3; Mat. 24:45-47.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 596
Okwolo
Ọ na-abụ okwolo rijuo nri afọ, ọtụtụ mgbe, ọ na-efere gaa ebe naanị ya ga-anọ. N’ebe ahụ, ọ na-anọrọ ka onye ike ụwa gwụrụ, dowe isi ya n’ubu ya. Ọ na-anọrọ otú ahụ n’emegharịghị ahụ́ nke na onye nọ ebe dị anya na-ele ya ga-eche na ọ bụ nkume na-acha ọcha. Nnụnụ a na-anọ otú a ruo ọtụtụ awa. Ọ bụ ya mere o ji daba adaba na otu ọbụ abụ kwuru na ya yiri okwolo mgbe ọ nọ naanị ya na-eru uju. O dere, sị: “M yiri okwolo nke nọ n’ala ịkpa.” (Ọma 102:6) Ihe ‘ala ịkpa’ a pụtara abụghị naanị ebe bụ́ ọzara. Kama, ọ pụtakwara ebe ndị mmadụ na-ebighị ma ọ bụ ebe mmiri na-adọ. N’oge ụfọdụ n’afọ, okwolo ka na-anọkarị n’ebe mmiri na-adọ n’ebe ugwu Ndagwurugwu Jọdan. E nwere ụdị okwolo atọ a na-ahụ n’Izrel. Nke a na-ahụkarị na ya bụ okwolo na-acha ọcha na-adị n’ebe ọwụwa anyanwụ (Pelecanus onocrotalus). A naghị ahụkarị nke a na-akpọ okwolo Dalmeshia (Pelecanus crispus) na okwolo azụ ya na-acha pịnk pịnk (Pelecanus rufescens).
Okwolo na-achọkarị ịnọ n’ebe ndị a na-arụghị ọrụ ubi na ha, ka ndị mmadụ ghara inye ya nsogbu. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ha na-akpa akwụ́ ha, yie àkwá ma bụọ àkwá ha. Ọ bụkwa ebe ha na-aga nọrọ ma ha gbutechaa azụ̀. Ebe ọ bụ na nnụnụ a na-anọkarị naanị ya n’ebe dakpọsịrị adakpọsị, ọ na-anọchi anya mbibi na Baịbụl. Iji gosi na a ga-ebibi Ịdọm, Aịzaya buru amụma na okwolo ga-ebichi ya. (Aịza. 34:11) Zefanaya buru amụma na okwolo ga-ebi n’isi ogidi obodo Ninive. Ihe a gosiri na a ga-ebibi ya kpamkpam, mmadụ agaghịzi ebi na ya.—Zef. 2:13, 14.
ỌKTOBA 28–NỌVEMBA 3
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE ABỤ ỌMA 103-104
“Ọ Na-echeta na Anyị Bụ Ájá”
Na-ele Ihe Anya Otú Kwesịrị Ekwesị Ka Jehova
5 Jehova dị umeala n’obi ma na-eme ebere. Ọ bụ ya mere o ji ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, Jehova gosiri na ọ dị umeala n’obi mgbe ọ chọrọ ibibi ndị ọjọọ bi na Sọdọm. O si n’ọnụ ndị mmụọ ozi ya gwa Lọt, bụ́ onye ezi omume, ka ọ gbaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu. Ụjọ nọ na-atụ Lọt ịgbaga ebe ahụ. N’ihi ya, ọ rịọrọ Jehova ka ọ hapụ ya na ndị ezinụlọ ya ka ha gbaga na Zoa, bụ́ obere obodo Jehova chọkwara ibibi. A sị na Jehova chọrọ, ọ gaara agwa Lọt na ọ ga-emerịrị ihe o kwuru n’ewepụghị ya ihe ọ bụla. Kama ime otú ahụ, o mere ihe Lọt rịọrọ ya, ọ bụ eziokwu na ọ ga-eme ka ọ ghara ibibi obodo Zoa. (Jen. 19:18-22) Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, Jehova meteere ndị bi na Ninive ebere. O zigara onye amụma ya bụ́ Jona ka ọ gaa gwa ha na a ga-ebibi obodo ahụ na ndị ọjọọ bi na ya n’oge na-adịghị anya. Ma ndị Ninive chegharịrị, Jehova emeere ha ebere ma hapụ ibibi ha.—Jona 3:1, 10; 4:10, 11.
Tụkwasị Jehova Obi Ka Samsịn
16 Ọ bụ eziokwu na e nwere ihe ụfọdụ na-adịghị mma mere Samsịn n’ihi ihe o mejọrọ, ọ kwụsịghị ịgbalị ime uche Jehova. Ọ bụrụgodị na anyị emejọọ ihe, a dọọ anyị aka ná ntị ma ọ bụ kwụsị anyị ọrụ ụfọdụ anyị na-arụ, anyị ekwesịghị ịkwụsị ife Jehova. Cheta na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị. (Ọma 103:8-10) N’agbanyeghị ihe anyị mejọrọ, anyị ka nwere ike ịbara Jehova uru otú ahụ Samsịn mere.
17 Legodị akụkọ otu nwanna na-eto eto aha ya bụ Michael. Ọ nọ na-agba ezigbo mbọ n’ozi Jehova. Ọ bụ ohu na-eje ozi na ọsụ ụzọ oge niile. Ma ọ dị mwute na o nwere ihe o mejọrọ nke mere ka a napụ ya ọrụ ndị ahụ ọ na-arụ n’ọgbakọ. Ọ sịrị: “Tupu ihe ahụ emee, m na-eme nnọọ nke ọma n’ofufe Jehova. Ma, na mberede, ọ bịaziri dị m ka o nweghị ihe ọ bụla m ga-emeli n’ozi Jehova. O nwebeghị mgbe m chere na Jehova ga-ahapụ m. Ma ọ na-abụ m nọtụ, mụ ana-eche ma mụ na ya ànyị ka ga-adị ná mma otú anyị dịbụ nakwa ma m̀ ka ga-enwe ike ịrụrụ ya ihe ndị ahụ m na-arụburu ya n’ọgbakọ.”
18 Ọ dị ezigbo mma na Michael akwụsịghị ife Jehova. Ọ sịrị: “M gbasiri mbọ ike ka mụ na Jehova dịwakwa ná mma. Otú m si mee ya bụ ịna-ekpechi ekpere anya, ịna-amụ ihe, na ịna-atụgharị uche n’ihe m na-amụ.” Michael mechakwara mewe nke ọma n’ọgbakọ. Ugbu a, ọ bụ okenye na ọsụ ụzọ oge niile. Ọ sịrị: “Ụmụnna nọ n’ọgbakọ, karịchaa ndị okenye, gbara m ume, kwadokwa m. O mere ka m mata na Jehova ka hụrụ m n’anya. Ejewekwala m ozi n’ọgbakọ ma nwee akọnuche dị ọcha. Ihe a mere m akụzierela m na Jehova ga-agbaghara onye ọ bụla ji obi ya niile chegharịa.” Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-eji anyị na-arụ ọrụ, gọziekwa anyị, ọ bụrụgodị na anyị mejọrọ ihe n’oge gara aga, ma ọ bụrụhaala na anyị na-agbasi mbọ ike ịgbanwe, na-atụkwasịkwa ya obi.—Ọma 86:5; Ilu 28:13.
Ị Ga-emeli Ihe Ndị I Kpebiri Ime n’Ofufe Jehova
2 Ọ bụrụ na e nwere ihe i kpebiri ime ugbu a ma i mebeghị ya, biko adala mbà. Ọtụtụ mgbe, anyị ga-agba ezigbo mbọ, ya eweekwa anyị oge, tupu anyị emee ihe anyị kpebiri ime, ọ bụrụgodị obere ihe. Ebe ọ bụ na ị ka na-agbalịsi ike ime ihe ahụ i kpebiri, ọ pụtara na i ji adịm ná mma gị na Jehova kpọrọ ihe. Ị chọkwara inye ya ihe kacha mma i nwere. Jehova ji mbọ ị na-agba kpọrọ ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ naghị atụ anya ka i mee ihe ị na-agaghị emeli. (Ọma 103:14; Maị. 6:8) N’ihi ya, ihe i kpebiri ime kwesịrị ịbụ ihe ị ga-emeli. Ọ bụrụ ihe ị ga-emeli, olee ihe ị ga-eme ka i nwee ike ime ya? Ka anyị leba anya n’aro ụfọdụ ga-enyere gị aka.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
Ike Ike Ihe—“Onye Meworo Eluigwe na Ụwa”
18 Gịnị ka anyị na-amụta site n’otú Jehova si eji ike ike ihe o nwere eme ihe? Ụjọ na-ejide anyị n’ihi ụdị ihe dịgasị iche iche e kere eke. Otu onye ọbụ abụ ji oké olu kwuo, sị: “Lee ka ọrụ Gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! . . . Ụwa jupụtara n’ihe I nwetara.” (Abụ Ọma 104:24) Lee ka nke ahụ si bụrụ eziokwu! Ndị ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ achọpụtawo ihe karịrị nnọọ otu nde ụdị ihe dịgasị iche iche dị ndụ n’ụwa; n’agbanyeghị nke ahụ, ha nwere echiche dịgasị iche iche banyere ma hà nwere ike iru ihe dị ka nde 10, nde 30, ma ọ bụ karịa. Omenkà bụ́ mmadụ pụrụ ịchọpụta mgbe ụfọdụ na ọ pụghịzi ichepụta ihe ọhụrụ. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, o doro anya na ike nchepụta ihe nke Jehova—ike o nwere ichepụta na ike ihe ọhụrụ dịgasị iche iche—enweghị mgbe ọ na-abịaru na nsọtụ.