Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 1/1 p. 3-5
  • Eziokwu Na-enwogha Ndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eziokwu Na-enwogha Ndụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nzube ná Ndụ
  • Ezinụlọ Ọhụrụ
  • “Ụjọ Atụghị M Izi Ndị Mmadụ Ozi Ọma”
    Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2015
  • Obi Eruola M Ala Ọ Bụ Ezie na Obi Kooro M n’Elu Mgbe M Bụ Okorobịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Jehova Ekwee Daniel Nkwa Ụgwọ Ọrụ Magburu Onwe Ya
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 1/1 p. 3-5

Eziokwu Na-enwogha Ndụ

Ọ BỤ ihe mwute ma bụrụ eziokwu na ndụ siere ọtụtụ ndị mmadụ taa ike, ọbụna dị oké njọ. Ọ̀ ga-ekwe mee ndị dị otú ahụ ịchọta obi ụtọ? Ụfọdụ bụ ndị omekome, na-awakpokwa mmadụ ibe ha. Ọ̀ dị mgbe ha pụrụ imecha ghọọ ndị òtù ọha mmadụ na-eme ihe n’eziokwu? Azịza nye ajụjụ abụọ a bụ ee. Ndị mmadụ pụrụ ịgbanwe. A pụrụ inwogha ndụ. Pọl onyeozi gosiri ụzọ a pụrụ isi mee nke a mgbe o dere, sị: “Ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.”—Ndị Rom 12:2.

Nhota e hotara ‘ihe Chineke na-achọ nke zuru okè’ pụrụ ime ka e cheta ihe Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe karịrị afọ 20 tupu Pọl dee okwu ndị ahụ dị n’elu. Jisọs kwuru, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” (Jọn 8:32) N’ịsị “eziokwu ahụ,” Jisọs bu n’uche ihe ọmụma sitere n’ike Chineke—karịsịa ihe ọmụma banyere uche Chineke—nke e chekwaara anyị n’ime Bible. (Jọn 17:17) Bible ọ̀ na-eme ka ndị mmadụ pụọ n’ohu n’ezie? Ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke ọ̀ na-enwogha ndụ n’ezie? N’eziokwu ọ na-enwogha. Tụlee ihe atụ ole na ole.

Nzube ná Ndụ

N’oge na-adịbeghị anya, Moisés, bi na Gibraltar, bụ nnọọ onye na-enweghị obi ụtọ. Ọ na-asị: “Abụ m onye aṅụrụma, na-ehikwa n’èzí. Ọ dị m ka mụ abaghị uru. Abalị ọ bụla ana m arịọ Chineke ka o meere m ebere, gharakwa ikwe ka m nọruo ụbọchị ọzọ. Ana m ebe ákwá ka m na-ajụ Chineke ihe m nọ n’ụwa a eme ma ọ bụrụ na mụ abaghị uru, n’enweghị ọrụ, n’enweghị ezinụlọ, n’enweghịkwa onye ọ bụla ga-enyere m aka. N’ihi gịnị ka m kwesịrị iji nọgide na-adị ndụ?” Mgbe ahụ, otu ihe mere.

Moisés na-aga n’ihu: “Amatara m na Chineke anụwo ekpere m mgbe m zutere Roberto, otu n’ime Ndịàmà Jehova. Roberto nyere m otu Bible na otu akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?a Kwa ụbọchị anyị na-amụkọ Bible ọnụ n’oche ogologo ebe m na-ehi ụra n’abalị. Mgbe otu ọnwa gasịrị Roberto kpọọrọ m gaa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị ebe a. N’oge na-adịghị anya, eziokwu Bible agbanwewo echiche m kpam kpam. Anakwaghị m ehi n’èzí; ka ọ fọkwa ịṅụ mmanya ma ọ bụ ise siga. Ndụ m agbanwewo, obi dịkwa m ụtọ. Enwere m olileanya ịbụ onye e mere baptism n’isi nso ma jeere Jehova ozi dị ka otu n’ime Ndịàmà ya.”

Lee aha nnwogha ọ bụ! Mgbe ndị mmadụ nọ n’enweghị olileanya, ihe na-akpatakarị ya bụ enweghị ihe ọmụma. Ha amaghị banyere Chineke ma ọ bụ nzube ya ndị dị ebube. N’ihe banyere Moisés, mgbe o nwetara ihe ọmụma ahụ, o nyere ya ume na obi ike ịgbanwe ndụ ya. A zara ekpere onye ọbụ abụ ahụ kpegaara Chineke n’ọnọdụ Moisés: “Zipụta ìhè Gị na eziokwu Gị; ka ha onwe ha na-edu m: ka ha mee ka m bịaruo ugwu nsọ Gị, bịaruokwa ebe obibi Gị nile.”—Abụ Ọma 43:3.

Na Belize, Daniel nwere ahụmahụ yiri nke ahụ. Daniel adịghị ehi n’èzí—o nwere ọrụ dị ùgwù. Ma ruo afọ 20 ọ lụsoro iri ahụ nke ọgwụ ọjọọ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ọgụ, na-ebikwa ndụ rụrụ arụ. Ọ bụ ezie na a zụlitere ya dị ka onye Katọlik, Daniel apụghị ịhụ nzube ọ bụla ná ndụ, o nwekwara obi abụọ banyere ịdị adị nke Chineke. Ọ gara ọtụtụ chọọchị na-achọ enyemaka ma chọpụta na ọtụtụ ndị enyi ya na-aga chọọchị na ọbụna ụfọdụ ndị enyi ya bụ́ ndị ụkọchukwu na-eji ọgwụ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ka ọ dịgodị, nwunye ya na-achọ ịgba ya alụkwaghịm.

N’amaghị ihe ọ ga-eme, Daniel banyere n’otu ogige mkpụzigharị uche. Ma, ọ matara na mgbe a tọhapụsịrị ya, na ya ga-alaghachi n’ọgwụ ọjọọ n’oge na-adịghị anya ma ọ bụrụ na o nwetaghị enyemaka. Ma, ụdị enyemaka dị aṅaa? Na May 1996, abalị abụọ ọ hapụrụ ogige mkpụzigharị uche, Daniel gakwuuru otu n’ime Ndịàmà Jehova ma mee ihe tụrụ ya n’anya site n’ịrịọ, “Biko mụọrọ m Bible.” Onyeàmà ahụ mere ndokwa ịmụrụ Daniel Bible ugbo abụọ n’izu, n’oge na-adịghị anya Daniel malitekwara ime ka ndụ ya kwekọọ n’uche Chineke ma were ndị enyi bụ́ ndị Kraịst ndị na-adịghị eji ọgwụ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na ndị na-ajụ omume rụrụ arụ dochie ndị enyi ochie ya. N’ụzọ dị otú a Daniel chọpụtara na ihe Bible kwuru bụ eziokwu: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) N’oge na-adịghị anya, o kwuru, sị: “Nke a bụ oge mbụ ná ndụ m, m matara ihe ọ pụtara bụ inwe akọ na uche dị ọcha.” E nwoghakwara ndụ Daniel.

Na Puerto Rico, otu nwoke ọzọ nwere nnwogha dị ịrịba ama. Ọ nọbu n’ụlọ mkpọrọ ma bụrụ onye a na-ele anya dị ka onye dị ezigbo ize ndụ, ebe ọ bụ na o gbuola ọtụtụ mmadụ. Eziokwu Bible ọ̀ pụrụ ịgbanwe ya? Ee. Otu onye n’ime Ndịàmà Jehova nyere ya magazin Ụlọ Nche na Teta! ụfọdụ, ngwa ngwa ọ rịọkwara ka e nyekwuo ya. A maliteere ya ọmụmụ Bible, ka eziokwu Bible malitekwara imetụta obi ya, mgbanwe ndị o mere pụtara ìhè nye mmadụ nile. Otu n’ime ihe àmà mbụ nke mgbanwe ya bụ na ọ kpụtulatara ogologo ntụtụ ya ma kpụọ ajị agba ya ghasasịrị aghasa.

Bible na-ekwu na Chineke na-agbaghara ndị mmehie nwere ezi nchegharị ma gbanwee ụzọ ndụ ha. Pọl dere, sị: “Ọ̀ bụ na unu amataghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? . . . Otú a ka ụfọdụ n’etiti unu dịkwarịị: ma unu sachara onwe unu.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 11) Obi abụọ adịghị ya na okwu ndị a kasiri nwoke a obi, dị ka Ọrụ 24:15 kasiri ya: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” O kwuru, sị: “Achọrọ m ịnọ ya mgbe mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ ga-ewere ọnọdụ ka m wee nwee ike ịrịọ ndị ahụ m gburu mgbaghara.”

Ezinụlọ Ọhụrụ

Otu ụbọchị, a kọwaara Luis, bụ́ otu Onyeàmà Jehova na-ezisa ozi ọma oge nile n’Argentina, otu nwoke nwere nzụlite dị mwute. Ịbụ onye nne na nna ya gbahapụrụ n’ọmụmụ, a zụlitere ya n’ogige dị iche iche. Mgbe ọ gbara ihe dị ka afọ 20, ọ matara ebe nne ya nọ ma kpebie ibi ya nso. Ọ rụsiri ọrụ ike, kpadoo ego buru ibu, ma mee njem gaa n’obodo ukwu ebe nne ya nọ. Nne ya kwere ka ya na ya nọrọ ruo mgbe ego ya gwụrụ, ọ sịzie ya laa. Ọjụjụ a mere ka o chee echiche igbu onwe ya.

Otú ọ dị, Luis sooro nwa okorobịa a kerịta eziokwu Bible. Eziokwu ahụ gụnyere nkwa ahụ bụ́: “N’ihi na nne m na nna m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) Nwa okorobịa ahụ chọpụtara na ya nwere Nna nke bi n’eluigwe onye ọ na-adịghị mgbe ọ ga-agbahapụ ya. Obi dị ya ụtọ ugbu a ịbụ akụkụ nke ezinụlọ ọhụrụ, ezinụlọ Jehova.

Nwoke ọzọ n’otu mba ahụ gwara otu onye n’ime Ndịàmà Jehova na ya nwere mmasị na magazin Ụlọ Nche. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ zọpụtawo alụmdi na nwunye ya. O yiri ka otu ụbọchị nwoke a, ka ọ hapụrụ ebe ọrụ, hụrụ n’ime ihe mkpofu ahịhịa otu magazin Ụlọ Nche nke nwere isiokwu bụ́ “Ịgba Alụkwaghịm” ná mkpụrụ akwụkwọ ndị gbara okpotokpo. Ebe ọ bụ na alụmdi na nwunye ya nọ ná nsogbu, ya na nwunye ya amalitewokwarị okwu ikpe maka nkewa iwu kwadoro, ọ tụtụpụtara magazin ahụ ma malite ịgụ ya. O ji ya laa ma soro nwunye ya gụọ ya. Di na nwunye ahụ gbalịrị itinye ndụmọdụ dabeere na Bible dị na magazin ahụ n’ọrụ. (Ndị Efesọs 5:21–6:4) N’oge na-adịghị anya, mmekọrịta ha kara mma. Ha kwụsịrị okwu ikpe nkewa ahụ, ha na-amụkwa Bible ugbu a dị ka di na nwunye dị n’otu.

Na Uruguay, nwoke ọzọ a na-akpọ Luis enwetụdịghị obi ụtọ. Ọgwụ iri ahụ, mgbaasị, ikpere arụsị, iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi—ndị a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị mere ka ndụ ya nọrọ n’ọgba aghara. N’ikpeazụ, Luis, n’ịbụ onye ike ụwa gwụrụ, ghọrọ onye na-ekweghị na Chineke. Otu enyi ya nyere ya akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation?b Nke a mere ka ọ kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nwa oge, ma n’oge na-adịghị anya Luis laghachiri n’ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na ọgwụ ọjọọ. Mgbe, n’otu oge oké nhụjuanya, ọ hụrụ onwe ya ka ọ nọ ọdụ n’ikpo ahịhịa, o kpere ekpere, na-ekpegara “nna nke Jisọs Kraịst” ekpere ya, ebe ọ bụ na o jighị n’aka ihe bụ aha Chineke.

Ọ rịọrọ Chineke ka o gosi ya ma o nwere ihe ọ bụla mere ya ji nọdụ n’ụwa. “Kpọmkwem n’echi ya,” ka Luis na-akọ, “otu enyi m nyere m otu akwụkwọ ọ na-enwekwaghị ihe o ji ya eme. Gịnị bụ aha ya? Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!”c Akwụkwọ ahụ nyeere ya aka ịza ajụjụ ya. Luis kpere ekpere ọzọ maka enyemaka n’ịchọta okpukpe ga-egosi ya ụzọ isi fee Chineke. Lee ihe ịtụnanya ọ bụ! Mgbịrịgba ụzọ kụrụ, mmadụ abụọ n’ime Ndịàmà Jehova guzokwa n’èzí. Luis malitere iso ha mụwa Bible ozugbo. O nwere ọganihu dị ngwa ma na-ele onwe ya anya dị ka onye a gọziri agọzi ugbu a ịbụ Onyeàmà e mere baptism. Ọ na-ebi ndụ dị ọcha ma na-enyere ndị ọzọ aka ịchọtakwa nzube ná ndụ ha. Nye ya, okwu Abụ Ọma 65:2 emezuwo: “Gị Onye na-anụ ekpere, Gị ka anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịakwute.”

Na Philippines, Allan bụbu nwa akwụkwọ na-eme ihe ike ike. O so n’otu òtù nzube ya bụ “ịkwatu ọchịchị ka ọgbọ na-abịa n’ihu wee nwee ike ịha nhata.” Ma, otu ụbọchị, Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ya, ọ mụtakwara site na Bible nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ. Nzube ahụ gụnyere nkwa ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:10, 11) Allan kwuru, sị: “N’oge na-adịghị anya achọpụtara m na ihe òtù anyị na-adọlịrị bụ ihe e kwerela nkwa ya na Bible ogologo oge gara aga. A ga-enyezu ihe nile ahụ anyị na-achọsi ike n’okpuru Alaeze Chineke.” Ugbu a, Allan na-akwado Alaeze Chineke ma na-enyere ndị ọzọ aka inwe okwukwe n’eziokwu Bible.

Ee, a na-enwogha ndụ mgbe ndị mmadụ rubeere eziokwu nke Okwu Chineke, bụ́ Bible isi. N’ezie oge na-abịa mgbe mmadụ nile dị ndụ ga-emeworị ka ndụ ha kwekọọ n’uche Chineke. Lee aha nnwogha nke ahụ ga-abụ! Mgbe ahụ, amụma ahụ ga-emezu: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:9.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

c Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya