Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Mmadụ nke Chọtaworo Amamihe Bụ”
    Ụlọ Nche—2001 | Mach 15
    • “Ọ Na-etisi Mkpu Ike”

      Isi nke 8 nke Ilu ji ajụjụ na-akpali echiche malite: “Amamihe, ọ́ dịghị akpọ òkù? Nghọta kwa, ọ́ dịghị eme ka olu ya daa ụda?”a Ee, amamihe na nghọta na-akpọ òkù, ma ọ dịghị nnọọ ka nwanyị ahụ rụrụ arụ bụ́ onye na-ezo n’ebe ndị gbara ọchịchịrị ma na-atamunye okwu na-arata mmadụ ná ntị nwa okorobịa nọ nanị ya nke na-enweghị uche. (Ilu 7:12) “N’elu ebe nile dị elu n’akụkụ ụzọ, n’agbata ụzọ nile, ka O guzoworo onwe ya; n’akụkụ ọnụ ụzọ ama nile, n’ọnụ ámá obodo, ná mbata ọnụ ụzọ nile, ka ọ na-etisi mkpu ike.” (Ilu 8:1-3) A na-anụ olu siri ike ma na-ada ụda nke amamihe n’ámá—n’ọnụ ụzọ ámá, n’agbata ụzọ dị iche iche, n’ebe ndị e si abanye obodo. Ndị mmadụ pụrụ ịnụ olu ahụ n’ụzọ dị mfe ma zaghachi.

      Ònye pụrụ ịgọpụ na amamihe ahụ e dekọrọ n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, dị n’ebe fọrọ nke nta ka o ruo onye ọ bụla nọ n’ụwa nke na-achọ inweta ya, aka? “Bible bụ akwụkwọ a kasị agụ n’akụkọ ihe mere eme,” ka The World Book Encyclopedia na-ekwu. Ọ na-agbakwụnye, sị: “E kesawo ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke Bible karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ. A sụgharịwokwa Bible ọtụtụ ugboro, nakwa n’ọtụtụ asụsụ karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ.” Ebe ọ bụ na Bible dum ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ dị n’ihe karịrị asụsụ na olumba 2,100, ihe karịrị pasent 90 nke ezinụlọ mmadụ pụrụ inweta ma ọ dịghị ihe ọzọ akụkụ ụfọdụ nke Okwu Chineke n’asụsụ nke ha.

      Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi Bible n’ebe nile n’ihu ọha. N’ala 235, ha ji ịrụsi ọrụ ike ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke ma na-akụziri ndị mmadụ eziokwu ndị a na-achọta n’Okwu Chineke. A na-ekesa ihe karịrị nde 20 na nke ọ bụla n’ime akwụkwọ ha ndị dabeere na Bible bụ́ Ụlọ Nche, nke a na-ebipụta n’asụsụ 140, nakwa Teta!, nke a na-ebipụta n’asụsụ 83. N’ezie, amamihe na-etisi mkpu ike n’ámá dị iche iche!

  • “Onye Ihe Na-agara nke Ọma Ka Mmadụ nke Chọtaworo Amamihe Bụ”
    Ụlọ Nche—2001 | Mach 15
    • a Okwu Hibru e ji mee ihe maka “amamihe” dị n’ụdị okwu e ji amata onye bụ́ nwanyị. N’ihi ya, nsụgharị ụfọdụ na-eji nnọchiaha e ji eme ihe maka onye bụ́ nwanyị eme ihe mgbe ha na-ezo aka n’amamihe.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya