Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lff isi 8
  • Ị Ga-abụli Enyi Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Ga-abụli Enyi Jehova
  • Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MỤTAKWUO IHE
  • NCHỊKỌTA
  • IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
  • Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Mete Ezigbo Ndị Enyi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Chineke Na-Akpọ Gị Òkù Ịghọ Enyi Ya
    Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Saa Anya ná Mmiri ma A Bịa n’Ụdị Ndị Ị Na-emete Enyi
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ole Ndị Bụ Ezigbo Ndị Enyi M?
    Teta!—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
lff isi 8
Isi nke 8. Ebe otu nwoke nọ ọdụ na bench na-ele anya n’eluigwe.

ISI NKE 08

Ị Ga-abụli Enyi Jehova

Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi

Jehova chọrọ ka ị mara ya nke ọma. Maka gịnị? O bu n’obi na ọ bụrụ na ị mata ụdị onye ọ bụ, mata otú o si emeso ndị ọzọ ihe nakwa ihe ndị ọ chọrọ imere gị, ị ga-achọ ka gị na ya bụrụ enyi. Ma, ị̀ ga-abụli enyi Chineke n’eziokwu? (Gụọ Abụ Ọma 25:14.) Olee ihe ị ga-eme ka i nwee ike bụrụ enyi ya? Baịbụl zara ajụjụ ndị a, kwuokwa ihe mere Jehova ji bụrụ enyi kacha mma mmadụ nwere ike inwe.

1. Gịnị ka Jehova na-agwa gị ka i mee?

Baịbụl sịrị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Gịnị ka ihe a Baịbụl kwuru pụtara? Jehova na-agwa gị ka ị bịa bụrụ enyi ya. Ụfọdụ ndị nwere ike iche na o siri ezigbo ike mmadụ na onye ọ na-anaghị ahụ anya ịbụ enyi, ma ya fọdụkwa mmadụ na Chineke ịbụ enyi. Ma, n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, Jehova kwuru ihe niile anyị kwesịrị ịma gbasara ụdị onye ọ bụ ka anyị nwee ike ịbịaru ya nso. Ka anyị na-agụ ihe Jehova gwara anyị na Baịbụl, anyị na ya na-adịkwu ná mma n’agbanyeghị na anyị ahụtụbeghị ya.

2. Gịnị mere Jehova ji bụrụ Enyi kacha ndị enyi niile i nwere mma?

N’ime ndị niile hụrụ gị n’anya, ọ bụ Jehova kacha hụ gị n’anya. Ọ chọrọ ka ị na-enwe obi ụtọ nakwa ka ị kpọtụrụ ya mgbe ọ bụla ị chọrọ ka o nyere gị aka. I nwere ike ‘ịkọrọ ya ihe niile na-echegbu gị, n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) Jehova nọ ya mgbe niile inyere ndị enyi ya aka, ịkasi ha obi, na ige ha ntị.—Gụọ Abụ Ọma 94:18, 19.

3. Olee ụdị ndị Jehova chọrọ ka ha na ya bụrụ enyi?

Jehova hụrụ mmadụ niile n’anya, “ma ya na onye ezi omume na-abụ ezigbo enyi.” (Ilu 3:32) Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-eme ihe dị ya mma ma na-agbara ihe ọ kpọrọ asị ọsọ. Ụfọdụ ndị nwere ike iche na ha agaghị emetachali ihe niile Jehova chọrọ ka anyị na-eme nakwa na ha agaghị enwe ike izere ihe niile ọ sịrị na ha dị njọ. Ma, Jehova na-eme ebere. Ọ na-anabata onye ọ bụla hụrụ ya n’anya n’eziokwu, onye na-emekwa ike ya niile ime ihe dị ya mma.—Abụ Ọma 147:11; Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụtakwuo ihe ị ga-eme ka gị na Jehova bụrụ enyi nakwa ihe mere o ji bụrụ Enyi kacha ndị enyi ọzọ niile i nwere mma.

4. Ebreham bụ enyi Jehova

Ihe Baịbụl kọrọ gbasara Ebreham (a na-akpọkwa ya Ebram) na-egosi anyị ihe mmadụ ịbụ enyi Chineke dị ka ya. Gụọnụ gbasara Ebreham na Jenesis 12:1-4. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka Jehova gwara Ebreham ka o mee?

  • Olee nkwa Jehova kwere ya?

  • Gịnị ka Ebreham mere gbasara ihe ahụ Jehova gwara ya?

5. Ihe Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-eme

E nwere ihe ụfọdụ anyị na-achọ ka ndị enyi anyị na-eme.

  • Olee ihe ụfọdụ ị na-achọ ka ndị enyi gị na-emere gị?

Gụọnụ 1 Jọn 5:3. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị ka Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-eme?

Anyị chọọ ịna-erubere Jehova isi, anyị kwesịrị ịhapụ ihe na-adịghị mma anyị na-eme. Gụọnụ Aịzaya 48:17, 18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Gịnị mere Jehova ji gwa ndị enyi ya ka ha hapụ ihe na-adịghị mma ha na-eme?

Ebe otu nwoke na-arụ ụlọ na-enye onye ọrụ ibe ya okpu ha na-ekpu arụ ọrụ ka ha ghara imerụ ahụ́.

Ezigbo enyi anyị na-agwa anyị ihe ndị anyị kwesịrị ime ka anyị ghara imerụ ahụ́ nakwa ihe ndị ga-abara anyị uru. Jehova na-emekwara ndị enyi ya ụdị ihe ahụ

6. Ihe Jehova na-emere ndị enyi ya

Jehova na-enyere ndị enyi ya aka idi nsogbu dị iche iche. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

VIDIO: Jehova Emeerela M Ọtụtụ Ihe Ọma (3:20)

  • Olee otú Jehova si nyere nwaanyị anyị lere na vidio a aka ka obi kwụsị ịna-ajọ ya njọ?

Gụọnụ Aịzaya 41:10, 13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka Jehova kwere nkwa na ọ ga-emere ndị enyi ya niile?

  • Ì chere na Jehova ga-abụli ezigbo Enyi mmadụ? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

Foto atọ na-egosi ebe ezigbo ndị enyi na-enyere ndị enyi ha aka. 1. Otu nwoke na-enyere nwoke ọzọ aka iburu otu nnukwu tebụl. 2. Otu nwaanyị na-akọrọ nwaanyị ọzọ ihe na-enye ya nsogbu n’obi. 3. Otu nwoke na-enyere nwoke ọzọ aka ka o ji mkpara e ji aga ije na-aga ije.

Ezigbo enyi na-enyere enyi ya aka. Jehova ga-enyekwara gị aka

7. Jehova na onye ya na ya bụ enyi ga na-akparịta ụka

Enyi na enyi na-adịkwu ná mma ma ha na-akparịta ụka. Gụọnụ Abụ Ọma 86:6, 11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee otú anyị nwere ike isi na-agwa Jehova okwu?

  • Olee otú Jehova si agwa anyị okwu?

Foto abụọ: 1. Otu nwaanyị na-ekpe ekpere. E nwere akụ́ chere ihu n’elu e sere n’elu isi ya. 2. Otu nwaanyị na-agụ Baịbụl. E nwere akụ́ chere ihu n’ala e sere n’elu isi ya.

Anyị na-agwa Jehova okwu ma anyị kpewe ekpere; yanwa na-agwa anyị okwu ma anyị gụwa Baịbụl

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na mmadụ na Chineke emekataghị bụrụ enyi.

  • Olee amaokwu Baịbụl ị ga-eji gosi mmadụ na anyị na Jehova ga-abụli enyi?

NCHỊKỌTA

Jehova chọrọ ịbụ Enyi gị, ọ ga-enyekwara gị aka ka gị na ya dị ná mma.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú Jehova si enyere ndị enyi ya aka?

  • Gịnị mere Jehova ji gwa ndị enyi ya ka ha hapụ ihe na-adịghị mma ha na-eme?

  • Ì chere na ihe Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-eme karịrị akarị? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Olee uru ịbụ enyi Chineke ga-abara gị?

“Jehova—Chineke nke Kwesịrị Ka A Mara Ya” (Ụlọ Nche, February 15, 2003)

Chọpụta otú ị ga-esi abụ enyi Chineke.

“Olee Otú M Ga-esi Abụ Enyi Chineke?” (Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, isi nke 35)

Chọpụta ihe mere otu nwaanyị ji kwuo na enyi ya na Jehova bụ zọrọ ya ndụ.

“Achọghị M Ịnwụ” (Ụlọ Nche Nke 1 2017)

Gere ihe ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa kwuru gbasara Jehova.

Gịnị Ka Ịbụ Enyi Chineke Pụtara? (1:46)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya