Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 6/8 p. 15-17
  • Ị Bara Uru n’Anya Chineke!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Bara Uru n’Anya Chineke!
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Echiche Ziri Ezi Banyere Uru Anyị Bara
  • Obi E Tiwara Etiwa, Mmụọ A Zọpịara Azọpịa
  • “Ọnụ Ahịa Unu Onwe Unu Karịrị nke Ọtụtụ Egwele”
  • Onye Na-ahụ Uru Anyị Bara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Jehova Agụwo “Ntutu Nile nke Isi Unu Ọnụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ọ Dịghị Ihe Pụrụ “Ikewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke”
    Bịaruo Jehova Nso
  • “Chineke Bụ Ịhụnanya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 6/8 p. 15-17

Echiche nke Bible

Ị Bara Uru n’Anya Chineke!

“MMETỤTA NKE ABAGHỊ URU ANỌWO NA-ENYE M NSOGBU N’IHE KA UKWUU NÁ NDỤ M,” KA OTU NWANYỊ BỤ́ ONYE KRAỊST DERE. “N’AGBANYEGHỊ OTÚ M HỤRURU JEHOVA N’ANYA MA Ọ BỤ OTÚ M TINYERURU MGBALỊ IJERE YA OZI, ANA M ECHEKARỊ NA O ZUGHỊ EZU.”

Ọ̀ DỊ onye ị maara na-alụso mmetụta miri emi nke erughị eru ma ọ bụ abaghị uru ọgụ? Ka ị̀ na-enwe mmetụta dị otú ahụ mgbe ụfọdụ? Mmetụta ndị dị otú ahụ abụghị ihe ọhụrụ, ọbụna n’etiti ndị na-efe Chineke n’ikwesị ntụkwasị obi. Ọ dịghị onye na-adịghị enwe mmetụta nke ibi “[n’oge] dị oké egwu.” Ọtụtụ abụrụwo ndị e leghaara anya na ndị “ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya”—àgwà zuru ebe nile na “mgbe ikpeazụ,” metọrọ. (2 Timoti 3:1-5) Ahụmahụ ndị dị otú ahụ na-egbu mgbu n’obi pụrụ inwe mmetụta ọjọọ n’ahụ mmadụ, na-akpata echiche nke abatụghị nnọọ uru.

N’ọnọdụ ndị ọzọ, echiche na-ezighị ezi pụrụ ịbụ n’ihi ndị mmadụ isetịpụrụ onwe ha ụkpụrụ ndị dị oké elu. Enweghị ike iru ụkpụrụ ndị a na-akpatakwuru ha echiche nke abatụghị nnọọ uru. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, ọ pụrụ isiri ndị na-alụso echiche nke abaghị uru ọgụ ike ịhụ ihe mere Chineke—ma ọ bụkwanụ onye ọ bụla ọzọ—ji hụ ha n’anya. N’ezie, ha pụrụ ọbụna ikwere na a pụghị nnọọ ịhụ ha n’anya.

Ma ọ bụghị otú ahụ ka Jehova Chineke si ele ya anya! N’Okwu ya, Jehova na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị nọrọ na nche maka “ụzọ aghụghọ” nke Onye Iro ya, bụ́ Setan bụ́ Ekwensu. (Ndị Efesọs 6:11, Jewish New Testament) Setan na-eji ụzọ aghụghọ ya anwa ime ka anyị kwụsị ife Chineke anyị. Iji mezuo nke ahụ, Setan na-akwalite echiche nke bụ́ na anyị abaghị uru, na Jehova apụghị ịhụ anyị n’anya ma ọlị. Ma Setan bụ “onye ụgha”—n’eziokwu, “nna ya.” (Jọn 8:44) N’ihi ya, anyị agaghị ekwe ka ụzọ aghụghọ ya megharịa anyị anya! Na Bible, Jehova zaara ọnụ ya, na-emesi anyị obi ike banyere uru anyị bara n’anya ya.

Echiche Ziri Ezi Banyere Uru Anyị Bara

Bible na-adọ aka ná ntị banyere mmetụta ọjọọ nkụda mmụọ pụrụ inwe n’ahụ anyị. Ilu 24:10 na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị dị umengwụ n’ụbọchị ahụhụ, ike gị pere mpe.” Anyị inwe echiche na-ezighị ezi ruo ogologo oge pụrụ ime ka ike gwụ anyị, na-eme ka anyị ghara ịdị ike ma bụrụ ndị pụrụ ịdị mfe nnweta. Ị pụrụ ijide n’aka na Setan maara nke a nke ọma. Ọ na-enye nsogbu n’obi ma ọ bụrụ na anyị na-enwe echiche nke abaghị uru. Otú ọ dị, mgbe Setan nwara iji echiche dị otú ahụ mee ihe maka uru onwe ya, ọ na-eme ka ọnọdụ ahụ ka njọ.

Ya mere, ọ dị mkpa ka anyị nwee echiche dị mma, nke ziri ezi banyere uru anyị bara. “Aga m agwa onye ọ bụla n’ime unu,” ka Pọl onyeozi na-agba ume, “ka ọ ghara ibuli onwe ya elu karịa uru ọ bara n’ezie; kama ka o jiri nlezianya tụọ onwe ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.” (Ndị Rom 12:3) Nsụgharị ọzọ na-agụ otú a: “Aga m agwa onye ọ bụla n’ime unu ka ọ ghara ịtụ onwe ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ karịa uru ọ bara n’ezie, kama ka o jiri nlezianya mara otú ọ hà.” (Charles B. Williams) N’ihi ya akwụkwọ nsọ na-agba anyị ume inwe echiche ziri ezi banyere onwe anyị. N’otu akụkụ, anyị aghaghị ịnọrọ na nche megide ịdị nganga; n’akụkụ nke ọzọ, anyị kwesịrị ịgbalị ịghara ịdịbiga umeala ókè, n’ihi na Pọl na-egosi na iji nwee uche zuru okè, ọ dị mkpa ka anyị chetụ echiche banyere onwe anyị. Ee, site n’ike mmụọ nsọ Chineke, Pọl na-egosi na onye ọ bụla n’ime anyị bara uru n’anya Jehova.

Inwe ùgwù onwe onye pụtakwara ìhè n’okwu Jisọs mgbe o kwuru, sị: “Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Okwu bụ́ “dị ka onwe gị” na-egosi na anyị aghaghị inwetụ ùgwù onwe onye. N’ezie, anyị nwere ebe ndị anyị na-adịghị ike, na-emehiekwa ihe. Ma mgbe anyị na-agbalị ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, na-enwe mwute banyere adịghị ike anyị, na-arịọkwa ya ka ọ gbaghara anyị, anyị ka pụrụ ịdị na-enwetụ ùgwù onwe onye. Obi anyị nke na-ama anyị ikpe pụrụ ịnọgide na-eche ihe dị iche, ma cheta, “Chineke ka obi anyị ukwuu.” (1 Jọn 3:20) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Jehova na-ele anyị anya n’ụzọ pụrụ ịdị nnọọ iche n’ụzọ anyị si ele onwe anyị anya.

Obi E Tiwara Etiwa, Mmụọ A Zọpịara Azọpịa

Ọbụ abụ bụ́ Devid dere, sị: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) N’ikwu okwu banyere amaokwu a, akwụkwọ bụ́ Matthew Henry’s Commentary on the Whole Bible na-ekwu, sị: “Ọ bụ ihe e ji mara ndị ezi omume . . . na ha na-abụ ndị obi ha tiwara etiwa na ndị nwere mmụọ nchegharị, ya bụ, ndị mmehie mere ka ha dị umeala n’obi, ndị na-enwekwaghị ùgwù onwe onye; ha abachaghị uru n’anya onwe ha, bụrụkwa ndị na-enweghị obi ike n’uru ha bara.”

Ndị “obi ha tiwara etiwa” ma ọ bụ ndị “a zọpịaworo n’ime mmụọ ha” pụrụ iche na Jehova anọghị ha nso nakwa na o nweghị nnọọ ihe ha bụ nke na Jehova ga-echewa banyere ha. Ma ọ bụghị otú ahụ. Okwu Devid na-emesi anyị obi ike na Jehova anaghị ahapụ ndị “wedara onwe ha n’ala.” Chineke anyị dị ọmịiko maara na n’oge ndị dị otú ahụ, anyị chọrọ ya karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ọ nọkwa nso.

Tụlee otu ihe atụ. Afọ ole na ole gara aga otu nne ji ọsọ kpọga nwa ya nwoke dị afọ abụọ n’ụlọ ọgwụ n’ihi na ụkwara jisiri ya ike. Mgbe ndị dọkịta lesịrị nwata ahụ ahụ, ha gwara nne ya na ọ ga-anọbọ chi n’ụlọ ọgwụ. Olee ebe nne ya rahụrụ n’abalị ahụ? N’otu oche dị n’ọnụ ụlọ ụlọ ọgwụ ahụ, n’akụkụ àkwà nwa ya nwoke. Obere nwa ya nwoke na-arịa ọrịa, ọ ghaghịkwa ịnọ ya nso. N’ezie anyị pụrụ ọbụna ịtụ anya ihe karịrị nke ahụ n’aka Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya, bụ́ onye e mere anyị n’oyiyi ya! (Jenesis 1:26; Aịsaịa 49:15) Okwu na-emetụ n’ahụ n’Abụ Ọma 34:18 na-emesi anyị obi ike na mgbe anyị nwere “obi e tiwara etiwa,” Jehova, dị ka nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya, “nọ nso”—nọrọ na nche, na-ege ntị, dịkwa njikere inye aka mgbe nile.—Abụ Ọma 147:1, 3.

“Ọnụ Ahịa Unu Onwe Unu Karịrị nke Ọtụtụ Egwele”

Mgbe ọ na-eje ozi n’elu ala, Jisọs kpughere ọtụtụ ihe banyere echiche na mmetụta Jehova, gụnyere mmetụta Jehova na-enwe banyere ndị ohu Ya nọ n’elu ala. Ihe karịrị otu ugboro, Jisọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike banyere uru ha bara n’anya Jehova.—Matiu 6:26; 12:12.

Dị ka ihe atụ, n’ime ihe atụ iji gosi uru onye ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ ya bara, Jisọs kwuru, sị: “Á dịghị ere egwele abụọ n’otu penny? ma otu n’ime ha agaghị ada n’ala ma Nna unu ekweghị: ma ọbụna agịrị isi nile nke isi unu ka a gụworo. Ya mere, unu atụla egwu; ọnụ ahịa unu onwe unu karịrị nke ọtụtụ egwele.” (Matiu 10:29-31) Tụlee ihe okwu ndị ahụ na-aghaghị ịpụta nye ndị na-ege Jisọs ntị na narị afọ mbụ.

Ihe àmà na-egosi na egwele so ná nnụnụ ndị kasị ọnụ ala n’ime nnụnụ nile a na-eri eri. A na-atụpụsịkarị obere nnụnụ ndị a ábụ́bà, gaa ha n’osisi, mịakwa ha n’ọkụ dị ka suya. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jisọs ahụwo ndị inyom dara ogbenye n’ọmà ahịa ka ha na-agụ mkpụrụ ego ha iji mara egwele ole ha pụrụ ịzụta. A na-ewere nnụnụ ndị ahụ dị ka ndị na-adịghị nnọọ ihe ha ruru nke na mmadụ pụrụ iji otu mkpụrụ ego ọnụ ahịa ya dị ala (n’ụzọ nkịtị, otu assarion, na-apụghị ịzụta ihe cent ise pụrụ ịzụta), zụta egwele abụọ.

Jisọs nyeghachiri ihe atụ a n’oge ọzọ—ma o nyere ya n’ụzọ dịtụ iche. Dị ka Luk 12:6 si kwuo, Jisọs sịrị: “Á dịghị ere egwele ise na penny abụọ?” Cheedị banyere ya. Mmadụ jiri otu mkpụrụ ego ọnụ ahịa ya dị ala zụta egwele abụọ. Ma ọ bụrụ na ọ dị njikere imefu mkpụrụ ego abụọ, ọ ga-azụta ọ bụghị egwele anọ kama ise. E ji otu nnụnụ nke mezuru ya ise mezie ya dị ka a ga-asị na ọ dịtụghị ihe o ruru. “Ma,” ka Jisọs kwuru, “a dịghị echezọ otu n’ime ha [ọbụna nke ahụ e ji mezie ahịa] n’ihu Chineke.” N’ịkọwa ihe atụ ahụ, Jisọs kwubiri, sị: “Ọnụ ahịa unu karịrị nke ọtụtụ egwele.” (Luk 12:7) Lee ka okwu ahụ na-aghaghị isiworị gbaa ndị na-ege ya ntị ume!

Ị̀ ghọtara isi ihe dị n’ihe atụ ahụ na-enye obi ụtọ nke Jisọs? Ọ bụrụ na Jehova na-ewere ọbụna ụmụ obere nnụnụ dị ka ihe ndị bara uru, lee ka ọ na-aghaghị isi hụ ndị ohu ya nọ n’elu ala n’anya karị! Jehova ma onye ọ bụla n’ime anyị n’etiti ìgwè mmadụ. Onye nke ọ bụla n’ime anyị bara uru otú ahụ n’anya Jehova nke na ọ na-arịba ọbụna ihe kasị nta banyere anyị ama—ọ gụrụ agịrị isi anyị nile ọnụ n’otu n’otu.

Otú ọ dị, Setan ga-anọgide na-eji “ụzọ aghụghọ” ya—dị ka iji echiche nke abaghị uru na-achọ uru onwe ya—eme ihe iji mee ka anyị kwụsị ijere Jehova ozi. Ma ekwela ka Setan merie! Cheta nwanyị ahụ bụ́ onye Kraịst e hotara ná mmalite. Otu isiokwu dị na magazin Ụlọ Nche nke dọrọ aka ná ntị banyere mgbalị Setan na-eme iji echiche anyị achọ uru onwe ya nyeere ya aka.a Ọ na-ekwu, sị: “Ọ dịtụghị mgbe m matara na Setan na-anwa iji echiche m na-enwe kụda m aka. Ịmata nke a na-akwali m ịlụso echiche a ọgụ. Ugbu a apụrụ m iguzogide mwakpo ndị a Setan na-eme, n’obi ike.”

Jehova “makwaara ihe nile.” (1 Jọn 3:20) Ee, ọ ma ihe anyị na-edi ugbu a. Ọ makwa ihe mere anyị n’oge gara aga bụ́ nke pụrụ imebiworị ùgwù anyị. Cheta, ọ bụ otú Jehova si ele anyị anya dị mkpa! N’agbanyeghị ókè anyị pụrụ icheru na a pụghị ịhụ anyị n’anya ma ọ bụ na anyị abaghị uru, Jehova na-emesi anyị obi ike na onye ọ bụla n’ime ndị ohu ya bara uru nye ya. Anyị pụrụ ikweta ihe Jehova kwuru, n’ihi na, n’adịghị ka Onye Iro ya, Chineke ‘apụghị ikwu okwu ụgha.’—Taịtọs 1:2.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee isiokwu bụ́ “Ị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Chineke!” dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke April 1, 1995, peji nke 10-15.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 16]

Dị ka nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya, Jehova nọ ndị ihe na-ewute n’obi nso

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ọ bụrụ na Jehova adịghị echezọ egwele, olee otú ọ ga-esi chezọọ gị?

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Lydekker

Illustrated Natural History

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya