Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 9/15 p. 22
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ihe Ọma Agaghị Akọ Ndị Na-achọ Jehova”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Jehova—‘Onye Na-emere Ndị Ya Ụzọ Mgbapụ’ n’Oge Baịbụl
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • “Kụziere M Ime Uche Gị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Dabere Na Mmụọ Chineke N’ime Ihe Banyere Mgbanwe Ndị A Na-enwe Ná Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 9/15 p. 22

AJỤJỤ NDỊ NA-AGỤ AKWỤKWỌ ANYỊ NA-AJỤ

Ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 37:25 na ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:33 ọ̀ pụtara na Jehova agaghị ekwe ka nri kọọ Onye Kraịst?

Devid kwuru, sị: “Ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.” O kwuru ihe a n’ihi ihe ndị o ji anya ya hụ. Ọ ma na Chineke na-elekọta ndị ya mgbe niile. (Ọma 37:25) Ma, ihe ahụ o kwuru apụtaghị na e nwetụbeghị ohu Jehova ihe kọrọ ma ọ bụkwanụ na e nweghị mgbe ihe ga-akọ ohu Jehova.

E nwere mgbe ụfọdụ ihe siiri Devid ezigbo ike. Otu n’ime ha bụ mgbe Sọl na-achụgharị ya. Nri Devid ji gwụrụ, ya agwa Ahimelek ka o nye ya achịcha ya na ndị so ya ga-ata. (1 Sam. 21:1-6) N’oge ahụ, Devid enweghị nri ọ ga-eri. Ma, ọ ma na Jehova ahapụbeghị ya. N’eziokwu, o nweghị ebe Baịbụl kwuru na Devid rịọrọ arịrịọ ka o nwee ike inweta ihe ọ ga-eri.

Na Matiu 6:33, Jizọs kwere ndị ji obi ha niile na-ejere Chineke ozi nkwa na ọ bụrụ na ha eburu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, Jehova ga-egboro ha mkpa ha. Ọ sịrị: “Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile [ya bụ, ma nri ma ihe ọṅụṅụ ma uwe].” Ma, Jizọs kwukwara ihe gosiri na agụụ nwere ike ịgụ “ụmụnna” ya n’ihi mkpagbu a ga-akpagbu ha. (Mat. 25:35, 37, 40) Ụdị ihe ahụ mere Pọl. Mgbe ụfọdụ, agụụ gụrụ ya, akpịrị akpọọkwa ya nkụ.—2 Kọr. 11:27.

Ndị agụụ na-agụgbu n’ogige ịta ahụhụ

Jehova gwara anyị na a ga-esi n’ụzọ dị iche iche kpagbuo anyị. O nwere ike ikwe ka ihe ụfọdụ kọọ anyị ka anyị na-agbalị ime ka o doo anya na ihe ahụ Ekwensu kwuru gbasara Chineke na ụmụ mmadụ bụ ụgha. (Job 2:3-5) Mgbe ụfọdụ, ụmụnna anyị na-ata ahụhụ n’ihi mkpagbu a na-akpagbu ha. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ụmụnna ndị ọchịchị Nazi tinyere n’ogige ịta ahụhụ. Otu ụzọ ha si rụsa ha arụrụala ka ha kwụsị irubere Chineke isi bụ na ha anaghị ekwe enye ha nri ga-ezuru ha. Ma, ụmụnna ndị ahụ rubeere Jehova isi, ọ hapụghịkwa ha. O kwere ka ọnwụnwa bịara ha, otú ahụ ọ na-ekwe ka ọnwụnwa dị iche iche bịara Ndị Kraịst niile taa. Ma, o doro anya na Jehova na-akwado ndị niile na-ata ahụhụ n’ihi aha ya. (1 Kọr. 10:13) Anyị kwesịrị icheta ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 1:29. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụ unu ka e nyere ihe ùgwù ahụ n’ihi Kraịst, ọ bụghị naanị ka unu nwee okwukwe n’ebe ọ nọ, kama ka unu taakwa ahụhụ n’ihi ya.”

Jehova kwere nkwa na ya agaghị ahapụ ndị ohu ya. Dị ka ihe atụ, Aịzaya 54:17 kwuru, sị: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma.” Nkwa a na nkwa ndị yiri ya gosiri na Jehova agaghị ekwe ka e kpochapụ ndị ya. Ma, o nwere ike ikwe ka ọnwụnwa bịara Onye Kraịst, ma ọ bụdị kwe ka e gbuo ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya