Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 123
  • Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Chineke ò bi ebe Niile?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Nile?
    Teta!—2005
  • Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?
    Teta!—2011
  • Ụdị Onye Chineke Bụ
    Teta!—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 123
Kpakpando na anyanwụ dị na mbara igwe

Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?

Ihe Baịbụl kwuru

Chineke nwere ikike ịhụ ihe niile na ime ihe ọ bụla ọ chọrọ n’ebe ọ bụla. (Ilu 15:3; Ndị Hibru 4:13) Ma, Baịbụl anaghị akụzi na Chineke nọ ebe niile ma ọ bụ n’ihe niile. Kama, Baịbụl kwuru na Chineke bụ onye dị adị, nweekwa ebe o bi.

  • Otú Chineke dị: Chineke bụ mmụọ. (Jọn 4:24) Ụmụ mmadụ enweghị ike ịhụ ya anya. (Jọn 1:18) Na Baịbụl, ndị niile hụrụ Chineke n’ọhụụ kwuru na e nwere otu ebe Chineke nọ. E nwetụghị ebe e kwuru na ọ nọ ebe niile.​—Aịzaya 6:1, 2; Mkpughe 4:2, 3, 8.

  • Ebe Chineke bi: Chineke bi n’eluigwe, ma ọ bụghị eluigwe nke a anyị na-ahụ anya. Ọ bụ ebe ahụ ka Baịbụl kpọrọ ‘ebe obibi ya n’eluigwe.’ (1 Ndị Eze 8:30) Baịbụl kwuru na e nwere mgbe ndị mmụọ ozi “bịara guzo n’ihu Jehova.”a Nke a gosiri na e nwere ebe Chineke bi.​—Job 1:6.

Ọ bụrụ na Chineke anọghị ebe niile, ọ̀ na-eche gbasara m?

Ee. Chineke na-eche gbasara anyị niile n’otu n’otu. N’agbanyeghị na Chineke bi n’eluigwe, ọ na ahụ ndị niile na-efe ya n’ụwa, na echebekwa ha. (1 Ndị Eze 8:39; 2 Ihe E Mere 16:9) Ka anyị leba anya n’otú Jehova si egosi na ọ na-eche banyere ndị ji obi ha niile na-efe ya:

  • Mgbe ị na-ekpe ekpere: Jehova na-anụ ekpere gị ozugbo ahụ ị na-ekpe ya.​—2 Ihe E Mere 18:31.

  • Mgbe ị dara mba n’obi: “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; Ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”​—Abụ Ọma 34:18.

  • Mgbe ị na-amaghị ihe ị ga-eme: Jehova ga-eji Okwu ya bụ Baịbụl mee “ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ.”​—Abụ Ọma 32:8.

Ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu banyere ebe Chineke nọ

Ụgha: Chineke nọ n’ihe niile o kere eke.

Eziokwu: Chineke ebighị n’ụwa, o bighịkwanụ n’ebe ọ bụla anyị nwere ike ịhụ anya. (1 Ndị Eze 8:27) Ọ bụ eziokwu na kpakpando na ihe ndị ọzọ Chineke kere “na-akọsa ebube Chineke.” (Abụ Ọma 19:1) Ma, Chineke anaghị ebi n’ihe ndị o kere eke, otú ahụ onye na-ese ihe na-enweghị ike ibi n’ime ihe o sere ese.  Ma ihe e sere ese nwere ike ime ka a mata ihe ụfọdụ gbasara onye sere ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka ihe ndị Chineke kere eke na-eme ka a mata “àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya,” ndị dị ka ike ya, amamihe ya, na ịhụnanya ya.​—Ndị Rom 1:20.

Ụgha: Ọ ga-abụrịrị na Chineke nọ ebe niile tupu ya enwee ike ịma ihe niile, bụrụkwa onye kacha ike.

Eziokwu: Mmụọ nsọ bụ ike Chineke nọ n’ọrụ. Chineke na-eji mmụọ nsọ ya eme ihe ọ bula ọ chọrọ, n’ebe ọ bụla ọ chọrọ, na mgbe ọ bụla ọ chọrọ, n’anọghịdị ebe ahụ.​—Abụ Ọma 139:7.

Ụgha: Ihe Abụ Ọma 139:8 kwuru gosiri na Chineke nọ ebe niile. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na mụ agbagoo n’eluigwe, ị ga-anọ n’ebe ahụ; Ọ bụrụkwa na mụ agbasaa ihe ndina m na Shiol, lee! ị ga-anọ n’ebe ahụ.”

Eziokwu: Amaokwu Baịbụl a anaghị ekwu gbasara ebe Chineke nọ. Ihe ebe ahụ na-akọwa bụ na o nweghị ebe anyị ga-anọ, ya adịrị Chineke anya ichebe anyị.

a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya