Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ‘Echiche Gị Nile Ga-eguzosi Ike’
    Ụlọ Nche—2007 | Mee 15
    • N’ABỤ ọbụ abụ bụ́ Devid dere, o kpegaara Chineke ekpere, sị: “Keere m obi dị ọcha, Chineke; meekwa ka mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ n’ime m. Nyeghachi m obi ụtọ nke nzọpụta Gị: werekwa mmụọ nke a maara aha ya kwagide m.” (Abụ Ọma 51:10, 12) Devid, bụ́ onye chegharịrị site ná mmehie ya na Bat-sheba mere, rịọrọ Jehova Chineke ebe a ka o mee ka obi ya dị ọcha ma tinye n’ime ya mmụọ, ma ọ bụ ọnọdụ uche, nke ga-akpali ya ime ihe ziri ezi.

      Jehova ọ̀ na-ekere anyị obi dị ọcha n’ezie, ọbụna tinye n’ime anyị mmụọ dị ọhụrụ na nke ga-akpali anyị ime ihe? Ka ànyị kwesịrị itinye mgbalị iji nweta obi dị ọcha ma chebe ya? “Jehova, na-enyocha obi,” ma olee otú ọ na-etinyeru anya n’ihe anyị na-eche n’obi anyị? (Ilu 17:3; Jeremaịa 17:10) Olee otú ọ na-achịkwaru ndụ, ebumnobi, na omume anyị?

  • ‘Echiche Gị Nile Ga-eguzosi Ike’
    Ụlọ Nche—2007 | Mee 15
    • Ònye Nwe “Ido Obi n’Usoro”?

      Ilu 16:1a na-ekwu, sị: “Mmadụ nwe ido obi n’usoro.” O doro anya na ọ bụ anyị nwe “ido obi n’usoro.” Jehova anaghị edozi obi anyị n’ụzọ ọrụ ebube ma ọ bụ na-enye anyị mmụọ ịchọ ime ihe. Ọ dị anyị mkpa itinye mgbalị iji nweta ezi ihe ọmụma nke Okwu ya, bụ́ Bible, na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị mụrụ, ma mee ka uche anyị kwekọọ na nke ya.—Ilu 2:10, 11.

      Ma, arịrịọ Devid rịọrọ Chineke ka o nye ya “obi dị ọcha” na “mmụọ dị ọhụrụ,” na-egosi na ọ maara banyere ọchịchọ ime mmehie nke dị n’ime ya na mkpa enyemaka nke Chineke dị ya n’ime ka obi ya dị ọcha. Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, e nwere ike ịnwa anyị itinye aka “n’ọrụ nke anụ ahụ́.” (Ndị Galeshia 5:19-21) Iji ‘mee ka akụkụ ahụ́ [anyị] ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe metụtara ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ na-emerụ ahụ́, na ọchịchọ anyaukwu,’ ọ dị anyị mkpa inweta enyemaka Jehova. (Ndị Kọlọsi 3:5) Lee ka o si dị mkpa anyị ikpegara Chineke ekpere maka enyemaka iji zere ịdaba n’ọnwụnwa na iji wepụ ọchịchọ mmehie n’obi anyị!

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya