Jiri Aka Dị Ọcha Na-efe Jehova
N’OKPURU ike mmụọ nsọ, onye ọbụ abụ bụ́ Devid bụrụ, sị: “Aga m akwọ ọbụ aka m abụọ n’emeghị ihe ọjọọ; wee gbaa ebe ịchụàjà Gị gburugburu otú a, Jehova.”—Abụ Ọma 26:6.
N’ịrọ okwu ndị a, ọ pụrụ ịbụworị na Devid na-arụtụ aka n’omenala ndị nchụàjà Israel bụ́ ndị Livaị ịrịgo n’elu ebe ịchụàjà wee tụkwasị àjà ha n’elu ọkụ. Ma tupu ha emee ihe omume a nke ife ofufe, a chọrọ n’aka ndị nchụàjà ịkwọ aka na ụkwụ ha. Nke a abụghị ihe dị nta. Ịghara iwere nzọụkwụ mmalite a pụrụ ịnapụ onye nchụàjà ndụ ya!—Ọpụpụ 30:18-21.
Ịsa ahụ n’ụzọ ihe atụ na-eweta ịdị ọcha ime mmụọ na omume. (Aịsaịa 1:16; Ndị Efesọs 5:26) Jehova chọrọ ka anyị ‘gbaa ebe ịchụàjà ya gburugburu’ taa site n’ijere ya ozi. Ma ọ chọkwara ka anyị jiri aka dị ọcha mee nke ahụ—dị ka Devid si tinye ya, ọbụ aka ndị a kwọrọ “n’emeghị ihe ọjọọ.” Nke a abụghị ihe nta a chọrọ, n’ihi na ndị na-eme omume na-adịghị ọcha agaghị eketa Alaeze Chineke. (Ndị Galetia 5:19-21) Ndụ n’ọrụ Chineke adịghị enye mmadụ ihe ngọpụ itinye aka n’omume rụrụ arụ. N’ihi ya Pọl onyeozi dere, sị: “Ana m etipụta ahụ m ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu m: ka mụ onwe m ghara ịghọ onye a jụrụ ajụ n’ụzọ ọ bụla.”—1 Ndị Kọrint 9:27.
Ndị na-achọ nnwapụta Chineke na ezi obi ụtọ aghaghị iji aka dị ọcha na-ejere Jehova ozi. Dị ka Devid, ha na-ejegharị “n’izu okè nke obi, na n’izi ezi.”—1 Ndị Eze 9:4.