N’agbanyeghị Ịbụ Ndị E Ji Ájá Kpụọ, Gaanụ n’Ihu!
“Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” —ABỤ ỌMA 103:14.
1. Bible ò ziri ezi n’ihe banyere sayensị n’ikwu na e ji ájá kpụọ ụmụ mmadụ? Kọwaa.
N’ỤZỌ nkịtị, anyị bụ ájá. “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7) Nkọwa nke a na-adịghị mgbagwoju anya nke okike mmadụ kwekọrọ n’eziokwu nke sayensị. Ihe karịrị 90 ihe dị mkpa dum mejupụtara ahụ mmadụ bụ ndị a na-ahụcha ‘n’ájá sitere n’ala.’ Otu onye ọkà n’ihe banyere mmiri ọgwụ kwuru n’otu mgbe na ahụ nke onye toruworo ogo mmadụ nwere 65 pasent nke ikuku ndụ oxygen, pasent 18 nke carbon, pasent 10 nke hydrogen, pasent 3 nke nitrogen, 1.5 pasent nke calcium, na 1 pasent nke phosphorus, ebe ihe ndị ọzọ na-emejupụta ndị fọdụrụ. Ma ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a ha ziri ezi n’ozuzu ha adịghị mkpa. Eziokwu dị na ya ka bụ: “Ájá ka anyị bụ”!
2. Mmeghachi omume dị aṅaa ka ụzọ Chineke si kee mmadụ na-ewepụta n’ime gị, n’ihi gịnịkwa?
2 Ònye, ma e wezụga Jehova, pụrụ isi nanị n’ájá kee ụdị ihe okike ndị dị otú ahụ dị mgbagwoju anya? Ọrụ aka Chineke zuru okè, ha enweghịkwa ntụpọ, ya mere ya ịhọrọ ike mmadụ n’ụzọ dị otú a n’ezie abụghị ihe a ga-emere mkpesa. N’eziokwu, na Onye Okike Ukwu ahụ pụrụ ike mmadụ site n’ájá nke ala n’ụzọ dị egwu ma dịkwa ịtụnanya na-amụba nghọta anyị nke ike, nkà, na amamihe Ya a na-akparaghị ókè.—Deuterọnọmi 32:4, ntụaka ala ala peji, NW; Abụ Ọma 139:14.
Mgbanwe nke Ọnọdụ
3, 4. (a) N’isite n’ájá kee mmadụ, gịnị ka Chineke na-ebughị n’obi? (b) Gịnị ka Devid na-ezo aka na ya n’Abụ Ọma 103:14, oleekwa otú ihe ndị gbara ya gburugburu si enyere anyị aka irute ná nkwubi okwu a?
3 Ihe ndị e kere eke ndị sitere n’ájá nwere ịkpa ókè dị iche iche. Otú ọ dị, Chineke ebughị n’obi ka ndị a bụrụ ibu arọ ma ọ bụ bụrụ oké ihe mgbochi. E bughị n’uche ka ha na-akpata nkụda obi ma ọ bụ kpata enweghị obi ụtọ. Ma, dị ka ihe ndị gbara okwu Devid n’Abụ Ọma 103:14 gburugburu na-egosi, ịkpa ókè ndị ụmụ mmadụ nọ n’okpuru ha pụrụ ịkpata nkụda obi na enweghị obi ụtọ. N’ihi gịnị? Mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, ha wetara mgbanwe ọnọdụ maka ezinụlọ ha na-abịa n’ọdịnihu. Ịbụ ndị e ji ájá kpụọ apụtazie ihe ọhụrụ.a
4 Devid na-ekwu banyere adịghị ike mmadụ nke ezughị okè e ketara eketa na-akpata, ọ bụghị banyere ịkpa ókè sitere n’okike nke ọbụna mmadụ zuru okè e ji ájá kpụọ gaara enwe. Ma ọ bụghị otú ahụ ọ garaghị ekwu banyere Jehova, sị: “Onye na-agbaghara gị ajọ omume gị nile; Onye na-agwọ ọrịa gị nile; Onye na-agbapụta ndụ gi n’aka mbibi; . . . ọ bụghị dị ka mmehie nile anyị si dị ka O meworo anyị, ọ bụghịkwa dị ka ajọ omume nile anyị si dị ka O mesoworo anyị.” (Abụ Ọma 103:2-4, 10) N’agbanyeghị ịbụ ndị e ji ájá kpụọ, a sị na ndị mmadụ zuru okè nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi, ha agaraghị ejehie, mee mmehie, iji bụrụ ndị mgbaghara mmehie dị mkpa; ha agaraghị enwe ọrịa ndị na-achọ ọgwụgwọ. Nke ka nke, ha agaraghịkwa arịda n’olulu nke ọnwụ bụ́ ebe a pụrụ isi nanị ná mbilite n’ọnwụ nwetaghachi ha.
5. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-esighị ike nye anyị ịghọta okwu Devid?
5 Ebe anyị na-ezughị okè, anyị nile enwetawo ahụmahụ nke ihe ndị Devid kwuru okwu ha. Anyị na-ahụ ịkpa ókè anyị nile n’ihi ezughị okè. Ọ na-ewute anyị oge ụfọdụ mgbe ha na-eyi ka ha na-emebi mmekọrịta anyị nwere n’ebe Jehova ma ọ bụ ụmụnna anyị ndị Kraịst nọ. Ọ na-ewute anyị na ezughị okè anyị na nrụgide nke ụwa Setan site n’oge ruo n’oge na-enuga anyị n’enweghị olileanya. Ebe ọchịchị Setan na-abịa ná njedebe ya ngwa ngwa, ụwa ya na-enye ndị mmadụ n’ozuzu ha na ndị Kraịst karịsịa nrụgide dị ukwuu.—Mkpughe 12:12.
6. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị Kraịst pụrụ iji nwee mmetụta nke nkụda obi, oleekwa otú Setan pụrụ isi jiri ụdị mmetụta nke a mee ihe ga-abara onwe ya uru?
6 Ị̀ na-eche na ibi ndụ onye Kraịst na-esiwanye ike? A nụwo ka ụfọdụ ndị Kraịst na-ekwu na ka ha na-anọwanye n’eziokwu ogologo oge bụ ka ha na-eyi ka ha na-aghọ ndị na-ezughị okè karị. Otú ọ dị, o yikarịrị ka ọ bụ nanị na ha na-amatakwu ezughị okè nke onwe ha na ha ịbụ ndị na-enweghị ike ikwekọ n’ụkpụrụ zuru okè nke Jehova n’ụzọ ha ga-enwe mmasị ime. Ma, n’ezie, nke a ma eleghị anya bụ ihe sitere n’ịnọgide na-eto n’ihe ọmụma na nghọta nke ihe ezi omume ndị Jehova chọrọ. Ọ dị oké mkpa na anyị ekweghị ka ihe ọ bụla dị otú ahụ anyị maara kụda anyị obi ruo n’ókè nke ịdaba n’aka Ekwensu. Ruo ọtụtụ narị afọ ọ gbalịwo mgbe mgbe ime nkụda obi ihe ga-abara ya uru iji mee ka ndị ohu Jehova hapụ ezi ofufe. N’agbanyeghị nke ahụ, ezi ịhụnanya e nwere n’ebe Chineke nọ, nakwa “ịkpọasị nke zuru okè” a kpọrọ Ekwensu, egbochiwo ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha ime otú ahụ.—Abụ Ọma 139:21, 22; Ilu 27:11.
7. N’akụkụ dị aṅaa ka anyị pụrụ ịdị ka Job mgbe ụfọdụ?
7 Ma, ndị ohu Jehova pụrụ inwe nkụda obi n’otu mgbe ma ọ bụ ọzọ. Enweghị afọ ojuju n’ihe ndị anyị rụzuru pụrụ ịbụ otu ihe kpatara ya. Ọ pụrụ ịgụnye ihe elu ahụ ma ọ bụ mmekọrịta mebiri emebi e nwere n’etiti ndị òtù ezinụlọ, ndị enyi, ma ọ bụ ndị ọrụ ibe anyị. Job na-ekwesị ntụkwasị obi ghọrọ onye a kụdara obi nke ukwuu nke na ọ rịọrọ Chineke, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na I zobe m [na sheol, NW], ma a sị na I debe m na nzuzo, ruo mgbe iwe Gị laghachiri, ma a sị na Ị kpaara m ókè, wee cheta m!” Ugbu a, ọ bụrụ na ọnọdụ siri ike pụrụ ime ka Job, “nwoke zuru okè, ziekwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya,” nwee ihe otiti nke nkụda obi, ọ bụghị ihe ịtụnanya na otu ihe ahụ pụrụ ime anyị.—Job 1:8, 13-19; 2:7-9, 11-13; 14:13.
8. N”ihi gịnị ka inwe nkụda obi site n’oge ruo n’oge pụrụ iji bụrụ ihe àmà kwesịrị ekwesị?
8 Lee aha ihe ngụgụ obi ọ bụ ịmara na Jehova na-eleba anya n’obi, ọ dịghịkwa eleghara ezi nzube anya! Ọ gaghị ajụ ndị na-agbalị n’ezi obi ime ihe na-atọ ya ụtọ ma ọlị. N’eziokwu, nkụda obi site na mgbe ruo na mgbe pụrụ ịbụ ihe àmà ziri ezi, na-egosi na anyị adịghị ewere ozi anyị na-ejere Jehova dị ka ihe dị nta. E si n’ebe a lee ya anya, onye na-adịghị agbaso nkụda obi mgba ma ọlị pụrụ ịbụ onye na-enweghị nghọta n’ụzọ ime mmụọ banyere adịghị ike ya nile dị ka ndị ọzọ ghọtara nke ha. Cheta: “Onye na-eche na ọ na-eguzo, ya lezie anya ka ọ ghara ịda.”—1 Ndị Kọrint 10:12; 1 Samuel 16:7; 1 Ndị Eze 8:39; 1 Ihe Emere 28:9.
E Jikwa Ájá Kpụọ Ha
9, 10. (a) Okwukwe ònye ka ndị Kraịst kwesịrị iṅomi? (b) Olee otú Mosis si meghachi omume n’ọrụ e nyere ya?
9 Ndị Hibru isi 11 depụtara ọtụtụ ndịàmà Jehova tupu oge ndị Kraịst bụ́ ndị nwere okwukwe siri ike. Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ na ndị nke oge a emewokwa otú ihe ahụ. Ihe ndị a ga-amụta site n’aka ha bara uru nke ukwuu. (Tụlee Ndị Hibru 13:7.) Dị ka ihe atụ, okwukwe ònye ka ndị Kraịst pụrụ iṅomi nke ọma karịa nke Mosis? A kpọrọ ya ka ọ ga kwusaara onye ọchịchị ụwa kasị ike nke oge ya, Fero nke Ijipt ozi ikpe ọmụma. Taa, Ndịàmà Jehova aghaghị ikwusa otu ụdị ozi ikpe ọmụma ndị ahụ megide okpukpe ụgha na nzukọ ndị ọzọ na-emegide Alaeze Kraịst e guzobeworo.—Mkpughe 16:1-15.
10 Ịrụzu ọrụ a abụghị ọrụ dị mfe, dị ka Mosis gosiri. “Ònye ka m bụ, na m ga-ejekwuru Fero, na m ga-emekwa ka ụmụ Israel si n’Ijipt pụta?” ka ọ jụrụ. Anyị pụrụ ịghọta mmetụta erughị eru ndị o nwere. O chegbukwara onwe ya banyere otú ndị Israel ibe ya ga-esi meghachi omume: “Ma, lee, ha agaghị ekwe m, ha agaghị egekwa ntị n’olu m.” Mgbe ahụ Jehova kọwaara ya otú ọ pụrụ isi gosipụta ikike e nyere ya, ma Mosis nwere nsogbu ọzọ. Ọ sịrị: “Biko, Onyenwe anyị, Ọ bụghị onye ọkà okwu ka m bụ, ma ọ bụ na mgbe gara aga, ma ọ bụ site na mgbe Ị gwara ohu Gị okwu: n’ihi na onye ọnụ ya dị arọ . . . ka m bụ.”—Ọpụpụ 3:11; 4:1, 10.
11. Dị ka Mosis, olee otú anyị pụrụ isi meghachi omume n’ebe ibu ọrụ ọchịchị Chineke dị, ma site n’inwe okwukwe, gịnị ka anyị pụrụ inwe obi ike ya?
11 Site n’oge ruo n’oge, anyị pụrụ inwe mmetụta dị ka Mosis nwere. Ọ bụ ezie na anyị na-aghọta ibu ọrụ anyị nke ọchịchị Chineke, anyị na-eche otú anyị ga-esi emezu ha. ‘Ònye ka m bụ na m ga-ejekwuru ndị mmadụ, ụfọdụ nọ n’ọkwá ka elu nke usoro ọha na eze, akụ̀ na ụba, ma ọ bụ nke agụmakwụkwọ, ma chekwube izi ha ihe n’ụzọ nile nke Chineke? Olee otú ụmụnna m n’ime mmụọ ga-esi emeghachi omume mgbe m kwuru okwu ná nzukọ ndị Kraịst dị iche iche ma ọ bụ mee ihe omume site n’ikpo okwu n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? Ọ̀ bụ na ha agaghị ahụ erughị eru m?’ Ma cheta, Jehova nọnyeere Mosis ma nye ya ihe ndị dị ya mkpa maka ọrụ ya n’ihi na Mosis nwere okwukwe. (Ọpụpụ 3:12; 4:2-5, 11, 12) Ọ bụrụ na anyị eṅomie okwukwe Mosis, Jehova ga-anọnyere anyị ma nye anyị ihe ndị dị anyị mkpa maka ọrụ anyị n’otú aka ahụ.
12. Olee otú okwukwe Devid pụrụ isi gbaa anyị ume mgbe anyị na-enwe nkụda obi maka mmehie ma ọ bụ njehie dị iche iche?
12 Onye ọ bụla nwere mmetụta nke ịda mbà ma ọ bụ nkụda obi n’ihi mmehie ma ọ bụ njehie dị iche iche pụrụ n’ezie inwe mmetụta yiri nke Devid mgbe ọ sịrị: “Mụ onwe m maara njehie m nile: mmehie m dịkwa n’ihu m mgbe nile.” N’ịrịọ Jehova arịrịọ, Devid kwukwara, sị: “Zopụ ihu Gị ná mmehie m nile, hichapụkwa ajọ omume m nile.” Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe o kwere ka nkụda obi napụ ya ọchịchọ ya ijere Jehova ozi. “Atụpụla m n’ihu Gị; anarakwala m Mmụọ Nsọ Gị.” Devid bụ “ájá” n’ụzọ doro anya, ma Jehova ewezụgaghị ihu ya site n’ebe ọ nọ, n’ihi na Devid nwere okwukwe ná nkwa Jehova kwere na ya agaghị eleda “obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa” anya.—Abụ Ọma 38:1-9; 51:3, 9, 11, 17.
13, 14. (a) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji ghọọ ndị na-eso ụzọ mmadụ? (b) Olee otú ihe atụ nke Pọl na Pita si gosi na e ji ájá kpụọ ha?
13 Otú ọ dị, rịba ama na ọ bụ ezie na anyị ga-ele “oké ìgwè ndị àmà dị otú a” anya dị ka ihe agbamume iji ‘were ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu,’ a gwaghị anyị ka anyị bụrụ ndị na-eso ụzọ ha. A gwara anyị ka anyị gbasoo nzọụkwụ nke “Jisọs . . . onye ndú na onye mmezu nke okwukwe anyị,” ọ bụghị ndị mmadụ na-ezughị okè—ọ bụghịdị ọbụna ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi nke narị afọ mbụ.—Ndị Hibru 12:1, 2; 1 Pita 2:21.
14 Ndị ozi bụ́ Pọl na Pita, ndị gbasiri ike n’ọgbakọ ndị Kraịst, nwere ihe mkpọbi ụkwụ mgbe ụfọdụ. “Ezi ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme,” ka Pọl dere. “Mmadụ nke hụjuru anya ka mụ onwe m bụ!” (Ndị Rom 7:19, 24) Pita kwa n’oge nke inwebiga obi ike ókè gwara Jisọs, sị: “Ọ bụrụ na a ga-eme mmadụ nile ka ha ma n’ọnyà n’ahụ Gị, a gaghị eme ka mụ onwe m ma n’ọnyà mgbe ọ bụla.” Mgbe Jisọs dọrọ Pita aka ná ntị na ọ ga-agọnarị Ya ugboro atọ, Pita ji mpako kwuo ihe megidere nke Nna ya Ukwu, na-etu ọnụ, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ọbụna ka m so Gị nwụọ, agaghị m agọnarị Gị ma ọlị.” Ma ọ gọnarịrị Jisọs, ngahie nke mere ka o bee ákwá nke ukwuu. Ee, e ji ájá kpụọ Pọl na Pita.—Matiu 26:33-35.
15. N’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ na e ji ájá kpụọ anyị, mkpali dị aṅaa ka anyị nwere iji gaa n’ihu?
15 Otú ọ dị, n’agbanyeghị adịghị ike ha, Mosis, Devid, Pọl, Pita, na ndị ọzọ yiri ha nwere mmeri. N’ihi gịnị? N’ihi na ha nwere okwukwe siri ike na Jehova, tụkwasị ya obi kpam kpam, ma rapagidesie ike n’ebe ọ nọ n’agbanyeghị ihe ndọla azụ dị iche iche. Ha dabeere n’ebe ọ nọ inye “ọkịka nke ike ahụ.” O mekwara otú ahụ, na-ekweghị ka ha daa ọdịda n’enweghị mbili. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-enwe okwukwe, anyị pụrụ ijide n’aka na mgbe e kpebiri ikpe n’ọnọdụ anyị, ọ ga-ekwekọ n’okwu a: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị.” Lee aha ihe mkpali nke a na-enye iji gaa n’ihu n’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ na e ji ájá kpụọ anyị!—2 Ndị Kọrint 4:7; Ndị Hibru 6:10.
Gịnị Ka Ịbụ Ndị E Ji Ájá Kpụọ Pụtaara Anyị n’Otu n’Otu?
16, 17. Mgbe a bịara n’ịtụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, olee ụzọ Jehova si etinye ụkpụrụ ahụ a kọwara ná Ndị Galetia 6:4 n’ọrụ?
16 Ahụmahụ akụziworo ọtụtụ ndị nne na nna na ndị nkụzi amamihe nke ịtụ ụmụaka ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ dị ka ikike ha nwere n’otu n’otu si dị, ọ bụghị ná ndabere nke iji ha tụnyere ụmụnne ha ma ọ bụ ụmụ klasị ha. Nke a kwekọrọ n’otu ụkpụrụ Bible nke a gwaworo ndị Kraịst ka ha gbasoo: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ nke aka ya, mgbe ahụ ka ọ ga-enwekwa ihe ọ ga-anyara isi n’ebe nanị ya onwe ya nọ, ọ bụghịkwa n’ebe ibe ya nọ.”—Ndị Galetia 6:4.
17 N’ikwekọ n’ụkpụrụ a, ọ bụ ezie na Jehova na-emeso ndị ya dị ka ìgwè a haziri ahazi, ọ na-atụ ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’otu n’otu. Ndị Rom 14:12 sịrị: “Onye ọ bụla n’etiti anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya nye Chineke.” Jehova maara nke ọma ihe mejupụtara mkpụrụ ndụ ebumpụta ụwa nke onye ohu ya ọ bụla. Ọ maara ihe mejupụtara elu ahụ na uche ha, ikike ha, ume na adịghị ike ha ketara eketa, nkà ha, nakwa ókè ha aṅaa ha na-eji nkà ndị a amịpụta mkpụrụ nke ndị Kraịst. Okwu Jisọs kwuru banyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ bụ́ onye tụbara mkpụrụ ego nta abụọ n’ebe a na-atụba ụtụ nke ụlọ nsọ ahụ na ilu ya nke mkpụrụ ahụ a kụrụ n’ala dị mma bụcha ihe atụ na-agba ume nye ndị Kraịst pụrụ inwe mmetụta nke ịda mbà n’obi n’ihi iji onwe ha atụnyere ndị ọzọ n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya.—Mak 4:20; 12:42-44.
18. (a) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji kpebie ihe ịbụ ájá pụtaara anyị n’otu n’otu? (b) N’ihi gịnị ka ezi nnyocha onwe onye ji na-ekwesịghị ịkpatara anyị obi nkoropụ?
18 Ọ dị oké mkpa na anyị kpebiri ihe ịbụ ájá pụtara n’ọnọdụ anyị onwe anyị n’otu n’otu ka anyị wee nwee ike iji ikike anyị zuru ezu jee ozi. (Ilu 10:4; 12:24; 18:9; Ndị Rom 12:1) Nanị site n’ịmara amaghị eme na adịghị ike nke onwe anyị nke ọma ka anyị pụrụ ịmụrụ anya nye mkpa na ikwe omume nke mmeziwanye ihe. N’ime nnyocha onwe onye, ka anyị hapụ ileghara ike nke mmụọ nsọ anya n’inyere anyị aka imeziwanye ihe. Ọ bụ site na ya ka e si kee eluigwe na ala, dee Bible, ma, n’etiti ụwa nke na-anwụ anwụ, wepụtaworị òtù ụwa ọhụrụ nke dị n’udo. Ya mere mmụọ nsọ Chineke n’ezie nwere ike zuru ezu inye ndị na-arịọ maka ya amamihe na ume nke dị mkpa iji nọgide n’ikwesị ntụkwasị obi.—Maịka 3:8; Ndị Rom 15:13; Ndị Efesọs 3:16.
19. Gịnị ka anyị ịbụ ndị e ji ájá kpụọ na-abụghị ihe ngọpụ ya?
19 Lee aha ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na Jehova na-echeta na anyị bụ ájá! Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe anyị kwesịrị iche na nke a bụ ihe ngọpụ ziri ezi maka adịghị uchu ma ọ bụ ma eleghị anya ọbụna maka ime ihe ọjọọ. Ọ dịghị ma ọlị! Na Jehova na-echeta na anyị bụ ájá bụ ngosipụta nke amara ya na-ekwesịghịrị anyị. Ma anyị agaghị achọ ịbụ “ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agha amara Chineke anyị ka ọ bụrụ agụụ ịkwa iko, ndị na-agọnarịkwa Onye nanị Ya bụ Nna nwe ọha, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (Jud 4) Ịbụ ndị e ji ájá kpụọ abụghị ihe ngọpụ maka ịbụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Onye Kraịst na-agbalị ibuso ọchịchọ ọjọọ agha, na-etipụta ahụ ya ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu ya, iji zere ‘ime ihe ga-ewute Mmụọ Nsọ nke Chineke.’—Ndị Efesọs 4:30; 1 Ndị Kọrint 9:27.
20. (a) N’akụkụ abụọ ndị dị aṅaa ka anyị nwere ‘ọrụ anyị ga-arụbiga ókè mgbe nile n’ọrụ Onyenwe anyị’? (b) N’ihi gịnị ka anyị ji nwee ihe mere anyị ga-eji na-enwe nchekwube?
20 Ugbu a, n’afọ ndị ikpeazụ nke usoro ihe nke ụwa Setan, abụghị oge ịkwụsịtụ—ọ bụghị n’akụkụ nke nkwusa Alaeze, ọ bụghịkwa n’akụkụ nke ịzụlitekwu mkpụrụ nke mmụọ Chineke. N’akụkụ abụọ ahụ anyị nwere ‘ọrụ anyị ga-arụbiga ókè mgbe nile.’ Ugbu a bụ oge ịga n’ihu n’ihi na anyị maara na ‘ọrụ anyị abụghị ihe efu.’ (1 Ndị Kọrint 15:58) Jehova ga-akwagide anyị, n’ihi na Devid kwuru banyere ya, sị: “Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 55:22) Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịmara na Jehova na-ekwe ka anyị n’otu n’otu kere òkè n’ọrụ kasị ukwuu e kenyetụworo ụmụ mmadụ e kere eke na-ezughị okè ịrụ—nke a kwa n’agbanyeghị anyị ịbụ ndị e ji ájá kpụọ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Akwụkwọ ahụ na-akọwa Bible bụ́ Herders Bibelkommentar, n’ikwu banyere Abụ Ọma 103:14, sịrị: “Ọ maara nke ọma na o sitere n’ájá nke ala kee mmadụ, ọ makwaara adịghị ike nile na ọdịdị na-adịghị adịte anya, nke na-anyịgbu ha kemgbe mmehie mbụ ahụ.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Olee ụzọ Jenesis 2:7 na Abụ Ọma 103:14 si dịrịta iche n’izo aka n’ebe ụmụ mmadụ nọ dị ka ndị e ji ájá kpụọ?
◻ N’ihi gịnị ka Ndị Hibru isi 11 ji bụrụ isi iyi nke agbamume nye ndị Kraịst taa?
◻ N’ihi gịnị ka anyị ji bụrụ ndị amamihe n’itinye ụkpụrụ e setịpụrụ ná Ndị Galetia 6:4 n’ọrụ?
◻ Olee ụzọ Ndị Hibru 6:10 na 1 Ndị Kọrint 15:58 pụrụ isi nyere anyị aka igbochi nkụda obi?
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Ndị Kraịst na-eṅomi okwukwe nke ndị ofufe ibe ha, ma ha na-agbaso Onye Mmezu nke okwukwe ha, bụ́ Jisọs