-
Jehova Bụ Onye Na-azụ Anyị Dị Ka AtụrụỤlọ Nche—2005 | Nọvemba 1
-
-
“M Gaghị Atụ Egwu Ihe Ọjọọ Ọ Bụla; n’Ihi na Gị Onwe Gị Nọnyeere M”
13. N’Abụ Ọma 23:4, olee otú Devid si kwuo okwu dị ka onye ya na Jehova nwere mmekọrịta chikwuru anya, gịnịkwa mere na nke a abụghịrị anyị ihe ijuanya?
13 Devid kwuru ihe nke abụọ mere o ji nwee obi ike: Jehova na-echebe atụrụ ya. Anyị na-agụ, sị: “A sị na ejee m ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwụ, m gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla; n’ihi na Gị onwe gị nọnyeere m: ndele Gị na mkpanaka Gị, ha onwe ha na-akasi m obi.” (Abụ Ọma 23:4) Devid na-ekwuzi ka onye ya na Jehova nwere mmekọrịta chikwuru anya, na-eji nnọchiaha bụ́ “gị” agwa Jehova okwu. Nke a abụghị ihe ijuanya n’ihi na Devid na-ekwu otú Chineke si nyere ya aka ịtachi obi n’ahụhụ. Devid ejeela ije n’ọtụtụ ndagwurugwu gbara ọchịchịrị—ya bụ, oge ndị ndụ ya nọ n’ihe ize ndụ. Ma, o kweghị ka ụjọ rikpuo ya n’ihi na ọ hụrụ na Chineke nọnyeere ya—“ndele” Ya na “mkpanaka” Ya adịrịkwa njikere ịrụ ọrụ. Mmara Devid maara na a na-echebe ya kasịrị ya obi, obi abụọ adịghịkwa ya na o mere ka ọ bịarukwuo Jehova nso.b
14. Olee mmesi obi ike Bible na-enye anyị banyere nchebe Jehova, ma gịnị ka nke a na-apụtaghị?
14 Olee otú Jehova si echebe atụrụ ya taa? Bible na-emesi anyị obi ike na ọ dịghị ndị mmegide—ma ndị mmụọ ọjọọ ma ndị mmadụ—ga-ekpochapụli atụrụ ya n’ụwa. Jehova agaghị ekwe ka nke ahụ mee. (Aịsaịa 54:17; 2 Pita 2:9) Otú ọ dị, nke a adịghị apụta na Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị ga-echebe anyị pụọ n’ọdachi nile. Anyị na-enweta ọnwụnwa ndị na-abịara ụmụ mmadụ, a na-emegidekwa anyị dị ka e si emegide ezi Ndị Kraịst nile. (2 Timoti 3:12; Jems 1:2) A pụrụ ikwu na e nwere oge ndị anyị nwere ike ije “ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwụ.” Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịfọdụ nke nta ka anyị nwụọ n’ihi mkpagbu ma ọ bụ ọrịa. Ma ọ bụ, ya afọdụ nke nta ka onye anyị hụrụ n’anya nwụọ ma ọ bụ ọbụna ya anwụọ. N’oge ndị o yiri ka olileanya adịghịzi, Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị na-anọnyere anyị, ọ ga-echebekwa anyị. N’ụzọ dị aṅaa?
15, 16. (a) Olee ụzọ ndị Jehova si enyere anyị aka imeri ihe mgbochi ndị anyị pụrụ izute? (b) Kọọ otu ahụmahụ na-egosi otú Jehova si enyere anyị aka n’oge ọnwụnwa.
15 Jehova anaghị ekwe nkwa inyere anyị aka n’ụzọ ọrụ ebube.c Ma anyị pụrụ ijide n’aka na: Jehova ga-enyere anyị aka imeri ihe mgbochi ọ bụla anyị pụrụ izute. Ọ pụrụ inye anyị amamihe iji nagide “ọnwụnwa dị iche iche.” (Jems 1:2-5) Ọ bụghị nanị anụ ndị na-egbu atụrụ ka onye ọzụzụ atụrụ na-eji ndele ma ọ bụ mkpanaka ya achụ, ọ na-ejikwa ya enutụ ụmụ atụrụ ya ka ha gawa ebe ha kwesịrị ịga. Jehova pụrụ “inutụ” anyị, ikekwe site n’aka nwanna anyị, itinye ụkpụrụ Bible pụrụ ime ka ọnọdụ anyị kakwuo nnọọ mma n’ọrụ. Tụkwasị na nke ahụ, Jehova pụrụ inye anyị ike ịtachi obi. (Ndị Filipaị 4:13) Site na mmụọ nsọ ya, ọ pụrụ inye anyị “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Mmụọ Chineke pụrụ inyere anyị aka ịtachi obi n’ule ọ bụla Setan pụrụ iwetara anyị. (1 Ndị Kọrint 10:13) Ọ́ bụghị ihe na-akasi obi ịmara na Jehova dị njikere inyere anyị aka?
16 Ee, n’agbanyeghị otú ndagwurugwu anyị hụrụ onwe anyị n’ime ya gbaruru n’ọchịchịrị, anyị agaghị eje ije na ya nanị anyị. Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị nọnyeere anyị, na-enyere anyị aka n’ụzọ ndị anyị nwere ike ghara ịghọtacha ná mmalite. Tụlee ahụmahụ nke otu okenye ọgbakọ nke dọkịta gwara na ọ na-arịa ọrịa ụbụrụ ịza aza bụ́ nke na-esi ike ngwọta. “Aghaghị m ikweta na ná mmalite, anọ m na-eche ma Jehova ọ̀ na-ewesa m iwe, ma ọ bụ ka ọ̀ hụkwadịrị m n’anya. Ma ekpebisiri m ike na agaghị m ahapụ Jehova. Kama nke ahụ, agwara m ya nsogbu m. Jehova nyekwaara m aka, na-eji ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị akasi m obi mgbe mgbe. Ọtụtụ mere ka m ghọtakwuo ọnọdụ m site n’ahụmahụ ha nwere mgbe ha rịara ọrịa siri ike, ihe ndị ahụ ha gwara m nyekwaara m aka. Ihe ndị ha ji ezi uche gwa m chetaara m na ihe na-eme m emetụkwala ndị ọzọ. Enyemaka ndị m nwetara, gụnyere ụfọdụ ndị ji obiọma rịọ ka ha nyere m aka n’ụzọ metụrụ m n’obi, mesiri m obi ike na Jehova anaghị ewesa m iwe. N’ezie, mụ na ọrịa m ka na-alụ, amaghịkwa m ihe ga-esi na ya pụta. Ma ekwenyesiri m ike na Jehova nọnyeere m, nakwa na ọ ga-anọgide na-enyere m aka n’ọnwụnwa a.”
-