Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Jehova Bụ Onye Kacha Agbaghara Mmehie
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2022 | Jun
    • Jehova Bụ Onye Kacha Agbaghara Mmehie

      “Gịnwa bụ́ Jehova dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie. Ịhụnanya ị na-egosi ndị niile na-akpọku gị dị ukwuu.”​—ỌMA 86:5.

  • Jehova Bụ Onye Kacha Agbaghara Mmehie
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2022 | Jun
    • JEHOVA DỊ NJIKERE ỊGBAGHARA

      4. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova dị njikere ịgbaghara?

      4 Jehova si n’Okwu ya na-eme ka obi sie anyị ike na ọ dị njikere ịgbaghara anyị. Mgbe Jehova si n’ọnụ mmụọ ozi na-akọwara Mosis onwe ya n’Ugwu Saịnaị, ọ sịrị: “Jehova, Jehova, Chineke nwere ọmịiko ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye ịhụnanya ya na eziokwu ya dị ukwuu, onye na-egosi puku kwuru puku ọgbọ na ọ hụrụ ha n’anya, onye na-agbaghara ajọ omume na mmebi iwu na mmehie.” (Ọpụ. 34:​6, 7) Jehova dị obiọma, na-eme ebere, dịrịkwa njikere mgbe niile ịgbaghara onye mmehie ọ bụla chegharịrị echegharị.​—Nehe. 9:17; Ọma 86:15.

      E dere okwu bụ́ “Ọ ma nnọọ otú e si kee anyị,” nke si n’Abụ Ọma 103:13, 14, n’akụkụ foto otu nwanna nwaanyị. Foto ndị gbara ya gburugburu na-egosi ihe ndị o mere kemgbe ọ bụ nwata.

      Jehova ma ihe niile merela ná ndụ anyị mere anyị ji na-akpa ụdị àgwa anyị na-akpa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

      5. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 103:13, 14, olee ihe otú a Jehova si mara anyị nke ọma na-eme ka o mee?

      5 Ebe ọ bụ Jehova kere anyị, ọ ma ihe niile gbasara anyị. Cheedị ihe a. Jehova ma ihe niile gbasara onye ọ bụla nọ n’ụwa a. (Ọma 139:​15-17) N’ihi ya, ọ ma ihe niile ezughị okè anyị ketara n’aka nne na nna anyị mbụ nwere ike ịkpatara anyị. Ọ makwa ihe niile merela ná ndụ anyị mere anyị ji bụrụ ụdị mmadụ anyị bụ. Olee ihe otú a Jehova si mara anyị nke ọma na-eme ka o mee? Ọ na-eme ka ọ gbaghara anyị.​—Ọma 78:39; gụọ Abụ Ọma 103:​13, 14.

      6. Olee otú Jehova sirila gosi na ọ dị njikere ịgbaghara anyị?

      6 Jehova egosila na ọ dị njikere ịgbaghara ndi mmehie. Ọ ma na mmehie Adam na Iv mere ka anyị niile bụrụ ndị mmehie, nakwa na anyị ga-emecha nwụọ. (Rom 5:12) Anyị agaghị emeli ka anyịnwa ma ọ bụ onye ọzọ ghara ime mmehie, ma ọ bụkwanụ ghara ịnwụ. (Ọma 49:​7-9) Ma, Chineke anyị hụrụ anyị n’anya meteere anyị ebere, meekwa ihe ga-eme ka anyị nwere onwe anyị. Gịnị ka o mere? Jọn 3:16 kwuru na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ka ọ nwụọ n’ihi anyị. (Mat. 20:28; Rom 5:19) Jizọs nwụchiteere anyị ọnwụ iji gbapụta onye ọ bụla nwere okwukwe na ya. (Hib. 2:9) Ọ ga-abụrịrị na o wutere Jehova nke ukwuu mgbe ọ hụrụ ka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya tara ahụhụ ma nwụọ ọnwụ ihere. N’eziokwu, Jehova agaraghị ekwe ka Ọkpara ya nwụọ ma a sị na ọ chọghị ịgbaghara anyị.

      7. Olee ndị ụfọdụ Baịbụl kọrọ akụkọ ha Jehova gbaghaara kpamkpam?

      7 Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ndị Jehova gbaghaara kpamkpam. (Efe. 4:32) Olee onye gbatara gị n’obi? O nwere ike ịbụ Eze Manase. Nwoke ọjọọ ahụ mehiere Jehova nke ukwuu. O fere arụsị dị iche iche, gbaakwa ndị ọzọ ume ka ha mee otú ahụ. O gburu ụmụ ya, jirikwa ha chụọrọ arụsị dị iche iche àjà. O dowedịrị arụsị n’ime ụlọ nsọ Jehova. Baịbụl kwuru gbasara ya, sị: “Ihe ọjọọ o mere, nke kpasuru Jehova iwe, karịrị akarị.” (2 Ihe 33:​2-7) Ma, mgbe Manase ji obi ya niile chegharịa, Jehova gbaghaara ya kpamkpam. Chineke medịrị ka ọ bụrụkwa eze ọzọ. (2 Ihe 33:​12, 13) O nwekwara ike ịbụ na i chetara Eze Devid. Eze Devid mere mmehie ndị dị oké njọ, dị ka ịkwa iko na igbu mmadụ. Ma, mgbe o ji obi ya niile chegharịa ma kweta na o mehiere, Jehova gbaghaara ya. (2 Sam. 12:​9, 10, 13, 14) N’eziokwu, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị. Anyị ga-ahụkwa na otú Jehova si agbaghara dị iche n’otú ụmụ mmadụ si agbaghara.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya