Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ị Ga-abụli Enyi Jehova
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 3. Olee ụdị ndị Jehova chọrọ ka ha na ya bụrụ enyi?

      Jehova hụrụ mmadụ niile n’anya, “ma ya na onye ezi omume na-abụ ezigbo enyi.” (Ilu 3:32) Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-eme ihe dị ya mma ma na-agbara ihe ọ kpọrọ asị ọsọ. Ụfọdụ ndị nwere ike iche na ha agaghị emetachali ihe niile Jehova chọrọ ka anyị na-eme nakwa na ha agaghị enwe ike izere ihe niile ọ sịrị na ha dị njọ. Ma, Jehova na-eme ebere. Ọ na-anabata onye ọ bụla hụrụ ya n’anya n’eziokwu, onye na-emekwa ike ya niile ime ihe dị ya mma.—Abụ Ọma 147:11; Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.

  • Na-akwụwa Aka Ọtọ n’Ihe Niile
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • Na-akwụwa Aka Ọtọ n’Ihe Niile

      Anyị niile chọrọ ka ndị na-akwụwa aka ọtọ bụrụ ndị enyi anyị. Jehova chọkwara ka ndị enyi ya na-akwụwa aka ọtọ. Ma, ịkwụwa aka ọtọ adịghị mfe n’ụwa a ọtụtụ ndị na-anaghị akwụwa aka ọtọ. Ma olee uru ịkwụwa aka ọtọ n’ihe niile bara?

      1. Olee ihe kacha bụrụ ihe mere anyị ji akwụwa aka ọtọ?

      Ọ bụrụ na anyị ana-akwụwa aka ọtọ mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe, anyị na-egosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya, na-akwanyekwara ya ùgwù. Cheta na Jehova ma ihe niile anyị na-eche na ihe niile anyị na-eme. (Ndị Hibru 4:13) Ọ na-ahụ anyị oge ọ bụla anyị kwụwara aka ọtọ, obi na-atọkwa ya ụtọ. Baịbụl kwuru na “Jehova kpọrọ onye aghụghọ asị, ma ya na onye ezi omume na-abụ ezigbo enyi.”​—Ilu 3:32.

      2. Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị?

      Jehova chọrọ ka anyị ‘na-agwa ibe anyị eziokwu.’ (Zekaraya 8:16, 17) Gịnị ka ịgwa ibe anyị eziokwu pụtara? Ma ànyị na-agwa ndị ezinụlọ anyị okwu ma ọ bụ ndị ọrụ ibe anyị ma ọ bụ ụmụnna anyị ma ọ bụ ndị na-anọchite anya ndị ọchịchị, anyị ekwesịghị ịghara ha ụgha ma ọ bụkwanụ gwa ha ihe na-abụchaghị eziokwu. Ndị na-akwụwa aka ọtọ anaghị ezu ohi, ha anaghịkwa egwu ndị ọzọ wayo. (Gụọ Ilu 24:28 na Ndị Efesọs 4:28.) Ha na-atụkwa ụtụ isi niile ha kwesịrị ịtụ. (Ndị Rom 13:5-7) Ihe a bụ ole na ole n’ime ụzọ dị iche iche anyị si egosi na anyị na-akwụwa “aka ọtọ n’ihe niile.”​—Ndị Hibru 13:18.

      3. Olee uru dị iche iche ịkwụwa aka ọtọ bara?

      Ndị ọzọ mara na anyị na-akwụwa aka ọtọ, ha ga-atụkwasị anyị obi. Ọ ga-emezi ka obi ruo onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ala, ya adị ka ànyị si n’otu ezinụlọ. Obi anyị agaghịkwa na-ama anyị ikpe. Ọ bụrụ na anyị ana-akwụwa aka ọtọ, anyị “na-achọ ozizi Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke, mma,” na-emekwa ka ndị ọzọ nwee mmasị ịbata n’ọgbakọ ma soro anyị na-efe Jehova.​—Taịtọs 2:10.

      MỤTAKWUO IHE

      Chọpụta otú Jehova si ele ịkwụwa aka ọtọ anya na uru ịkwụwa aka ọtọ ga-abara gị. Chọpụtakwa otú ị ga-esi na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ndị ị na-eme ná ndụ.

      4. Ịkwụwa aka ọtọ na-eme Jehova obi ụtọ

      Gụọnụ Abụ Ọma 44:21 na Malakaị 3:16. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • A sị gị kwuo, gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na o nwere ihe anyị ga-ezochiri Jehova?

      • Olee otú i chere obi na-adị Jehova mgbe ọ bụla anyị kwuru eziokwu, a sịgodị na o siiri anyị ike?

      Ebe otu nwatakịrị na-agwa papa ya gbusara ikpere n’ala okwu. Juus dị n’iko wụfuru wụsa n’akụkụ tebụl a dọkwasịrị ya.

      Ụmụaka na-eme nne na nna ha obi ụtọ ma ha na-ekwu eziokwu.Anyị na-emekwa Jehova obi ụtọ ma anyị na-ekwu eziokwu

      5. Na-akwụwa aka ọtọ mgbe niile

      Ọtụtụ ndị chere na ịkwụwa aka ọtọ mgbe niile adịghị mfe. Ma, chegodị gbasara ihe mere anyị kwesịrị iji na-akwụwa aka ọtọ mgbe niile. Kpọnyenụ VIDIO a.

      VIDIO: Ihe Ndị So Na-eme Ka Anyị Nwee Ezigbo Ọṅụ​—Akọnuche Dị Ọcha (2:32)

      Foto si na vidio bụ́ ‘Ihe Ndị So Na-eme Ka Anyị Nwee Ezigbo Ọṅụ​—Akọnuche Dị Ọcha.’ Mgbe Ben gwachara ọga ya gbasara ihe o mebiri, ha abụọ kwere n’aka.

      Gụọnụ Ndị Hibru 13:18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’otú anyị ga-esi na-akwụwa aka ọtọ . . .

      • n’ezinụlọ anyị.

      • n’ebe anyị na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ.

      • n’ihe ndị ọzọ.

      6. Ịkwụwa aka ọtọ na-abara anyị uru

      O nwere ike ịdị ka ịkwụwa aka ọtọ ọ̀ na-eme ka ihe siere mmadụ ike. Ma, ọ bụ ya bụ ihe kacha mma i kwesịrị ime. Gụọnụ Abụ Ọma 34:12-16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee otú ịkwụwa aka ọtọ si eme ka ndụ gị ka mma?

      A. Ebe di na nwunye na-akparịta ụka, na-aṅụrụtụkwa kọfị. B. Ebe ọga otu onye na-arụzi ụgbọala na-aja ya mma n’ụlọ ọrụ ha. CH. Ebe otu nwoke nọ n’ụgbọala ya na-egosi onye uwe ojii akwụkwọ na-akọwa onye ọ bụ.
      1. Di na nwunye na-adịkwu ná mma ma ha na-akwụwa aka ọtọ n’ezinụlọ ha

      2. Mmadụ na-akwụwa aka ọtọ, onye ọ na-arụrụ ọrụ ga-atụkwasị ya obi

      3. Ndị na-anọchite anya ndị ọchịchị na-akwanyere ndị na-akwụwa aka ọtọ ùgwù

      ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ịgha obere ụgha abụghị ihe ọjọọ.

      • Gịnị mere i ji kweta na Jehova kpọrọ ụdị ụgha niile asị?

      NCHỊKỌTA

      Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ọ bụla ha na-ekwu nakwa n’ihe ọ bụla ha na-eme.

      Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

      • Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi gosi na anyị na-akwụwa aka ọtọ?

      • Gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na o nwere ihe anyị ga-ezochiri Jehova?

      • Gịnị mere i kwesịrị iji na-akwụwa aka ọtọ mgbe niile?

      Ihe ị ga-agba mbọ mee

      IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

      Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi kụziere ụmụ ha ka ha na-akwụwa aka ọtọ?

      Na-ekwu Eziokwu (1:44)

      Gịnị mere o ji dị mma ka anyị na-emezu nkwa anyị kwere?

      Na-emezu Nkwa Gị ma Nweta Ọtụtụ Ngọzi (9:09)

      Chọpụta ma ànyị kwesịrị ịna-atụ ụtụ isi anyị a sịgodị na e jighị ya eme ihe e kwesịrị iji ya eme.

      “Ọ̀ Bụ Iwu Na Ị Ga-atụ Ụtụ Isi?” (Ụlọ Nche, Septemba 1, 2011)

      Gịnị mere otu nwoke na-anabughị akwụwa aka ọtọ ji gbanwee malite ịkwụwa aka ọtọ?

      “Ọ Bịara Doo M Anya na Jehova Na-eme Ebere ma Na-agbaghara Mmehie” (Ụlọ Nche, Mee 1, 2015)

  • Saa Anya ná Mmiri ma A Bịa n’Ụdị Ndị Ị Na-emete Enyi
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 2. Olee otú obi ga-adị Jehova n’ihi ndị i metere enyi?

      Jehova na-eleru anya ala tupu ya emete mmadụ enyi. “Ya na onye ezi omume na-abụ ezigbo enyi.” (Ilu 3:32) Olee otú obi ga-adị Jehova ma anyị mete ndị na-ahụghị ya n’anya enyi? Obi agaghị adị ya mma. (Gụọ Jems 4:4.) Ma, ọ bụrụ na anyị na ndị ọjọọ anaghị akpa, ọ bụrụkwa na anyị abịaruo Jehova nso ma mete ndị hụrụ ya n’anya enyi, obi ga-adị ya mma, ọ ga-abụkwa enyi anyị.​—Abụ Ọma 15:1-4.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya