Isi 21
E Weghachi Ogige Iden—Gburugburu Ụwa
1. (a) N’echiche dị aṅaa ka a ga-eweghachi ogige Iden, n’ihi gịnịkwa ka ọ na-agaghị eji kpuchie nanị otu akụkụ a kpaara ókè nke ụwa? (b) Gịnị ka okwu ndị ahụ Jisọs gwara onye ahụ na-eme ihe ọjọọ na-egosi?
OGIGE Iden ahụ bụ “paradaịs obi ụtọ,” n’echiche ahụkwa ka a ga-eweghachi ya. (Jenesis 2:8, Douay Version) Paradaịs mbụ ahụ gbasara ruo nanị ókèala a kpaara ókè nke ụwa. Ma Jehova zubere na a ga-agbasapụ ókèala ya gburugburu, site n’ezinụlọ ụmụ mmadụ ahụ na-amụba amụba ruo mgbe Paradaịs kpuchiri elu ụwa nile ma yikwasị ya ezi ịma mma ya nke dị ka e si kee ya. (Jenesis 1:26-28; 2:8, 9, 15) Okwu Jisọs gwara onye ajọ omume ahụ nwere ọmịiko, onye nwụrụ n’akụkụ ya na Kalvari mesiri nwoke ahụ obi ike na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ mgbe mweghachi nke Paradaịs ahụ na-aga nnọọ n’ihu, mgbe ahụkwa ọ ga-arịba ama mgbanwe na-eme obi ụtọ nke meworo n’elu ụwa. (Luk 23:43) Gịnị ka Paradaịs ahụ e weghachiri nke zuru ụwa ọnụ ga-adị ka ya? Olee otú ọ ga-esi dịrị iche n’ebe ogige Iden nke mbụ ahụ dị?
2. (a) Gịnị dị n’ime ogige Iden mbụ ahụ nke na-agaghị adị n’ime Paradaịs ahụ zuru ụwa ọnụ? (b) N’ihi gịnị ka ọ na-agaghị eji bụrụ ihe ezi uche dị n’ime ya na Chineke ga-eji otu osisi lee nrubeisi ihe a kpọrọ mmadụ ule?
2 N’amụma ndị ahụ na-eme ka e jupụta n’obi ụtọ nke ihe ndị ahụ dị ebube nke nọ kpọmkwem n’ihu, anyị na-ahụ otu ihe na-efu efu n’ime Paradaịs ahụ zuru ụwa ọnụ nke e weghachiri. Gịnị ka nke ahụ bụ? Ọ bụ ‘osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ’ nke nọ ‘n’etiti ubi ahụ a gbara ogige.’ (Jenesis 2:17; 3:3) E nwere ihe àmà na nke a bụ otu osisi. Ọ̀ ga-abụ ihe ezi uche dị n’ime ya iche na e kwesịrị inwe otu osisi dị otú ahụ n’etiti ogige Iden ahụ e weghachiri eweghachi nke zuru ụwa ọnụ nke a ga-enwe mmachibido iwu nke Chineke n’elu ya? Ee e. Ọ ga-achọ ime oké njem n’aka ndị mmadụ nọ n’akụkụ ndị dị anya nke ụwa iji ruo n’ebe osisi dị otú a dị n’Ebe Etiti Ọwụwa Anyanwụ ụwa iji nwee ike ma eleghị anya iri mkpụrụ sitere na ya ná nnupụisi megide Chineke Onye Kachasị Ihe Nile Elu.
3. Gịnị ọzọ bụ ihe na-agaghị adị n’ime Paradaịs ahụ e weghachiri?
3 Ọzọkwa, a gaghị enwe n’ebe dị otú ahụ agwọ “na-ekwu okwu” nke ga-akpọku ndị bịara osisi ahụ nso iri mkpụrụ ndị na-adọrọ adọrọ sitere na ya nanị n’ihi iji mebie iwu Chineke. A gaghịkwa enwe ajọ mmụọ a na-adịghị ahụ anya nke ga-eduzi otu agwọ ma mee ka ọ dị ka ọ na-ekwu okwu ma kpọkuo onye na-ele ya anya inupụ isi megide Chineke site n’ịnakwere ụzọ nke nnupụisi megide Onye Okike, na-arụpụta ihe ndị na-akpata ọnwụ.
4. N’ihi gịnị ka Setan bụ Ekwensu na-agaghị eji nọrọ ya n’oge Ọchịchị Puku Afọ ahụ nke “Onyeisi Udo” ahụ?
4 Ee e, mmụọ ahụ e kere eke a na-adịghị ahụ anya nke nọ n’azụ agwọ ahụ “na-ekwu okwu” laa azụ n’ebe ahụ n’ogige Iden agaghị anọ ya n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke “Onyeisi Udo” ahụ, bụ́ Kraịst Jisọs. A ga-eke ajọ onye ahụ, Setan bụ Ekwensu, agbụ zuru ezu mgbe Amagedọn gasịrị. Mkpughe 20:2, 3 na-agwa anyị na “Onyeisi Udo” ahụ ga-ejide “agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan,” wee kee ya agbụ ma tụba ya n’ime abyss ahụ ruo otu puku afọ.
Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi n’Ime Paradaịs ahụ E Weghachiri
5. N’ime Paradaịs ahụ e weghachiri, n’ihi gịnị ka ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ga-eji dịrị n’ụwa nile?
5 Lee aha udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke ga-esochi! Mmetụta na ike nke Setan nwere n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ dị ka “onye isi nke ụwa” agawo! (Jọn 14:30) N’ịtụbakwa ìgwè ndị mmụọ ọjọọ nke Setan n’abyss, n’ikpeazụ elu ala ga-enwere onwe ya pụọ n’ụdị ọ bụla nke mgbaasị, anwansi, na majik ojii—ee, ụdị ọ bụla nke ikpere ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ nke Jehova kpọrọ asị.—Deuterọnọmi 18:10-12.
6, 7. (a) N’ihi gịnị ka anụmanụ ndị e kere eke na-agaghị eji bụrụ ihe iyi egwu ọ bụla nye ụmụ mmadụ? (b) Amụma dị aṅaa banyere nke a ga-enwe mmezu nkịtị?
6 Ụmụ anụmanụ e kere eke agaghị emerụ ndị bi na Paradaịs ahụ e weghachiri ahụ ma ọ bụ bụụrụ ha ihe iyi egwu. Chineke ga-eme ka ihe e kere eke bụ́ ndị dị ala nwetaghachi ọ̀tụ̀tụ̀ ọ bụla furu efu nke ịtụ ụmụ mmadụ egwu. Otú a anyị ga-atụ anya nkọwa ahụ mara mma dị ukwuu nke ndụ ụmụ anụmanụ bụ́ nke a kọwara n’Aịsaịa 11:6-9 inwe mmezu nkịtị n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ nke “Onyeisi Udo” ahụ:
7 “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe; nwatakịrị ga na-edukwa ha. Nne ehi na anụ ọhịa bear ga-atakọkwa nri; ụmụ ha ga-amakpukọ; ọdụm ga-atakwa okporo ọka dị ka ehi. Nwa na-aṅụ ara ga-egwurikwa egwu n’elu ọnụ ajụ ala nọ, ọ bụkwa anya ubí ka nwa e mere ka ọ hapụ ara ga-atụkwasị aka ya. Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”
8. Gịnị ka okwu amụma ahụ bụ na “ájá ga-abụ” nri agwọ pụtara?
8 Ọ ga-abụ enweghị nkwekọ ma ọ bụrụ na Chineke akpalie odide nke amụma dị otú ahụ inwe nanị ihe ọ pụtara n’ụzọ ime mmụọ ma ghara igosipụta ụdị ihe ndị dị otú ahụ ná ndụ a na-adị n’ezie n’ụwa. N’otu aka ahụ, Aịsaịa 65:25 na-agwa anyị, sị: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-atakọ nri n’otu, ọdụm ga-atakwa ahịhịa dị ka ehi: ma agwọ, ájá ga-abụ nri ya.” Nke a ọ̀ na-egosi na a ga-ekpochapụ ezinụlọ nke agwọ pụọ n’ogige Iden ahụ nke zuru ụwa ọnụ? Ee e, okwu amụma ahụ bụ́ na “ájá ga-abụ” nri agwọ pụtara na ndị òtù nke ihe ndị nọ n’ezinụlọ agwọ agaghị abụkwa ọzọ ihe iyi egwu nye ndụ na ezi ahụ ike nke ụmụ mmadụ e kere eke. Ha ga-amata na ihe a kpọrọ mmadụ bụ nna ha ukwu, nke nwere ike n’ahụ ihe nile na-agagharị agagharị n’elu ala, dị nnọọ ka ọ dị n’ebe Adam nọ n’ime ogige Iden ahụ mgbe ọ kpọrọ anụmanụ nile aha n’atụghị egwu.—Jenesis 2:19, 20; Hosea 2:18.
9, 10. Gịnị ka Abụ Ọma nke 65 na Aịsaịa 25:6 buru n’amụma banyere elu ala n’okpuru ọchịchị nke “Onyeisi Udo” ahụ?
9 Ịma mma na ịba ụba nke ogige Iden ahụ zuru ụwa ọnụ bụ nke anyị na-apụghị ichetụdị n’echiche. Ma Bible n’ụdị amụma, na-akọwara anyị otú ọ ga-adị n’Abụ Ọma nke 65, bụ́ nke a bụkuru Chineke. N’akụkụ ụfọdụ, abụ ọma nke a na-asị: “Iletawo ala, wee mee ka o jupụta n’ihe, ị na-eme ka o nwee akụ hie nne; mmiri iyi Chineke jupụtara ná mmiri: i na-edozi ọka ha, mgbe i si otú a dozie ala onwe ya.” A gaghị enwe ala ịkpọ nkụ mgbe ahụ, kama nke ahụ, “oké mmiri ozuzo”! (Abụ Ọma 65:1, 9-13) A ga-enwe nri n’ụba maka ndị nile bi n’elu ala.
10 E bukwara amụma ịba ụba nke a n’Aịsaịa 25:6: “Ọ bụkwa n’ugwu a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vine doro edo.” Ndị ga-ebi n’ime Paradaịs ahụ e weghachiri ga-eri nri ndị mara abụba nke na-eme ka obi dị ndụ ma mee ka ihu na-egbuke egbuke. Ha ga-aṅụ mmanya, nke doro edo nke ọma, nke a zakwara aza, na-eme ka obi dị ha ụtọ. (Abụ Ọma 104:14, 15) A gaghị enwe ụkọ nri n’okpuru Ọchịchị Narị Afọ Iri nke “Onyeisi Udo” ahụ! Kama nke ahụ, a ga-enwe “ọtụtụ ọka.”—Abụ Ọma 72:16.
Mgbanwe Dị Iche Iche n’Asụsụ na n’Ihu Igwe
11. Mgbanwe dị aṅaa n’asụsụ ga-ewere ọnọdụ, oleekwa otú nke a ga-esi metụta ihe a kpọrọ mmadụ?
11 Paradaịs ahụ zuru ụwa ọnụ ọ̀ ga-enwe nsogbu ọgba ọghara nke inwe ọtụtụ asụsụ? Ee e, n’ihi na e zokwara aka n’ebe “Onyeisi Udo” ahụ nọ dị ka “Chineke nke Bụ Dike.” (Aịsaịa 9:6) Otú a o nwere ike nke ịtụgharị nghagbu nke asụsụ, bụ́ nke malitere n’Ụlọ Elu Bebel. (Jenesis 11:6-9) Gịnị ga-abụ otu asụsụ nke ụmụ elu ala nile nke “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi”? Ọ̀ ga-abụ asụsụ mbụ ahụ nke Adam mbụ ahụ, asụsụ nke Jehova nyere ya? O yiri ka ọ ga-abụ. Ihe ahụla mee, a ga-ehichapụ ihe mgbochi nile nke asụsụ. Ị ga-enwe ike ime njem gaa ebe ọ bụla, sorokwa ndị mmadụ kwurịta okwu. Ị ga-enwe ike ịghọta ha, ha ga-enwekwa ike ịghọta gị. A ga-enwe otu asụsụ maka ihe nile a kpọrọ mmadụ, ọ ga-ekwesịkwa ekwesị ka Bible dum nọrọ n’asụsụ ahụ. (Tụlee Zefanaịa 3:9.) N’asụsụ ahụ ụwa nile ga-ejupụta n’ihe ọmụma nke Jehova “dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:9.
12. Olee otú Zekaraịa 14:9 ga-esi nwee mmezu?
12 Okwu ndị ahụ nke Zekaraịa 14:9 ga-emezu mgbe ahụ: “N’ụbọchị ahụ ka Jehova ga-adị otu, aha ya ga-adịkwa otu.” Nanị Jehova ka a ga-efe ofufe dị ka otu ezi Chineke dịnụ. “N’ụbọchị ahụ” nke Alaeze Jehova site n’aka “Onyeisi Udo” ahụ, Chineke ga-ekpughe kpọmkwem otú e si akpọpụta aha ya. Mgbe ahụ a ga-enwe nanị otu ụzọ mmadụ nile n’ụwa si akpọpụta aha ahụ dị nsọ. Aha ya ga-abụ otu.
13. N’ihi gịnị ka ihu igwe, ikuku, na ebili mmiri na-agaghị eji bụrụ ihe iyi egwu nye ndị bi n’ụwa?
13 Mgbanwe ndị a ga-enwe n’ọnọdụ ihu igwe na ọnọdụ gburugburu ebe obibi bụkwa ihe na-adọrọ ezi mmasị nye ndị ahụ na-ele anya Paradaịs ahụ zuru ụwa ọnụ nke “Onyeisi Udo” ahụ. Otu ihe doro anya: A ga-eme ka ụwa nile bụrụ ezigbo ebe a ga-ebi. Ọ dịghị mgbe ajọ ifufe, oké ikuku mmiri, ikuku oké osimiri, oké ifufe, ma ọ bụ ajọ ikuku typhoon ga-akpaghasị Paradaịs ahụ. Ikuku, ebili mmiri, na ihu igwe ga-erubere “Onyeisi Udo” ahụ isi. (Mak 4:37-41) Ogige Iden nke zuru ụwa ọnụ ga-enwe ọnọdụ ihu igwe nke a na-achịkwa n’ụzọ zuru ezu. A ga-achọ ụwa nile mma ịghọ paradaịs nke obi ụtọ, ebe ọ ga-abụ ihe ùgwù obi ụtọ nke ihe nile a kpọrọ mmadụ nwere ibi ná ntụkwasị obi ruo mgbe na-adịghị agwụ agwụ.
14, 15. (a) Nkwa dị aṅaa nke e dekọrọ ná Mkpughe 21:3, 4 ka a ga-emezu? (b) Olee otú Chineke ga-esi binyere ihe a kpọrọ mmadụ? (ch) Ụdị anya mmiri ndị dị aṅaa ka a ga-ehichapụ ruo mgbe ebighị ebi?
14 A gaghị enwe ihe ọ bụla ga-akpata anya mmiri nke iru újú mgbe ahụ! Okwu amụma Jehova na-emesi anyị obi ike, sị: “Ụlọ ikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke ya, Chineke onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 21:3, 4.
15 Eluigwe bụ ocheeze Chineke, ụwa bụkwa ihe mgbakwasị ụkwụ ya. (Aịsaịa 66:1) Ya mere Chineke apụghị ibi n’ụwa n’echiche nkịtị. Ma ọ ga-ebinyere ihe a kpọrọ mmadụ. N’oge Ọchịchị Puku Afọ ahụ, Jehova ga-ebinyere ihe a kpọrọ mmadụ site n’onye nnọchianya ya bụ Ọkpara ya e mere ebube, bụ́ Jisọs Kraịst. Lee ka o si nnọọ kwesị ekwesị na ọnụnọ nke Jehova ga-abụ nke “Onyeisi Udo” ya nọchitere anya ya! Nke a na-echetara anyị okwu ndị ahụ nke Aịsaịa 7:14 banyere aha ahụ e jiri mee ihe banyere Mesaịa ahụ—Immanuel. Aha ahụ pụtara “Chineke Nọnyeere Anyị.” (Matiu 1:23) Lee ka o si bụrụ ihe na-akpali akpali na Chineke site n’aka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya karịsịa, ‘ga-ebinyere’ ihe a kpọrọ mmadụ! Mgbe ahụ o yikwara ka anya mmiri nke ọṅụ ọ̀ ga-abịa n’anya anyị ka anyị na-ahụ ọrụ ebube ndị dị ịtụnanya nke “Chineke nke Bụ Dike” na-arụ, karịsịa mgbe e mere ka ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ bịaghachi ná ndụ ná mbilite n’ọnwụ gaa n’ọnọdụ nile nke Paradaịs. (Ọrụ 24:15) Ọrụ ebube ndị dị otú a ga-abụ ihe àmà dị ebube na Chineke nọnyeere ihe a kpọrọ mmadụ nakwa na ọ na-ehichapụ anya mmiri nile nke iru újú site n’anya anyị ruo mgbe ebighị ebi.
Otu Ebe Mara Mma n’Eluigwe na Ala nke Na-enweghị Nsọtụ
16. Mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ ọ̀ ga-echere ruo mgbe a gbasara Paradaịs ahụ ruo ụwa nile? Kọwaa.
16 A gwara Adam mbụ otú ọ ga-esi malite ọrụ nke ịgbasapụ Paradaịs site kpọmkwem n’ebe ahụ n’ogige Iden. A ga-enweta mmezu nke nzube mbụ ahụ ịgbasapụ ya gburugburu ụwa. Ma mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ ọ̀ ga-echere ruo mgbe Paradaịs ahụ gbasazuru gburugburu ụwa nile? Ee e. Dị ka ihe atụ, ndị bịara ná mbilite n’ọnwụ nke bu ụzọ ga-abịa ná mbilite n’ọnwụ n’akụkụ ndị ahụ nke ala ebe ndị lanarịrị Amagedọn nọ, meekwa ka ebe ndị dị otú ahụ ghọọ paradaịs. Ka mbilite n’ọnwụ nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ya na-aga n’ihu, ógbè ndị a bụ Paradaịs ga-agbasa ruo mgbe ha sọkọtara isi iji bụrụ Paradaịs zuru ụwa ọnụ.
17. Nkọwa dị aṅaa nke Paradaịs ahụ zuru ụwa ọnụ ka e nyere?
17 Paradaịs ahụ gaje ịbịa ga-aka ogige ntụrụndụ nile ma ọ bụ ubi nile a gbara ogige ndị dị taa mma. N’ụzọ na-egbuke egbuke, ụwa dum ga-ama mma dị ka paradaịs nke udo, nke na-atọ ọ bụghị nanị anya nke ndị mmadụ kama ọbụna anya nke Onye Okike ụtọ. Ọ ga-abụ ogige Iden nke zuru ụwa ọnụ, nke e ji ahịhịa ndụ na osisi dị iche iche chọọ mma—nke mara mma ile anya na nke na-emepụta nri iji kwadoo ndụ nke ihe e kere eke n’izu okè. Ruo mgbe ebighị ebi ụwa ga-anọgide bụrụ otu ebe mara mma n’eluigwe na ala nile n’enweghị nsọtụ nke Jehova. Agbụrụ mmadụ nile dị n’otu ga-enwe ibu ọrụ na ihe ùgwù na-adịru ebighị ebi nke ime ka ụwa nọgide na-abụ ebe dị otú ahụ nke mara mma.
18. Olee otú anyị si mara na mmadụ nile, ndị ikom na ndị inyom, ga-ebikọ n’udo dị ka ụmụnne ndị ikom na ndị inyom?
18 Ndị òtù nile nke ezinụlọ mmadụ nke a naasọpụrụ Chineke ga-ebikọ n’udo dị ka ụmụnne ndị ikom na ndị inyom n’ịdị ọcha nile, n’ihi na ha ga-abụ n’ezie ụmụ nke “Nna nke Bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi,” bụ́ “Onyeisi Udo” ahụ. Ya mere ndị ikom agaghị eji mpako na-enwe ike n’ahụ ndị inyom, bụ́ ụmụnne ha ndị inyom. Ma ndị inyom e mere ka ha zuo okè ga-abụ ihe Jehova Chineke na-ezube ha ịbụ, ọbụna dị ka o zubere Iv ịbụ “onye inye aka” maka di ya zuru okè, bụ́ Adam.—Jenesis 2:18; leekwa 1 Pita 3:7.
19. Olee otú Paradaịs elu ala ga-adị n’anya ndị bi n’eluigwe nke anya na-adịghị ahụ?
19 Otú paradaịs elu ala ahụ nke jupụtara ná ndị ikom na ndị inyom zuru okè ga-adị mgbe ahụ n’anya ndị nọ n’eluigwe nke anya na-adịghị ahụ ga-adị ebube ma maa mma nke ukwuu karịa otú ụwa dị mgbe mbụ ahụ e kere ya, n’oge ahụ “kpakpando ụtụtụ na-etikọ mkpu ọṅụ, ụmụ Chineke nile wee tisie mkpu ọṅụ ike.” (Job 38:7) Mgbe ahụ Chineke Onye Kachasị Ihe Nile Elu, bụ́ Jehova, ga-abụworị onye e wepụrụ n’ụta n’ụzọ zuru ezu dị ka Onye a na-apụghị imebi nzube ya dị ebube mgbe ọ bụla. Otuto nile dịrị ya!
[Foto dị na peeji nke 172, 173]
Paradaịs nkịtị ga-eme ka “ihe mgbakwasị ụkwụ” dum nke Chineke, bụ́ ụwa maa mma