Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Nganga Na-eduga ná Nlelị
    Ụlọ Nche—2000 | Ọgọst 1
    • Nganga Na-eduga ná Nlelị

      “Nganga bịa, nlelị abịakwa: ma n’ebe ndị [maara ebe ike ha ruru] nọ ka amamihe dị.”—ILU 11:2.

      1, 2. Gịnị bụ nganga, n’ụzọ ndị dịkwa aṅaa ka o siworo duga n’ọdachi?

      OTU onye Livaị bụ́ onye ekworo eduru otu ìgwè ndị nnupụisi gaa imegide ndị Jehova họpụtara ịchị isi. Otu nwa eze nke nwere oké ọchịchọ akpaa nkata aghụghọ iji weghara ocheeze nna ya. Otu eze na-enweghị ndidi eleghara ndụmọdụ doro anya nke onye amụma Chineke anya. E nwere otu àgwà ndị Israel atọ a nwechara: nganga.

      2 Nganga bụ àgwà na-esi n’obi amalite nke na-eyi mmadụ nile egwu n’ụzọ dị ukwuu. (Abụ Ọma 19:13) Onye nganga na-eji anyaike eme ihe na-erughịrị ya, n’anataghị ikike ime otú ahụ. Nke a na-edugakarị n’ọdachi. N’ezie, nganga alawo ndị eze n’iyi, meekwa ka alaeze ukwu dị iche iche daa. (Jeremaịa 50:29, 31, 32; Daniel 5:20) O mewo ọbụna ka ụfọdụ ndị ohu Jehova ma n’ọnyà ma duga n’ọnwụ ha.

      3. Ànyị pụrụ isi aṅaa mata ihe ize ndụ ndị dị na nganga?

      3 E nwere ezi ihe mere Bible ji na-asị: “Nganga bịa, nlelị abịakwa: ma n’ebe ndị [maara ebe ike ha ruru] nọ ka amamihe dị.” (Ilu 11:2) Bible na-enye anyị ihe atụ ndị na-akwado ịbụ eziokwu nke ilu a. Ịtụle ụfọdụ n’ime ha ga-enyere anyị aka ịhụ ihe ize ndụ dị n’ịgafe ókè ndị kwesịrị ekwesị. N’ihi ya, ka anyị tụlee otú ekworo, oké ọchịchọ, na enweghị ndidi si mee ka ndị ikom atọ ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite jiri nganga mee omume, bụ́ nke dugara ná nlelị e lelịrị ha.

      Kora—Onye Nnupụisi Na-ekwo Ekworo

      4. (a) Ònye bụ Kora, ihe omume ndị dịkwa aṅaa mere ihe akụkọ ka obi abụọ na-adịghị ya na o keere òkè na ha? (b) Omume ọjọọ dị aṅaa ka Kora kpalitere n’afọ ndụ ya ndị sochirinụ?

      4 Kora bụ onye Livaị nke si n’usoro ọmụmụ Kohat, bụrụkwa nwa nwanne nna Mosis na Erọn. Ihe àmà na-egosi na o guzosiri ike n’ihe nye Jehova ruo ọtụtụ iri afọ. Kora nwere ihe ùgwù nke iso ná ndị ahụ e si n’Osimiri Uhie napụta n’ụzọ ọrụ ebube, o yikwara ka o keere òkè n’imezu ihe Jehova kpere n’ikpe megide ndị Israel ahụ fere chi nwa ehi n’Ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 32:26) Otú ọ dị, n’ikpeazụ, Kora ghọrọ onye duziri nnupụisi megide Mosis na Erọn bụ́ nke ndị Reuben bụ́ Detan, Abaịram, na On, tinyere ndị isi Israel 250, so na ya.a “O zuworo unu,” ka ha gwara Mosis na Erọn, “n’ihi na nzukọ Israel nile, ha nile n’otu n’otu, dị nsọ, ọ bụkwa n’etiti ha ka Jehova nọ: ọ̀ bụkwa gịnị mere unu na-ebuli onwe unu karịa mkpọkọta nke Jehova?”—Ọnụ Ọgụgụ 16:1-3.

      5, 6. (a) N’ihi gịnị ka Kora ji nupụrụ Mosis na Erọn isi? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na o yiri ka Kora ò ledara ọnọdụ ya ná ndokwa Chineke anya?

      5 N’ihi gịnị ka Kora ji nupụ isi mgbe o kwesịworo ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ? N’ezie, Mosis ejighị aka ike duo ụmụ Israel, n’ihi na ọ “dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Ma, o yiri ka Kora ò kwosoro Mosis na Erọn ekworo ma wee iwe n’ihi ọbụbụ ha bụ ndị a ma ama, nke a dugakwara ya n’ikwu—n’ụzọ na-ezighị ezi—na ha ejiriwo aka ike na ịchọ ọdịmma onwe ha nanị na-ebuli onwe ha karịa mkpọkọta ahụ.—Abụ Ọma 106:16.

      6 O yiri nnọọ ka otu n’ime nsogbu Kora ọ̀ bụ ejighị ihe ùgwù ndị o nwere ná ndokwa Chineke kpọrọ ihe. N’eziokwu, ndị Livaị si n’usoro ọmụmụ Kohat abụghị ndị nchụàjà, ma ha bụ ndị nkụzi nke Iwu Chineke. Ha na-ebukwa arịa ndị dị n’ụlọikwuu ahụ mgbe ọ bụla a chọrọ ibufe ha ebe ọzọ. Nke ahụ abụghị ọrụ dị ala, n’ihi na ọ bụ nanị ndị dị ọcha n’ụzọ okpukpe na n’omume pụrụ ibu arịa nsọ ndị ahụ. (Aịsaịa 52:11) N’ihi ya, mgbe Mosis gakwuuru Kora, ọ nọ na-ajụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị, Ị̀ na-ele ọrụ e kenyere gị anya dị ka ihe dị nnọọ ala nke na ị ghaghịkwa isonye n’òtù ndị nchụàjà? (Ọnụ Ọgụgụ 16:9, 10) Kora aghọtaghị na ihe ùgwù kasịnụ bụ ijere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi dị ka ndokwa ya si dị—ọ bụghị inweta ọkwá ma ọ bụ ọnọdụ ụfọdụ pụrụ iche.—Abụ Ọma 84:10.

      7. (a) Olee otú Mosis si mesoo Kora na ndị ikom ya ihe? (b) Olee otú e si weta nnupụisi Kora ná njedebe n’ụzọ dị egwu?

      7 Mosis gwara Kora na ndị ikom ya ka ha chịrị ihe ịgụ ọkụ na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ gbakọta n’ụlọikwuu nzute n’ụtụtụ echi ya. E nyeghị Kora na ndị ikom ya ikike isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, ebe ọ bụ na ha abụghị ndị nchụàjà. Ọ bụrụ na ha achịrị ihe ịgụ ọkụ na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ bịa, nke a ga-egosi n’ụzọ doro anya na ndị ikom a ka chere na ọ bụ ihe ruuru ha ije ozi dị ka ndị nchụàjà—ọbụna mgbe ha nwesịworo ohere iji abalị dum tụleghachi okwu ahụ. Mgbe ha bịara n’echi ya, Jehova gosipụtara iwe ya n’ụzọ ziri ezi. Ma ndị Reuben, “ala [saghere] ọnụ ya, lodaa ha.” Ọkụ sitere n’ebe Chineke nọ ripịara ndị ọzọ, gụnyere Kora. (Deuterọnọmi 11:6; Ọnụ Ọgụgụ 16:16–35; 26:10) Nganga Kora dugara ná nlelị kasịnụ—enweghị ihu ọma Chineke!

      Guzogide ‘Ụzọ Ekworo’

      8. Olee otú ‘ụzọ ekworo’ pụrụ isi pụta ìhè n’etiti ndị Kraịst?

      8 Ihe ndekọ banyere Kora bụụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị. Ebe ọ bụ na ‘ụzọ ekworo’ dị n’ime ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ọ pụrụ ịpụta ìhè ọbụna n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Jemes 4:5) Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịbụ ndị ji ọnọdụ kpọbigara ihe ókè. Dị ka Kora, anyị pụrụ ikwoso ndị nwere ihe ùgwù ndị anyị na-achọ inweta ekworo. Ma ọ bụ, anyị pụrụ ịdị ka onye Kraịst narị afọ mbụ aha ya bụ Dịọtrefis. Ọ na-akatọkarị ikike ndị ozi, ihe àmà na-egosi na ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ ịbụ onyeisi. N’ezie, Jọn dere na “ọ na-atọ [Dịọtrefis] ụtọ ịbụ onyeisi.”—3 Jọn 9.

      9. (a) Àgwà dị aṅaa n’ebe ibu ọrụ dị iche iche nke ọgbakọ dị ka anyị kwesịrị izere? (b) Olee ụzọ kwesịrị ekwesị anyị ga-esi na-ele ọnọdụ anyị ná ndokwa Chineke anya?

      9 N’ezie, ọ dịghị njọ nwoke bụ́ onye Kraịst iru eru maka ibu ọrụ dị iche iche nke ọgbakọ. Ọbụna Pọl gbara ume ka e nwee omume dị otú ahụ. (1 Timoti 3:1) Otú ọ dị, anyị ekwesịtụghị ile ihe ùgwù ije ozi anya dị ka ihe e ji amata ndị rụpụtara ihe, dị ka a ga-asị na site n’inweta ha, anyị arịala n’ọkwá nke ihe ịga nke ọma. Cheta na Jisọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-achọ ka e mee ya onye ukwu n’etiti unu, ọ ga-abụ onye na-ejere unu ozi; ọzọ, onye ọ bụla nke na-achọ ka ọ bụrụ onyeisi n’etiti unu, ọ ga-abụ ohu unu.” (Matiu 20:26, 27) N’ụzọ doro anya, ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi ikwoso ndị nwere ibu ọrụ ka ukwuu ekworo, dị ka a ga-asị na uru anyị bara n’anya Chineke na-adabere ‘n’ọkwá’ anyị nọ na ya ná nzukọ ya. Jisọs kwuru, sị: “Unu nile bụ ụmụnna.” (Matiu 23:8) Ee, ma hà bụ ndị nkwusa ma hà bụ ndị ọsụ ụzọ, ndị ọhụrụ e mere baptism ma ọ bụ ndị guzosiworo ike n’ezi ihe ruo ọtụtụ afọ—ndị nile ji mkpụrụ obi ha dum na-ejere Jehova ozi nwere ọnọdụ dị oké ọnụ ahịa ná ndokwa ya. (Luk 10:27; 12:6, 7; Ndị Galetia 3:28; Ndị Hibru 6:10) Ọ bụ ngọzi n’ezie iso ọtụtụ nde ndị mmadụ na-arụkọ ọrụ bụ́ ndị na-agbalịsi ike itinye n’ọrụ ndụmọdụ Bible bụ́: “Were obi dị umeala kee onwe unu dị ka ákwà, ijerịtara ibe unu ozi.”—1 Pita 5:5.

      Absalọm—Onye Nrigbu Nwere Oké Ọchịchọ

      10. Ònye bụ Absalọm, oleekwa otú o si nwaa inweta ihu ọma nke ndị na-abịakwute eze maka ikpe?

      10 Ụzọ ndụ nke nwa nwoke nke atọ nke Eze Devid, bụ́ Absalọm, na-akụzi ihe gbara ọkpụrụkpụ banyere oké ọchịchọ. Onye nrigbu a na-eme atụmatụ ọjọọ nwara inweta ihu ọma nke ndị na-abịakwute eze maka ikpe. Na mbụ, o ji aghụghọ kwuo na Devid enweghị mmasị ná mkpa ha. E mesịa, ọ hapụrụ ụzọ aghụghọ ya ma kpughee ihe bụ́ nzube ya kpọmkwem. “Ònye ga-edo m onyeikpe n’ala nke a,” ka Absalọm kwuru, “ka nwoke ọ bụla nke nwere okwu ma ọ bụ ikpe wee bịakwute m, m wee kpọọ ya onye ezi omume!” Atụmatụ aghụghọ Absalọm gabigara ókè. “Mgbe nwoke ọ bụla bịaruru ya nso ịkpọ isiala nye ya,” ka Bible na-ekwu, “na o setịrị aka ya, jide ya, sutụ ya ọnụ. Absalọm wee meere Israel nile dị ka okwu a si dị, bụ́ ndị bịakwutere eze ka e kpee ha ikpe.” Gịnị si na ya pụta? “Absalọm wee zuru obi ndị ikom Israel n’ohi.”—2 Samuel 15:1-6.

      11. Olee otú Absalọm si nwaa iweghara ocheeze Devid?

      11 Absalọm kpebisiri ike iweghara ọbụbụeze nna ya. Afọ ise tupu mgbe ahụ, o mere ka e gbuo diọkpara Devid, bụ́ Amnọn, o yiri ka ọ bụ n’ịbọ ọ́bọ̀ maka ndina o dinara nwanne nwanyị Absalọm bụ́ Tema, n’ike. (2 Samuel 13:28, 29) Otú ọ dị, ọbụna n’oge ahụ, anya Absalọm pụrụ ịdịwo n’ocheeze ahụ, o wee na-ele ogbugbu e gburu Amnọn anya dị ka ụzọ dị mfe isi wepụ onye ya na ya gaara azọ ya.b Ka o sina dị, mgbe oge ruru, Absalọm malitere ime ihe. O mere ka a kpọsaa gburugburu ala ahụ na ya abụrụla eze.—2 Samuel 15:10.

      12. Kọwaa otú nganga Absalọm si duga n’ilelị ya.

      12 Ihe gaara Absalọm nke ọma ruo oge ụfọdụ, n’ihi na “nkekọta ahụ [nọgidere na-adị] ike; ndị Israel na-abakwa ụba na-eje n’ihu n’ihu n’aka Absalọm.” Ka oge na-aga, a manyere Eze Devid ịgba ọsọ ndụ. (2 Samuel 15:12-17) Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, nchụso Absalọm jedebere mgbe Joab gburu ya, tụba ya n’otu olulu, ma were nkume kpuchie ya. Cheedị echiche—e lighịdị nwoke a nwere oké ọchịchọ nke chọrọ ịbụ eze n’ụzọ dị mma mgbe ọ nwụrụ!c N’ezie, nganga dugara ná nlelị e lelịrị Absalọm.—2 Samuel 18:9-17.

      Jụ Oké Ọchịchọ nke Ịchọ Ọdịmma Onwe Onye Nanị

      13. Olee otú àgwà nke oké ọchịchọ pụrụ isi gbanye mkpọrọgwụ n’obi onye Kraịst?

      13 Nrịgo Absalọm rịgoro n’ọchịchị na ọdịda sochiri ya bụụrụ anyị ihe mmụta. N’ụwa taa nke omume ọjọọ jupụtara, ọ bụ ihe a na-ahụkarị bụ́ ndị mmadụ ịgwa ndị ka ha elu okwu ịja mma efu, na-anwa inweta ihu ọma ha nanị iji mee ka ha mara na ha nọ ya ma ọ bụ ikekwe iji nweta ụdị ihe ùgwù ma ọ bụ mbuli n’ọkwá ụfọdụ. N’otu oge ahụ, ha pụrụ ituru ndị nọ n’okpuru ha ọnụ, na-enwe olileanya inweta ihu ọma na nkwado ha. Ọ bụrụ na anyị akpachapụghị anya, àgwà nke oké ọchịchọ dị otú ahụ pụrụ ịgbanye mkpọrọgwụ n’obi anyị. Ihe àmà na-egosi na ọ dị otú a n’etiti ụfọdụ ndị na narị afọ mbụ, na-eme ka ọ dị mkpa ka ndị ozi nye ịdọ aka ná ntị siri ike megide ndị dị otú ahụ.—Ndị Galetia 4:17; 3 Jọn 9, 10.

      14. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị izere àgwà nke oké ọchịchọ na nke ibuli onwe onye elu?

      14 Jehova enweghị ọnọdụ ọ bụla n’ime nzukọ ya maka ndị na-eme atụmatụ ọjọọ bụ́ ndị na-ebuli onwe ha elu, ndị na-anwa ‘igwupụta ala nsọpụrụ ha.’ (Ilu 25:27) N’ezie, Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ka Jehova bipụ egbugbere ọnụ nile nke na-ekwu okwu ire ụtọ, na ire nke na-ekwu oké ihe.” (Abụ Ọma 12:3) Absalọm nwere ire ụtọ. Ọ gwara ndị ọ na-achọ ihu ọma ha okwu na-ebu isi—nanị iji nweta ọnọdụ ịbụisi ọ na-achọsi ike bụ́ nke na-erughịrị ya. N’ụzọ dị iche, lee ka anyị si bụrụ ndị a gọziri agọzi ịnọ n’etiti òtù ụmụnna na-agbaso ndụmọdụ Pọl, bụ́: “Unu emela ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịtanụ ibe unu ná ndị ka unu onwe unu mma.”—Ndị Filipaị 2:3.

      Sọl—Eze Na-enweghị Ndidi

      15. Olee otú Sọl si gosi n’otu oge na ya wedara onwe ya ala?

      15 N’otu oge, Sọl, bụ́ onye mesịrị ghọọ eze Israel, wedara onwe ya ala. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe mere n’oge ọ bụ nwa okorobịa. Mgbe onye amụma Chineke bụ́ Samuel kwuru okwu ọma banyere ya, Sọl ji obi umeala zaghachi, sị: “Ọ́ bụghị onye Benjamin ka m bụ, sitere n’ebo Israel nke dịkarịsịrị nta? agbụrụ m, ó pekarịsịghị mpe n’etiti agbụrụ nile nke ebo Benjamin? n’ihi gịnịkwa ka ị gwaworo m okwu dị ka okwu a si dị?”—1 Samuel 9:21.

      16. N’ụzọ dị aṅaa ka Sọl si gosipụta àgwà nke enweghị ndidi?

      16 Otú ọ dị, mgbe e mesịrị, Sọl ewedaghịzi onwe ya ala. Mgbe ha na ndị Filistia na-alụ agha, ọ gara Gilgal, bụ́ ebe a tụrụ anya ka ọ nọrọ chere ka Samuel bịa rịọ Chineke arịrịọ site n’ịchụ àjà. Mgbe Samuel na-abịaghị n’oge a kara aka, Sọl ji nganga chụọ àjà nsure ọkụ ahụ n’onwe ya. Ozugbo o mechara, Samuel bịarutere. “Gịnị ka i meworo?” ka Samuel jụrụ. Sọl zara, sị: “Ahụrụ m na ndị Israel esiwo n’ebe m nọ gbasaa, ma gị onwe gị abịaghị n’ụbọchị a kara aka, . . . m wee jisie onwe m ike, wee suree àjà nsure ọkụ ahụ.”—1 Samuel 13:8-12.

      17. (a) E lee ya anya n’elu elu, n’ihi gịnị ka ihe Sọl mere pụrụ iji yie ihe ziri ezi? (b) N’ihi gịni ka Jehova ji katọọ Sọl maka omume enweghị ndidi ya?

      17 E lee ya anya n’elu elu, ihe Sọl mere pụrụ iyi ihe ziri ezi. E kwuwerị, “mkpa na-akpa” ndị Chineke, “a na-achị [ha] n’ihe ike,” ha na-amakwa jijiji n’ihi ọnọdụ enweghị olileanya ha nọ na ya. (1 Samuel 13:6, 7) N’ezie, ọ dịghị njọ ime ihe ụfọdụ n’onwe anyị mgbe e nwere ihe ndị mere a ga-eji mee otú ahụ.d Otú ọ dị, cheta na Jehova pụrụ ịma ihe dị anyị n’obi na ịchọpụta ebumnobi anyị ndị dị n’ime ime obi. (1 Samuel 16:7) N’ihi ya, ọ ghaghị ịhụwo ihe ụfọdụ banyere Sọl bụ́ ndị a na-ekwughị kpọmkwem n’ihe ndekọ Bible ahụ. Dị ka ihe atụ, Jehova pụrụ ịhụwo na ọ bụ nganga kpaliri enweghị ndidi Sọl. Ikekwe iwe were Sọl nke ukwuu na ya—eze Israel nile—aghaghị ichere onye o lere anya dị ka onye amụma merela agadi, nke na-eyigharị ihe! Ka o sina dị, Sọl chere na oge Samuel gburu nyere ya ikike ime ihe n’onwe ya na ileghara ntụziaka doro anya e nyeworo ya anya. Gịnị si na ya pụta? Samuel ajaghị Sọl mma maka ime ihe ahụ n’onwe ya. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ baara Sọl mba, na-asị: “Alaeze gị agaghị eguzosi ike . . . n’ihi na i debeghị ihe ahụ nke Jehova nyere gị n’iwu.” (1 Samuel 13:13, 14) Ọzọkwa, nganga dugara ná nlelị.

      Zere Enweghị Ndidi

      18, 19. (a) Kọwaa otú enweghị ndidi pụrụ isi mee ka onye na-ejere Chineke ozi n’oge a dị nganga. (b) Gịnị ka anyị kwesịrị icheta banyere otú ọgbakọ ndị Kraịst si arụ ọrụ?

      18 E dekọwo omume nganga Sọl n’Okwu Chineke maka abamuru anyị. (1 Ndị Kọrint 10:11) Ọ dịịrị anyị nnọọ mfe iwe iwe n’ihi ezughị okè nke ụmụnna anyị. Dị ka Sọl, anyị pụrụ ịbụ ndị na-adịghị enwe ndidi, na-eche na ọ bụrụ na a ga-eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, anyị aghaghị ime ya n’onwe anyị. Dị ka ihe atụ, were ya na otu nwanna kasị nwee nkà n’ịhazi ihe. Ọ na-abịa n’oge, na-agbasochi usoro ọgbakọ ji eme ihe anya, nweekwa onyinye n’ikwu okwu nakwa n’izi ihe. N’otu oge ahụ, ya achọpụta na ndị ọzọ adịghị eru ụkpụrụ ya ndị dị elu, nakwa na ha enwerutụghị nkà otú ọ ga-achọ ka ha nweruo. Nke a ọ̀ na-eme ka o zie ezi ịghara inwe ndidi? Ò kwesịrị ịkatọ ụmụnna ya, ikekwe na-enye echiche na a sị na ọ bụghị n’ihi mgbalị ndị ya na-eme, ọ dịghị ihe a ga-eme nakwa na ọgbakọ ahụ ga-ada? Nke a ga-abụ nganga!

      19 N’ezie, gịnị na-ejikọta ọgbakọ ndị Kraịst ọnụ? Ọ̀ bụ nkà nke ịhazi ihe? ọ̀ bụ ịdị nkọ? ọ̀ bụ otú ihe ọmụma haruru? N’eziokwu, ihe ndị a bara uru ka ihe wee na-aga werewere n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 14:40; Ndị Filipaị 3:16; 2 Pita 3:18) Otú ọ dị, Jisọs sịrị na ihe bụ́ isi a ga-eji mata ụmụazụ ya bụ ịhụnanya. (Jọn 13:35) Ọ bụ ya mere ndị okenye na-ahụ n’anya, n’agbanyeghị na ha na-eme ihe n’usoro, ji aghọta na ọgbakọ abụghị achụmnta ego nke chọrọ iji aka ike na-elekọta ya; kama, ọ bụ nke ìgwè atụrụ chọrọ nlekọta ọmịiko mejupụtara. (Aịsaịa 32:1, 2; 40:11) Iji nganga eleghara ụkpụrụ ndị dị otú ahụ anya na-akpatakarị esemokwu. N’ụzọ dị iche, ime ihe n’usoro n’ụzọ na-enye Chineke nsọpụrụ na-eweta udo.—1 Ndị Kọrint 14:33; Ndị Galetia 6:16.

      20. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

      20 Ihe ndekọ Bible banyere Kora, Absalọm, na Sọl na-egosi n’ụzọ doro anya na nganga na-eduga ná nlelị, dị ka e kwuru n’Ilu 11:2. Otú ọ dị, otu amaokwu Bible ahụ na-agbakwụnye, sị: “N’ebe ndị [maara ebe ike ha ruru] nọ ka amamihe dị.” Gịnị bụ mmadụ ịma ebe ike ya ruru? Ihe atụ ndị dị aṅaa sitere na Bible pụrụ inye aka ime ka a hụ àgwà a nke ọma, oleekwa otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị maara ebe ike anyị ruru taa? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

      [Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

      a Ebe ọ bụ na Reuben bụ diọkpara Jekọb, ụmụ ya ndị ahụ Kora ratara inupụ isi pụrụ iwewo iwe na Mosis—nwa Livaị—nwere ikike ịbụisi n’ebe ha nọ.

      b A kpọtụghị Kileab, bụ́ nwa nwoke nke abụọ Devid aha ọzọ mgbe a mụsịrị ya. Ọ pụrụ ịbụ na ọ nwụrụ tupu nnupụisi Absalọm.

      c N’oge Bible, olili ozu bụ ihe omume dị nnọọ mkpa. N’ihi ya, ịbụ onye a na-elighị eli bụ ajọ ihe, ọ na-abụkarịkwa ngosipụta nke enweghị ihu ọma Chineke.—Jeremaịa 25:32, 33.

      d Dị ka ihe atụ, Fineas mere ihe ngwa ngwa iji kwụsị ihe otiti nke gburu ọtụtụ iri puku ụmụ Israel, Devid gbakwara ndị ikom ya agụụ na-agụgbu ume iso ya rie achịcha nke ihu Chineke bụ́ nke dị “n’ụlọ Chineke.” Chineke akatọghị omume abụọ ahụ dị ka nganga.—Matiu 12:2-4; Ọnụ Ọgụgụ 25:7-9; 1 Samuel 21:1-6.

  • “N’ebe Ndị Maara Ebe Ike Ha Ruru Nọ Ka Amamihe Dị”
    Ụlọ Nche—2000 | Ọgọst 1
    • “N’ebe Ndị Maara Ebe Ike Ha Ruru Nọ Ka Amamihe Dị”

      “Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị . . . [ịma ebe ike gị ruru n’iso] Chineke gị na-eje ije?”—MAỊKA 6:8.

      1, 2. Gịnị bụ mmadụ ịma ebe ike ya ruru, oleekwa otú o si dị iche n’ịdị nganga?

      OTU onyeozi a ma ama ajụ ịdọrọ uche gaa n’ebe ya onwe ya nọ. Otu onyeikpe Israel nwere obi ike akpọọ onwe ya onye pekasịrị mpe n’ụlọ nna ya. Nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ ekweta na ya enweghị ikike a na-akparaghị ókè. Nke ọ bụla n’ime ndị ikom a gosipụtara na ọ maara ebe ike ya ruru.

      2 Mmadụ ịma ebe ike ya ruru dị iche na nganga. Onye maara ebe ike ya ruru adịghị ele ikike ya na uru ọ bara anya n’ụzọ gabigara ókè, ọ dịghịkwa adị mpako ma ọ bụ okomoko. Kama ịdị mpako, itu ọnụ, ma ọ bụ inwe oké ọchịchọ, onye maara ebe ike ya ruru na-ama ihe ndị a kpaara ya ókè na ha mgbe nile. N’ihi ya, ọ na-akwanyere mmetụta na echiche nke ndị ọzọ ùgwù ma na-echebara ha echiche n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

      3. N’ụzọ dị aṅaa ka amamihe si dịrị “n’ebe ndị maara ebe ike ha ruru nọ”?

      3 E nwere ezi ihe mere Bible ji na-asị: “N’ebe ndị [maara ebe ike ha ruru] nọ ka amamihe dị.” (Ilu 11:2) Onye maara ebe ike ya ruru na-enwe amamihe n’ihi na ọ na-agbaso ụzọ Chineke kwadoro, ọ na-ezerekwa mmụọ nganga bụ́ nke na-akpata nlelị. (Ilu 8:13; 1 Pita 5:5) Ụzọ ọtụtụ ndị ohu Chineke si bie ndụ na-akwado na mmadụ ịma ebe ike ya ruru bụ ihe amamihe dị na ya. Ka anyị tụlee ihe atụ atọ ahụ e zoro aka na ha na paragraf nke mbụ.

      Pọl—‘Onye Na-eje Ozi’ na ‘Onye Nlekọta Ụlọ’

      4. Ihe ùgwù ndị dị aṅaa pụrụ iche ka Pọl nwere?

      4 Pọl bụ onye a ma ama n’etiti ndị Kraịst oge mbụ, o dokwara anya ihe mere o ji dị otú ahụ. N’oge ọ na-eje ozi ya, o ji ụgbọ mmiri na ụkwụ mee njem ruru ọtụtụ puku kilomita, o guzobekwara ọtụtụ ọgbakọ. Tụkwasị na nke ahụ, Jehova ji ọhụụ dị iche iche na onyinye nke ịsụ asụsụ ndị mba ọzọ gọzie Pọl. (1 Ndị Kọrint 14:18; 2 Ndị Kọrint 12:1-5) O nyekwara Pọl ike mmụọ nsọ ide akwụkwọ ozi 14 ndị sozi n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. N’ụzọ doro anya, a pụrụ ikwu na ọrụ Pọl rụrụ karịrị nke ndị ozi ndị ọzọ.—1 Ndị Kọrint 15:10.

      5. Olee otú Pọl si gosi na ọ na-ele onwe ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

      5 Ebe ọ bụ na Pọl nọ n’isi nke ọrụ ndị Kraịst, ụfọdụ pụrụ ịtụ anya ịhụ ya ka onwe ya juru ya afọ n’ihi ịbụ onye a ma ama, ọbụna na-eme ka a hụ na o nwere ikike. Otú ọ dị, ọ dịghị otú ahụ n’ihi na Pọl maara ebe ike ya ruru. Ọ kpọrọ onwe ya “[onye] dịkarịsịrị nta n’etiti ndị ozi,” na-agbakwụnye, sị: “[Erughị m] ka a kpọọ m onyeozi, n’ihi na esogburu m nzukọ Chineke.” (1 Ndị Kọrint 15:9) Dị ka onye kpagbuburu ndị Kraịst, ọ dịghị mgbe Pọl chefuru na ọ bụ nanị site n’obiọma na-erughịrị mmadụ ka o ji nwee ike isotụdị Chineke nwee mmekọrịta, ma ya fọdụzie inwe ihe ùgwù ije ozi ndị pụrụ iche. (Jọn 6:44; Ndị Efesọs 2:8) N’ihi ya, Pọl echeghị na ihe ndị pụrụ iche ọ rụzuru n’ozi ya mere ka ọ ka ndị ọzọ.—1 Ndị Kọrint 9:16.

      6. Olee otú Pọl si gosi na ọ maara ebe ike ya ruru n’ụzọ o si mesoo ndị Kọrint ihe?

      6 Ọmụma Pọl maara ebe ike ya ruru pụtara ìhè karịsịa n’ụzọ o si mesoo ndị Kọrint ihe. Ihe àmà na-egosi na ụfọdụ n’ime ha nwere oké mmasị n’ebe ndị ha chere na ha bụ ndị nlekọta a ma ama nọ, gụnyere Apọlọs, Kifas, na Pọl n’onwe ya. (1 Ndị Kọrint 1:11-15) Ma Pọl anwaghị ime ka ndị Kọrint jaa ya mma, o jighịkwa ùgwù ha na-akwanyere ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Mgbe ọ na-eleta ha, o jighị ‘ọkà okwu ma ọ bụ ọkà amamihe’ gosipụta onwe ya. Kama nke ahụ, Pọl kwuru banyere onwe ya na ndị ibe ya, sị: “Ka mmadụ na-agụ anyị otú a, dị ka ndị na-ejere Kraịst ozi, ndị bụ́kwa ndị [nlekọta ụlọ, NW] n’ihe omimi nke Chineke.”a—1 Ndị Kọrint 2:1-5; 4:1.

      7. Olee otú Pọl si gosipụta na ọ maara ebe ike ya ruru ọbụna mgbe ọ na-enye ndụmọdụ?

      7 Ọbụna Pọl gosipụtara na ọ maara ebe ike ya ruru mgbe ọ na-aghaghị inye ndụmọdụ na ntụziaka siri ike. O ji “obi ebere nile nke Chineke” nakwa “n’ihi ịhụnanya ahụ” rịọ ndị Kraịst ibe ya arịrịọ kama igosipụta ịdị ukwuu nke ikike ya dị ka onyeozi. (Ndị Rom 12:1, 2; Faịlimọn 8, 9) N’ihi gịnị ka Pọl ji mee nke a? Ọ bụ n’ihi na o lere onwe ya anya n’ezie dị ka ‘onye so ụmụnna ya na-arụkọ ọrụ,’ ọ bụghị dị ka ‘onye nwe okwukwe ha.’ (2 Ndị Kọrint 1:24) Obi abụọ adịghị ya na ọ bụ ọmụma Pọl maara ebe ike ya ruru nyere aka mee ka ọgbakọ ndị Kraịst narị afọ mbụ hụ ya n’anya karịsịa.—Ọrụ 20:36-38.

      Ile Ihe Ùgwù Anyị Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

      8, 9. (a) N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ile onwe anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị? (b) Olee otú ndị nwere ibu ọrụ ụfọdụ pụrụ isi gosipụta na ha maara ebe ike ha ruru?

      8 Pọl setịpụụrụ ndị Kraịst taa ezi ihe nlereanya. N’agbanyeghị ihe ùgwù ndị e nyefeworo anyị, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iche na ọ karịrị ndị ọzọ. “A sị na mmadụ na-eche na ya bụ ihe, mgbe ọ na-abụghị ihe ọ bụla,” ka Pọl dere, “ọ na-aghọ onwe ya aghụghọ n’obi.” (Ndị Galetia 6:3) N’ihi gịnị? N’ihi na “mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23; 5:12, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ee, anyị ekwesịghị ichefu ma ọlị na anyị nile eketawo mmehie na ọnwụ n’aka Adam. Ihe ùgwù ndị pụrụ iche adịghị ebuli anyị gabiga ọnọdụ mmehie anyị na-eweda n’ala. (Eklisiastis 9:2) Dị ka ọ dị n’ebe Pọl nọ, ọ bụ nanị site n’obiọma na-erughịrị mmadụ ka ụmụ mmadụ pụrụ isotụdị Chineke na-enwe mmekọrịta, ma ya fọdụkwa ijere ya ozi n’ọnọdụ ihe ùgwù ụfọdụ.—Ndị Rom 3:12, 24.

      9 N’ịmara nke a, onye maara ebe ike ya ruru adịghị abụ onye onwe ya juru afọ n’ihi ihe ùgwù ndị o nwere, ọ dịghịkwa eji ihe ndị ọ rụzuru etu ọnụ. (1 Ndị Kọrint 4:7) Mgbe ọ na-enye mmadụ ndụmọdụ ma ọ bụ ntụziaka, ọ na-enye ya dị ka onye ya na ya na-arụkọ ọrụ—ọ bụghị dị ka onye nwe ya. N’ezie, ọ ga-abụ ihe jọgburu onwe ya bụ́ onye kasị eme nke ọma n’ọrụ ụfọdụ ịnwa ime ka ndị kwere ekwe ibe ya jaa ya mma ma ọ bụ jiri ùgwù ha na-akwanyere ya na-eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. (Ilu 25:27; Matiu 6:2-4) Okwu ịja mma nke nanị ya bara uru na-esi n’aka ndị ọzọ abịa—o kwesịghịkwa ịbụ nke onye ahụ ji aka ya mee ka a jaa ya. Ọ bụrụ na a jaa anyị mma, anyị ekwesịghị ikwe ka o mee ka anyị na-eche banyere onwe anyị karịa otú o kwesịrị.—Ilu 27:2; Ndị Rom 12:3.

      10. Kọwaa otú ụfọdụ bụ́ ndị pụrụ iyi ka ha dị ala pụrụ isi bụrụ “ọgaranya n’okwukwe” n’ezie.

      10 Mgbe e nyere anyị ibu ọrụ ụfọdụ, ịma ebe ike anyị ruru ga-enyere anyị aka izere ịdị na-adọrọ uche gaa n’ebe anyị onwe anyị nọ n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na-enye echiche na ọ bụ nanị n’ihi mgbalị na ikike anyị ka ọgbakọ ji na-aga nke ọma. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ inwe onyinye nke izi ihe nke ọma karịa ndị ọzọ. (Ndị Efesọs 4:11, 12) Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị maara ebe ike anyị ruru, anyị aghaghị ịghọta na ụfọdụ n’ime ihe ndị kasị ukwuu a na-amụta ná nzukọ ọgbakọ abụghị n’ikpo okwu ka a na-ekwu ha. Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ na ọ dịghị abụrụ gị ihe agbamume mgbe ị hụrụ ndị nne ma ọ bụ ndị nna na-azụ ụmụ nanị ha bụ́ ndị na-akpọrọ ụmụ ha abịa Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe nile? Ma ọ bụ ndị dara mbà n’obi bụ́ ndị na-eji ikwesị ntụkwasị obi abịa nzukọ n’agbanyeghị mmetụta ha na-enwe mgbe nile na ha abaghị n’ihe? Ma ọ bụ ndị ntorobịa bụ́ ndị na-anọgide na-enwe ọganihu ime mmụọ n’agbanyeghị mmetụta ọjọọ ndị ha na-enweta n’ụlọ akwụkwọ nakwa n’ebe ndị ọzọ? (Abụ Ọma 84:10) E nwere ike mmadụ ndị a abụghị ndị a ma ama. Ndị ọzọ adịghị ahụ ihe ka ukwuu n’ule iguzosi ike n’ezi ihe ndị ha na-eche ihu. Ma, ha pụrụ ịbụ “ọgaranya n’okwukwe” dị ka ndị ahụ a ma ama karị. (Jemes 2:5) E kwuwerị, n’ikpeazụ, ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi ka e ji enweta ihu ọma Jehova.—Matiu 10:22; 1 Ndị Kọrint 4:2.

      Gideọn—“Onye Pekasịrị Mpe” n’Ụlọ Nna Ya

      11. N’ụzọ dị aṅaa ka Gideọn si gosipụta na ọ maara ebe ike ya ruru mgbe ya na mmụọ ozi Chineke na-ekwurịta okwu?

      11 Gideọn, bụ́ nwa okorobịa siri ike nke si n’ebo Manase, biri ndụ n’oge e nwere ọgba aghara n’akụkọ ihe mere eme nke Israel. Ruo afọ asaa, ndị Chineke hụsiri anya n’okpuru mmegide ndị Midian. Otú ọ dị, oge ruziri ka Jehova napụta ndị ya. N’ihi ya, otu mmụọ ozi mere ka Gideọn hụ ya anya ma kwuo, sị: “Jehova nọnyeere gị, gị dike bụ́ dimkpa.” Gideọn maara ebe ike ya ruru, n’ihi ya, o kweghị ka onwe ya ju ya afọ n’ihi otuto dị n’okwu ịja mma a ọ na-atụghị anya ya. Kama nke ahụ, o ji nkwanye ùgwù gwa mmụọ ozi ahụ, sị: “Biko, onyenwe m, ọ bụrụ na Jehova nọnyeere anyị, n’ihi gịnịkwa ka ihe a nile dakwasịworo anyị?” Mmụọ ozi ahụ mere ka ihe doo anya ma gwa Gideọn, sị: “[Ị ga-azọpụta] Israel n’aka Midian.” Olee otú Gideọn si meghachi omume? Kama iji ịnụ ọkụ n’obi nakwere ọrụ ahụ e kenyere ya dị ka ohere o nwere iji mee onwe ya dike n’obodo ya, Gideọn zaghachiri, sị: “Biko, Onyenwe anyị, M ga-eji gịnị zọpụta Israel? lee, [otu puku ndị ikom] nke m bụ nke na-enweghị ike n’ime Manase, mụ onwe m bụkwa onye pekasịrị mpe n’ụlọ nna m.” Lee mmadụ ịma ebe ike ya ruru nke ahụ bụ!—Ndị Ikpe 6:11-15.

      12. Olee otú Gideọn si gosi ezi uche n’ịrụ ọrụ e nyere ya?

      12 Tupu Jehova ezipụ Gideọn ịlụ agha, ọ nwalere ya? N’ụzọ dị aṅaa? A gwara Gideọn ka ọ kwadaa ebe ịchụàjà nna ya wuuru Beal ma gbutuo Ashera nke dị n’akụkụ ya. Ọrụ a ga-achọ obi ike, ma Gideọn gosipụtara na ọ maara ebe ike ya ruru na ezi uche n’ụzọ o si rụọ ya. Kama ime ka ọha na eze hụ ya, Gideọn rụrụ ya n’abalị mgbe o yikarịrị ka ọ dịghị onye ga-ahụ ya. Ọzọkwa, Gideọn ji akọ kwesịrịnụ rụọ ọrụ ahụ e nyere ya. Ọ kpọọrọ ndị ohu iri—ikekwe ọ bụ ka ụfọdụ wee nwee ike iguzo na-eche nche ka ndị ọzọ na-enyere ya aka ibibi ebe ịchụàjà na Ashera ahụ.b Ka o sina dị, site ná ngọzi Jehova, Gideọn rụzuru ọrụ e nyere ya, ka oge na-agakwa, Chineke ji ya mee ihe n’ịtọhapụ Israel site n’aka ndị Midian.—Ndị Ikpe 6:25-27.

      Mmadụ Igosipụta na Ya Maara Ebe Ike Ya Ruru na Inwe Ezi Uche

      13, 14. (a) Ànyị pụrụ isi aṅaa gosi na anyị maara ebe ike anyị ruru mgbe a na-enye anyị ihe ùgwù ije ozi? (b) Olee otú Nwanna A. H. Macmillan si setịpụ ezi ihe nlereanya nke mmadụ igosipụta na ọ maara ebe ike ya ruru?

      13 Anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ọmụma Gideọn maara ebe ike ya ruru. Dị ka ihe atụ, olee otú anyị si emeghachi omume mgbe e nyere anyị ihe ùgwù ije ozi? Ànyị na-ebu ụzọ eche banyere ịbụ ndị a ma ama ma ọ bụ ùgwù ga-esi na ya pụta? Ka ànyị na-eweda onwe anyị ala ma jiri ekpere na-atụle ma ànyị pụrụ ịrụzu ihe ọrụ ahụ ga-achọ n’aka anyị? Nwanna A. H. Macmillan, bụ́ onye jesịrị ozi elu ala ya na 1966, setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’akụkụ a. N’otu oge, C. T. Russell, bụ́ onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Society, jụrụ Nwanna Macmillan onye o chere pụrụ ilekọta ọrụ ahụ mgbe ya na-anọghị ya. Ná mkparịta ụka sochirinụ, ọ dịghị mgbe Nwanna Macmillan tụrụ aro ka ọ bụrụ ya onwe ya, n’agbanyeghị na ọ gaara adịrị ya nnọọ mfe ime otú ahụ. N’ikpeazụ, Nwanna Russell gbara Nwanna Macmillan ume ịtụle ịnakwere ọrụ ahụ. “Eguzo m ebe ahụ n’enweghị ọnụ okwu,” ka Nwanna Macmillan dere ọtụtụ afọ mgbe nke a gasịrị. “Echebasiiri m ya nnọọ echiche ike, ma kpee ekpere banyere ya ruo oge ụfọdụ tupu m gwa ya n’ikpeazụ na obi ga-adị m ụtọ ime ihe ọ bụla m pụrụ ime iji nyere ya aka.”

      14 N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Nwanna Russell nwụrụ, na-ahapụ ọnọdụ nke onyeisi oche Watch Tower Society n’enweghị onye nọ ya. Ebe ọ bụ na ọ bụ Nwanna Macmillan na-elekọta ọrụ ahụ n’oge Nwanna Russell mere njem nkwusa ikpeazụ ya, otu nwanna gwara ya, sị: “Mac, i nwere ezigbo ohere ịbanye n’ọnọdụ a n’onwe gị. Ị bụ onye nnọchianya pụrụ iche nke Nwanna Russell mgbe ọ na-anọghị ya, ọ gwakwara anyị nile ka anyị na-eme otú i kwuru. Ọ pụrụ ma ọ lọghachighị ma ọlị. O yiri ka ọ bụ gị ga-eburu ọrụ a gaa n’ihu.” Nwanna Macmillan zaghachiri, sị: “Nwanna, nke ahụ abụghị ụzọ e kwesịrị isi lee okwu a anya. Ihe a bụ ọrụ Onyenwe anyị, ọ bụkwa nanị ọnọdụ Onyenwe anyị lere anya dị ka nke kwesịrị ekwesị inye gị ka ị na-enweta ná nzukọ ya; ejikwa m n’aka na ọ bụghị m ka ọrụ ahụ ruuru.” E mesịa, Nwanna Macmillan tụrụ aro ka e nye onye ọzọ ọnọdụ ahụ. Dị ka Gideọn, o lere onwe ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị—ụzọ ile onwe onye anya anyị ga-eme nke ọma ịgbaso.

      15. Olee ụzọ ụfọdụ dị irè anyị pụrụ isi jiri nghọta na-eme ihe mgbe anyị na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma?

      15 Anyị onwe anyị kwa kwesịrị igosipụta na anyị maara ebe ike anyị ruru n’ụzọ anyị si arụ ọrụ e kenyere anyị. Gideọn nwere ezi uche, ọ gbalịsikwara ike ịghara ịkpasu ndị na-emegide ya iwe n’ụzọ na-enweghị isi. N’otu aka ahụ, n’ọrụ nkwusa anyị, anyị kwesịrị iji ọmụma anyị maara ebe ike anyị ruru na ezi uche na-eme ihe mgbe anyị na-agwa ndị ọzọ okwu. N’eziokwu, anyị na-alụ agha ime mmụọ iji kwada “ebe e wusiri ike” na “ihe a na-atụle n’obi.” (2 Ndị Kọrint 10:4, 5) Ma anyị ekwesịghị ịgwa ndị ọzọ okwu n’ụzọ nlelị ma ọ bụ mee ihe ọ bụla ga-eme ka ha wewa iwe megide ozi anyị. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịkwanyere echiche ha ùgwù, mesie ihe anyị na ha kwekọrịtara ike, ma lekwasịzie anya n’akụkụ ndị na-enye olileanya nke ozi anyị.—Ọrụ 22:1–3; 1 Ndị Kọrint 9:22; Mkpughe 21:4.

      Jisọs—Ihe Nlereanya Kasịnụ nke Mmadụ Ịma Ebe Ike Ya Ruru

      16. Olee otú Jisọs si gosi na ọ na-ele onwe ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

      16 Ihe nlereanya kasị mma nke mmadụ ịma ebe ike ya ruru bụ nke Jisọs Kraịst.c N’agbanyeghị mmekọrịta chiri anya ya na Nna ya nwere, Jisọs alaghị azụ n’ikweta na ihe ụfọdụ karịrị ike ya. (Jọn 1:14) Dị ka ihe atụ, mgbe nne Jemes na Jọn rịọrọ ka ụmụ ya ndị ikom abụọ nọdụ n’akụkụ Jisọs n’Alaeze ya, Jisọs kwuru, sị: “Ịnọdụ n’aka nri m, na n’aka ekpe m, abụghị nke m inye.” (Matiu 20:20-23) N’oge ọzọ, Jisọs kwetara hoo haa, sị: “Mụ onwe m apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe m . . . etughị m ihe Mụ onwe m na-achọ, kama ihe Onye zitere m na-achọ.”—Jọn 5:30; 14:28; Ndị Filipaị 2:5, 6.

      17. Olee otú Jisọs si gosipụta na ọ na-emeru ihe n’ókè n’ụzọ o si mesoo ndị ọzọ ihe?

      17 Jisọs karịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè n’ụzọ nile, o nwetakwara ikike na-enweghị atụ site n’aka Nna ya, bụ́ Jehova. Otú o sina dị, Jisọs meruru ihe n’ókè ná mmeso o mesoro ụmụazụ ya. O gosipụtaghị na ọ maara ihe site n’izi ha ihe gabiga ókè. O gosipụtara mmetụta na ọmịiko ma chebara mkpa ndị ha nwere dị ka ụmụ mmadụ echiche. (Matiu 15:32; 26:40, 41; Mak 6:31) N’ihi ya, ọ bụ ezie na Jisọs zuru okè, ọ bụghị onye na-achọkarị izu okè. Ọ dịghị mgbe ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya mee ihe ha na-agaghị emeli, ọ dịghịkwa mgbe o bokwasịrị ha ihe ha na-agaghị ebuli. (Jọn 16:12) Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ mmadụ ji hụta ya dị ka onye na-eme ka e nwee izu ike!—Matiu 11:29.

      Ṅomie Ihe Nlereanya Jisọs nke Mmadụ Ịma Ebe Ike Ya Ruru

      18, 19. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ọmụma Jisọs maara ebe ike ya ruru (a) n’ụzọ anyị si ele onwe anyị anya, nakwa (b) n’ụzọ anyị si emeso ndị ọzọ ihe?

      18 Ọ bụrụ na nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ gosipụtara na ọ maara ebe ike ya ruru, anyị kwesịrị ime otú ahụ karị. Ụmụ mmadụ na-ezughị okè anaghị adịkarị njikere ikweta na ha enweghị nnọọ ikike n’ụzọ zuru ezu. Otú ọ dị, n’iṅomi Jisọs, ndị Kraịst na-agbalịsi ike ịma ebe ike ha ruru. Ha adịghị eji nnọọ mpako ala azụ n’iwere ibu ọrụ nye ndị ruru eru inweta ya; ha abụghị ndị na-ebuli onwe ha elu na ndị na-adịghị njikere ịnara ntụziaka n’aka ndị e nyere ikike inye ya. N’ịbụ ndị na-egosipụta mmụọ imekọ ihe ọnụ, ha na-ekwe ka ihe nile n’ọgbakọ na-ewere ọnọdụ “n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro.”—1 Ndị Kọrint 14:40.

      19 Anyị ịma ebe ike anyị ruru ga-enyekwara anyị aka inwe ezi uche banyere ihe ndị anyị na-atụ anya ya n’aka ndị ọzọ nakwa ichebara mkpa ha echiche. (Ndị Filipaị 4:5, NW) Anyị pụrụ inwe ụfọdụ nkà na ikike ndị ọ pụrụ ịbụ na ndị ọzọ enweghị. Ma, ọ bụrụ na anyị maara ebe ike anyị ruru, anyị agaghị na-atụkarị anya ka ndị ọzọ na-eme ihe dị ka ọ ga-amasị anyị ka ha mee. N’ịmara na onye ọ bụla nwere erughị eru nke ya, anyị ga-eji ọmụma anyị maara ebe ike anyị ruru na-enye ohere maka adịghị ike nke ndị ọzọ. Pita dere, sị: “Nke bụ́ isi ihe nile meenụ ka ịhụnanya ahụ unu na-ahụrịta onwe unu dị ike; n’ihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.”—1 Pita 4:8.

      20. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji merie àgwà ọ bụla ga-eduga n’amaghị ebe ike anyị ruru?

      20 Dị ka anyị mụtaworo, n’ebe ndị maara ebe ike ha ruru nọ ka amamihe dị n’ezie. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ị chọpụta na i nwere àgwà ndị na-eduga ná mmadụ amaghị ebe ike ya ruru ma ọ bụ nganga? Enwela nkụda mmụọ. Kama nke ahụ, gbasoo ihe nlereanya Devid, bụ́ onye kpere ekpere, sị: “Gbochiekwa ohu Gị ná mmehie nganga; ekwela ka ha na-achị m.” (Abụ Ọma 19:13) Site n’iṅomi okwukwe nke ndị ikom dị ka Pọl, Gideọn, na—karịa onye ọ bụla ọzọ—Jisọs Kraịst, anyị ga-ahụ n’onwe anyị eziokwu dị n’okwu ahụ bụ́: “N’ebe ndị [maara ebe ike ha ruru] nọ ka amamihe dị.”—Ilu 11:2.

      [Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

      a Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ ‘ndị na-eje ozi’ pụrụ izo aka n’ohu nke na-anọ n’oche ka ala soro na-akwọ nnukwu ụgbọ mmiri. N’ụzọ dị iche, a pụrụ inyefe ibu ọrụ ka ukwuu n’aka “ndị nlekọta ụlọ,” ikekwe ilekọta ala na ụlọ. Ka o sina dị, n’anya ihe ka ọtụtụ n’ime ndị nwe mmadụ, onye nlekọta ụlọ bụ ohu otú ohu nke na-akwọ ụgbọ mmiri bụkwa.

      b E kwesịghị iwere ezi uche na ịdị akọ Gideọn dị ka ihe àmà nke ịtụ ụjọ. N’ụzọ dị iche, Ndị Hibru 11:32–38, bụ́ nke gụnyere Gideọn n’etiti ndị ‘e mere ka ha dị ike’ na ndị “dị ike n’agha,” na-akwado na o nwere obi ike.

      c A kparaghị ike Jehova ókè. Ya mere, a pụghị izi ezi ikwu na o nwere ebe ike ya ruru. Otú ọ dị, ọ dị umeala n’obi.—Abụ Ọma 18:35.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya