Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 1/1 p. 27-31
  • Ikpebi Ihe Bụ Adịghị Ike, Mmebi Iwu, na Nchegharị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikpebi Ihe Bụ Adịghị Ike, Mmebi Iwu, na Nchegharị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịtụ Adịghị Ike, Mmebi Iwu, na Nchegharị n’Ihe Ọ̀tụ̀tụ̀
  • Iburu Ibu Ọrụ na Ichegharị
  • Ime Omume Ọjọọ
  • Iji Mpako Leghara Jehova Anya
  • Imerụ Ndị Ọzọ Ahụ
  • Itinye Ụkpụrụ Chineke n’Ọrụ
  • Na-anabata Ịdọ Aka ná Ntị Jehova Mgbe Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Gịnị Ka I Kwesịrị Ime ma I Mee Mmehie Dị Oké Njọ?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ì Mehiela Megide Mmụọ Nsọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 1/1 p. 27-31

Ikpebi Ihe Bụ Adịghị Ike, Mmebi Iwu, na Nchegharị

MMEHIE bụ ihe ndị Kraịst kpọrọ asị—erughị eru n’ụkpụrụ ezi omume nile nke Jehova. (Ndị Hibru 1:9) N’ụzọ na-adịghị enye obi ụtọ, anyị nile na-emehie site n’oge ruo n’oge. Anyị nile na-agba mgba megide adịghị ike na ezughị okè ebumpụta ụwa. Otú ọ dị, n’ihe ka n’ọtụtụ ọnọdụ, ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị gwa Jehova ma tinyesie mgbalị ike ịghara imeghachi ha, anyị pụrụ ịbịakwute ya site n’akọ na uche dị ọcha. (Ndị Rom 7:21-24; 1 Jọn 1:8, 9; 2:1, 2) Anyị na-ekele Jehova na, ná ndabere nke àjà mgbapụta ahụ, ọ na-anakwere ozi anyị dị nsọ n’agbanyeghị adịghị ike anyị.

Ọ bụrụ na mmadụ adaba ná mmehie dị oké njọ n’ihi adịghị ike nke anụ ahụ, ọzụzụ atụrụ dị ngwa dị ya mkpa n’ikwekọ n’ụkpụrụ e depụtara na Jemes 5:14-16: “Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti unu nke ahụ ya na-adịghị ike [n’ụzọ ime mmụọ]? ya kpọọ ndị okenye nke nzukọ Kraịst ka ha bịakwute ya . . . Ọ bụrụkwa na o mehieworo, a ga-agbaghara ya mmehie ahụ. Ya mere, na-ekwupụtanụ mmehie nile unu gwarịta ibe unu, na-ekpekwa ekpere n’ihi ibe unu, ka e wee mee ka ahụ dị unu ike.”

Ya mere, mgbe onye Kraịst raara onwe ya nye mere ajọ mmehie, ihe karịrị ya onwe ya ikwupụta ya gwa Jehova dị mkpa. Ndị okenye aghaghị ime ihe ụfọdụ, ebe ọ bụ na a na-eyi ịdị ọcha ma ọ bụ udo nke ọgbakọ egwu. (Matiu 18:15-17; 1 Ndị Kọrint 5:9-11; 6:9, 10) Ndị okenye pụrụ ikpebi: Onye ahụ ò nwere nchegharị? Gịnị dujere ná mmehie ahụ? Ọ̀ bụ ihe sitere n’adịghị ike nke mere n’otu mgbe? Ọ̀ bụ omume mmehie? Mkpebi dị otú ahụ abụghị ihe na-adị mfe ma ọ bụ doo anya mgbe nile, ọ na-achọkwa inwe nghọta dị ukwuu.

Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na mmehie ahụ bụ n’ihi ịgbaso ụzọ nke ajọ omume na àgwà ọjọọ? Mgbe ahụ, ibu ọrụ ndị okenye doro anya. Mgbe ọ na-enye ntụziaka banyere ileba okwu siri ike anya n’ọgbakọ Kọrint, Pọl onyeozi sịrị: “Wepụnụ ajọ onye ahụ n’etiti onwe unu.” (1 Ndị Kọrint 5:13) Ndị ajọ omume enweghị ọnọdụ ọ bụla n’ọgbakọ ndị Kraịst.

Ịtụ Adịghị Ike, Mmebi Iwu, na Nchegharị n’Ihe Ọ̀tụ̀tụ̀

Olee otú ndị okenye pụrụ isi mara mgbe mmadụ nwere nchegharị?a Nke a abụghị ajụjụ dị mfe. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere Eze Devid. Ọ kwara iko, mgbe ahụkwa, n’ihi nke ahụ, gbuo ọchụ. Ma, Jehova kwere ka ọ nọgide ndụ. (2 Samuel 11:2-24; 12:1-14) Cheekwa echiche banyere Ananaịas na Safaịra. Ha ji okwu ụgha nwaa ịghọgbu ndị ozi ahụ, jiri ihu abụọ na-eme ka à gaasị na ha na-emesapụ aka karịa otú ha na-eme n’ezie. Nke ahụ ọ̀ dị oké njọ? Ee. Ọ̀ dị njọ ruo ka igbu ọchụ na ịkwa iko? Ọ dịghị ma ọlị! Ma, Ananaịas na Safaịra ji ndụ ha kwụọ ụgwọ.—Ọrụ 5:1-11.

Gịnị mere e ji nwee ọdịiche n’ikpe ndị ahụ? Devid dabara ná mmehie dị oké njọ n’ihi adịghị ike anụ ahụ. Mgbe a kọọrọ ya ihe o meworo, o chegharịrị, Jehova gbaghakwaara ya—ọ bụ ezie na a tara ya ahụhụ n’ụzọ siri ike n’ihe banyere nsogbu ndị dị n’ezinụlọ ya. Ananaịas na Safaịra mehiere n’ihi na ha ji ihu abụọ ghaa ụgha, na-anwa ịghọgbu ọgbakọ ndị Kraịst wee si otú a ‘gwa mmụọ nsọ na Chineke okwu ụgha.’ Nke ahụ ghọrọ ihe àmà nke na-egosi obi ọjọọ. Ya mere, a mara ha ikpe n’ụzọ siri ike.

N’ọnọdụ abụọ ahụ Jehova kpere ikpe ahụ, ikpe ya zikwara ezi n’ihi na ọ na-enyocha obi. (Ilu 17:3) Ndị okenye bụ́ mmadụ apụghị ime nke ahụ. Ya mere olee otú ndị okenye pụrụ isi chọpụta ma mmehie dị oké njọ ọ̀ bụ ihe àmà nke adịghị ike kama ịbụ nke mmebi iwu?

N’ezie, mmehie nile dị njọ, ma ọ bụghị ndị mmehie nile dị njọ. Otu ụdị mmehie pụrụ ịbụ ihe àmà nke adịghị ike n’otu onye na nke mmebi iwu n’onye ọzọ. N’ezie, ime mmehie na-agụnyekarị ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ma adịghị ike ma mmebi iwu n’akụkụ nke onye mmehie ahụ. Otu isi ihe na-ekpebi nke ahụ bụ ụzọ onye mmehie ahụ si ele ihe o meworo anya na ihe o bu n’uche ime banyere ya. Ọ̀ na-egosi mmụọ nchegharị? Nghọta dị ndị okenye mkpa iji chọpụta nke a. Olee otú ha pụrụ isi nweta nghọta nke ahụ? Pọl onyeozi kwere Timoti nkwa, sị: “Na-atụgharị uche n’ihe m na-ekwu; n’ihi na Onyenwe anyị ga-enye gị nghọta n’ihe nile.” (2 Timoti 2:7) Ọ bụrụ na ndị okenye ji umeala n’obi “na-atụgharị uche” n’okwu Pọl nke sitere n’ike mmụọ nsọ na nke ndị ọzọ so dee Bible, ha ga-enweta nghọta dị mkpa iji lee ndị mere mmehie n’ọgbakọ anya n’ụzọ ziri ezi. Mgbe ahụ, mkpebi ha ga-egosipụta echiche Jehova, ọ bụghị nke ha.—Ilu 11:2; Matiu 18:18.

Olee ụzọ e si eme nke a? Otu ụzọ bụ inyocha ụzọ Bible si akọwa ndị mmebi iwu ma hụ ma nkọwa ahụ ò kwekọrọ n’ọnọdụ onye ahụ a na-elenye anya n’okwu ya.

Iburu Ibu Ọrụ na Ichegharị

Mmadụ abụọ mbụ họọrọ ụzọ mmebi iwu bụ Adam na Iv. N’agbanyeghị na ha zuru okè ma nwee ihe ọmụma zuru ezu banyere iwu Jehova, ha nupụrụ isi megide ọkaaka Chineke. Mgbe Jehova mere ka ha mara ihe ha meworo, mmeghachi omume ha kwesịrị ịrịba ama—Adam tara Iv ụta, Iv takwara agwọ ahụ ụta! (Jenesis 3:12, 13) Jiri nke a tụnyere ịdị umeala n’obi dị omimi nke Devid. Mgbe e ji ajọ mmehie ya chee ya ihu, ọ nakweere ibu ọrụ ma rịọ maka mgbaghara, na-asị: “Emehiewo m megide Jehova.”—2 Samuel 12:13; Abụ Ọma 51:4, 9, 10.

Ọ ga-adị mma ka ndị okenye tụlee ihe atụ abụọ ndị a mgbe ha na-eleba anya n’okwu ndị metụtara mmehie dị oké njọ, karịsịa n’akụkụ nke onye toworo eto. Onye mmehie ahụ—dị ka Devid mgbe e doro ya anya banyere mmehie ya—ọ̀ nakweere ụta nke ihe o mere n’egbughị oge ma jiri nchegharị na-elegara Jehova anya maka enyemaka na mgbaghara, ka ọ̀ chọrọ ibelata ihe o meworo, ma eleghị anya na-ata onye ọzọ ụta? N’eziokwu, onye ahụ mere mmehie pụrụ ịchọ ịkọwa ihe dujere n’ihe o mere, a pụkwara inwe ọnọdụ ndị, ma ọ bụ n’oge gara aga ma ọ bụ ugbu a, ọ pụrụ ịdị mkpa ka ndị okenye tụlee mgbe ha na-ekpebi ụzọ isi nyere ya aka. (Tụlee Hosea 4:14.) Ma o kwesịrị ịnakwere na ọ bụ ya bụ onye mere mmehie na ọ bụkwa ya nwe ibu ọrụ n’ihu Jehova. Cheta: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.”—Abụ Ọma 34:18.

Ime Omume Ọjọọ

N’akwụkwọ Abụ Ọma, e nwere ọtụtụ izo aka n’ebe ndị ajọ omume nọ. Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị otú ahụ pụrụ inyekwuru ndị okenye aka ịghọta ma mmadụ ọ̀ bụ onye mmebi iwu ka ọ̀ bụ onye na-adịghị ike n’ụzọ bụ isi. Dị ka ihe atụ, tụlee ekpere Eze Devid nke sitere n’ike mmụọ nsọ: “Adọkpụrụla m tinyere ndị na-emebi iwu, tinyekwara ndị na-arụ ajọ ihe; ndị na-agwa mmadụ ibe ha okwu udo, ma ihe ọjọọ dị n’obi ha.” (Abụ Ọma 28:3) Rịba ama na e hotara ndị na-emebi iwu n’akụkụ “ndị na-arụ ajọ ihe.” Onye mere mmehie n’ihi adịghị ike anụ ahụ yikarịrị ka ọ ga-akwụsị ozugbo anya doro ya. Otú ọ dị, ọ bụrụ na mmadụ “na-arụ” ajọ ihe nke na ọ na-aghọ akụkụ nke ndụ ya, nke a pụrụ ịbụ ihe àmà nke ajọ obi.

Devid hotara njimara ọzọ nke mmebi iwu n’amaokwu ahụ. Dị ka Ananaịas na Safaịra, onye na-emebi iwu na-eji ọnụ ya ekwu ezi ihe ma nwee ajọ ihe n’obi ya. Ọ pụrụ ịbụ onye ihu abụọ—dị ka ndị Farisii nke oge Jisọs bụ́ ndị ‘na-egosi onwe ha n’ìhè nye mmadụ dị ka ndị ezi omume, ma n’ime jupụta n’ihu abụọ na ihe na-emebi iwu.’ (Matiu 23:28; Luk 11:39) Jehova kpọrọ ihu abụọ asị. (Ilu 6:16-19) Ọ bụrụ na mmadụ ejiri ihu abụọ nwaa ịgọnarị mmehie ya ndị dị oké njọ ọbụna mgbe ọ na-ekwu okwu n’ihu kọmitii ikpe, ma ọ bụ jiri ịma ọsụ kweta nanị ihe ndị ọzọ mataworo, na-ajụ ikwupụta ihe nile, nke a pụrụ ịbụ ihe àmà nke ajọ obi.

Iji Mpako Leghara Jehova Anya

E depụtara ihe ndị ọzọ e ji amara onye mmebi iwu n’Abụ Ọma nke 10. N’ebe ahụ anyị na-agụ, sị: “Site ná mpako nke onye na-emebi iwu ka a na-achụ onye e wedara n’ala ọkụ ọkụ; . . . o lelịwo Jehova.” (Abụ Ọma 10:2, 3) Olee otú anyị ga-esi lee onye Kraịst raara onwe ya nye anya nke dị mpako ma na-elelị Jehova? N’ezie, ndị a bụ àgwà uche ndị dị njọ. Onye mere mmehie n’ihi adịghị ike gaje, ozugbo ọ ghọtara mmehie ya ma ọ bụ a dọọrọ uche ya gaa na ya, ichegharị ma gbalịsie ike ichigharị ndụ ya. (2 Ndị Kọrint 7:10, 11) N’ụzọ dị iche, ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie n’ihi nlelị bụ isi o nwere maka Jehova, gịnị ga-egbochi ya ịlaghachi mgbe mgbe n’ụzọ mmehie ya? Ọ bụrụ na ọ dị mpako n’agbanyeghị ịbụ onye e nyere ndụmọdụ na mmụọ nke ịdị nwayọọ, olee otú ọ pụrụ isi nwee umeala n’obi dị mkpa iji chegharịa n’ezi obi na n’eziokwu?

Ugbu a tụlee okwu Devid mesịrị kwuo n’otu abụ ọma ahụ: “N’ihi gịnị ka onye na-emebi iwu lelịworo Chineke? Ọ sịwo n’obi ya, Ị gaghị ajụ ajụjụ.” (Abụ Ọma 10:13) N’usoro ọgbakọ ndị Kraịst, onye na-emebi iwu maara ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ, ma ọ dịghị ala azụ ime ihe ọjọọ ma o chee na ya pụrụ ịgbanahụ na nke ahụ. Ọ bụrụhaala na ụjọ ikpughe ya adịghị, ọ na-emikpu onwe ya ná mkpali mmehie ya nile. N’adịghị ka Devid, ọ bụrụ na mmehie ya apụta ìhè, ọ ga-akpa nkata izere ịdọ aka ná ntị. Onye dị otú ahụ na-elelị Jehova nke ukwuu. “Ọ dịghị oké egwu Chineke dị n’anya ya abụọ. . . . Ọ dịghị ajụ ihe ọjọọ.”—Abụ Ọma 36:1, 4.

Imerụ Ndị Ọzọ Ahụ

Dị ka ọ na-adịkarị, mmehie na-emetụtakarị ihe karịrị otu onye. Dị ka ihe atụ, onye na-akwa iko na-emehie megide Chineke; ọ na-eme nwunye na ụmụ ya ihe ọjọọ; ọ bụrụ na onye ya na ya kwara iko lụrụ di, ọ na-eme ezinụlọ ya ihe ọjọọ; ọ na-emetọ ezi aha nke ọgbakọ. Olee otú o si ele ihe ndị ahụ nile anya? Ọ̀ na-egosi mwute sitere n’obi tinyere ezi nchegharị? Ka ọ̀ na-egosipụta mmụọ ahụ a kọwara n’Abụ Ọma nke 94: “Ndị nile nke na-arụ ajọ ihe na-anya isi. Ndị Gị ka ha na-azọpịa, Jehova, ọ bụkwa ihe nketa Gị ka ha na-eweda n’ala. Ha na-egbu nwanyị di ya nwụrụ, na ọbịa, ha na-egbukwa ụmụ mgbei n’ọchụ. Ha wee sị, Ja agaghị ahụ, Chineke nke Jekọb agaghị amatakwa”?—Abụ Ọma 94:4-7.

O yikarịrị ka mmehie ndị a na-eleba anya n’ọgbakọ agaghị agụnye igbu ọchụ na igbu mmadụ. Ma mmụọ nke e gosipụtara n’ebe a—mmụọ nke ịdị njikere ime ndị ọzọ ihe ọjọọ maka abamuru onwe onye—pụrụ ịghọ ihe doro anya mgbe ndị okenye na-enyocha ajọ omume. Nke a bụkwa nganga, akara e ji ama onye na-emebi iwu. (Ilu 21:4) Ọ na-emegide kpam kpam mmụọ nke ezi onye Kraịst, bụ́ onye dị njikere ịchụ onwe ya n’àjà maka nwanna ya.—Jọn 15:12, 13.

Itinye Ụkpụrụ Chineke n’Ọrụ

E bughị n’uche ka ntụziaka ole na ole ndị a ghọọ iwu. Otú ọ dị, ha na-enye echiche nke ihe ụfọdụ Jehova na-ele anya dị ka mmebi iwu n’ezie. À jụrụ ịnakwere ibu ọrụ maka ajọ ihe e mere? Onye ahụ mere mmehie ò jiwo anyaike leghara ndụmọdụ e nyere na mbụ banyere okwu nke a anya? È nwere omume gbara mkpọrọgwụ nke ajọ omume dị oké njọ? Onye ajọ omume ahụ ọ̀ na-egosipụta iji anyaike elelị iwu Jehova? Ò tinyewo mgbalị e leziri anya mee iji zochie ihe ọjọọ ahụ, ma eleghị anya na-emebi ndị ọzọ n’otu oge ahụ? (Jud 4) Mgbalị ndị dị otú ahụ hà na-esiwanye nnọọ ike mgbe ihe ọjọọ ahụ pụtara ìhè? Onye ajọ omume ahụ ọ̀ na-egosipụta nlelị kpam kpam maka mmerụ ahụ o wetawooro ndị ọzọ na aha Jehova? Gịnị banyere àgwà ya? Mgbe e nyesịrị ya ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ n’obi ọma, ọ̀ dị mpako ma ọ bụ nganga? Ọ̀ bụ na o nweghị ọchịchọ sitere n’obi izere imeghachi ihe ọjọọ ahụ? Ọ bụrụ na ndị okenye achọpụta ihe ndị dị otú ahụ, nke na-egosi n’ụzọ siri ike enweghị nchegharị, ha pụrụ ikwubi na mmehie ndị ahụ e mere na-enye ihe àmà nke mmebi iwu kama ịbụ nanị adịghị ike nke anụ ahụ.

Ọbụna mgbe a na-emeso onye yiri ka o nwere ọchịchọ mmebi iwu omume, ndị okenye adịghị akwụsị ịgba ya ume ịgbaso ezi omume. (Ndị Hibru 3:12) Ndị na-emebi iwu pụrụ ichegharị ma gbanwee. Ọ bụrụ na ọ bụghị otú ahụ, n’ihi gịnị ka Jehova ji gbaa ndị Israel ume, sị: “Onye na-emebi iwu, ya hapụ ụzọ ya, onye na-eme ajọ ihe, ya hapụ echiche ya nile: ya laghachikwutekwa Jehova, Ọ ga-enwekwa obi ebere n’ahụ ya; ya laghachikwutekwa Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụba”? (Aịsaịa 55:7) Eleghị anya, n’oge a na-anụrụ okwu ikpe ahụ, ndị okenye ga-achọpụta mgbanwe pụtara ìhè n’ọnọdụ obi ya dị ka a na-egosipụta n’omume na àgwà nke onye nwere nchegharị.

Ọbụna n’oge a na-achụpụ mmadụ n’ọgbakọ, ndị okenye, dị ka ndị ọzụzụ atụrụ, ga-agba ya ume ichegharị ma gbalịa ịlaghachite n’amara Jehova. Cheta ‘onye ahụ na-emebi iwu’ nọ na Kọrint. Ihe àmà gosiri na ọ gbanwere ụzọ ya, Pọl mesịkwara tụọ aro ka a kpọbataghachi ya. (2 Ndị Kọrint 2:7, 8) Tụleekwa Eze Manase. Ọ bụ nnọọ onye mmebi iwu n’ezie, ma o mesịrị chegharịa, Jehova nakweere nchegharị ya.—2 Ndị Eze 21:10-16; 2 Ihe Emere 33:9, 13, 19.

N’eziokwu, e nwere mmehie nke a na-agaghị agbaghara agbaghara—mmehie megide mmụọ nsọ. (Ndị Hibru 10:26, 27) Nanị Jehova na-ekpebi onye meworo mmehie ahụ. Ụmụ mmadụ enweghị ikike ime otú ahụ. Ibu ọrụ nke ndị okenye bụ idebe ọgbakọ ọcha na inye aka iweghachi ndị mmehie nwere nchegharị. Ọ bụrụ na ha emee otú ahụ site ná nghọta na umeala n’obi, na-ekwere ka mkpebi ha nile na-egosipụta amamihe Jehova, mgbe ahụ Jehova ga-agọzi akụkụ nke a nke ọzụzụ atụrụ ha.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee Ụlọ Nche nke December 1, 1981, peji nke 23-26; Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 772-774.

[Foto dị na peeji nke 29]

Ananaịas na Safaịra ji ihu abụọ gwa mmụọ nsọ okwu ụgha, na-egosipụta mmebi iwu nke obi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya