-
‘E Mere Anyị Ka Anyị Bụrụ Oké Ọrụ’Ụlọ Nche—2007 | Jun 15
-
-
Uche Anyị nke Pụrụ Iche
12. Olee ihe kasị mee ka ụmụ mmadụ dị iche n’ụmụ anụmanụ?
12 “Lee ka echiche Gị nile si dị oké ọnụ ahịa n’anya m, Chineke! Lee ka ọnụ ọgụgụ nile ha si dị ukwuu hie nne! Ọ bụrụ na agụọ m ha ọnụ, ha bara ụba karịa ájá.” (Abụ Ọma 139:17, 18a) E mekwara ụmụ anụmanụ ka ha bụrụ oké ọrụ, ụfọdụ n’ime ha nwekwara ikike ụfọdụ karịrị nke ụmụ mmadụ. Ma Chineke nyere ụmụ mmadụ ọgụgụ isi karịrị nke ụmụ anụmanụ ndị ahụ. Otu akwụkwọ sayensị kwuru, sị: “N’agbanyeghị otú anyị na ihe ndị ọzọ dị ndụ n’ụwa si yie, anyị dị iche n’ihe ọ bụla ọzọ dị ndụ n’ihi ikike anyị nwere ịsụ asụsụ na iche echiche. Ihe ọzọkwa mere anyị ji dị iche bụ otú anyị si enwe ọchịchọ ịmata banyere onwe anyị: Olee otú ahụ́ anyị si bịa dịrị otú ọ dị? Olee otú e si kee anyị?” Ọ bụkwa ajụjụ ndị a ka Devid chebaara echiche.
13. (a) Olee otú Devid si nwee ike ịtụgharị uche banyere echiche Chineke? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Devid?
13 Ụzọ kasị mkpa anyị si dị iche n’ụmụ anụmanụ bụ na anyị nwere ike iche echiche banyere Chineke.c Onyinye a pụrụ iche anyị nwere so n’ihe ndị mere e ji sị na e kere anyị “n’onyinyo Chineke.” (Jenesis 1:27) Devid ji onyinye a mee ihe nke ọma. O chebaara ihe ndị na-egosi na Chineke dị adị echiche nakwa ezi àgwà ihe ndị e kere eke gbara ya gburugburu n’ụwa na-egosipụta. Devid nwekwara akụkụ ndị mbụ nke Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ebe Chineke nọ kọwaa onwe ya na ọrụ ya. Akwụkwọ ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ nyeere Devid aka ịghọta echiche Chineke, àgwà ya, na nzube ya. Devid ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ, n’ihe ndị e kere eke, nakwa n’otú Chineke si emeso ya ihe mere ka o too Onye Okike ya.
-
-
‘E Mere Anyị Ka Anyị Bụrụ Oké Ọrụ’Ụlọ Nche—2007 | Jun 15
-
-
c Okwu Devid ndị dị n’Abụ Ọma 139:18b yiri ka hà pụtara na ọ bụrụ na ọ malite n’ụtụtụ ruo mgbe o hiri ụra n’abalị gụkọwa echiche Jehova, mgbe o tetara n’ụtụtụ, ọ ka ga-enwe ndị ọ na-agụbeghị.
-