Iwe M Ka Ọ̀ bụ Ahụ Ike M?
ÒNYE bụ onye na-adịghị ewe iwe? Ọ na-eme anyị nile. Mgbe ụfọdụ ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke iwe pụrụ izi ezi. Ma, n’ikwu eziokwu, ọ̀ bụ na ọ bụghị eziokwu na ọtụtụ mgbe iwe anyị (ma ọ bụ ịdị ike ya) pụrụ ịbụ nke na-ezighị ezi?
Bible na-agwa anyị: “Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma: emela ka iwe gị dị ọkụ, ọ na-eduba nanị n’ime ihe ọjọọ.” (Abụ Ọma 37:8) Ruo ókè hà aṅaa ka ndụmọdụ dị otú ahụ bụ ihe amamihe? Ọ̀ pụrụ imetụta ahụ ike gị ruo ogologo oge?
N’akụkụ “Ahụ Ike” ya, akwụkwọ The New York Times rịbara ama, sị:
“Ndị na-etiwapụkarị n’ajọ ọnụma ma ọ bụ ndị na-anọdụ na-asụ n’iwe maka ihe ọ bụla gahiere pụrụ ịdị na-eme ihe karịrị ime onwe ha ka ha ghara inwe obi ụtọ. Ha pụrụ ịdị na-egbu onwe ha.
“Ndị nchọpụta achịkọtawo ọtụtụ ihe ndekọ n’oge na-adịbeghị anya bụ́ ndị na-atụ aro na ịdị na-ewe iwe mgbe nile na-ebibi ahụ nke ukwuu nke na e debere ya na ise sịga, ibu oké ibu na nri na-eme ka mmadụ dibiga arọ ókè n’otu ọkwá ma ọ bụ n’ọkwá ka elu dị ka ihe ize ndụ dị ike maka ọnwụ nnwụchu.
“‘Ihe ọmụmụ ndị anyị mere na-egosi na iwe esemokwu, nke inyo mmadụ enyo, na ihe ize ndụ ọ bụla ọzọ nye ahụ ike anyị maara banyere ya hà otu,’ ka Dr. Redford Williams, onye nnyocha banyere ọgwụ akparamagwa n’ụlọ ọgwụ Duke University Medical Center, na-ekwu.”
Ihe ọmụmụ ndị e mere na-egosi na ndị na-emeghachi omume n’ihi ebe e nwere ihe isi ike n’ụzọ nke ndụ na-ewepụta mmiri ọgwụ na-adị n’ime ahụ na-eme ka e nwee nrụgide karị. Ntiwapụ ha mgbe nile pụrụ ịkpata ahaghị nhata n’etiti ụdị ndị na-echebe echebe na ndị na-emeerụ ahụ nke abụba cholesterol, na-etinye ha n’ihe ize ndụ nke ọrịa usoro oruru ọbara.
Ụfọdụ pụrụ ịzaghachi sị, ‘Ma nke ahụ bụ nnọọ otú m dị’ ma ọ bụ, ‘Otú ahụ ka e si zụlite m.’ Ka o sina dị, nke ahụ apụtaghị na ị pụghị ịgbanwe, site n’iji obi eziokwu na-etinye ndụmọdụ Chineke n’ọrụ. N’ime Bible nke gị, lee ndụmọdụ ya banyere iwe na ọnụma bụ́ ndị e dekọrọ n’Ilu 14:29, 30; 22:24, 25; Ndị Efesọs 4:26; Jemes 1:19, 20.
Itinye amamihe ahụ nke Chineke n’ọrụ pụrụ imeziwanye ahụ ike gị ma gbatịkwuo ndụ gị. Akwụkwọ Times ahụ kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị nchọpụta sịrị na ndị iwe na-ewekarị pụrụ ibelata ihe ize ndụ nke ịnwụchu ọnwụ site n’ịgbanwe ụzọ mmeghachi omume ngwa ngwa ahụ, nke ise okwu.”