Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g21 nke 1 p. 8-9
  • Ihe Ga-eme Ka Ihe Ndị I Nwere Na-eju Gị Afọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ga-eme Ka Ihe Ndị I Nwere Na-eju Gị Afọ
  • Teta!—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-arụsi Ọrụ Ike
  • Na-akwụwa Aka Gị Ọtọ
  • Ekwela Ka Ego Bụrụ Ihe Kacha Gị Mkpa ná Ndụ
  • Họrọ Agụmakwụkwọ Kacha Mma
  • Otú E Kwesịrị Isi Na-ele Ego Anya
    Teta!—2015
  • Ego Ọ̀ Bụ Mkpọrọgwụ nke Ihe Ọjọọ Niile?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ego
    Teta!—2014
  • Olee Ụzọ Amamihe Dị na Ya Isi Na-ele Ego Anya?
    Teta!—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2021
g21 nke 1 p. 8-9
Ebe otu nwaanyị na nwa ya ji obi ụtọ na-agafe n’ebe a na-ere ahịa n’India. Ihe ha nwere juru ha afọ. Ndị nọ ha n’akụkụ na-azụ ihe ndị dị oké ọnụ.

Ihe Ga-eme Ka Ihe Ndị I Nwere Na-eju Gị Afọ

Anyị niile, ma ndị lụrụla di na nwunye ma ndị na-alụbeghị, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, chọrọ ka ihe anyị nwere na-eju anyị afọ, anyị ana-enwekwa obi ụtọ ná ndụ. Ihe a ka Chineke chọkwara maka anyị. N’ihi ya, o nyere anyị ndụmọdụ ndị ga-abara anyị uru.

Na-arụsi Ọrụ Ike

“Ka ọ na-arụsi ọrụ ike, jiri aka ya na-arụ ọrụ dị mma, ka o wee nwee ihe ọ ga-enye onye nọ ná mkpa.”​—NDỊ EFESỌS 4:28.

Chineke na-agba anyị ume ile ọrụ anya otú kwesịrị ekwesị. N’ihi gịnị? Onye na-arụsi ọrụ ike na-enwe obi ụtọ n’ihi na ọ ga-enwe ike igbo mkpa ya na nke ndị ezinụlọ ya. O nwedịrị ike inyere onye ọzọ nọ ná mkpa aka. Onye ọ na-arụrụ ọrụ ga-ejikwa ya kpọrọ ihe. N’ihi ya, o yikarịrị ka a gaghị achụ ụdị onye a n’ọrụ. Otú Akwụkwọ Nsọ si kọwaa uru dị n’ịrụsi ọrụ ike dabara adaba. Ọ sịrị na ọ bụ “onyinye Chineke.”​—Ekliziastis 3:13.

Na-akwụwa Aka Gị Ọtọ

“Obi siri anyị ike na akọnuche anyị dị ọcha, anyị chọkwara ịna-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile.”​—NDỊ HIBRU 13:18.

Ọ bụrụ na anyị na-akwụwa aka anyị ọtọ, anyị ga na-enwe obi ụtọ n’ime onwe anyị. Obi ga na-eru anyị ala, anyị ga na-ehikwa ụra nke ọma n’abalị. Ihe ọzọ bụ na ndị mmadụ ga na-atụkwasị anyị obi ma na-akwanyere anyị ùgwù. Ndị na-anaghị akwụwa aka ha ọtọ anaghị enweta ihe ọma ndị a. Akọnuche ha nwekwara ike ịna-apịa ha ụtarị, ụjọ ana-atụkwa ha na otu ụbọchị, iko ha ga-eju.

Ekwela Ka Ego Bụrụ Ihe Kacha Gị Mkpa ná Ndụ

“Ka otú unu si ebi ndụ gosi na unu ahụghị ego n’anya, kama ka ihe ndị dị ugbu a ju unu afọ.”​—NDỊ HIBRU 13:5.

Ego dị anyị mkpa iji zụta nri na ihe ndị ọzọ dị anyị mkpa. Ma, “ịhụ ego n’anya” dị njọ. O nwere ike ime ka mmadụ jiri ike ya niile na oge ya niile na-achọ inwetakwu ego. Mmadụ isi otú a na-achụ ego ọnwụ ọnwụ nwere ike ịkpaghasị ezinụlọ ya, mee ka ya na ụmụaka ya ghara ịna-anọ, kpatakwara ya ọrịa. (1 Timoti 6:​9, 10) Ihe ọzọ bụ na onye hụrụ ego n’anya nwere ike ịchọwa ịrụrụ aka iji nweta ego. Otu nwoke nwere amamihe kwuru, sị: “Ọtụtụ ngọzi ga-abịara onye a tụkwasịrị obi, ma onye na-achọ ka ọ baa ọgaranya ngwa ngwa ga-etinyerịrị aka n’ihe ọjọọ.”​—Ilu 28:20.

Họrọ Agụmakwụkwọ Kacha Mma

“Jidesie ezigbo amamihe aka ike, na-echebakwara ihe echiche nke ọma.”​—ILU 3:21.

Ezigbo agụmakwụkwọ na-enyere mmadụ aka ịbụ onye e nwere ike ịtụkwasị obi, nakwa ịbụ ezigbo nne ma ọ bụ nna. Ma, naanị mmadụ ịgụ akwụkwọ nke ọma n’ụlọ akwụkwọ agaghị eme ka onye ahụ na-enweta ihe ndị dị ya mkpa mgbe niile ma na-enwe obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe gaziere anyị n’ihe niile anyị na-eme ná ndụ, agụmakwụkwọ nke si n’aka Chineke dị anyị mkpa. Akwụkwọ Nsọ kwuru otú ihe ga-adịrị onye na-ege Chineke ntị. Ọ sịrị: “Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”​—Abụ Ọma 1:​1-3.

Obi Na-adị M Ụtọ, Ihe M Nwere Na-ejukwa M Afọ

“N’obodo anyị, ọtụtụ ndị na-arụsi ọrụ ike ka ha nwee ike ịgụ oké akwụkwọ, nwee akụnụba, bụrụkwa ndị a ma ama. Ma, ọ ka na-esiri ha ike ịna-enwe ezigbo obi ụtọ, ha nwetachagodị ihe ndị a. Baịbụl nyeere m aka ịghọta ihe kacha mkpa ná ndụ. Amụtara m na ego nwere ike ichebe anyị n’ụzọ ụfọdụ. Ma, agaghị ejili ya azụta ezigbo obi ụtọ na ezigbo ịhụnanya. Obi na-adị m ụtọ, ihe m nwere na-ejukwa m afọ n’ihi na Baịbụl na-enyere m aka ime mkpebi dị mma ma a bịa n’ihe banyere ego.”​—Kishore.

Kishore.

Mụtakwuo ihe ndị ọzọ:

Ị chọọ ịmatakwu banyere ndụmọdụ Chineke nyere anyị n’ihe banyere ọrụ, ego, na agụmakwụkwọ, gaa na jw.org/ig n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa UDO NA OBI ỤTỌ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya