“Amamihe Bụ Ndò”
ILU 16:16 kwuru, sị: “Inweta amamihe, lee ka o si dị mma nke ukwuu karịa ọlaedo ọma! Inweta nghọta kwa, lee ka o si bụrụ ihe a na-ahọpụta nke ukwuu karịa ọlaọcha!” Gịnị mere amamihe ji baa nnọọ uru? Ọ bụ n’ihi na “amamihe bụ ndò, ego bụkwa ndò: ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.” (Eklisiastis 7:12) Otú ọ dị, olee otú amamihe si eme ka onye nwe ya dị ndụ?
Inweta amamihe Chineke, ya bụ, inweta ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, na ime ihe kwekọrọ na ya, na-enyere anyị aka ije ije n’ụzọ na-atọ Jehova ụtọ. (Ilu 2:10-12) Eze Solomọn nke Izrel oge ochie kwuru, sị: “Ụzọ a tụliri atụli nke ndị ziri ezi bụ isi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ha: onye na-edebe mkpụrụ obi ya na-eche ụzọ ya.” (Ilu 16:17) Ee, amamihe na-anapụta ndị nwere ya n’ụzọ ọjọọ ma na-eme ka ha dị ndụ! Okwu amamihe ndị dị mkpirikpi dị n’Ilu 16:16-33 na-egosi mmetụta dị mma amamihe Chineke nwere ike inwe n’echiche, n’okwu, na n’omume anyị.a
“Inwe Mmụọ Dị Ala”
E kwuru na amamihe a kọwara n’ụdị mmadụ kwuru, sị: “Mpako, na nganga, . . . ka m kpọworo asị.” (Ilu 8:13) Nganga na amamihe dị nnọọ iche n’ebe ibe ha dị. Anyị kwesịrị iji amamihe na-eme ihe ma kpachara anya ka anyị wee ghara ịzụlite mpako. Anyị kwesịrị ịkpachara anya karịsịa ma ọ bụrụ na anyị enwetụla ihe ịga nke ọma ná ndụ ma ọ bụ nwee ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ Ndị Kraịst.
Ilu 16:18 dọrọ aka ná ntị, sị: “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.” Tụlee ọdịda kasịnụ e nwetụrụla n’eluigwe na ala—ya bụ ọdịda nke nwa Chineke zuru okè bụ́ mmụọ, bụ́ onye mere onwe ya Setan Ekwensu. (Jenesis 3:1-5; Mkpughe 12:9) Ó bughị ụzọ zụlite mpako tupu ya adaa? Bible kwuru ihe banyere nke a mgbe o kwuru na e kwesịghị ịhọpụta nwanna nwoke ka chegharịrị ọhụrụ ịrụ ọrụ nlekọta n’ọgbakọ Ndị Kraịst, “ka ọ ghara iji nganga fụlie onwe ya elu ma daba n’ikpe a mara Ekwensu.” (1 Timoti 3:1, 2, 6) Ọ dị nnọọ mkpa izere ime ihe ga-eme ka ndị ọzọ dị mpako nakwa ịzụlite ya n’ime onwe anyị!
Ilu 16:19 kwuru, sị: “Ọ dị mma inwe mmụọ dị ala n’etiti ndị e wedara n’ala, karịa isoro ndị mpako kesaa ihe a kwatara n’agha.” Ndụmọdụ a amamihe dị na ya pụtara ìhè n’ihe banyere Eze Nebukadneza nke Babilọn oge ochie. O ji mpako kpụọ otu ihe oyiyi buru ibu—eleghị anya nke na-anọchi anya ya—na ndagwurugwu Dura. Ọ pụrụ ịbụ na a dọkwasịrị ihe oyiyi ahụ n’elu ihe a wụrụ awụ nke mere o ji ruo mita 27 n’ịdị elu. (Daniel 3:1) A kpụrụ ihe oyiyi a dị nnọọ elu ka ọ bụrụ ihe dị ebube na-anọchi anya alaeze ukwu Nebukadneza. Ọ bụ ezie na ihe ndị dị elu—dị ka ihe oyiyi ahụ nakwa mgbidi a wụrụ awụ, ụlọ chọọchị ndị uko ha dị nnọọ elu, na ụlọ elu ndị nwere ọtụtụ okpukpu—nwere ike ịdọrọ mmasị ụmụ mmadụ, ha anaghị adọrọ mmasị Chineke. Ọbụ abụ bụrụ, sị: “Jehova dị elu, ma ọ bụ onye dị umeala n’obi ka Ọ na-ahụ anya: ma onye mpako, Ọ na-esite n’ebe dị anya mara ya.” (Abụ Ọma 138:6) N’eziokwu, “ihe dị oké elu n’etiti ụmụ mmadụ bụ ihe arụ n’anya Chineke.” (Luk 16:15) Ọ kaara anyị mma ịbụ “ndị ihe ndị dị ala na-edu” karịa “uche anyị . . . ịdị na-adị n’ihe ndị dị oké elu.”—Ndị Rom 12:16.
Na-ekwu Okwu “Onye Nwere Uche” na nke “Na-eru n’Obi”
Olee otú inweta amamihe si emetụta okwu anyị? Eze ahụ maara ihe gwara anyị, sị: “Onye nwere uche n’okwu Chineke ga-aghọta ezi ihe: ọzọ, onye na-atụkwasị Jehova obi, onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ. Onye obi ya maara ihe, a ga-akpọ ya onye nghọta: ọzọ, ụtọ egbugbere ọnụ na-atụkwasịrị mmụta ihe. Isi iyi nke ndụ ka ezi uche bụ n’ebe ndị nwe ya nọ: ma ịdọ aka ná ntị nke ndị uche ha gbagọrọ agbagọ bụ uche gbagọrọ agbagọ. Obi onye maara ihe na-eme ka ọnụ ya nwee uche, ọ na-atụkwasịkwara egbugbere ọnụ ya abụọ mmụta [okwu na-eru n’obi].”—Ilu 16:20-23.
Amamihe na-enyere anyị aka ikwu okwu dị ka ndị nwere ezi uche na ikwu okwu ndị na-eru n’obi. N’ihi gịnị? N’ihi na onye obi ya maara ihe na-agbalị ‘ịghọta ezi ihe’ n’ihe na-emenụ ma “na-atụkwasị Jehova obi.” Mgbe anyị na-agbalị ịchọta ihe dị mma n’ebe ndị ọzọ nọ, o yiri ka ànyị ga na-ekwu ihe dị mma banyere ha karị. Kama ịdị na-agwa ha okwu ọjọọ ma ọ bụ okwu ndị na-akpasu iwe, okwu anyị ga na-adị ụtọ ma na-eru n’obi. Ịmata ọnọdụ ndị ọzọ nke ọma na-enyere anyị aka ịghọta ụdị ihe isi ike ha nwere ike ịdị na-enwe na otú ha si na-edi ya.
Iji amamihe na-ekwu okwu dịkwa mkpa n’ihe banyere ọrụ nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ. Mgbe anyị na-akụziri ndị ọzọ Okwu Chineke, ebumnobi anyị abụghị nanị ịkọwara ha ozi ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ. Ihe dị anyị mkpa bụ iru ndị mmadụ n’obi. Nke a na-achọ ka anyị na-ekwu okwu ndị na-eru n’obi. Pọl onyeozi gbara onye ya na ya jekọrọ ozi bụ́ Timoti ume ka ọ nọgide n’ihe ndị ‘e mere ka o kwere.’—2 Timoti 3:14, 15.
Akwụkwọ bụ́ An Expository Dictionary of New Testament Words, nke W. E. Vine dere kwuru na okwu Grik e ji mee ihe maka ‘ime ka mmadụ kwenye’ pụtara “ime ka e nwee mgbanwe nke uche site ná mmetụta nke ntụgharị uche ma ọ bụ ntụle nke omume.” Ka anyị wee nwee ike ịrụ ụka ndị ga-edo anya bụ́ ndị ga-eme ka onye na-ege anyị ntị tụgharịa uche, ọ chọrọ ka anyị mara ihe onye ahụ na-eche, ihe ndị na-amasị ya, ọnọdụ ndị onye ahụ nọ na ya na otú e si zụlite ya. Olee otú anyị ga-esi mara ihe ndị a? Jems onye na-eso ụzọ zara, sị: ‘Dịrị ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu.’ (Jems 1:19) Site n’ịjụ onye na-ege gị ntị ajụjụ na ige ntị nke ọma n’ihe ọ na-ekwu, anyị ga-abịa ghọta ihe dị ya n’obi.
A ma Pọl onyeozi ama dị ka onye nwere ike ime ka ndị ọzọ kwenye. (Ọrụ 18:4) Ọbụna otu onye n’ime ndị na-emegide ya, bụ́ Dimitriọs, onye na-akpụ ọlaọcha, kwetara, sị: ‘Ọ bụghị nanị n’Efesọs kama n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ógbè Eshia dum, o mewo ka ìgwè mmadụ batụrụ ụba kweta, tụgharịakwa ha gaa n’echiche dị iche.’ (Ọrụ 19:26) Pọl ò towere onwe ya otú o si nwee ihe ịga nke ọma n’ọrụ ikwusa ozi ọma? Mbanụ. O weere ozi ọma o kwusara dị ka “ngosipụta nke mmụọ nsọ na ike [Chineke].” (1 Ndị Kọrint 2:4, 5) Anyị na-enwetakwa enyemaka nke mmụọ nsọ Jehova. Ebe anyị tụkwasịrị Jehova obi, anyị nwere obi ike na ọ ga-enyere anyị aka ka anyị na-agbalịsi ike ikwu okwu dị ka ndị nwere ezi uche ma na-ekwu okwu ndị na-eru ndị mmadụ n’obi n’ozi anyị.
Ka a sịkwa ihe mere e ji kpọọ “onye obi ya maara ihe” “onye nghọta!” (Ilu 16:21) Ee, ezi uche bụụrụ ndị nwere ya “isi iyi nke ndụ.” Ma gịnị banyere ndị uche ha gbagọrọ agbagọ? Ha ‘na-eleda amamihe na ịdọ aka ná ntị anya.’ (Ilu 1:7) Olee ihe na-eme ha n’ihi ịjụ ịdọ aka ná ntị Jehova? Dị ka e kwuru n’elu, Solomọn kwuru, sị: “Ịdọ aka ná ntị nke ndị uche ha gbagọrọ agbagọ bụ uche gbagọrọ agbagọ.” (Ilu 16:22) Ha na-enweta ụdị ịdọ aka ná ntị ọzọ, ọ na-abụkarịkwa site n’inye ha ntaramahụhụ siri ike. Ndị uche ha gbagọrọ agbagọ nwere ike ịkpatara onwe ha ihe isi ike, ihere, ọrịa, na ọbụnadị ọnwụ ike.
Mgbe eze Izrel na-ekwukwa ụzọ ndị ọzọ amamihe si eme ka okwu anyị dị mma, ọ sịrị: “Ụgbụgbọ mmanụ aṅụ ka okwu ọnụ ụtọ nile bụ, nke na-atọ mkpụrụ obi ụtọ, bụrụkwa ihe na-agwọ ọkpụkpụ n’ọrịa.” (Ilu 16:24) Dị nnọọ ka mmanụ aṅụ si atọ ụtọ ma na-eme ka ahụ́ doo onye agụụ ji ọsọ ọsọ, okwu ọma na-agba mmadụ ume ma mee ka obi ruo mmadụ ala. Mmanụ aṅụ nwekwara ihe ndị na-eme ka ahụ́ sie mmadụ ike ma na-agwọ ọrịa, ọ na-adịkwa mmadụ mma n’ahụ́. Ọ bụ otú ahụ ka okwu ọma dị; ọ na-ewuli okwukwe mmadụ elu.—Ilu 24:13, 14.
Zere ‘Ụzọ Yiri nke Ziri Ezi’
Solomọn kwuru, sị: “Ụzọ dị nke ziri ezi n’ihu mmadụ, ma nsọtụ ya bụ ụzọ nile nke ọnwụ.” (Ilu 16:25) Nke a bụ okwu ịdọ aka ná ntị iji nyere anyị aka izere echiche na-ezighị ezi na ime ihe megidere iwu Chineke. Otu ụzọ nwere ike iyi nke ziri ezi n’anya mmadụ na-ezughị okè, ma o nwere nnọọ ike imegide ụkpụrụ ndị ziri ezi dị n’Okwu Chineke. Ọzọkwa, Setan nwere ike ịdị na-eme ka mmadụ na-aghọgbu onwe ya otú ahụ ka onye ahụ wee gbasoo ụzọ o chere ziri ezi, ma ya abụrụ nnọọ na ụzọ ahụ na-eduba n’ọnwụ.
Ọ dịghị ihe na-echebe mmadụ ka obi ya ghara iduhie ya karịa inwe obi nke maara ihe ma nwee nghọta na akọnuche e ji amamihe nke Okwu Chineke zụọ. Mgbe a bịara n’ime mkpebi ná ndụ—ma ọ̀ bụ n’ihe banyere omume ma ọ bụ n’ihe banyere ofufe ma ọ bụ n’ihe ọ bụla ọzọ—ụzọ kasị mma mmadụ pụrụ isi zere iduhie onwe ya bụ ikwe ka ụkpụrụ Chineke nke ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ na-eduzi ya.
“Agụụ nke Onye Na-arụsi Ọrụ Ike Na-agbara Ya Mbọ”
Eze ahụ maara ihe kwukwara, sị: “Ọchịchọ mkpụrụ obi nke onye na-adọgbu onwe ya n’ọrụ adọgbuworo ya onwe ya n’ọrụ; n’ihi na ọnụ ya arụgidewo ya.” (Ilu 16:26) Solomọn na-ekwu na ọchịchọ onye na-arụ ọrụ nwere maka nri ‘nwere ike ime ka ọ dọgbuo onwe ya n’ọrụ’ n’ihi na agụụ na-agụ ya ‘na-arụgide ya,’ ma ọ bụ na-akwali ya. Nsụgharị bụ́ An American Translation kwuru ebe a, sị: “Agụụ nke onye na-arụsi ọrụ ike na-agbara ya mbọ; n’ihi na agụụ na-agụ ya na-enye ya ike.” Ọchịchọ e bu pụta ụwa, dị ka agụụ na-agụ mmadụ iri nri, nwere ike ịkwali anyị ịbụ ndị na-arụsi ọrụ ike. Ọchịchọ dị otú ahụ bara uru. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ọchịchọ kwesịrị ekwesị agabiga ókè ma ghọzie anyaukwu? Ihe ọ na-arụpụta na-eyi ihe na-emenụ mgbe ọkụ a mụnyere n’ubi iji sie nri bara n’ọhịa ma ghọọ nnukwu ọkụ ọgbụgba. Anyaukwu bụ ọchịchọ gabigara ókè, ọ na-emebikwa ihe. Site n’ịmara ihe ize ndụ dị na ya, onye maara ihe ga na-akpachara anya ọbụna banyere ọchịchọ ziri ezi o nwere.
Abala “n’Ụzọ Na-adịghị Mma”
Okwu ndị na-esi n’ọnụ anyị apụta nwere ike imebi ihe dị ka ọkụ na-enwusi ike. Mgbe Solomọn na-ekwu banyere ihe ọjọọ na-esi n’ịdị na-enyochapụta ebe ndị ọzọ na-emejọ na ịdị na-akọsa ha, o kwuru, sị: “Onye jọgburu onwe ya na-egwupụta ihe ọjọọ: ọ bụkwa n’egbugbere ọnụ ya abụọ ka ihe dị ka ọkụ na-ahụ ahụ dị. Onye na-agbakụta Chineke azụ na-ezisa ise okwu: ọzọ onye na-ekwu okwu azụ na-ekewa ezi enyi.”—Ilu 16:27, 28.
Onye na-achọ imebi aha mmadụ ibe ya bụ “onye jọgburu onwe ya.” Anyị kwesịrị ịgbalị ịchọpụta ebe ndị ọzọ na-emezi ma na-ekwu ihe ndị ga-eme ka a na-akwanyere ha ùgwù. Oleekwanụ banyere ịdị na-ege ndị na-agba asịrị ndị na-emerụ ahụ́ ntị? Okwu ha nwere ike ime ka anyị nyowe ndị ọzọ enyowe n’enweghị ezi ihe kpatara ya, kpata esemokwu n’etiti ndị enyi ma mee ka e nwee nkewa n’ọgbakọ. Amamihe ga-eme ka anyị ghara ige ndị dị otú ahụ ntị.
Mgbe Solomọn na-adọ aka ná ntị banyere ikike na-ara mmadụ ụrà bụ́ nke nwere ike ime ka mmadụ mewe ihe ọjọọ, ọ sịrị: “Onye na-eme ihe ike na-ara mmadụ ibe ya ụrà, na-emekwa ka o jee ije n’ụzọ na-adịghị mma. Onye na-atachi anya ya abụọ iche echiche ịgbakụta Chineke azụ, onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ, o mezuwo ihe ọjọọ.”—Ilu 16:29, 30.
È nwere ike ịrata ndị na-efe ezi ofufe ime ihe ike? A ratala ọtụtụ ndị taa “iche echiche ịgbakụta Chineke azụ.” Ha na-akwalite ime ihe ike ma ọ bụ na-eme ya eme. O nwere ike ọ gaghị esiri anyị ike izere ime ihe ike. Ma gịnị ma ọ bụrụ na e jiri ụzọ aghụghọ duba anyị na ya? Ọ̀ bụ na a ratabeghị ọtụtụ nde mmadụ ịdị na-ele ihe ntụrụndụ ma ọ bụ egwuregwu ndị na-akwalite ime ihe ike? Akwụkwọ Nsọ nyere ịdọ aka ná ntị doro anya, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Amamihe Chineke na-echebe anyị!
Olee ihe e nwere ike ikwu banyere onye jirila ogologo oge ná ndụ ya gosipụta amamihe na nghọta ma ‘ghara ije ije n’ụzọ na-adịghị mma’? Chineke na-ele ndụ ezi omume anya dị ka ihe kwesịrị ịja mma na ihe e kwesịrị ịkwanyere ùgwù. Ilu 16:31 kwuru, sị: “Okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.”
N’aka nke ọzọ, ọ dịghị ezi ihe na-esi n’iwe a na-achịkwaghị achịkwa apụta. Nwa Adam na Iv, bụ́ Ken, ‘were iwe dị ọkụ nke ukwuu’ megide nwanne ya, bụ́ Ebel, wee ‘bilie imegide ya, wee gbuo ya.’ (Jenesis 4:1, 2, 5, 8) Ọ bụ ezie na e nwere ike inwe ihe mere anyị ga-eji wee iwe, anyị aghaghị ịkpachara anya ka o wee ghara ịgabiga ókè. Ilu 16:32 kwuru hoo haa, sị: “Ọ dị mma, bụ́ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, karịa dike: ọ dịkwa mma, bụ́ onye na-achị mmụọ ya, karịa onye na-ewere obodo n’agha.” Iwe a na-achịkwaghị achịkwa abụghị ihe e ji ama na mmadụ dị ike ma ọ bụ nwee omume ọma. Ọ bụ adịghị ike nke nwere ike ‘ime ka mmadụ jee ije n’ụzọ na-adịghị mma.’
Mgbe ‘Ikpe Nile Sitere n’Aka Jehova’
Eze Izrel ahụ kwuru, sị: “A na-efe nzà, ma n’aka Jehova ka ikpe ya nile sitere.” (Ilu 16:33) N’Izrel oge ochie, Jehova jiri ife nzà mee ka a mara ihe bụ́ uche ya mgbe ụfọdụ. Ihe ndị e jiri fee nzà ndị ahụ bụ obere nkume ndị dị gburugburu ma ọ bụ ibé osisi. Ihe mbụ a na-eme bụ ịrịọ Jehova ka o jiri aka ya kpebie ihe ahụ. Nke ahụ gasịa, a fụchie ihe ndị ahụ e ji efe nzà n’ime uwe mwụda ma wụpụzie ha. A na-ewerezi ihe ọ bụla si na ya pụta dị ka ihe si n’aka Chineke.
Jehova anaghịzi eji ife nzà eme ka ndị ya mara ihe bụ́ uche ya. O kpughewo uche ya n’ime Okwu ya, bụ́ Bible. Ịmata ihe ndị dị na Bible nke ọma dị nnọọ mkpa iji nweta amamihe Chineke. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwe ka otu ụbọchị gafee n’agụghị Akwụkwọ Nsọ.—Abụ Ọma 1:1, 2; Matiu 4:4.
[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]
a Iji tụlee ihe dị n’Ilu 16:1-15, lee peeji nke 17-20 ná mbipụta Ụlọ Nche nke May 15, 2007.
[Foto dị na peeji nke 8]
Gịnị mere amamihe ji dị mma karịa ọlaedo?
[Foto dị na peeji nke 9]
Olee ihe na-eme ka okwu gị ruo ndị mmadụ n’obi mgbe ị na-ezi ozi ọma?
[Foto dị na peeji nke 10]
“Onye jọgburu onwe ya na-egwupụta ihe ọjọọ”
[Foto dị na peeji nke 11]
Iwe a na-achịkwaghị achịkwa nwere ike ime ka mmadụ “jee ije n’ụzọ na-adịghị mma”
[Foto dị na peeji nke 12]
Ime ihe ike nwere ikike nke ịra mmadụ ụrà