-
Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ndụ Chineke Nyere GịNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
5. Jiri ndụ nwa e bu n’afọ kpọrọ ihe
Devid kwuru na Jehova ejighị ihe niile na-eme mmadụ mgbe a ka bu ya n’afọ egwu egwu. Gụọnụ Abụ Ọma 139:13-17. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
N’anya Jehova, ọ̀ bụ mgbe a tụụrụ ime mmadụ ka ọ̀ bụ mgbe a mụrụ ya ka ọ na-amalite ịdị ndụ?
Jehova nyere ndị Izrel iwu ndị nyere aka mee ka ihe ọ bụla ghara ime nwaanyị dị ime na nwa o bu n’afọ. Gụọnụ Ọpụpụ 21:22, 23. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú Jehova si ele mmadụ anya ma ihe o mere n’amaghị ama mee ka nwa e bu n’afọ nwụọ?
Olee otú obi ga-adị ya ma mmadụ kpachara anya gbuo nwa e bu n’afọ?b
Olee otú obi dị gị maka otú a Chineke si ele onye gburu nwa e bu n’afọ anya?
Nwaanyị ji ndụ kpọrọ ihe nwedịrị ike iche na e nweghị ihe ọzọ ọ ga-eme ma ọ́ bụghị ite ime. Gụọnụ Aịzaya 41:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Ọ bụrụ na otú ihe si dịrị nwaanyị emee ka ọ dị ka e nweghị ihe ọzọ ọ ga-eme ma ọ́ bụghị ite ime, onye ka o kwesịrị ịgakwuru ka o nyere ya aka? Maka gịnị?
-
-
Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ndụ Chineke Nyere GịNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
b Ndị wepụtụrụla afọ ime ekwesịghị ikwe ka obi amamikpe mee ka ha chee na Jehova emekataghị gbaghara ha. Jehova nwere ike ịgbaghara ha. Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya, gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ime?” Ọ dị n’isiokwu a, n’ebe a kpọrọ Ihe Ị Ga-elebakwu Anya.
-