Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 4/1 p. 27-30
  • Na-atụkwasị Jehova Ibu Arọ Gị Mgbe Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-atụkwasị Jehova Ibu Arọ Gị Mgbe Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-eme Ihe Nile n’Ike Jehova
  • Mee Ihe I Nwere Ike Ime Iji Dozie Nsogbu Ahụ
  • Atụkwasịla Ihe n’Ibu Arọ Gị Nile
  • Ịnagide Ibu Arọ nke Obi Amamikpe
  • Ịnagide Mgba Okpuru
  • Wulite ma Nọgide Soro Jehova Na-enwe Mmekọrịta Siri Ike, nke Ntụkwasị Obi
  • Dabere Na Mmụọ Chineke N’ime Ihe Banyere Mgbanwe Ndị A Na-enwe Ná Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Mara Ihe Ma Tụọ Egwu Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Ọ Bụ Jehova Nwe Agha A”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Samuel nke Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 4/1 p. 27-30

Na-atụkwasị Jehova Ibu Arọ Gị Mgbe Nile

ỌTỤTỤ ndị taa na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị ibu arọ na-anyịgbu. Ihe isi ike akụ̀ na ụba, nsogbu ezinụlọ ndị na-egbu mgbu, nsogbu ahụ ike, ihe mgbu na ịta ahụhụ n’ihi mmegbu na ọchịchị aka ike, na ihe isi ike ndị ọzọ na-ekokwasị ha n’olu dị ka nkume igwe nri. E wezụga nrụgide ndị a sitere n’èzí, ụfọdụ na-enwekwa mmetụta nke ịbụ ndị echiche nke abaghị uru onwe onye na ọdịda n’ihi ezughị okè nke ha na-anyịda n’ala. A na-anwa ọtụtụ ndị ịchịli aka kpam kpam ná mgba ahụ. Olee otú ị pụrụ isi nagide ha mgbe ibu arọ dị iche iche yiri ndị a na-agaghị ebuli?

N’otu oge Eze Devid nke Israel chere na nrụgide ahụ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke a na-agaghị anagideli. Dị ka Abụ Ọma nke 55 si kwuo, nchegbu mere ka o nwee oké nchekasị n’ihi nrụgide na ịkpọasị nke ndị iro ya. O nwere oké obi mgbu na egwu. Nanị ihe ọ pụrụ ime bụ ịsụ ude ná mwute ya. (Abụ Ọma 55:2, 5, 17) Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe mgbu ya nile, ọ chọtara ụzọ isi nagide. N’ụzọ dị aṅaa? O legaara Chineke ya anya maka nkwado. Okwu ndụmọdụ ọ gwara ndị ọzọ bụ́ ndị pụrụ inwe ụdị mmetụta o nwere bụ: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu.”—Abụ Ọma 55:22.

Gịnị ka o bu n’uche site n’ikwu, sị, “tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu”? Ọ̀ bụ nanị okwu ịgakwuru Jehova n’ekpere na ikwupụta nchegbu anyị? Ka ànyị pụrụ ime ihe n’onwe anyị iji nye aka belata ọnọdụ ahụ? Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na anyị enwee mmetụta nke erughị eru ma ọlị ịgakwuru Jehova? Anyị pụrụ ịchọpụta ihe Devid bu n’uche site n’ile anya n’ahụmahụ ụfọdụ ndị ọ pụrụ ịbụ na o chetararịị nke ọma mgbe o deturu okwu ndị ahụ.

Na-eme Ihe Nile n’Ike Jehova

Ị̀ na-echeta otú Golaịat si tinye egwu n’obi nke ndị ikom na-alụrụ Israel agha? Nwoke a bụ dike, nke karịrị 2.7 mita n’elu, menyere ha egwu. (1 Samuel 17:4-11, 24) Ma egwu atụghị Devid. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ gbalịghị ịlụso Golaịat ọgụ n’ike nke onwe ya. Malite n’oge e tere ya mmanụ dị ka eze ọdịnihu nke Israel, o kweworị ka mmụọ Chineke duzie ya ma nye ya ume n’ihe nile o mere. (1 Samuel 16:13) Ya mere ọ gwara Golaịat, sị: “Mụ onwe m na-ewere aha Jehova nke usuu nile nke ndị agha bịakwute gị, bụ́ Chineke nke usoro agha nile nke Israel, Onye ị taworo ụta. Ụbọchị taa ka Jehova ga-emechibido gị nye n’aka m.” (1 Samuel 17:45, 46) Devid dị nkà n’ịma èbè, ma anyị pụrụ ijide n’aka na mmụọ nsọ Jehova duziri ma mee ka nkume ahụ ọ mara Golaịat na-egbu egbu karị.—1 Samuel 17:48-51.

Devid nagidere oké ihe ịma aka nke a ma merie site n’inwe obi ike na Chineke ga-akwado ma nye ya ume. Ọ zụlitewo mmekọrịta dị mma, nke ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụzọ Jehova siworo napụta ya na mbụ wusiri nke a ike. (1 Samuel 17:34-37) Dị ka Devid, ị pụrụ ịnọgide soro Jehova na-enwe mmekọrịta onwe onye ma nwee obi ike zuru ezu n’ikike o nwere na njikere ọ dị inye gị ume na ịkwagide gị n’ọnọdụ nile.—Abụ Ọma 34:7, 8.

Mee Ihe I Nwere Ike Ime Iji Dozie Nsogbu Ahụ

Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ọ dịghị mgbe ọ bụla a ga-enwe oké ihe mgbu, nchegbu, na ọbụna egwu, dị ka Abụ Ọma nke 55 na-egosi n’ụzọ doro anya. Dị ka ihe atụ, afọ ole na ole mgbe ngosipụta a nke obi ike n’ebe Jehova nọ n’atụghị egwu gasịrị, Devid tụrụ oké egwu mgbe ndị iro ya chere ya ihu. O nwekwaghị ihu ọma n’ebe Eze Sọl nọ, ọ ghaghịkwa ịgba ọsọ maka ndụ ya. Gbalịa jiri uche see onyinyo nsogbu mmetụta uche nke a na-aghaghị ịkpataworo Devid, ajụjụ ndị ọ na-aghaghị ịkpaliteworị n’uche ya banyere mmezu nke nzube Jehova. E kwuwerị, e teworị ya mmanụ dị ka eze ọdịnihu n’Israel, ma leenụ ọ dị ya mkpa ibi ndụ dị ka onye na-agba ọsọ ndụ n’ọzara, onye a na-achụgharị dị ka anụ ọhịa. Mgbe ọ gbalịrị ịchọ nchebe n’obodo Gat, bụ́ obodo Golaịat, a matara onye ọ bụ. Gịnị ka ọ rụpụtara? Ihe ndekọ ahụ na-asị na ọ “tụọ egwu . . . nke ukwuu.”—1 Samuel 21:10-12.

Ma o kweghị ka egwu na oké nchegbu ya gbochie ya ịdị na-elegara Jehova anya maka enyemaka. Dị ka Abụ Ọma nke 34 (nke e dere n’ihi ahụmahụ nke a) si kwuo, Devid sịrị: “Achọrọ m Jehova, Ọ zakwara m, wee napụta m n’ụjọ m nile. Onye a e wedara n’ala kpọrọ òkù, Jehova wee nụrụ ya, wee si ná mkpagbu ya nile zọpụta ya.”—Abụ Ọma 34:4, 6.

N’ezie, Jehova kwadoro ya. Ma rịba ama na Devid afọnyeghị aka n’ụkwụ ma chere ka Jehova napụta ya. Ọ ghọtara mkpa ọ dị ya ime ihe nile ọ pụrụ ime n’ọnọdụ ndị ahụ iji si n’ọnọdụ ahụ siri ike pụọ. O kwetara na aka Jehova dị ná mgbapụta ya, ma ya onwe ya mere ihe, mee ka onye isi mebiri nke mere na eze nke Gat egbughị ya. (1 Samuel 21:14–22:1) Ọ dịkwa anyị onwe anyị mkpa ime ihe nile anyị pụrụ ime iji nagide ibu arọ nile, kama nanị ichere ka Jehova napụta anyị.—Jemes 1:5, 6; 2:26.

Atụkwasịla Ihe n’Ibu Arọ Gị Nile

Devid mụtara ihe ọzọ, nke na-egbu mgbu, ka oge na-aga ná ndụ ya. Gịnị ka ọ bụ? Na mgbe ụfọdụ anyị na-atụkwasị ihe n’ibu arọ anyị. Mgbe o merisịrị ndị Filistia, ihe agazighiri Devid mgbe o kpebiri ibughachi igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jerusalem. Ihe ndekọ akụkọ nke ihe ahụ merenụ na-akọrọ anyị, sị: “Devid wee bilie, si na Beale Juda jee, ya na ndị Israel nile ndị ya na ha nọ, isi n’ebe ahụ bugota igbe Chineke . . . Ha wee mee ka ụgbọ ala ọhụrụ buru igbe Chineke, . . . Uza na Ahio, bụ́ ụmụ Abinadab, wee na-edu ụgbọ ala ọhụrụ ahụ.”—2 Samuel 6:2, 3.

Iji ụgbọ ala buru Igbe ahụ megidere ntụziaka nile Jehova nyeworo banyere ya. E kwuru n’ụzọ doro anya na nanị ndị e nyere ikike ibu ya, bụ́ ndị Livaị bụ́ ụmụ Kohat, kwesịrị ibu Igbe ahụ n’ubu ha, na-eji osisi ndị e tinyere n’ime mgbaaka ndị a rụnyere n’ụzọ pụrụ iche n’Igbe ahụ. (Ọpụpụ 25:13, 14; Ọnụ Ọgụgụ 4:15, 19; 7:7-9) Ileghara ntụziaka ndị a anya wetara ọdachi. Mgbe ehi nke na-akpụ ụgbọ ala ahụ fọrọ nke nta ka o mee ka o kpuo ihu n’ala, Uza, bụ́ onye Livaị ma eleghị anya ma o doro anya na ọ bụghị onye nchụàjà, matịrị aka iji mee ka Igbe ahụ ghara ịda, o wee bụrụ onye Jehova tigburu n’ihi enweghị nsọpụrụ ya.—2 Samuel 6:6, 7.

Devid dị ka eze aghaghị ịnata ụta ụfọdụ maka nke a. Mmeghachi omume ya na-egosi na ọbụna ndị ha na Jehova nwere mmekọrịta dị mma pụrụ imeghachi omume mgbe ụfọdụ n’ụzọ na-adịghị mma n’ọnọdụ ndị na-ele mmadụ ule. Iwe buru ụzọ wee Devid. Mgbe ahụ egwu jidere ya. (2 Samuel 6:8, 9) E lere mmekọrịta ntụkwasị obi nke ya na Jehova ule n’ụzọ siri ike. Ihe a bụ ọnọdụ mgbe o yiri ka ọ tụkwasịghị Jehova ibu arọ ya, mgbe ọ na-agbasoghị ihe ndị o nyere n’iwu. Nke ahụ ọ̀ pụrụ ịbụ otú ihe ahụ n’ebe anyị nọ mgbe ụfọdụ? Ọ̀ dị mgbe ọ bụla anyị na-ata Jehova ụta maka nsogbu ndị na-apụta n’ihi na anyị na-eleghara ntụziaka ya dị iche iche anya?—Ilu 19:3.

Ịnagide Ibu Arọ nke Obi Amamikpe

Ka e mesịrị, Devid wetaara onwe ya oké ibu arọ nke obi amamikpe site n’ime mmehie dị oké njọ megide ụkpụrụ omume ọma ndị nke Jehova. N’oge a Devid agbahapụworị ọrụ dịịrị ya iduru ndị ikom ya jee agha. Ọ nọdụrụ na Jerusalem mgbe ha gawara ịlụ agha. Nke a dujere n’oké nsogbu.—2 Samuel 11:1.

Eze Devid hụrụ Bat-sheba ahụ mara mma ka ọ na-asa ahụ. O sooro ya nwee mmekọahụ, o wee tụrụ ime. (2 Samuel 11:2-5) Iji gbalịa ikpuchi omume ọjọọ ahụ, o mere ndokwa ka di ya, bụ́ Ụraịa, si n’ọgbọ agha lọta na Jerusalem. Ụraịa jụrụ isoro nwunye ya nwee mmekọrịta alụmdi na nwunye ebe Israel nọ na-alụ agha. (2 Samuel 11:6-11) Ugbu a Devid kpebiri iji ụzọ ọjọọ na nke aghụghọ mee ihe iji kpuchie mmehie ya. O mere ndokwa ka ndị ha na Ụraịa so na-alụ agha hapụ Ụraịa n’ebe dị ize ndụ n’agha ahụ ka e wee gbuo ya. Mmehie na-awụ akpata oyi n’ahụ, nke jọgburu onwe ya!—2 Samuel 11:12-17.

N’ezie, ka e mesịrị, Devid zara ajụjụ maka mmehie ya, e kpughekwara ya. (2 Samuel 12:7-12) Gbalịa iji uche chee banyere oké mwute na obi amamikpe nke Devid na-aghaghị inweworị mgbe ọ ghọtara ịdị njọ nke ihe o meworo n’ihi agụụ mmekọahụ ya. Echiche nke ọdịda ya pụrụ irikpuworị ya, karịsịa n’ihi na ọ bụ nwoke nke na-enwekarị mmetụta uche, nke ihe na-emetụ n’ahụ. Ọ pụrụ nnọọ inweworị mmetụta nke abaghị n’ihe ma ọlị!

Otú ọ dị, Devid kwetara mmejọ ya ngwa ngwa, na-agwa Netan onye amụma, sị: “Emehiewo m megide Jehova.” (2 Samuel 12:13) Abụ Ọma nke 51 na-akọrọ anyị mmetụta o nwere na otú o si rịọ Jehova Chineke ka ọ sachaa ya ma gbaghara ya. O kpere ekpere, sị: “Sụchaa m nke ọma dị ka ákwà ka ajọ omume m pụọ n’ime m, meekwa ka m si ná mmehie m dị ọcha. N’ihi na mụ onwe m maara njehie m nile: mmehie m dịkwa n’ihu m mgbe nile.” (Abụ Ọma 51:2, 3) N’ihi na o chegharịrị n’eziokwu, o nwere ike iwuliteghachi mmekọrịta siri ike, nke chiri anya nke ya na Jehova. Devid etinyeghị uche ya ná mmetụta nile nke ịkwa ụta na abaghị n’ihe. Ọ tụkwasịrị Jehova ibu arọ ya site n’iji ịdị umeala n’obi kweta mmejọ ya, na-egosipụta ezi nchegharị, ma na-ekpesi ekpere ike maka mgbaghara Jehova. O nwetaghachiri ihu ọma Chineke.—Abụ Ọma 51:7-12, 15-19.

Ịnagide Mgba Okpuru

Nke a na-edute anyị n’ihe merenụ nke kpaliri Devid ide Abụ Ọma nke 55. Ọ nọ n’oké nrụgide mmetụta uche. “Ọ na-egbusi mkpụrụ obi m mgbu ike n’ime m,” ka o dere, “oké ụjọ nile nke ọnwụ adakwasịwokwa m.” (Abụ Ọma 55:4) Gịnị kpatara ihe mgbu a? Absalọm, bụ́ nwa nwoke Devid, emeworị atụmatụ iji aghụghọ nara Devid ọbụbụeze ahụ. (2 Samuel 15:1-6) Mgba okpuru a nke nwa ya nwoke gbara ya siri nnọọ ike odidi, ma ihe mere ka ọ ka njọ bụ na onye ndụmọdụ Devid kasị tụkwasị obi, nwoke aha ya bụ́ Ahitofel, sonyeere ịgba izu ahụ megide Devid. Ọ bụ Ahitofel ka Devid na-akọwa n’Abụ Ọma 55:12-14. Dị ka ihe si n’ịgba izu mmegide na ịgba mgba okpuru ahụ pụta, Devid aghaghị isi na Jerusalem gbapụ. (2 Samuel 15:13, 14) Lee aha obi mgbu nke ahụ na-aghaghị ịkpataworo ya!

Ma, o kweghị ka oké mmetụta uche na mwute ya mee ka ntụkwasị obi na obi ike o nwere n’ebe Jehova nọ ghara isi ike. O kpegaara Jehova ekpere ka o mebie atụmatụ nke ndị ahụ gbara izu mmegide. (2 Samuel 15:30, 31) Ọzọkwa anyị na-ahụ na Devid afọnyeghị nnọọ aka n’ụkwụ chere ka Jehova rụọ ọrụ ahụ nile. Ozugbo ohere dapụtara, o mere ihe ọ pụrụ ime iji lụsoo izu ahụ a gbara megide ya ọgụ. O zipụrụ onye ndụmọdụ ya ọzọ, bụ́ Hushaị, laghachi na Jerusalem ime ka a ga-asị na o sonyeere ndị ahụ gbara izu mmegide, ọ bụ ezie na o jere imebi ya. (2 Samuel 15:32-34) Site ná nkwado Jehova, atụmatụ a gara nke ọma. Hushaị dọghachiri ha azụ ka Devid wee nwee ike ịchịkọta ndị ibe ya ma hazie ihe iji chebe onwe ya.—2 Samuel 17:14.

Lee ka Devid ná ndụ ya nile na-aghaghị isiworị nwee ekele ná nlekọta nchebe nke Jehova tinyekwara ndidi ya na njikere ọ dị ịgbaghara! (Abụ Ọma 34:18, 19; 51:17) Ọ bụ n’iburu ọnọdụ a n’uche ka Devid ji jiri obi ike na-agba anyị ume n’oge ihe isi ike anyị ịgakwuru Jehova maka enyemaka, ‘ịtụkwasị Jehova ibu arọ anyị nile.’—Tụlee 1 Pita 5:6, 7.

Wulite ma Nọgide Soro Jehova Na-enwe Mmekọrịta Siri Ike, nke Ntụkwasị Obi

Olee otú anyị ga-esi soro Jehova nwee ụdị mmekọrịta ahụ ya na Devid nwere, mmekọrịta nke kwagidere ya n’oge oké ule na mkpagbu? Anyị na-ewulite ụdị mmekọrịta ahụ site n’ịbụ ndị mmụta dị uchu nke Okwu Chineke, bụ́ Bible. Anyị ga-ekwe ka o zi anyị iwu, ụkpụrụ, na àgwà ya nile. (Abụ Ọma 19:7-11) Ka anyị na-atụgharị uche n’Okwu Chineke, anyị na-abịa ya nso karị ma na-amụta ịtụkwasị ya obi kpam kpam. (Abụ Ọma 143:1-5) Anyị na-eme ka mmekọrịta ahụ dị omimi ma sie ike karị ka anyị na ndị anyị na ha na-efekọ ofufe na-akpakọrịta ịbụ ndị Jehova zikwuru ihe. (Abụ Ọma 122:1-4) Anyị na-emesi mmekọrịta anyị na Jehova ike site n’ekpere sitere n’obi.—Abụ Ọma 55:1.

N’eziokwu, Devid, dị ka anyị, nwere ịda mbà n’obi mgbe mmekọrịta ya na Jehova na-esirughị ike dị ka o kwesịrị ịdị. Mmegbu pụrụ ime ka anyị ghọọ ‘ndị nzuzu.’ (Eklisiastis 7:7) Ma Jehova na-ahụ ihe na-emenụ, ọ makwaara ihe dị n’ime obi anyị. (Eklisiastis 4:1; 5:8) Ọ dị anyị mkpa ịrụsi ọrụ ike iji mee ka mmekọrịta nke anyị na Jehova nọgide na-esi ike. Mgbe ahụ, n’agbanyeghị ibu arọ anyị na-aghaghị ibu, anyị pụrụ ịdabere n’ebe Jehova nọ ibelata nrụgide ahụ ma ọ bụ inye anyị ume iji nagide ọnọdụ anyị. (Ndị Filipaị 4:6, 7, 13) Ihe dị mkpa bụ anyị ịnọ Jehova nso. Mgbe Devid mere nke a, ọ nọ ná nchebe n’ụzọ zuru ezu.

Ya mere, ihe ọ sọkwara ọnọdụ gị bụrụ, ka Devid na-ekwu, na-atụkwasị Jehova ibu arọ gị mgbe nile. Mgbe ahụ anyị ga-ahụ eziokwu dị ná nkwa ahụ bụ́: “Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 55:22.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya