-
Ọrụ Gị Ọ̀ Ga-alanarị Ọkụ?Ụlọ Nche—1998 | Nọvemba 1
-
-
4. (a) Gịnị bụ ọrụ Pọl n’ọrụ ndị Kraịst nke iwu ụlọ? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ma Jisọs ma ndị na-ege ya ntị maara ịdị mkpa nke ezi ntọala?
4 Ọ bụrụ na ụlọ ga-abụ nke ga-akwụrụ chịm ma dịtee anya, ọ chọrọ ezi ntọala. N’ihi ya, Pọl dere, sị: “Dị ka amara Chineke nke e nyere m si dị, dị ka onyeisi ọkà nke maara ihe, atọrọ m ntọala.” (1 Ndị Kọrint 3:10) N’iji ihe atụ yiri nke ahụ mee ihe, Jisọs Kraịst kọrọ banyere ụlọ nke lanarịrị oké ifufe n’ihi na onye wuru ya ahọrọwo ntọala siri ike. (Luk 6:47-49) Jisọs maara ihe nile banyere ịdị mkpa nke ntọala. Ọ nọ ya mgbe Jehova tọrọ ntọala ụwa.a (Ilu 8:29-31) Ndị na-ege Jisọs ntị jikwa ezi ntọala kpọrọ ihe. Nanị ụlọ ndị a tọrọ ntọala ha nke ọma pụrụ iguzogide idei mmiri na ala ọma jijiji ndị na-eme mgbe ụfọdụ na Palestine. Otú ọ dị, gịnị bụ ntọala Pọl bu n’uche?
-
-
Ọrụ Gị Ọ̀ Ga-alanarị Ọkụ?Ụlọ Nche—1998 | Nọvemba 1
-
-
a “Ntọala ụwa” pụrụ izo aka n’ike ndị sitere n’okike ndị jigidesiri ya ike—jigidekwa ihe ndị dị n’eluigwe. Tụkwasị ná nke ahụ, a rụrụ ụwa n’onwe ya otú a na-agaghị ‘ewezụga ya n’ọnọdụ ya’ mgbe ọ bụla, ma ọ bụ bibie ya.—Abụ Ọma 104:5.
-