Ebere Jehova Na-azọpụta Anyị Pụọ N’obi Nkoropụ
“Meere m amara, Chineke, dị ka ebere gị si dị: dị ka ịba ụba nke obi ebere gị nile si dị hichapụ njehie m nile.”—ABỤ ỌMA 51:1.
1, 2. Olee otú mmehie dị oké njọ pụrụ isi metụta otu n’ime ndị na-ejere Jehova ozi?
APỤGHỊ imebi iwu Jehova na-enwetaghị ntaramahụhụ ya. Lee ka nke ahụ si apụta ìhè ma ọ bụrụ na anyị emee mmehie dị oké njọ megide Chineke! Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ijeworo Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ, imebi iwu ya pụrụ ịkpata oké nchekasị ma ọ bụ nkụda mmụọ mmiri emi. Ọ pụrụ ịdị anyị ka Jehova ahapụwo anyị nakwa na anyị erukwaghị eru ijere ya ozi. Mmehie anyị pụrụ iyi ka nnukwute igwe ojii nke na-ekpuchi ìhè nke ihu ọma Chineke.
2 Eze Devid nke Israel oge ochie nwetara onwe ya n’ọnọdụ dị otú ahụ n’otu oge. Olee otú ọnọdụ a si bilite?
Nzọhie Ụkwụ Pụrụ Iduba n’Oké Mmehie
3, 4. Gịnị mere Eze Devid n’oge ihe na-aga nke ọma?
3 Devid hụrụ Chineke n’anya ma ọ zọhiere ụkwụ bụ́ ndị dugara n’ajọ mmehie. (Tụlee Ndị Galetia 6:1.) Nke a pụrụ ime mmadụ ọ bụla na-ezughị okè, karịsịa ma ọ bụrụ na o nwere ike n’ahụ ndị ọzọ. Dị ka eze ihe na-agara nke ọma, Devid bụ onye a ma ama na onye nwere ike. Ònye ga-anwa anwa ịgbagha okwu ya? Ndị ikom dị ike dị njikere ime ihe ọ bụla ọ chọrọ, ndị mmadụ na-ejikwa ịnụ ọkụ n’obi na-eme ihe o kwuru. Ma, Devid mehiere site n’ịlụtara onwe ya ọtụtụ nwunye na ịgụ ndị ahụ ọnụ.—Deuterọnọmi 17:14-20; 1 Ihe Emere 21:1.
4 N’oge nke a nke ụba ihe onwunwe, Devid mere mmehie ndị dị oké njọ megide Chineke na mmadụ. Leenụ, otu mmehie dugara n’ọzọ dị ka eriri ákwà e kekọtara ọnụ nke Setan kpara! Ka ndị Israel ibe ya na-alụso ndị Amọn agha, site n’elu ụlọ ya Devid kiriri nwunye Uraịa mara mma bụ́ Batsheba ka ọ na-asa ahụ. Ebe Uraịa nọ n’agha, eze mere ka a kpọta nwanyị ahụ n’òbí ya wee kwaso ya iko. Cheedị echiche otú ahụ si maa ya jijiji mgbe ọ nụrụ na ọ dị ime! Devid ziri ozi ka a kpọọ Uraịa, na-enwe olileanya na ọ ga-anọnyere Batsheba n’abalị ahụ wee lee nwa ahụ anya dị ka nke ya. Ọ bụ ezie na Devid mere ka ọ ṅụbiga mmanya ókè, Uraịa jụrụ iso ya dinaa. Ugbu a ka obi ya na-akụsi ike n’egwu, Devid zigaara ọchịagha bụ Joab iwu nzuzo nke itinye Uraịa n’ihu agha ebe ọ na-aghaghị ịnwụ. E gburu Uraịa n’agha, nwunye ọ hapụrụ rukwara újú dị ka ha si eme, Devid wee lụọ ya tupu ndị mmadụ amata banyere ime ọ dị.—2 Samuel 11:1-27.
5. Gịnị mere mgbe Devid mehiesịrị n’ebe Batsheba nọ, mmetụta dị aṅaa ka mmehie ya nile nwekwara n’ahụ ya?
5 Site n’onye amụma bụ́ Netan, Chineke kpughere mmehie Devid ndị a wee sị: “M na-eme ka ihe ọjọọ si n’ụlọ gị bilie imegide gị.” N’ihi ya, nwa Batsheba mụrụ nwụrụ. (2 Samuel 12:1-23) Nwa nwoke mbụ nke Devid, bụ́ Amnọn, dinara nwanne ya nwanyị nna ji ha abụọ bụ́ Tema n’ike, nwanne Tema nke nwoke wee gbuo ya. (2 Samuel 13:1-33) Nwa nwoke eze bụ́ Absalom nwara iweghara ocheeze n’ike ma menye nna ya ihere site n’iso ndị iko nwanyị Devid biri. (2 Samuel 15:1–16:22) Agha obodo kwụsịrị n’ọnwụ Absalom na n’iru újú ka ukwuu nye Devid. (2 Samuel 18:1-33) Otú ọ dị, mmehie nile nke Devid weturu ya ala ma mee ka ọ mata mkpa ọ dị ịnọ Chineke ya dị ọmịiko nso. Ọ bụrụ na anyị adahie, ka anyị jiri obi umeala chegharịa ma bịa Jehova nso.—Tụlee Jemes 4:8.
6. N’ihi gịnị ka ikpe ji ma Eze Devid karịsịa?
6 Ikpe mara Devid karịsịa n’ihi na ọ bụ onye na-achị Israel nke maara Iwu Jehova nke ọma. (Deuterọnọmi 17:18-20) Ọ bụghị fero nke Ijipt ma ọ bụ eze Babilọn nke na-enweghị ihe ọmụma dị otú ahụ, nke nwekwara ike ịnọ na-eme ihe ndị Chineke kagburu. (Tụlee Ndị Efesọs 2:12; 4:18.) Dị ka onye so ná mba a raara nye Jehova, Devid matara na ịkwa iko na igbu mmadụ bụ mmehie ndị dị oké njọ. (Ọpụpụ 20:13, 14) Ndị Kraịst makwaara iwu Chineke. Otú ọ dị, dị ka Devid, ụfọdụ n’ime ha na-emebi ya n’ihi mmehie e ketara eketa, adịghị ike mmadụ, na ọnwụnwa a na-eguzogideghị. Ọ bụrụ na nke ahụ emee onye ọ bụla n’ime anyị, ọ bụghị iwu na anyị ga-anọgide n’ọnọdụ gbara ọchịchịrị nke na-eme ka ọhụhụ ụzọ ime mmụọ anyị dị inyoghị inyoghị ma kpuchie anyị n’ime oké nkoropụ obi.
Nkwupụta Mmehie Na-eweta Nkuda Ume
7, 8. (a) Gịnị mere Devid mgbe ọ nwara ikpuchi mmehie ya nile? (b) N’ihi gịnị ka mmadụ ga-eji kwupụta ma hapụ mmehie ya?
7 Ọ bụrụ na ikpe ajọ mmebi nke iwu Chineke ama anyị, ọ pụrụ isiri anyị ike ikwupụta mmehie anyị, ọbụna nye Jehova. Gịnị pụrụ ime n’ọnọdụ ndị ahụ? N’Abụ Ọma nke 32, Devid kwetara, sị: “Mgbe m gbara nkịtị [kama ikwupụta mmehie], ọkpụkpụ m nile kara nká site n’ọgbụgbọ ụja m ogologo ụbọchị nile. N’ihi na ehihie na abalị aka gị [Jehova] dị arọ n’ahụ m: ume m gbanwere n’ihe ịkpọ nkụ nke ụgụrụ.” (Amaokwu nke 3, 4) Ịnwa ikpuchi mmehie ya na ịbịada akọ na uche nọ n’ikpe ọmụma mere ka ike gwụ Devid na-agahie agahie. Oké ahụhụ belatara ume ya nke ukwuu nke na o yiri ka osisi ụkọ mmiri ji nke na-enweghị mmiri na-enye ndụ. N’ezie, ọ pụrụ nnọọ inwewo mmetụta ọjọọ n’uche na n’elu ahụ. Ka o sina dị, ọ tụfuru ọṅụ ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị achọta onwe anyị n’ọnọdụ yiri ya, gịnị ka anyị kwesịrị ime?
8 Ikwupụtara Chineke mmehie pụrụ iweta mgbaghara na ikuru ume ndụ. “Ana m emerị ka ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m,” ka Devid bụrụ n’abụ. “M sịrị, M ga-ekwupụtara Jehova njehie m nile; gị onwe gị bupụkwara ajọ omume nke mmehie m.” (Abụ Ọma 32:5) Ị̀ na-ata ahụhụ n’ihi mmehie e kpuchiri ekpuchi? Ọ̀ bụ na ọ gaghị akasị mma ikwupụta ma hapụ ya ka i wee nata ebere Chineke? Gịnị mere ị gaghị akpọ ndị okenye ọgbakọ ma chọọ ọgwụgwọ ime mmụọ? (Ilu 28:13; Jemes 5:13-20) A ga-ahụta mmụọ nchegharị gị, mgbe oge na-agakwa, a ga-eweghachi ọṅụ gị nke ndị Kraịst. “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ onye e bupụworo njehie ya, onye e kpuchiworo mmehie ya,” ka Devid kwuru. “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ mmadụ nke Jehova na-adịghị agụrụ ya ajọ omume, bụ́ onye ọ dịghị aghụghọ ọ bụla dị na mmụọ ya.”—Abụ Ọma 32:1, 2.
9. Olee mgbe e dere Abụ Ọma nke 51, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
9 Devid na Batsheba ga-aza Jehova Chineke ajụjụ maka njehie ha. Ọ bụ ezie na a pụrụ imewo ka ha nwụọ n’ihi mmehie ha, Chineke meere ha ebere. O meere Devid ebere karịsịa n’ihi ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ. (2 Samuel 7:11-16) Àgwà nchegharị Devid n’ebe mmehie ya ndị metụtara Batsheba dị bụ nke a hụrụ n’Abụ Ọma nke 51. Ọ bụ eze ahụ nke na-akwa ụta dere abụ ọma nke a na-emetụ n’ahụ mgbe Netan onye amụma tụtesịrị akọ na uche ya n’otú mmebi o mebiri iwu Chineke hà. O were obi ike ka Netan dọrọ uche Devid gaa ná mmehie ya, ọbụna dị ka ndị okenye ndị Kraịst a họpụtara ahọpụta na-aghaghị inwe obi ike iji mee ihe ndị dị otú ahụ taa. Kama ịgọpụ n’ebubo ahụ na inye iwu ka e gbuo Netan, eze ahụ ji obi umeala kwupụta ya. (2 Samuel 12:1-14) Abụ Ọma nke 51 gosiri ihe ọ gwara Chineke n’ekpere banyere ihe nke a dị ihere, ọ dịkwa nnọọ mma maka ekpere ntụgharị uche, karịsịa ma ọ bụrụ na anyị adahiewo ma na-achọsi ebere Jehova ike.
Anyị Ga-aza Ajụjụ n’Ihu Chineke
10. Olee otú Devid pụrụ isi nwetaghachi onwe ya n’ụzọ ime mmụọ?
10 Devid achọghị ụzọ isi nye ihe ngọpụ maka mmehie ya kama ọ rịọrọ, sị: “Meere m amara, Chineke, dị ka ebere gị si dị: dị ka ịba ụba nke obi ebere gị nile si dị hichapụ njehie m nile.” (Abụ Ọma 51:1) Site n’ijehie, Devid gabigara ókè nile nke Iwu Chineke. Otú ọ dị, e nwere olileanya maka inwetaghachi onwe ya n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụrụ na Chineke emeere ya amara dị ka obi ebere Ya si dị, ma ọ bụ ịhụnanya nke na-anọgidesi ike n’ihe. Ụba nke obi ebere ndị mbụ nke Chineke nyere eze ahụ nwere nchegharị ihe ndabere maka okwukwe na Onye Mere ya ga-ehichapụ njehie ya nile.
11. Gịnị ka àjà nile nke Ụbọchị Mkpuchi Mmehie pụtara, gịnịkwa ka a chọrọ taa maka nzọpụta?
11 Site n’ihe atụ amụma nke àjà ndị a chụrụ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie sere onyinyo ya, Jehova mere ka a mara na ya nwere ụzọ isi hichapụ ndị nwere nchegharị pụọ ná mmehie ha. Anyị maara ugbu a na e setịpụụrụ anyị ebere na mgbaghara ya ná ndabere nke okwukwe anyị n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst. Ọ bụrụ na Devid, nke nwere nanị ihe atụ na ihe nnọchianya nke àjà a n’uche, pụrụ ịtụkwasị obi ebere na ebere ịhụnanya Jehova obi, lee ka ndị na-ejere Chineke ozi taa kwesịrị isi gosipụta okwukwe karị ná mgbapụta nke a na-enye maka nzọpụta ha!—Ndị Rom 5:8; Ndị Hibru 10:1.
12. Gịnị ka ime mmehie pụtara, oleekwa otú ngahie Devid si nwee mmetụta n’ahụ ya?
12 N’ịrịọ Chineke arịrịọ, Devid gbakwụnyere, sị: “Sụchaa m nke ọma dị ka ákwà ka ajọ omume m pụọ n’ime m, meekwa ka m si ná mmehie m dị ọcha. N’ihi na mụ onwe m maara njehie m nile: mmehie m dịkwa n’ihu m mgbe nile.” (Abụ Ọma 51:2, 3) Ime mmehie bụ erughị ọ̀tụ̀tụ̀ n’ihe banyere ụkpụrụ Jehova. Devid emewo nnọọ nke ahụ. Ma, ọ dịghị ka ogbu mmadụ ma ọ bụ onye na-akwa iko nke na-achọghị ịma banyere mmejọ ya, nke na-ata ahụhụ nanị n’ihi ahụhụ e nyere ya ma ọ bụ inwe ike ibute ọrịa. Dị ka onye hụrụ Jehova n’anya, Devid kpọrọ ihe ọjọọ asị. (Abụ Ọma 97:10) Mmehie ya na-asọ ya oyi, ọ chọkwara ka Chineke hichapụ ya pụọ na ya kpam kpam. Devid matara njehie ya nke ọma, nweekwa mwute miri emi na ya ekwewo ka ọchịchọ mmehie ya merie ya. Mmehie ya dị n’ihu ya mgbe nile, n’ihi na akọ na uche nọ n’ikpe ọmụma nke onye hụrụ Chineke n’anya adịghị ezu ike mgbe ọ bụla ruo mgbe e nwere nchegharị, nkwupụta mmehie, na mgbaghara Jehova.
13. N’ihi gịnị ka Devid pụrụ iji kwuo na ya emehiewo megide nanị Chineke?
13 Ịnakwere na ya ga-aza ajụjụ n’ihu Jehova, Devid sịrị: “Megide gị, nanị gị, ka m mehieworo, ọ bụkwa ihe jọrọ njọ n’anya gị ka m meworo: ka i wee bụrụ onye ezi omume mgbe ị na-ekwu okwu, dịkwa ọcha n’obi mgbe ị na-ekpe ikpe.” (Abụ Ọma 51:4) Devid emebiwo iwu Chineke, kparịa ọkwá onyeeze, ‘mesookwa Jehova n’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù n’ụzọ pụtara ìhè,’ na-ekpughepụ Ya nye nkọcha. (2 Samuel 12:14, NW; Ọpụpụ 20:13, 14, 17) Mmehie ndị Devid mere bụkwa ndahie megide ọha mmadụ nke Israel na ndị òtù ezinụlọ ya, dị nnọọ ka onye mmehie bụ onye e mere baptism na-akpata mwute ma ọ bụ ahụhụ taa n’ọgbakọ ndị Kraịst na n’etiti ndị a hụrụ n’anya. Ọ bụ ezie na eze ahụ nwere nchegharị maara na ya emehiewo megide ụmụ mmadụ ibe ya dị ka Uraịa, ọ ghọtara ibu ọrụ ka elu o nwere n’ebe Jehova nọ. (Tụlee Jenesis 39:7-9.) Devid nakweere na ikpe Jehova ga-abụ nke ezi omume. (Ndị Rom 3:4) Ọ dị ndị Kraịst mehieworo mkpa inwe otu echiche ahụ.
Ọnọdụ Ndị Siri Oké Ike
14. Ọnọdụ siri oké ike dị aṅaa ka Devid hotara?
14 Ọ bụ ezie na Devid anwaghị imere onwe ya ihe ngọpụ, o kwuru, sị: “Lee, n’ajọ omume ka a mụpụtara m; ọ bụkwa ná mmehie ka nne m tụụrụ ime m.” (Abụ Ọma 51:5) A mụpụtara Devid n’ajọ omume, nne ya nwekwara ihe mgbu nke ọmụmụ nwa n’ihi mmehie e ketara eketa. (Jenesis 3:16; Ndị Rom 5:12) Okwu ya apụtaghị na mmekọrịta alụmdi na nwunye kwesịrị ekwesị, ntụrụ ime na ọmụmụ nwa bụ mmehie, ebe ọ bụ Chineke mere ndokwa maka alụmdi na nwunye na ịmụ nwa; Devid adịghịkwa ezo aka ná mmehie ọ bụla kpọmkwem nke nne ya mere. A tụụrụ ime ya ná mmehie n’ihi na ndị mụrụ ya bụ ndị mmehie dị ka mmadụ nile na-ezughị okè.—Job 14:4.
15. Ọ bụ ezie na Chineke pụrụ ịtụle ọnọdụ ndị siri oké ike, gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime?
15 Ọ bụrụ na anyị emehiewo, anyị pụrụ ịgwa Chineke n’ekpere ọnọdụ ọ bụla siri oké ike nke pụrụ isowo kpata ngahie anyị. Ma ka anyị ghara ịgha amara Chineke ịbụ ihe ngọpụ maka omume rụrụ arụ ma ọ bụ jiri mmehie e ketara eketa dị ka ihe mkpuchi iji zere ibu ọrụ maka mmehie anyị. (Jud 3, 4) Devid nakweere ibu ọrụ maka ịnagide echiche ndị na-adịghị ọcha na ịdaba n’ọnwụnwa. Ka anyị kpee ekpere ka a ghara ịgbahapụ anyị nye ọnwụnwa ma mgbe ahụ mee ihe kwekọrọ n’ekpere dị otú ahụ.—Matiu 6:13.
