ISI NKE 17
Olee Ụdị Onye Jizọs Bụ?
Ọ bụrụ na anyị ana-amụ gbasara ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere mgbe ọ bịara n’ụwa, anyị ga-amụta ọmarịcha àgwà ya ndị ga-eme ka anyị na ya nakwa Nna ya, bụ́ Jehova, bụrụ enyi. Olee ụfọdụ n’ime ọmarịcha àgwà ndị ahụ? Oleekwa otú anyị ga-esi eṅomi Jizọs n’otú anyị si ebi ndụ?
1. Olee ụzọ dị iche iche Jizọs si yie Nna ya?
Mgbe Jizọs nọ n’eluigwe, o ji ọtụtụ ijeri afọ hụ otú Nna ya, onye hụrụ ihe ndị o kere eke n’anya, si eme ihe. Ọ mụtakwara ihe n’aka Nna ya. Ọ bụ ya mere o ji eche echiche ka ya, ahụhụ ndị ọzọ na-ata ana-emetụ ya n’ahụ́ ka ya, ya ana-akpakwa àgwà ka ya. (Gụọ Jọn 5:19.) N’eziokwu, Jizọs na-eme nnọọ ka Nna ya. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Onye ọ bụla hụrụ m ahụla Nna m.” (Jọn 14:9) Ka ị na-amụ gbasara àgwà Jizọs, ị ga-abịa mụtakwuo gbasara Jehova nke ọma. Dị ka ihe atụ, otú ihe gbasara ndị mmadụ si emetụ Jizọs n’obi na-egosi otú ihe gbasara gị si emetụ Jehova n’obi.
2. Olee otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya?
Jizọs sịrị: “Ka ụwa wee mara na m hụrụ Nna m n’anya, m na-eme ihe niile otú Nna m nyere m iwu ka m mee.” (Jọn 14:31) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri nnọọ na ọ hụrụ Nna ya n’anya. Otú o si gosi ya bụ na o rubeere ya isi, ma mgbe ọ na-adịrịghị ya mfe. Otú a Jizọs si hụ Nna ya n’anya mere ka ọ na-amasị ya ịkọrọ ndị ọzọ gbasara Nna ya nakwa inyere ha aka ka ha na ya dịrị ná mma.—Jọn 14:23.
3. Olee otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya?
Baịbụl kwuru na ‘ihe gbasara ụmụ mmadụ na-eme Jizọs ezigbo obi ụtọ.’ (Ilu 8:31) Otú o si gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya bụ ịgba ha ume nakwa iwepụta onwe ya nyere ha aka. Ọ rụrụ ọrụ ebube ndị gosiri na ọ dị ike, na-emetekwara ndị mmadụ ebere. (Mak 1:40-42) O mesoro ndị mmadụ ihe otú gosiri na ọ dị obiọma. Ọ naghịkwa ele mmadụ anya n’ihu tupu ya e meere ya ihe. Ihe ndị o kwuru kasiri ndị na-ege ya ntị obi, ya bụ, ndị niile na-ege ya ntị ka ha mata nke bụ́ eziokwu. Ihe ndị ahụ o kwuru mekwara ka ha nwee olileanya. Jizọs dị njikere ịta ahụhụ ma nwụọ n’ihi otú o si hụ ndị mmadụ n’anya. Ma, ndị ọ kacha hụ n’anya bụ ndị na-eme ihe ndị ọ na-akụzi.—Gụọ Jọn 15:13, 14.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụtakwuo ụdị onye Jizọs bụ. Chọpụtakwa otú ị ga-esi na-egosi na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya, na-emesapụkwara ha aka otú ahụ o mere.
4. Jizọs hụrụ Nna ya n’anya
Ihe Jizọs mere kụziiri anyị otú anyị ga-esi na-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya. Gụọnụ Luk 6:12 na Jọn 15:10; 17:26. Unu gụchaa amaokwu nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya otú ahụ Jizọs hụrụ ya?
Jizọs hụrụ Nna ya nke eluigwe n’anya. Mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ na-agwakwa Nna ya okwu n’ekpere mgbe niile
5. Ihe gbasara ndị nọ ná mkpa na-emetụ Jizọs n’obi
Jizọs na-eche gbasara mkpa ndị ọzọ karịa ka ọ na-eche gbasara mkpa nke ya. Ọ na-ewepụta oge jiri ike ya na-enyere ndị ọzọ aka, ma mgbe ike gwụrụ ya. Gụọnụ Mak 6:30-44. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
N’amaokwu ndị a anyị gụrụ, olee ụzọ dị iche iche Jizọs si gosi na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 31, 34, 41, na 42.
Olee ihe Jizọs chọpụtara mere o ji nyere ndị ọzọ aka? —Leruonụ anya n’amaokwu nke 34.
Ebe ọ bụ na Jizọs na-akpa àgwà dị iche iche Nna ya na-akpa, gịnị ka ihe a niile na-akụziri gị gbasara Jehova?
Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi na-egosi na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi ka Jizọs?
6. Jizọs na-emesapụ aka
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ na-emesapụ aka n’agbanyeghị na o nweghị oké ihe. Ọ gwakwara anyị ka anyị na-eme otú ahụ. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 20:35. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị ka Jizọs kwuru ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ?
Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi na-enye onyinye, ọ bụrụgodị na o nweghi oké ihe anyị nwere?
Ị̀ ma ihe a?
Baịbụl gwara anyị ka anyị na-agwa Jehova okwu n’ekpere n’aha Jizọs. (Gụọ Jọn 16:23, 24.) Ime ihe a na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jizọs mere iji nyere anyị aka ka anyị na Jehova bụrụ enyi.
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ahụhụ anyị na-ata anaghị emetụ Chineke n’obi.
Ebe ọ bụ na Jizọs na-akpa àgwà ka Nna ya, olee otú ihe ndị Jizọs mere si egosi na ahụhụ ndị mmadụ na-ata na-emetụ Jehova n’obi?
NCHỊKỌTA
Jizọs hụrụ Jehova n’anya, hụkwa ndị mmadụ n’anya. Ebe ọ bụ na Jizọs na-eme ka Nna ya, ka ị na-amụtakwu gbasara Jizọs, ị ga na-amatakwu gbasara Jehova.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya otú ahụ Jizọs hụrụ ya?
Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya otú Jizọs hụrụ ha?
Olee àgwà Jizọs nke kacha amasị gị?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta àgwà Jizọs ndị anyị nwere ike ịgba mbọ na-akpa.
“Ị Chọọ Iṅomi Jizọs, Bụrụ . . . ” (Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ, peeji nke 317)
Chọpụta ihe mere anyị ga-eji na-ekpe ekpere n’aha Jizọs.
“Gịnị Mere Anyị Ji Ekpe Ekpere n’Aha Jizọs?” (Ụlọ Nche, Febụwarị 1, 2008)
Baịbụl ò kwuru otú Jizọs dị?
Olee ihe anyị ga-amụta n’otú Jizọs si mesoo ụmụ nwaanyị ihe?
“Chineke Chọrọ Ka A Na-akwanyere Ụmụ Nwaanyị Ùgwù” (Ụlọ Nche, Septemba 1, 2012)