Ha Maara Aha Chineke
AKWỤKWỌ mbụ a maara dị ka nke e deworo ma bie ná mba ndị dị na kọntinent America nke England chịrị bụ Bay Psalm Book. Stephen Daye biri mbipụta mbụ ya na Massachusetts Bay Colony n’afọ 1640. Akwụkwọ oge gboo ahụ nwere akwụkwọ Bible bụ́ Abụ Ọma, bụ́ nke a sụgharịrị site n’asụsụ Hibru gaa n’asụsụ Bekee dị ka e si asụ ma na-ede ya n’oge ahụ.
Otu ihe dị ịrịba ama banyere akwụkwọ Bay Psalm Book bụ ojiji o ji aha Chineke mee ihe n’amaokwu ụfọdụ. Ya mere, onye ọ bụla na-agụ akwụkwọ ahụ laa azụ n’ihe dị ka 350 afọ gara aga nọ n’ọnọdụ ịmara aha nke Onye Okike anyị. Dị ka ihe atụ, n’ime mbipụta ahụ, Abụ Ọma 83:17, 18 na-agụ, sị: “Ka ha nwee mgbagwoju anya mgbe nile, ka ha bụrụkwa ndị a na-enye nsogbu nke ukwuu: ee, ka e mee ka ihere mee ha, ka a laakwa ha n’iyi. Ka ụmụ mmadụ wee mara, na gị onye aha gị bụ IEHOVAH nanị gị, gburugburu elu ụwa nile kachasị ihe nile elu.”
N’ezie, Chineke onye kasị ihe nile elu chọrọ anyị n’aka ihe karịrị ịmata na aha ya bụ Jehova (Iehovah). N’akwụkwọ Bay Psalm Book, Abụ Ọma 1:1, 2 na-asị na “onye a gọziri agọzi” adịghị eje ije na ndụmọdụ nke ndị ajọ omume, “kama n’iwu nke Iehovah, ka obi ụtọ ya dị.” Mbipụtaghachi New England Psalm nke 1648 na-asị: “Ma ya onwe ya n’iwu Jehova ka ọ na-atụkwasị obi ụtọ ya nile.”
N’ebe a, nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures nke narị afọ nke 20 na-agụ, sị: “Onye obi ụtọ ka nwoke ahụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ nke ndị ajọ omume bụ, nke na-eguzoghịkwa n’ụzọ nke ndị mmehie, nke na-anọdụghịkwa n’oche ndị na-akwa emo. Kama obi ụtọ ya dị n’iwu Jehova, n’iwu ya ka ọ na-agụkwa n’olu dị ala ehihie na abalị.”
Iji nwee obi ụtọ n’ezie, mmadụ aghaghị ịjụ ndụmọdụ nke ndị ajọ omume. Ọ gaghị agbaso ihe nlereanya nke ndị mmehie, ọ pụghịkwa iso ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke na-akwa emo na-akpakọ. Gụnyere ihe ndị ọzọ, ọ dị mkpa ka ọ na-ezere mkpakọrịta nke ndị ahụ, bụ́ ndị ndụmọdụ na omume ha pụrụ iduba ya ná mmekọahụ rụrụ arụ, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na ihe omume ndị ọzọ megidere iwu Chineke. Ee, ezi obi ụtọ na-adabere n’ịmụta banyere ezi Chineke, bụ́ onye aha ya bụ Jehova, na itinye iwu ya n’omume dị ka e kpughere na Bible.