Ụta Adịghịrị Jehova
“Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ ndị na-atụ egwu ya. N’ihi na ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.”—ABỤ ỌMA 103:13, 14.
1, 2. Ònye bụ Abraham, oleekwa otu nwa nwanne ya Lọt si bịa biri n’obodo ọjọọ ahụ bụ Sọdọm?
Ọ BỤGHỊ Jehova kpatara ihe isi ike ndị anyị pụrụ inweta n’ihi ngahie nile anyị. Banyere nke a tụlee ihe mere ihe dị ka 3,900 afọ gara aga. Enyi Chineke bụ Abraham (Abram) na nwa nwanne ya bụ́ Lọt abawo ọgaranya. (Jemes 2:23) N’ezie, ihe onwunwe na anụ ụlọ ndị ha nwere dị ọtụtụ nke ukwuu nke na “ala ahụ anagideghị ha.” Ọzọkwa, esemokwu bilitere n’etiti ndị na-azụrụ ndị ikom abụọ ahụ anụ. (Jenesis 13:5-7) Gịnị ka a pụrụ ime banyere nke a?
2 Iji kwụsị esemokwu ahụ, Abraham tụrụ aro ka e nwee nkewa, o nyekwara Lọt ohere ibu ụzọ họrọ. Ọ bụ ezie na ọ bụ Abraham tọrọ, ọ gaara ezikwa ezi ka nwa nwanne ya kwe ka o were ebe kasị mma, Lọt họọrọ ókèala dịkarịsịrị mma—ala nile mmiri na-ede nke ọma nke Ndịda Jọdan. Ihe ndị a na-ahụ anya na-eduhie eduhie, n’ihi na obodo ndị retọrọ eretọ nke Sọdọm na Gọmọra dị ya nso. Lọt na ezinụlọ ya mesịrị kwaba na Sọdọm, nke a tinyekwara ha n’ihe ize ndụ ime mmụọ. Ọzọ, a dọọrọ ha laa n’agha mgbe Eze Kedoalaoma na ndị njikọ ya meriri onye na-achị Sọdọm. Abraham na ndị ikom ya napụtara ha, ma Lọt na ezinụlọ ya lọghachiri Sọdọm.—Jenesis 13:8-13; 14:4-16.
3, 4. Gịnị mere Lọt na ndị òtù ezinụlọ ya mgbe Chineke bibiri Sọdọm na Gọmọra?
3 N’ihi mmekọahụ na-adịghị ka okike si dị na ịrụ arụ n’omume nke Sọdọm na Gọmọra, Jehova kpebiri ibibi obodo ndị ahụ. O ji obi ebere ziga ndị mmụọ ozi abụọ si Sọdọm dupụta Lọt, nwunye ya, na ụmụ ha nwanyị abụọ. Ha agaghị ele anya n’azụ, ma nwunye Lọt mere otú ahụ, ma eleghị anya na-eto akpịrị maka ihe onwunwe ndị a hapụrụ. Mgbe ahụ, ọ ghọrọ ogidi nnú.—Jenesis 19:1-26.
4 Lee oké ihe funahụrụ Lọt na ụmụ ya ndị nwanyị! Ụmụ agbọghọ ahụ aghaghị ịhapụ ndị ikom gaje ịlụ ha. Lọt enwekwaghị nwunye ya na ụba ihe onwunwe ya ugbu a. N’ezie, e mesịrị weda ya ala ibi n’ime otu ọgba ya na ụmụ ya ndị nwanyị. (Jenesis 19:30-38) Ihe yiworo ihe dị mma nke ukwuu n’anya ya aghọwo ihe dị nnọọ iche. Ọ bụ ezie na o mere ngahie ụfọdụ siri ike, e mesịrị kpọọ ya “Lọt, bụ́ onye ezi omume.” (2 Pita 2:7, 8) O dokwara anya na ụta adịghịrị Jehova Chineke maka ngahie nile nke Lọt.
‘Mmehie—Ònye Pụrụ Ịghọta Ha?’
5. Gịnị bụ mmetụta Devid banyere ngahie na mpako?
5 Anyị nile na-agahie n’ihi ịbụ ndị na-ezughị okè ma na-eme mmehie. (Ndị Rom 5:12; Jemes 3:2) Dị ka Lọt, a pụrụ iduhie anyị site n’ihe ndị a na-ahụ anya ma ọ bụ anyị pụrụ ihie ụzọ n’ikpe. Otú a, ọbụ abụ bụ Devid rịọrọ, sị: “Mmehie e mehieworo ònye ga-aghọta ha? Gụọ m n’onye ikpe ihe nzuzo nile na-amaghị. Gbochiekwa ohu gị ná mmehie nganga; ekwela ka ha na-achị m: mgbe ahụ ka m ga-ezu okè, a ga-agụkwa m n’onye ikpe njehie hiri nne na-amaghị.” (Abụ Ọma 19:12, 13) Devid matara na ya pụrụ ime mmehie nke ọ na-amaghịdị banyere ya. N’ihi ya, ọ rịọrọ ka a gbaghara ya njehie ndị ọ pụrụ ịbụ na ha zoro ezo nye ya. Mgbe o mere ngahie siri ike n’ihi na anụ ahụ ya na-ezughị okè nubara ya n’ụzọ dị njọ, ọ chọsiri enyemaka Jehova ike nke ukwuu. Ọ chọrọ ka Chineke jighachi ya azụ n’ime ihe nganga. Devid achọghị ka nganga bụrụ àgwà na-achị ndụ ya. Kama nke ahụ, ọ chọsiri izu ezu ike n’ofufe ya nye Jehova Chineke.
6. Nkasi obi dị aṅaa ka a pụrụ inweta site n’Abụ Ọma 103:10-14?
6 Dị ka ndị na-ejere Jehova ozi taa bụ́ ndị raara onwe ha nye, anyị bụkwa ndị na-ezughị okè, ya mere anyị na-eme ngahie. Dị ka Lọt, dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ime nhọrọ na-adịghị mma banyere ebe anyị ga-ebi. Ma eleghị anya anyị hapụrụ ohere anyị nwere iji gbasapụ ozi nsọ anyị na-ejere Chineke. Ọ bụ ezie na Jehova na-ahụ ngahie ndị dị otú ahụ, ọ maara ndị nwere obi nke na-achọ ime ezi omume. Ọbụna ma ọ bụrụ na anyị emee mmehie dị oké njọ ma chegharịa, Jehova na-agbaghara mmehie ma na-eweta enyemaka, nọgidekwa na-ele anyị anya dị ka mmadụ ndị na-asọpụrụ Chineke. “Ọ bụghị dị ka mmehie nile anyị si dị ka o meworo anyị, ọ bụghịkwa dị ka ajọ omume nile anyị si dị ka o mesoworo anyị,” ka Devid kwupụtara. “N’ihi na dị ka ịdị elu nke eluigwe si dị n’elu ụwa, otú a ka ebere ya dị ike n’ahụ ndị na-atụ egwu ya. Dị ka ihu anyanwụ si dị anya n’ọdịda anyanwụ, otú a ka o meworo ka njehie nile anyị dị anya n’ebe anyị nọ. Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ ndị na-atụ egwu ya. N’ihi na ya onwe ya maara otu a kpụworo anyị; ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:10-14) Nna eluigwe anyị dị ebere pụkwara inyere anyị aka idozi ụzọ ndị anyị hiere ma ọ bụ nye anyị ohere ọzọ iji gbasawanye ozi nsọ anyị, maka otuto ya.
Ihie Ụzọ nke Ịta Chineke Ụta
7. N’ihi gịnị ka anyị ji enwe ihe isi ike?
7 Mgbe ihe na-agazighị, ọdịdị mmadụ na-achọkarị ịta otu onye ma ọ bụ otu ihe ụta maka ihe merenụ. Ụfọdụ na-ata ọbụna Chineke ụta. Ma Jehova adịghị ewetara ndị mmadụ ihe isi ike ndị dị otú ahụ. Ọ na-eme ihe ọma, ọ bụghi ihe ndị na-emerụ ahụ. Leenụ, “ọ na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ajọ mmadụ na ezi mmadụ, ọ na-emekwa ka mmiri zokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume”! (Matiu 5:45) Ihe kasị pụta ìhè mere anyị ji enweta ihe isi ike bụ na anyị bi n’ụwa nke ji ụkpụrụ nile nke ọchịchọ onwe onye nanị eme ihe na nke dabeere n’ike Setan Ekwensu.—1 Jọn 5:19.
8. Gịnị ka Adam mere mgbe ihe na-agazighịrị ya?
8 Ịta Jehova Chineke ụta maka ihe isi ike ndị ngahie anyị wetaara anyị bụ ihe nzuzu na nke dị ize ndụ. Ime otú ahụ pụrụ ọbụna ịnapụ anyị ndụ anyị kpọmkwem. Nwoke mbụ, bụ́ Adam, gaara ekeleworị Chineke maka ihe ọma nile ọ natara. Ee, Adam kwesịrị inwewo obi ekele dị omimi nye Jehova maka ndụ n’onwe ya na maka ngọzi ndị ọ na-anụ ụtọ ha n’ebe obibi ahụ yiri ubi a gbara ogige, ubi Iden. (Jenesis 2:7-9) Gịnị ka Adam mere mgbe ihe na-agazighị n’ihi na o nupụụrụ Jehova isi ma rie mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu? Adam kpesaara Chineke, sị: “Nwanyị ahụ nke i nyere m ka mụ na ya biri, ya onwe ya nyere m mkpụrụ sitere n’osisi ahụ, m wee ire.” (Jenesis 2:15-17; 3:1-12) N’ezie, anyị ekwesịghị ịta Jehova ụta, dị ka Adam mere.
9. (a) Ọ bụrụ na anyị ezute ihe isi ike n’ihi ihe nzuzu ndị anyị mere, site na gịnị ka anyị pụrụ inweta nkasi obi? (b) Dị ka Ilu 19:3 na-ekwu, gịnị ka ụfọdụ na-eme mgbe ha wetaara onwe ha ihe isi ike?
9 Ọ bụrụ na anyị ezute ihe isi ike n’ihi na ihe ndị anyị mere bụ ihe nzuzu, anyị pụrụ inweta nkasi obi site n’ịmara na Jehova na-aghọta adịghị ike anyị karịa ka anyị na-aghọta, ọ ga-agbapụtakwa anyị site n’ọnọdụ ọjọọ anyị ma anyị nye nanị ya ofufe. Anyị kwesịrị iji enyemaka Chineke anyị na-anata kpọrọ ihe, na-adịghị mgbe anyị na-ata Chineke ụta maka ọdachi na ihe isi ike anyị na-ewetara onwe anyị. Banyere nke a, otu ilu amamihe dị na ya na-ekwu, sị: “Uche gbagọrọ agbagọ nke mmadụ na-ekpu ụzọ ya ihu; ọ bụkwa imegide Jehova ka obi ya dị ọkụ.” (Ilu 19:3) Nsụgharị ọzọ na-asị: “Ụfọdụ na-ebibi onwe ha site n’ihe nzuzu ndị ha mere wee na-ata ONYENWE ANYỊ ụta.” (Today’s English Version) Nsụgharị ọzọkwa na-asị: “Amaghị ihe mmadụ na-etisagharị ihe ndị mmadụ na-eme, o wee weso Jehova oké iwe.”—Byington.
10. Olee otú nzuzu Adam si ‘kpuo ụzọ ya ihu’?
10 N’ikwekọ n’ụkpụrụ dị n’ilu nke a, Adam mere ihe ịchọ ọdịmma onwe ya nanị, echiche ya gbagọrọ agbagọ ‘kpuru ụzọ ya ihu.’ Obi ya tụgharịrị pụọ n’ebe Jehova Chineke nọ, o wee malite n’ụzọ onwe ya nke ọchịchọ onwe onye nanị na nnwere onwe onye. Ọbụna na Adam ghọrọ onye na-enweghị ekele ma ọlị nke na ọ tara Onye Okike ya ụta wee si otú a mee onwe ya onye iro nke Onye Kachasị Ihe Nile Elu! Mmehie Adam wetara ụzọ nke ya na nke ezinụlọ ya ná mbibi. Lee oké ihe ịdọ aka ná ntị dị na nke a! Ndị na-achọkarị ịta Jehova ụta maka ọnọdụ ndị na-adịghị mma pụrụ nnọọ ịjụ onwe ha, sị: M̀ na-ekele Chineke maka ihe ọma ndị m na-anụ ụtọ ha? M̀ nwere obi ekele na m nwere ndụ dị ka otu n’ime ihe ndị o kere? Ọ̀ pụrụ ịbụ na ihie ụzọ m nile ewetaworo m ihe isi ike? M̀ ruru eru inweta ihu ọma ma ọ bụ enyemaka Jehova n’ihi ịgbaso nduzi ya, dị ka e setịpụrụ n’Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible?
Ihe Ize Ndụ Ọbụna Nye Ndị Na-ejere Chineke Ozi
11. Banyere Chineke, gịnị ka ikpe ya mara ndị ndú okpukpe ndị Juu nke narị afọ mbụ?
11 Ndị ndú okpukpe ndị Juu nke narị afọ mbụ O.A. mere nzọrọ na ha na-ejere Chineke ozi ma leghara okwu eziokwu ya anya, na-adaberekwa ná nghọta nke ha. (Matiu 15:8, 9) N’ihi na Jisọs Kraịst kpughere echiche ha na-ezighị ezi, ha mere ka ọ nwụọ. E mesịa, ha were iwe dị ọkụ megide ndị na-eso ụzọ ya. (Ọrụ 7:54-60) Ụzọ ndị ikom ahụ kpuru ihu nke ukwuu nke na ha wesoro Jehova onwe ya oké iwe.—Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 5:34, 38, 39.
12. Ihe atụ dị aṅaa na-egosi na ọbụna ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst na-anwa ịta Jehova ụta maka ihe isi ike ha?
12 Ọbụna ụfọdụ nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst azụlitewo echiche dị ize ndụ, na-anwa ikwu na ọ bụ Chineke kpatara ihe isi ike ha zuteworo. Dị ka ihe atụ, ndị okenye a họpụtara ahọpụta hụrụ na ọ dị mkpa inye otu nwa agbọghọ lụworo di ndụmọdụ obi ọma ma bụrụ nke siri ike site n’Akwụkwọ Nsọ megide iso otu nwoke bụ onye ụwa na-akpakọrịta. N’otu mkparịta ụka, ọ tara Chineke ụta n’ihi enyereghị ya aka iguzogide ọnwụnwa nke mkpakọrịta ya na nwoke ahụ nọgidere na-enwe wetaara ya. O kwuru n’ezie na ya na-eweso Chineke oké iwe! Ntụgharị uche Akwụkwọ Nsọ na mgbalị e mere ugboro ugboro iji nyere ya aka adịghị nke bara uru, ụzọ omume rụrụ arụ mesịkwara duba n’ịchụpụ ya n’ọgbakọ ndị Kraịst.
13. N’ihi gịnị ka a ga-eji zere àgwà ịdị na-eme mkpesa?
13 Mmụọ ịdị na-eme mkpesa pụrụ iduba mmadụ n’ịta Jehova ụta. “Ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” gbebatara n’ime ọgbakọ narị afọ mbụ nwere mmụọ dị njọ dị otú ahụ, echiche ndị ọzọ na-emerụ emerụ n’ime mmụọ sochikwara ya. Dị ka Jud onyeozi kwuru, ndị ikom ndị a “na-agha amara Chineke anyị ka ọ bụrụ agụụ ịkwa iko, ndị na-agọnarịkwa Onye nanị ya bụ Nna nwe ọha, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” Jud kwukwara, sị: “Ndị a bụ ndị ntamu, ndị na-ata Chineke ụta.” (Jud 3, 4, 16) Ndị na-eguzosi ike n’ihe na-ejere Jehova ozi ga-eji amamihe kpee ekpere ka ha nwee mmụọ nke obi ekele, ọ bụghị àgwà ịdị na-eme mkpesa nke pụrụ imesịa mee ha obi ilu ruo n’ókè nke ịtụfu okwukwe na Chineke ma tinye mmekọrịta ha na ya n’ihe ize ndụ.
14. Olee otú mmadụ pụrụ isi meghachi omume ma ọ bụrụ na onye Kraịst ibe ya mejọọ ya, ma n’ihi gịnị ka nke a na-agaghị abụ omume ziri ezi?
14 Ị pụrụ iche na nke a agaghị eme gị. Ma, ihe ndị na-agazighị n’ihi ngahie nke anyị ma ọ bụ nke ndị ọzọ pụrụ imesịa mee ka anyị taa Chineke ụta. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ịkpasu mmadụ iwe n’ihi ihe onye kwere ekwe ibe ya kwuru ma ọ bụ mee. Onye ahụ e mejọrọ—ma eleghị anya onye jewooro Jehova ozi n’ịnọgidesi ike n’ihu ruo ọtụtụ afọ—pụrụ ịsị mgbe ahụ: ‘Ọ bụrụ na onye ahụ nọ n’ọgbakọ, m gaghị aga nzukọ.’ Mmadụ pụrụ inwe ahụ erughị ala nke ukwuu nke na ọ na-ekwu n’obi ya, sị: ‘Ọ bụrụ na ihe ndị dị otú a anọgide, achọghị m ịbụ akụkụ nke ọgbakọ a.’ Ma ò kwesịrị ka onye Kraịst nwee àgwà ahụ? Ọ bụrụ na mmadụ ọzọ na-ezughị okè emejọọ gị, n’ihi gịnị ka ị ga-eji weso ọgbakọ dum nke mmadụ ndị Chineke na-anakwere ma na-ejere ya ozi n’iguzosi ike n’ihe mejupụtara iwe? N’ihi gịnị ka onye ọ bụla rarawooro onwe ya nye Jehova ga-eji kwụsị ime uche Chineke wee si otú ahụ weso Chineke iwe? Olee otú o si bụrụ ihe amamihe dị na ya ikwere ka otu onye ma ọ bụ otu usoro ọnọdụ bibie mmekọrịta ọma e nwere n’ebe Jehova nọ? N’ezie, ọ ga-abụ ihe nzuzu na mmehie ịkwụsị ife Jehova Chineke ofufe n’ihi ihe ọ bụla.—Jemes 4:17.
15, 16. Gịnị ka ikpe ya mara Dịọtrefis, ma olee otú Gaịọs si duzie onwe ya?
15 Were onwe gị na ị nọ n’otu ọgbakọ ahụ onye Kraịst ahụ na-ahụ n’anya bụ Gaịọs nọ na ya. Ọ “na-eme ihe kwesịrị ntụkwasị obi n’ọrụ” n’ile ndị ofufe ibe ya na-abịa nleta—bụkwa ndị ọ na-amaghị ama—ọbịa nke ọma! Ma ihe àmà na-egosi na n’otu ọgbakọ ahụ, e nwere Dịọtefis na-eme mpako. Ọ gaghị eji nsọpụrụ nakwere ihe ọ bụla site n’aka Jọn, otu n’ime ndị ozi Jisọs Kraịst. N’ezie, ọbụna na Dịọtrefis ji okwu ọjọọ na-ekwugide Jọn. Onyeozi ahụ sịrị: “Afọ ejughịkwa ya n’ihe ahụ, ma [Dịọtrefis] onwe ya adịghị anara ụmụnna anyị nke ọma, ọ na-egbochikwa ndị na-ezube ịnara ha, ọ na-achụpụkwa ha ná nzukọ Kraịst.”—3 Jọn 1, 5-10.
16 Ọ bụrụ na Jọn abịa n’ọgbakọ ahụ, o zubere icheta ihe Dịọtrefis na-eme. Ka ọ dị ugbu a, olee otú Gaịọs na ndị Kraịst ndị ọzọ na-ele ọbịa nke ọma n’ọgbakọ ahụ si meghachi omume? E nweghị ihe ọ bụla na-egosi n’Akwụkwọ Nsọ na nke ọ bụla n’ime ha sịrị: ‘Ọ bụrụhaala na Dịọtrefis nọ n’ọgbakọ a, m chọghị ịbụ akụkụ ya. Ị gaghị ahụ m ná nzukọ.’ Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Gaịọs na ndị ọzọ dị ka ya guzosiri ike. Ha ekweghị ka ihe ọ bụla kwụsị ha ime uche Chineke, ha ewesoghịkwa Jehova iwe ma ọlị. Ee e, n’ezie, ha adabaghịkwa n’ihe aghụghọ nile Setan Ekwensu na-ezupụta, bụ́ gaara aṅụrịwo ọṅụ a sị na ha hapụrụ ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova maa taa Chineke ụta.—Ndị Efesọs 6:10-18.
Ya Adịla Mgbe I Ga-eweso Jehova Iwe!
17. Olee otú anyị kwesịrị isi mee omume ma ọ bụrụ na mmadụ ma ọ bụ ọnọdụ emejọọ ma ọ bụ kpasuo anyị iwe?
17 Ọbụna ma a sị na otu onye ma ọ bụ ọnọdụ n’ọgbakọ ewetara onye na-ejere Chineke ozi ma ọ bụ kpasuo ya iwe, onye nke na-ewe iwe ga na-ekpu ụzọ ya ihu ma ọ bụrụ na ọ kwụsị isonyere ndị Jehova. Onye dị otú ahụ agaghị na-eji ike nghọta ya dị iche iche eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Ndị Hibru 5:14) Ya mere kpebisie ike ịnagide ihe isi ike nile dị ka onye na-anọgide n’iguzosi ike n’ezi ihe. Jigide ịnọgidesi ike n’ihe gị nye Jehova Chineke, Jisọs Kraịst, na ọgbakọ ndị Kraịst. (Ndị Hibru 10:24, 25) A pụghị ịchọta eziokwu ahụ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi n’ebe ọ bụla ọzọ.
18. Ọ bụ ezie na anyị adịghị aghọta mgbe nile ihe ndị Chineke na-eme, gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka banyere Jehova Chineke?
18 Chetakwa na ọ dịghị mgbe Jehova na-eji ihe ọjọọ anwa onye ọ bụla. (Jemes 1:13) Chineke, onye bụ isi iyi nke ịhụnanya, na-eme ihe ọma, karịsịa nye ndị na-ahụ ya n’anya. (1 Jọn 4:8) Ọ bụ ezie na anyị adịghị aghọta mgbe nile ihe ndị Chineke na-eme, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova Chineke agaghị ada mgbe ọ bụla n’imere ndị na-ejere ya ozi ihe kasị mma. Dị ka Pita kwuru, sị: “Ya mere wedanụ onwe unu n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o wee welie unu elu n’oge nke ya; na-atụkwasịnụ ya nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:6, 7) Ee, ihe banyere ndị ya na-emetụ Jehova n’obi.—Abụ Ọma 94:14.
19, 20. Olee otú anyị kwesịrị isi mee omume, ọbụna ma ọ bụrụ na mgbe ụfọdụ ule ndị anyị na-enweta emee ka anyị nwee nkụda mmụọ?
19 Ya mere, ekwela ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla mee ka ị sụọ ngọngọ. Dị ka onye ọbụ abụ ahụ kwuru, “udo nke hiri nne ka ndị na-ahụ iwu [Jehova Chineke] n’anya nwere; ọ dịghịkwa ihe ịsụ ngọngọ ha nwere.” (Abụ Ọma 119:165) Anyị nile na-enweta ule, ndị a pụkwara ime ka anyị nwetụ nkụda mmụọ na obi mwute mgbe ụfọdụ. Ma ekwela mgbe ọ bụla ka obi ilu bilite n’obi gị, karịsịa megide Jehova. (Ilu 4:23) Site n’enyemaka ya na ná ndabere nke Akwụkwọ Nsọ, chee nsogbu ndị ị pụrụ idozi ihu ma die ndị na-anọgide.—Matiu 18:15-17; Ndị Efesọs 4:26, 27.
20 Ekwela mgbe ọ bụla ka mmetụta uche gị mee ka i meghachi omume n’ụzọ nzuzu wee kpuo ụzọ gị ihu. Na-ekwu okwu ma na-eme omume n’ụzọ ga-eme ka obi Chineke ṅụrịa. (Ilu 27:11) Kpọkuo Jehova n’ekpere sitere n’ala ala obi, na-amata na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi n’ezie dị ka otu n’ime ndị na-ejere ya ozi, na ọ ga-enyekwa gị nghọta dị mkpa iji soro ndị ya nọgide n’ụzọ nke ndụ. (Ilu 3:5, 6) Karịsịa ihe nile, ewesola Chineke oké iwe. Mgbe ihe gahiere, cheta mgbe nile na ụta adịghịrị Jehova.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Ngahie dị aṅaa ka Lọt mere, ma olee otú Chineke si lee ya anya?
◻ Olee ihe bụ mmetụta Devid banyere ngahie na mpako?
◻ Mgbe ihe na-agazighị, n’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ịta Chineke ụta?
◻ Gịnị ga-enyere anyị aka izere iweso Jehova iwe dị ọkụ?
[Foto dị na peeji nke 15]
Mgbe ọ na-ekewapụ site n’ebe Abraham nọ, Lọt mere nhọrọ na-adịghị mma banyere ebe ọ ga-ebi