-
A Pụghị Ịmatacha Ịdị Ukwuu Jehova AmatachaỤlọ Nche—2004 | Jenụwarị 15
-
-
Lee Ka Àgwà Chineke Si Dị Ukwuu!
20, 21. (a) Abụ Ọma 145:7-9 na-ebuli ịdị ukwuu Jehova elu n’ihe metụtara àgwà ndị dị aṅaa? (b) Mmetụta dị aṅaa ka àgwà Chineke ndị a kpọtụrụ aha n’ebe a na-enwe n’ahụ́ ndị nile hụrụ ya n’anya?
20 Dị ka anyị hụworo, amaokwu isii mbụ nke Abụ Ọma nke 145 na-enye anyị ezi ihe mere a ga-eji na-eto Jehova maka ihe ndị metụtara ịdị ukwuu ya a na-apụghị ịmatacha amatacha. Amaokwu nke 7 ruo nke 9 na-ebuli ịdị ukwuu Chineke elu site n’izo aka n’àgwà ya. Devid bụrụ, sị: “Ncheta nke ịba ụba nke ịdị mma Gị ka ha ga-ekwuwa, ọ bụkwa ezi omume gị ka ha ga-eti mkpu ọṅụ banyere ya. Onye dị amara na onye nwere obi ebere ka Jehova bụ; ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ dịkwa ukwuu n’ebere. Jehova dị mma n’ebe ihe nile e kere eke dị; obi ebere Ya nile dịkwasịkwa n’ọrụ Ya nile.”
21 N’ebe a, Devid bu ụzọ mee ka ịdị mma na ezi omume Jehova pụta ìhè—àgwà ndị Setan bụ́ Ekwensu gbaghara. Mmetụta dị aṅaa ka àgwà ndị a na-enwe n’ahụ́ ndị nile hụrụ Chineke n’anya ma na-erubere ọchịchị ya isi? N’ezie, ịdị mma Jehova na ụzọ ziri ezi o si achị na-ewetara ndị na-efe ya ofufe ọṅụ dị ukwuu nke na ha apụghị ịkwụsị ito ya. Ọzọkwa, ‘mmadụ nile’ na-enweta ịdị mma Jehova. Anyị nwere olileanya na nke a ga-enyekwuru ọtụtụ ndị aka ichegharị ma ghọọ ndị na-efe ezi Chineke ahụ tupu oge agafee.—Ọrụ 14:15-17.
22. Olee otú Jehova si emeso ndị ohu ya?
22 Devid jikwa àgwà ndị ahụ Chineke n’onwe ya mere ka ha pụta ìhè kpọrọ ihe mgbe Ọ ‘gabigara n’ihu Mozis, kpọọ òkù, sị, Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.’ (Ọpụpụ 34:6) N’ihi ya, Devid pụrụ ikwupụta, sị: “Jehova nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere.” Ọ bụ ezie na a pụghị ịmatacha ịdị ukwuu Jehova amatacha, ọ na-akwanyere ndị ohu ya bụ́ mmadụ ùgwù site n’iji amara na-emeso ha ihe. O nwere obi ebere dị ukwuu, na-adị njikere ịgbaghara ndị mmehie chegharịrị echegharị ná ndabere nke àjà mgbapụta Jizọs. Jehova adịghịkwa ewe iwe ọsọ ọsọ n’ihi na ọ na-enye ndị ohu ya ohere imeri adịghị ike ndị pụrụ igbochi ha ịba n’ụwa ọhụrụ ezi omume ya.—2 Pita 3:9, 13, 14.
-
-
Jehova Dị Ukwuu n’Ịhụnanya nke Na-eguzosi Ike n’IheỤlọ Nche—2004 | Jenụwarị 15
-
-
Jehova Dị Ukwuu n’Ịhụnanya nke Na-eguzosi Ike n’Ihe
“ Jehova . . . dịkwa ukwuu n’obiọma sitere n’ịhụnanya.”—ABỤ ỌMA 145:8, NW.
1. Ruo ókè ha aṅaa ka ịhụnanya Chineke sara mbara?
“CHINEKE bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Okwu a na-enye ọṅụ na-agba akaebe na ụzọ Jehova si achị dabeere n’ịhụnanya. Leenụ, ọbụna ụmụ mmadụ ndị na-adịghị erubere ya isi na-erite uru site n’anyanwụ na mmiri ozuzo o ji ịhụnanya na-enye! (Matiu 5:44, 45) N’ihi ịhụnanya Chineke nwere maka ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọbụna ndị iro ya pụrụ ichegharị, chigharịkwuru ya ma nweta ndụ. (Jọn 3:16) Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ndị ajọ omume na-enweghị mmekwata ka ụmụ mmadụ hụrụ ya n’anya wee nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume.—Abụ Ọma 37:9-11, 29; 2 Pita 3:13.
2. Ịhụnanya dị aṅaa pụrụ iche ka Jehova na-egosi ndị ya na ha na-enwe mmekọrịta bụ́ ndị raara onwe ha nye ya?
2 Jehova na-egosi ndị na-efe ya ezi ofufe ịhụnanya n’ụzọ dị oké ọnụ ahịa na nke na-adịgide adịgide. Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “obiọma sitere n’ịhụnanya,” ma ọ bụ “ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe” na-egosi ịhụnanya dị otú ahụ. Eze Devid nke Izrel oge ochie ji obiọma sitere n’ịhụnanya nke Chineke kpọrọ ihe nke ukwuu. N’ihi ahụmahụ ya na ntụgharị uche ya n’otú Chineke si emeso ndị ọzọ ihe, Devid ji obi ike bụọ, sị: “Jehova . . . dị ukwuu n’ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” ma ọ bụ, “ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe,” NW].”—Abụ Ọma 145:8.
-