Echiche nke Bible
Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịkpọ Ndị Na-edina Ụdị Onwe Ha Asị?
NA 1969 e chepụtara otu okwu n’asụsụ Bekee na-akọwa egwu na-enweghị isi ma ọ bụ ịsọ oyi maka ndị na-edina ụdị onwe ha. Okwu ahụ bụ “homophobia.” Ọtụtụ asụsụ enweghị otu okwu dị otú ahụ, ma ruo ọtụtụ puku afọ, ndị mmadụ nke ọtụtụ mba na asụsụ egosiwo enweghị mmasị maka ndị na-edina ụdị onwe ha.
Otú ọ dị, na nso nso a karị, a kwalitewo ndina ụdị onwe n’ụzọ sara mbara dị nnọọ ka ụdị ọzọ nke inwe mmekọahụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Jerry Z. Muller dere n’isi nso a banyere “ọchịchọ na-arị elu maka ọha na eze ịnabata na ịkwanyere ndina ụdị onwe ùgwù.” Ọ kọwara na ndị na-edina ụdị onwe ha “ejikọtawo ọnụ n’ụzọ na-arị elu ikwupụta omume ha dị ka nke kwesịrị otuto, na ikwu ka ndị ọzọ meekwa otú ahụ.” A na-ahụ nke a karịsịa ná mba Ebe Ọdịda Anyanwụ. Otú ọ dị, n’akụkụ ka ukwuu nke ụwa, ọbụna n’ebe a na-akpọ ala ndị na-anabata ọtụtụ echiche, ọtụtụ ka na-akatọ ma na-ajụ ndina ụdị onwe.
Ndị na-edina ụdị onwe ha na ndị a na-enyo enyo banyere ndina ụdị onwe na-abụkarị ndị e lekwasịrị anya maka ịgwa okwu ịkwa emo, mmaja, na ime ihe ike. Ọbụna ndị ndú okpukpe egosipụtawo ịkpọasị dị otú ahụ. Ụfọdụ amalitewo ihe pụrụ iyi agha nke onwe ha megide ndị na-edina ụdị onwe ha. Were, dị ka ihe atụ, okwu bishọp nke Chọọchị Grik Ọtọdọks kwuru nke a kpọsara n’oge na-adịbeghị anya na redio mba Gris. O kwuru, sị: “Chineke ga-akpọ ndị na-edina ụdị onwe ha ọkụ ruo mgbe ebighị ebi n’olulu na-ere ọkụ nke hel. Iti mkpu nke ọnụ ha ruru unyi ga-ada ụda ruo mgbe nile ebighị ebi. Ahụ ha rụrụ arụ ga-enweta ajọ mmekpa ahụ.” Nke a ọ̀ bụ eziokwu n’ezie? Olee ihe Chineke na-eche banyere ndị na-edina ụdị onwe ha?
Echiche Chineke
Bible akpọghị ndị na-edina ụdị onwe ha aha kpọmkwem dị ka ìgwè nke ndị Kraịst ga-amapụ n’iwu ma ọ bụ kpọọ asị. Ọzọkwa, ọ dịghị akụzi na Chineke ga-ata ndị na-edina ụdị onwe ha—ma ọ bụ ihe ọ bụla o kere eke—ahụhụ site n’ịkpọ ha ọkụ na hel na-ere ọkụ ruo mgbe ebighị ebi.—Tụlee Ndị Rom 6:23.
Otú ọ dị, Akwụkwọ Nsọ setịpụrụ ụkpụrụ omume nke Onye Okike anyị, nke na-emegidekarị ụkpụrụ omume nke oge a. Omume idina ụdị onwe, mmekọahụ n’etiti nwoke na nwanyị na-anọghị n’alụmdi na nwunye, na ndina anụmanụ bụcha ihe Bible kagburu. (Ọpụpụ 22:19; Ndị Efesọs 5:3-5) Chineke bibiri Sọdọm na Gọmọra n’ihi omume mmekọahụ ndị dị otú ahụ.—Jenesis 13:13; 18:20; 19:4, 5, 24, 25.
Banyere omume ndina ụdị onwe, Okwu Chineke kwuru hoo haa, sị: “Nke a bụ ihe kwesịrị ịkpọ asị.” (Levitikọs 18:22, The New Jerusalem Bible) Iwu Chineke nyere Israel kwuru, sị: “Nwoke ọ bụla nke ya na nwoke na-edina, dị ka nwoke na nwanyị na-edina, ihe arụ ka ha abụọ meworo: a ghaghị ime ka ha nwụọ.” (Levitikọs 20:13) E kwupụtara otu ntaramahụhụ ahụ maka ndị na-edina anụmanụ, na-edina ndị ikwu, na ndị di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko.—Levitikọs 20:10-12, 14-17.
E nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ịkọwa omume ndina ụdị onwe dị ka ngosipụta nke “agụụ ihe ihere” nakwa dị ka “ihe na-emegide ka e si mụọ ha.” Ọ na-ede, sị: “N’ihi nke a Chineke raara ha nye n’aka agụụ ihe ihere: n’ihi na ndị inyom ha weere nwanyị ha bụ site n’ọmụmụ gbanwere ihe na-emegide ka e si mụọ ha: otú a ndị ikom hapụkwara otú a na-eme nwanyị site ka e si mụọ ya, wee ree ọkụ n’agụụ ha n’ahụ ndị ikom ibe ha, ndị ikom na-arụpụta ihe na-adịghị mma n’anya n’ahụ ndị ikom, na-anarakwa n’ime onwe ha ụgwọ ọrụ ahụ nke njehie ha nke ha na-aghaghị ịnara. Dị ka ha jụrụ ịnọgide n’ịmazu Chineke, Chineke rakwaara ha nye n’aka uche a jụrụ ajụ, ime ihe ahụ nile na-ekwesịghị.”—Ndị Rom 1:26-28.
Akwụkwọ Nsọ adịghị enye ihe ngọpụ, ohere, ihe mgbagwoju anya; omume idina ụdị onwe, ịkwa iko nile, na-asọcha oyi n’anya Chineke. N’ụzọ kwekọrọ ekwekọ, ezi ndị Kraịst adịghị agwagbu echiche Bible banyere “agụụ ihe ihere” nanị iji bụrụkwuo ndị a ma ama ma ọ bụ bụrụkwuo ndị a na-anakwere n’ọdịbendị oge a. Ha adịghịkwa ekwenyere njikọ òtù ọ bụla nke raara onwe ya nye ịkwalite ndina ụdị onwe dị ka ụzọ ndụ dị otú o kwesịrị.
“Kpọọnụ Ihe Ọjọọ Asị”
Bible na-adụ ọdụ, sị: “Unu ndị na-ahụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.” (Abụ Ọma 97:10) N’ihi ya, a na-atụ anya na ndị Kraịst ga-akpọ omume ọ bụla nke na-emebi iwu Jehova asị. Ụfọdụ ndị pụrụ ọbụna iji mmetụta siri ike nke ịsọ ihe asọ ma ọ bụ ịsọ oyi meghachi omume banyere ndina ụdị onwe karịa ụdị ndị ọzọ nke omume rụrụ arụ, na-ele ndina ụdị onwe anya dị ka omume mmekọahụ rụrụ arụ nke megidere okike. Otú ọ dị, ndị Kraịst hà kwesịrị ịkpọ ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ asị?
Ọbụ abụ ahụ na-enye ihe ọmụma ụfọdụ n’okwu a n’Abụ Ọma 139:21, 22: “Ọ́ bụghị ndị na-akpọ Gị asị, Jehova, ka m na-akpọ asị? Ọ́ bụghịkwa ndị na-ebili imegide Gị ka m na-asọ oyi? Ọ bụ ịkpọasị nke zuru okè ka m ji kpọọ ha asị: ndị iro ka ha bụụrụ m.” Iguzosi ike n’ihe anyị nye Jehova na ụkpụrụ ya kwesịrị ịkpali n’ime anyị enweghị mmasị siri ike banyere ndị ahụ kpachara anya na-enupụ isi megide Jehova na ndị na-ewere nguzo dị ka ndị iro Chineke. Setan na ndị mmụọ ọjọọ so ná ndị iro dị otú ahụ e ji n’aka nke Chineke. Ụfọdụ ndị mmadụ yikwara ka ha dabara n’otu ọkwá a. Ma, ọ pụrụ isi oké ike nye onye Kraịst ịchọpụta ndị dị otú ahụ site n’ọdịdị ihe a na-ahụ anya. Anyị apụghị ịmata obi. (Jeremaịa 17:9, 10) Ọ ga-adị njọ iche na mmadụ bụ onye iro Chineke nke na-apụghị ịgbanwe agbanwe n’ihi na ọ na-eme ihe ọjọọ. N’ọtụtụ ọnọdụ ndị na-eme ihe ọjọọ amaghị nnọọ ụkpụrụ Chineke.
N’ihi ya, n’akụkụ ka ukwuu, ndị Kraịst anaghị adị ngwa n’ịkpọ ụmụ mmadụ ibe ha asị. Ọ bụrụgodị na ha nwere mmetụta siri ike nke ịkpọasị n’ebe ụzọ ndụ ụfọdụ dị, ha adịghị achọ imerụ ndị ọzọ ahụ, ha adịghịkwa ebu iwe n’obi ma ọ bụ nwee obi ọjọọ n’ebe ha nọ. Kama nke ahụ, Bible na-adụ ndị Kraịst ọdụ ‘iso mmadụ nile na-adị n’udo.’—Ndị Rom 12:9, 17-19.
“Chineke Abụghị Onye Na-ele Mmadụ Anya n’Ihu”
Jehova ga-agbaghara onye na-echegharị n’eziokwu, n’agbanyeghị omume rụrụ arụ onye ahụ nwere ike ịdị na-emebu. E nweghị ihe àmà na-egosi na Jehova na-ele otu ụdị nke omume rụrụ arụ anya dị ka nke ka ibe ya njọ. “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu.” (Ọrụ 10:34, 35) Dị ka ihe atụ, tụlee ọnọdụ nke ọgbakọ narị afọ mbụ dị na Kọrint. Pọl onyeozi degaara ha akwụkwọ, sị: “Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Mgbe ahụ Pọl kwetara na a nabatawo ụfọdụ ndị bụbu ndị na-akwa iko, ndị di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ndị na-edina ụdị onwe ha, na ndị ohi n’ime ọgbakọ ndị Kraịst dị na Kọrint. Ọ kọwara, sị: “Otú a ka ụfọdụ n’etiti unu dịkwarịị: ma unu sachara onwe unu, ma e doro unu nsọ, ma a gụrụ unu ná ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na n’ime Mmụọ nke Chineke anyị.”—1 Ndị Kọrint 6:9-11.
N’ezie, Jehova adịghị anabata ịnọgide na-emebi ụkpụrụ omume ya zuru okè. O doro anya na ọ kpọrọ iji nnupụisi na-eleghara ụkpụrụ ya anya asị. Otú ọ dị, ọ na-enye ohere maka ịdịghachi n’otu. (Abụ Ọma 86:5; Aịsaịa 55:7) N’ikwekọ na nke a, ndị Kraịst adịghị eme ndị na-edina ụdị onwe ha, ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ, ebe nlekwasị anya maka obi ọjọọ, ịkwa emo, ma ọ bụ mmaja. Ezi ndị Kraịst na-ele ụmụ mmadụ ibe ha anya dị ka ndị nwere ike ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, na-emeso ha n’ụzọ nsọpụrụ na nkwanye ùgwù. Bible na-ekwu, sị: “Nke a dị mma bụrụkwa ihe a ga-anara nke ọma n’ihu Onye nzọpụta anyị, bụ́ Chineke; Onye na-achọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.”—1 Timoti 2:3, 4.
Ndị Kraịst Na-anabata Onye Chegharịrị
Ugboro ugboro, Bible na-ekwu na Chineke na-agbaghara. Ọ na-akọwa ya dị ka “Chineke nke mgbaghara mmehie, Onye na-eme amara nweekwa obi ebere, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere.” (Nehemaịa 9:17; Ezikiel 33:11; 2 Pita 3:9) Bible gakwara n’ihu jiri ya tụnyere nna ahụ n’ilu Jisọs banyere nwa mmefu bụ́ onye mefusịrị ihe nketa ya ná ndụ ịla n’iyi n’ala dị anya. Nna ahụ jiri aka ghere oghe chere ịnabata nwa ya mgbe nwa ahụ mesịrị mara onwe ya, chegharịa, ma laghachi n’ebe obibi ezinụlọ ya.—Luk 15:11-24.
Ee, o kwere omume onye na-eme ihe ọjọọ ịgbanwe. Akwụkwọ Nsọ na-ekweta nke a site n’ịgba ndị mmadụ ume iyipụ mmadụ ochie ma yikwasị nke ọhụrụ na ‘ime ka ha dị ọhụrụ ná mmụọ nke uche ha.’ (Ndị Efesọs 4:22-24) Ndị na-eme ihe dị njọ, gụnyere ndị na-edina ụdị onwe ha, pụrụ ime mgbanwe pụtara ìhè n’ụzọ iche echiche na akparamàgwà ha, ọtụtụ enwewokwa ihe ịga nke ọma n’ime mgbanwe a.a Jisọs n’onwe ya mere nkwusa gwa ndị dị otú ahụ; mgbe ha gosikwara nchegharị, ọ nabatara ha.—Matiu 21:31, 32.
Ndị Kraịst na-anabata ndị chegharịrịnụ site n’akụkụ dị iche iche nke ndụ. Mgbe ha hapụsịrị omume rụrụ arụ, n’agbanyeghị ihe ọ bụla ha bụbu, mmadụ nile pụrụ inweta abamuru zuru ezu nke mgbaghara Chineke n’ihi na “Jehova dị mma n’ebe ihe nile e kere eke dị; obi ebere Ya nile dịkwasịkwa n’ọrụ Ya nile.”—Abụ Ọma 145:9.
Ndị Kraịst dị njikere inye nkwado ime mmụọ dị mkpa, ọbụna nye ndị ka na-alụso ọchịchọ idina ụdị onwe ọgụ. Nke a kwekọrọ ná ngosipụta ịhụnanya nke Chineke n’onwe ya, n’ihi na Bible na-ekwu, sị: “Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka Ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.”—Ndị Rom 5:8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Olee Otú M Pụrụ Isi Mee Ka Mmetụta Ndị A Pụọ?,” ná mbipụta Teta! nke April 8, 1995.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 26]
Ndị Kraịst adịghị agwagbu echiche Bible banyere ndina ụdị onwe
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]
Punch