E Kwesịrị Ilerukwu Ekpere Ndị Dị n’Ime Bible Anya
OTU nwanyị na-echegbu onwe ya, onye eze, na Ọkpara Chineke n’onwe ya kpere ekpere ndị anyị ga-eleru anya ugbu a. Ekpere nke ọ bụla nwere ọnọdụ ndị pụrụ iche kpaliri ya. Ma, ọnọdụ ndị dị otú ahụ pụrụ imetụta anyị taa. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ ndị a?
‘Lekwasị Anya ná Mweda n’Ala nke Ohu Gị Nwanyị’
Ị̀ na-agbaso otu nsogbu na-adịghị akwụsị akwụsị mgba? Ma ọ bụ è jiwo nchegbu bogbuo gị? Mgbe ahụ, ị nọ nnọọ n’ọnọdụ yiri nke Hana tupu ya amụọ nwa mbụ ya, bụ́ Samuel. O nweghị nwa, ndị inyom ndị ọzọ na-akọchakwa ya. N’eziokwu, ọnọdụ Hana wutere ya nke ukwuu nke na ọ jụrụ iri nri. (1 Samuel 1:2-8, 15, 16) O kpegaara Jehova ekpere ma rịọ arịrịọ sonụ:
“Jehova nke usuu nile nke ndị agha, ọ bụrụ na I lekwasị anya n’ezie ná mweda n’ala nke ohu Gị nwanyị, ọ bụrụ na I cheta m, ghara ichezọ ohu Gị nwanyị, wee nye ohu Gị nwanyị nwa nwoke, m ga-enyekwa ya Jehova ụbọchị ndụ ya nile, agụba agaghị agakwa n’elu isi ya.”—1 Samuel 1:11.
Rịba ama na Hana ekwughị okwu n’akpọghị otu isi ihe aha. O ji otu arịrịọ kpọmkwem gakwuru Jehova n’ekpere (maka nwa nwoke), jikọtakwa nke a na otu mkpebi doro anya (iwepụta ya maka ijere Chineke ozi). Gịnị ka nke a na-agwa anyị?
Mgbe a nọ n’ihe isi ike, kpọọ okwu aha n’ekpere. N’agbanyeghị ihe bụ nsogbu gị—ma ọ̀ bụ nsogbu ebe obibi gị, owu ọmụma, ma ọ bụ ahụ esighị ike—kpegara Jehova ekpere banyere ya. Kọwaara ya kpọmkwem ọdịdị nke ihe isi ike gị na mmetụta ị na-enwe. “N’uhuruchi ọ bụla ana m atụkwasị Jehova nsogbu m nile,” ka otu nwanyị di ya nwụrụ aha ya bụ Louise na-ekwu. “Mgbe ụfọdụ ha na-adị nnọọ ọtụtụ, ma ana m akpọtụ nke ọ bụla aha n’ụzọ doro anya.”
Ịgwa Jehova okwu n’ezoghị ọnụ na-eweta ọtụtụ abamuru. Ime otú ahụ na-enyere anyị aka ịmata nsogbu anyị, nke pụziri iyi ihe na-adịchaghị oké njọ. Ikpe ekpere ndị a kpọrọ okwu aha na ha na-eme ka anyị nwee ahụ efe pụọ ná nchegbu. Ọbụna tupu a zaa ekpere ya, Hana nwere mmetụta obi ike, “ihu ya agbarụghịkwa n’ihi ya ọzọ.” (1 Samuel 1:18) Ọzọkwa, ịkpọ ihe aha kpọmkwem na-eme ka anyị mụrụ anya ịmata azịza nye ekpere anyị. “Ka m na-ekwupụtakwu ihe kpọmkwem n’ekpere m,” ka Bernhard, bụ́ otu onye Kraịst na Germany na-ekwu, “ka azịza ha na-edo m anya karị.”
“Mụ Onwe M Bụ Nwatakịrị”
Otú ọ dị, mmadụ pụrụ inwe ụdị nchegbu dị iche ma ọ bụrụ na ọ nata ibu ọrụ o chere na ya erughị eru ịrụ. Ibu ọrụ Jehova nyere gị ịrụ ọ̀ na-erikpu gị mgbe ụfọdụ? Ka ndị mmadụ ụfọdụ hà na-ewere gị dị ka onye na-ekwesịghị ekwesị maka ibu ọrụ gị? Nwa okoro bụ́ Solomọn nọ n’ọnọdụ ahụ mgbe e tere ya mmanụ dị ka eze Israel. Ndị ikom ụfọdụ a maara aha ha nwere mmasị karị ka ọ bụrụ onye ọzọ nọkwasịrị n’ocheeze ahụ. (1 Ndị Eze 1:5-7, 41-46; 2:13-22) Ná mmalite nke ọchịchị ya, Solomọn rịọrọ otu arịrịọ n’ekpere:
“Jehova, bụ́ Chineke m, Gị onwe gị emewo ohu Gị eze . . . mụ onwe m bụ nwatakịrị; amaghị m ịpụ apụ na ịbata abata. . . . Nye ohu Gị obi na-anụ ihe ikpe ndị Gị ikpe, ịghọta ihe dị iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ.”—1 Ndị Eze 3:7-9.
Ekpere Solomọn lekwasịrị anya ná mmekọrịta ya na Jehova, n’ihe ùgwù e nyeworo ya, na n’ikike o nwere ịrụ ọrụ ahụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe ọ bụla e nyere anyị ibu ọrụ nke anyị chere na ọ karịrị ikike anyị, anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka ọ kwadoo anyị ịrụ ọrụ ahụ. Tụlee ahụmahụ ndị sonụ:
“Mgbe a gwara m ka m lekọta ibu ọrụ ka ukwuu na alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society,” ka Eugene na-akọwa, “enwere m mmetụta nke erughị eru ma ọlị. E nwere ndị ọzọ ka ruo eru nweekwa ahụmahụ ka nnọọ ukwuu. Ehiri m ụra dị nta n’abalị abụọ ndị sochiri, na-etinye oge ka ukwuu n’ekpere, nke nyere m ume na obi ike nke dị mkpa.”
A gwara Roy ka o kwuo okwu olili ozu mgbe otu enyi na-eto eto a ma ama nwụrụ na mberede. Ọtụtụ narị mmadụ ga-abịarịrị. Gịnị ka Roy mere? “Nanị ugboro ole na ole ka m kpetụworo ọtụtụ ekpere otú a maka ume na ikike iji chọta okwu ndị ziri ezi iji kwupụta echiche ndị na-ewuli elu na iji nye nkasi obi.”
Ka Onye Okike ahụ ‘na-eme ka ihe gaa ọsọ ọsọ’ na ka nzukọ ya na-agbasa, ihe kwesịrị ekwesị na-esi na ya apụta bụ na a na-atụkwasịkwu ndị ọzọ na-ejere ya ozi ibu ọrụ. Ọ bụrụ na a gwa gị ka i kerekwuo òkè, nwee obi ike na Jehova pụrụ imejupụta erughị eru ọ bụla n’ahụmahụ, ọzụzụ, ma ọ bụ ikike n’akụkụ nke gị. Gakwuru Chineke n’ekpere n’otu aka ahụ Solomọn mere, Ọ ga-akwado gị ịrụ ọrụ ahụ.
“Ka Ha Nile Wee Bụrụ Otu”
Ọnọdụ nke atọ na-ebilite taa bụ nke ịbụ onye a chọrọ ka ọ nọchite anya otu ìgwè n’ekpere. Mgbe a kpọrọ anyị ịnọchite anya ndị ọzọ n’ekpere, gịnị ka anyị kwesịrị ikpe maka ya? Tụlee ekpere Jisọs nke e dekọrọ na Jọn isi nke 17. O kpere ekpere nke a n’ihu ndị na-eso ụzọ ya n’uhuruchi ikpeazụ ya dị ka mmadụ. Ụdị arịrịọ dị aṅaa ka ọ rịọrọ Nna ya nke eluigwe?
Jisọs mesiri ihe mgbaru ọsọ na olileanya nke ndị nile nọ n’ebe ahụ nwere ike. Ọ kpọtụrụ inye aha Jehova Chineke otuto na ime ka a mara Alaeze ahụ aha. Jisọs mesiri uru nke mmekọrịta onwe onye n’ebe Nna ahụ na Ọkpara ahụ nọ ike, nke dabeere n’ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ. O kwuru okwu banyere ịnọpụ iche site n’ụwa, nke ga-akwadebe ndị na-eso ụzọ ya maka mmegide. Kraịst rịọkwara Nna ya ka o chebe ndị ahụ na-eso ụzọ na ime ka ha dị n’otu n’ezi ofufe.
Ee, Jisọs mesiri ịdị n’otu ike. (Jọn 17:20, 21) Ná mmalite uhuruchi ahụ, ndị na-eso ụzọ ya anọwo na-esegharị okwu ka ụmụaka. (Luk 22:24-27) Otú ọ dị, n’ekpere, Kraịst amaliteghị nkatọ kama ime ka a dị n’otu. N’otu ụzọ ahụ, ekpere ezinụlọ na nke ọgbakọ kwesịrị ịkwalite ịhụnanya, chọọkwa imeri esemokwu n’etiti otu onye na ibe ya. E kwesịrị ịdọta ndị ahụ a na-anọchite anya ha n’ịdị n’otu.—Abụ Ọma 113:1-3.
A na-egosipụta ịdị n’otu nke a mgbe ndị ahụ na-ege ntị sịrị, “Amen,” ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ,” ná ngwụsị. Ka nke a wee kwe omume, ha aghaghị ịghọta ma kwenye n’ihe nile e kwuru. Ya mere, ọ ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ịkpọtụ n’ekpere otu isiokwu nke ụfọdụ ndị nọ n’ebe ahụ na-amaghị. Dị ka ihe atụ, onye okenye nke na-anọchite anya ọgbakọ n’ekpere pụrụ ịrịọ ngọzi Jehova n’isi nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị ime mmụọ onye na-arịasi ọrịa ike. Ma ọ ga-akachasị mma ma o mee otú ahụ nanị ma ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ dị nnọọ ukwuu nke ndị ọ na-anọchite anya ha maara onye ahụ, nụkwa banyere ahụ esighị ike ya.
Rịbakwa ama na Jisọs akpọtụghị mkpa onwe onye dị iche iche nke onye òtù ọ bụla nke ìgwè ahụ aha. Ime otú ahụ ga-agụnye ịkpọtụ ihe ndị dịịrị onwe onye ndị ọ bụ nanị mmadụ ụfọdụ maara. Ihe ndị dịịrị onwe onye bụ isiokwu ndị kwesịrị ekwesị maka ekpere onwe onye, bụ́ nke a pụrụ ịgbatị ma bụrụ ihe dịịrị onwe onye ruo otú e si chọọ ya.
Olee otú mmadụ kwesịrị isi kwadebe onwe ya ịnọchite anya mgbakọ dị ukwuu nke ndị na-efe ofufe n’ekpere? Otu onye Kraịst nweworo ahụmahụ na-akọwa, sị: “Ana m ebu ụzọ tụlee ihe ndị m ga-ekele ekele maka ha, arịrịọ ndị ụmụnna pụrụ ịrịọ, na arịrịọ ndị m pụrụ ịrịọ n’ọnọdụ ha. Ana m etinye echiche m, tinyekwara okwu otuto dị iche iche n’usoro kwesịrị ekwesị n’ime obi m. Tupu mụ ekpee ekpere ihu ọha ahụ, ana m ekpe ekpere n’ime obi m, na-arịọ maka enyemaka iji nọchite anya ụmụnna n’ụzọ dị ùgwù.”
N’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ gị, o yikarịrị ka ị ga-achọta otu ekpere n’ime Bible nke onye nọ n’ọnọdụ yiri nke gị kpere. Ọtụtụ ekpere ndị dị n’ime Akwụkwọ Nsọ bụ ihe àmà nke ịhụnanya obi ọma Chineke. Ịgụ ekpere ndị a na ịtụgharị uche na ha ga-enyere gị aka ime ka ekpere gị ka mma.
[Igbe dị na peeji nke 5]
EKPERE NDỊ DỊ ỊRỊBA AMA N’IME BIBLE
Ndị ohu Jehova kpere ekpere n’okpuru ọtụtụ ọnọdụ. Ị̀ pụrụ ịzaghachi ee n’otu ma ọ bụ karị n’ọnọdụ ndị na-esonụ?
Ì nwere mkpa nke nduzi sitere n’aka Chineke, dị ka Elieza nwere?—Jenesis 24:12-14.
Ị̀ na-eche ihe ize ndụ dị nso ihu, dị ka Jekọb?—Jenesis 32:9-12.
Ị̀ chọrọ ịmara Chineke nke ọma karị, dị ka Mosis chọrọ?—Ọpụpụ 33:12-17.
Ndị mmegide hà na-eche gị ihu, dị ka ha chere Elaịja?—1 Ndị Eze 18:36, 37.
Ime nkwusa ọ̀ na-esiri gị ike, dị ka o siiri Jeremaịa?—Jeremaịa 20:7-12.
Ọ̀ dị gị mkpa ikwupụta mmehie ma chọọ mgbaghara, dị ka Daniel mere?—Daniel 9:3-19.
Ị̀ na-eche mmegide ihu, dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs chere?—Ọrụ 4:24-31.
Leekwa Matiu 6:9-13; Jọn 17:1-26; Ndị Filipaị 4:6, 7; Jemes 5:16.
[Igbe dị na peeji nke 6]
IHE E KWESỊRỊ IKPE N’EKPERE MGBE A NA-AGBASO OTU OMUME RIWORO MMADỤ AHỤ MGBA
Ị̀ na-agbaso otu adịghị ike na-apụtaghachi apụtaghachi mgba? Olee otú ekpere ndị e dekọrọ n’ime Bible pụrụ isi baa uru? Mụrụ ihe site n’aka Devid, onye kpere ekpere n’oge dị iche iche banyere adịghị ike ndị nke ya.
Devid bụrụ, sị: “Gwupụta ala obi m, Chineke, wee mara obi m: na-anwa m, wee mara iche uche m nile.” (Abụ Ọma 139:23) Ọ bụ ọchịchọ Devid ka Jehova Chineke gwupụta ọchịchọ, mmetụta uche, ma ọ bụ nzube ndị na-ezighị ezi. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Devid rịọrọ maka enyemaka Jehova n’izere mmehie.
Ma adịghị ike dị iche iche nke Devid meriri ya, o mehiekwara nke ukwuu. Ọzọkwa, ekpere nyeere ya aka—n’oge a iji weghachi mmekọrịta ya na Chineke. Dị ka Abụ Ọma 51:2 si kwuo, Devid rịọrọ, sị: “Sụchaa m nke ọma dị ka ákwà ka ajọ omume m pụọ n’ime m, meekwa ka m si ná mmehie m dị ọcha.”
Anyị pụkwara iji obi umeala rịọ maka enyemaka Jehova iji gbochie ọchịchọ ọjọọ dị iche iche. Nke a ga-ewusiwanye anyị ike imeri adịghị ike nke riworo mmadụ ahụ, ọ pụkwara inyere anyị aka izere mmehie. Ọ bụrụ na e nwee ndaghachi azụ, anyị kwesịrị iji arịrịọ gakwuru Jehova ọzọ ka o nyere anyị aka ịga n’ihu n’ọgụ ahụ.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ekpere ndị e kpere n’ịnọchite anya otu ìgwè kwesịrị imesi olileanya Akwụkwọ Nsọ na ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ e nwekọrọ ọnụ ike