Arịrịọ Maka Ime Ka A Dị Ọcha
16. N’àgwà dị aṅaa ka Chineke na-enwe obi ụtọ, oleekwa otú nke ahụ kwesịrị isi metụta akparamagwa anyị?
16 Ndị mmadụ pụrụ iyi ndị dị mma ndị nyefere Chineke onwe ha, ma ọ na-ele anya gabiga ihe dị n’elu wee hụ ihe ha bụ n’ime. Devid sịrị: “Lee, eziokwu n’akụkụ nile dị n’ime mmadụ atọwo gị [Jehova] ụtọ: ọ bụkwa n’akụkụ zoro ezo ka ị na-eme ka m mara amamihe.” (Abụ Ọma 51:6) Ikpe akwụbaghị aka ọtọ na nghọgbu mara Devid n’ịkpata ọnwụ Uraịa na ịnwa ikpuchi ihe ndị bụ eziokwu banyere ime Batsheba dị. Ka o sina dị, ọ maara na Chineke na-enwe obi ụtọ n’ime ihe n’eziokwu na ịdị nsọ. Nke a kwesịrị imetụta akparamagwa anyị n’ụzọ dị mma, n’ihi na Jehova ga-ama anyị ikpe ma anyị na-aghọ aghụghọ. (Ilu 3:32) Devid matakwara na ọ bụrụ na Chineke ‘ga-eme ka ọ mara amamihe,’ dị ka eze nwere nchegharị, ọ ga-enwe ike ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke ná ndụ ya nile fọrọnụ.
17. Gịnị ka ikpe ekpere maka iji hyssop mee ka a dị ọcha pụtara?
17 N’ihi na onye ọbụ abụ ahụ hụrụ mkpa enyemaka Chineke dị ya n’imeri ọchịchọ mmehie nile, ọ rịọkwuru, sị: “Ị ga-ewere hyssop wepụ mmehie m, m ga-adịkwa ọcha: ị ga-asụcha m dị ka ákwà, m ga-adịkwa ọcha karịa snow.” (Abụ Ọma 51:7) Tinyere ihe ndị ọzọ, osisi hyssop (ma eleghị anya marjoram, ma ọ bụ Origanum maru) so n’ihe e ji eme ihe n’ememe ime ka ndị nweburu ọrịa ekpenta dị ọcha. (Levitikọs 14:2-7) Ya mere o kwesịrị ekwesị ka Devid kpee ekpere ka e jiri hyssop mee ka ọ dị ọcha site ná mmehie ya. Echiche nke ịdị ọcha bụkwa nke e jikọrọ ya na arịrịọ ya ka Jehova sụchapụ ya dị ka ákwà ka o wee dị ọcha kpam kpam, na-enwu ọcha ọbụna karịa snow nke anwụrụ ma ọ bụ irighiri ihe ndị ọzọ na-etetọbeghị. (Aịsaịa 1:18) Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị na-ata ahụhụ ugbu a n’ihi nsogbu akọ na uche maka ngahie ọ bụla, ka anyị nwee okwukwe na ọ bụrụ na anyị ejiri nchegharị chọọ mgbaghara Chineke, ọ pụrụ ịsacha anyị ma mee ka anyị dị ọcha n’ihe ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs.
Arịrịọ Maka Mweghachi
18. Gịnị bụ ọnọdụ Devid tupu o chegharịa ma kwupụta mmehie ya, oleekwa otú ihe ọmụma banyere nke a pụrụ isi nyere anyị aka taa?
18 Onye Kraịst ọ bụla taworo ahụhụ akọ na uche nọ n’ikpe ọmụma pụrụ ịghọta okwu Devid: “Ị [Jehova] ga-eme ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; ka ọkpụkpụ nile ị gwepịaworo wee tegharịa egwú ọṅụ.” (Abụ Ọma 51:8) Tupu Devid echegharịa ma kwupụta mmehie ya, akọ na uche ya nọ ná nsogbu mere ka ọ bụrụ onye dị imere ebere. O nwetaghị obi ụtọ ọbụna n’abụ nile nke ite egwú ọṅụ na ịṅụrị ọṅụ nke ndị na-abụ abụ dị ụtọ na ndị egwú nwere nkà bụrụ. Ihe mgbu nke Devid mehierenụ nwere dị ilu nke ukwuu n’ihi amamikpe Chineke nke na ọ dị ka nwoke e gwepịaworo ọkpụkpụ ya n’ụzọ na-afụ ụfụ. Mgbaghara, nnwetaghachi onwe onye n’ụzọ ime mmụọ, na mweghachi nke ọṅụ o nwere na mbụ gụsiri ya agụụ ike. Onye ngahie nwere nchegharị taa nwekwara mkpa maka mgbaghara Jehova iji nwetaghachi ọṅụ o nwere na mbụ tupu o mee ihe nke tinyere mmekọrịta ya na Chineke n’ihe ize ndụ. Inyeghachi onye chegharịrịnụ “ọṅụ nke mmụọ nsọ” na-egosi na Jehova agbagharawo ya, na-ahụkwa ya n’anya. (1 Ndị Tesalọnaịka 1:6) Lee aha nkasi obi nke ahụ na-eweta!
19. Olee otú ọ ga-adị Devid ma Chineke hichapụ mmejọ ya nile?
19 Devid kpekwara ekpere, sị: “Zopụ ihu gị ná mmehie m nile, hichapụkwa ajọ omume m nile.” (Abụ Ọma 51:9) A pụghị ile anya na Jehova ga-ele mmehie anya nkwado. Ya mere, a rịọrọ ya ka o zopụ ihu ya site ná mmehie nile nke Devid. Eze ahụ rịọkwara ka Chineke hichapụ mmejọ ya nile, hichapụ emeghị ezi omume ya nile. A sịkwa nnọọ na Jehova ga-eme nke ahụ! Ọ ga-ebuli mmụọ Devid, wepụ ibu arọ nke akọ na uche nọ na nsogbu, wee kwe ka eze nke a chegharịworo ugbu a mara na Chineke ya na-ahụ n’anya agbagharawo ya.
Gịnị Ma Ọ Bụrụ na I Mehiewo?
20. Gịnị ka a na-atụrụ onye Kraịst ọ bụla meworo mmehie jọrọ oké njọ aro ka o mee?
20 Abụ Ọma nke 51 na-egosi na onye ọ bụla n’ime ndị na-ejere Jehova ozi raara onwe ha nye bụ́ ndị meworo oké ihe ọjọọ ma nwee nchegharị pụrụ ịrịọ ya n’obi ike ka o meere ha amara ma mee ka ha dị ọcha site ná mmehie ha. Ọ bụrụ na ị bụ onye Kraịst nke dahieworo n’ụzọ dị otú ahụ, gịnị mere ị gaghị achọ mgbaghara nke Nna anyị nke eluigwe site n’ekpere obi umeala? Nakwere mkpa i nwere maka enyemaka Chineke ka i wee guzo n’ihu ya na-abụ onye a nwapụtara, rịọkwa ka o weghachiri gị ọṅụ i nwere na mbụ. Ndị Kraịst chegharịrịnụ pụrụ iji obi ike gakwuru Jehova n’ekpere na-arịọ ihe ndị dị otú ahụ, n’ihi na ‘ọ ga-agbaghara n’ụba.’ (Aịsaịa 55:7; Abụ Ọma 103:10-14) Otú ọ dị, e kwesịrị ịkpọku ndị okenye ọgbakọ ka ha wee nye aka ime mmụọ dị mkpa.—Jemes 5:13-15.
21. Gịnị ọzọ ka anyị ga-atụle?
21 Ebere Jehova n’ezie na-azọpụta ndị ya pụọ n’obi nkoropụ. Ma ka anyị nyochaa arịrịọ ndị ọzọ si n’ala ala obi nke Devid n’Abụ Ọma nke 51. Ọmụmụ ihe anyị ga-egosi na Jehova adịghị eleda obi tiwara etiwa anya.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Mmetụta dị aṅaa ka mmehie dị oké njọ pụrụ inwe n’ahụ otu n’ime ndị na-ejere Jehova ozi?
◻ Olee otú ọ dị Devid n’ahụ mgbe ọ nwara ikpuchi mmehie ya?
◻ N’ihi gịnị ka Devid ji sị na ya emehiewo megide nanị Chineke?
◻ Ọ bụ ezie na Chineke pụrụ ịtụle banyere ọnọdụ ndị siri oké ike, gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime?
◻ Gịnị ka onye Kraịst kwesịrị ime ma ọ bụrụ na o mewo mmehie jọrọ oké njọ?