Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 4/1 p. 28-31
  • Nwee Obi Ụtọ, Bụrụkwa Onye A Haziri Ahazi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwee Obi Ụtọ, Bụrụkwa Onye A Haziri Ahazi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inwe Nhazi na Obi Ụtọ
  • Emesola Onwe Gị Omume n’Ụzọ Enweghị Obi Ebere
  • Nkịta Dị Ndụ ka ọ bụ Ọdụm Nwụrụ Anwụ?
  • Na-emeso Onwe Gị Ezi Ihe
  • Na-emeso Ndị Ọzọ Ezi Ihe
  • Ichebara Onye Ọ Bụla Echiche
  • Nọrọ Ìgwè Atụrụ ahụ Nso
  • Ndị Ohu Chineke—Ndị A Haziri Ahazi na Ndị Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-efe “Chineke Bụ́ Onye Obi Ụtọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Iji Ịhụnanya Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Otú E Si Enweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 4/1 p. 28-31

Nwee Obi Ụtọ, Bụrụkwa Onye A Haziri Ahazi

INWE nhazi na-enyere anyị aka ime ihe nke ọma. Ịma ọrụ na-enyere anyị aka iji oge na ihe ndị e nwere mee ihe n’ụzọ kasị mma. (Ndị Galetia 6:16; Ndị Filipaị 3:16; 1 Timoti 3:2) Ma e nwere ihe dị ná ndụ karịa nhazi na ịma ọrụ. Onye ọbụ abụ ahụ nwere ike mmụọ dere, sị: “[Ndị obi ụtọ, “NW”] ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha.” (Abụ Ọma 144:15) Ihe ịma aka e nwere bụ inwe obi ụtọ ma bụrụkwa onye a haziri ahazi n’ihe nile anyị na-eme.

Inwe Nhazi na Obi Ụtọ

Jehova Chineke bụ ihe nlereanya kasịnụ nke ezi nhazi. Ihe nile o kere, site ná mkpụrụ ndụ kasị nta ruo n’ihe ndị e kere eke dị ndụ dị mgbagwoju anya, site ná ntakịrị atọm dị iche iche ruo n’ụyọkọ kpakpando ndị buru oké ibu, na-egosi usoro na ịkwụzi akwụzi. Iwu ya ndị metụtara eluigwe na ala na-enyere anyị aka iji obi ike hazie ndụ anyị. Anyị maara na anyanwụ ga-awa kwa ụtụtụ na oge ọkọchị ga-esochi oge oyị.​—⁠Jenesis 8:22; Aịsaịa 40:26.

Ma Jehova karịrị nanị Chineke nke usoro. Ọ bụkwa “Chineke dị ngọzi [“obi ụtọ,” NW].” (1 Timoti 1:11; 1 Ndị Kọrint 14:33) A na-ahụta obi ụtọ ya n’ihe ndị o kere. Ụmụ nwamba na-egwuri egwu, ọdịda anyanwụ na-ama mma ile anya, nri na-adọrọ anya, egwú na-akpali mmụọ, ọrụ na-akpali akpali, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-egosi na o bu n’uche ka anyị nụ ụtọ ndụ. Iwu ya nile abụghị ihe mgbochi ndị na-agbakasị ahụ kama ihe nchebe maka obi ụtọ anyị.

Jisọs Kraịst na-eme onwe ya ka o yie Nna ya. Ọ bụ “onye nanị ya bụ Onye Dị Ike, onye bụkwa onye dị ngọzi [“obi ụtọ,” NW],” ọ na-emekwa nnọọ dị ka Nna ya. (1 Timoti 6:15; Jọn 5:19) Mgbe o so Nna ya rụkọsie ọrụ ike n’ike ihe, ọ karịrị “onye ọkà” nkịtị maara ọrụ. O nwere obi ụtọ n’ihe o mere. O “nwere ọṅụ n’ihu [Jehova] n’oge nile, na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ala na-emepụta ihe nke ụwa, ihe ndị na-amasịkarịkwa [ya] dị n’ebe ụmụ mmadụ nọ.”​—⁠Ilu 8:​30, 31.

Anyị chọrọ igosipụta ụdị obi ọma, inwe ọṅụ, na mmasị yiri nke ahụ maka ndị mmadụ n’ihe nile anyị na-eme. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ná mgbalị ime ihe dị ka ndị maara ọrụ, anyị pụrụ ichezọ na ịdị “na-agazikwa site na mmụọ nsọ [Chineke]” gụnyere ịmịpụta mkpụrụ nile nke mmụọ Chineke. (Ndị Galetia 5:​22-⁠25) Ya mere ọ ga-adị mma ka anyị jụọ, sị, Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ndị a haziri ahazi ma nwee obi ụtọ ma n’ihe anyị na-eme ma n’iduzi ọrụ ndị ọzọ?

Emesola Onwe Gị Omume n’Ụzọ Enweghị Obi Ebere

Tụlee okwu ndụmọdụ ọma ahụ e dekọrọ n’Ilu 11:17. Nke mbụ, onye ahụ ji ike mmụọ nsọ dee ihe na-agwa anyị na “onye na-emeso mkpụrụ obi ya ezi ihe ka onye ebere bụ.” O wee kwuo ihe dị iche site n’ịsị: “Ma onye na-emekpa anụ ahụ nke aka ya ahụ ka onye na-enweghị obi ebere bụ.” Nsụgharị New International Version tinyere ya n’ụzọ dị otú a: “Nwoke obi ọma na-ewetara onwe ya abamuru, ma onye obi ọjọọ na-ewetara onwe ya mmerụ ahụ.”

Olee otú anyị pụrụ isi meso onwe anyị ihe n’enweghị obi ebere n’amaghị ama? Otu ụzọ bụ site n’ibu nnọọ ihe ọma n’uche ma ghara inwe nhazi ma ọlị. Ọ̀ na-arụpụta gịnị? Otu ọkachamara kwuru, sị: “Otu nchezọ ihe, akwụkwọ ọrụ e tinyere na faịlụ na-ekwesịghị ekwesị, iwu a na-aghọtazughị, òkù telifon a na-emeghị ndekọ ya nke ọma​—⁠ndị a bụ ụmụ irighiri ọdịda, okpo ndị na-erida ihe nkekọ nke ịma ọrụ wee mee ka ebumnche ndị kasị mma kụọ afọ n’ala.”—⁠Teach Yourself Personal Efficiency.

Nke a kwekọrọ n’ihe onye ahụ ji ike mmụọ nsọ dee ihe kwuru, bụ́ onye sịrị: “Onye dị umengwụ n’ije ozi ya, onye ahụ bụ nwanne nke onye nwe mbibi.” (Ilu 18:9) Ee, ndị na-enweghị nhazi, na-amaghị ọrụ, pụrụ ịkpatara onwe ha na ndị ọzọ ọdachi na mbibi. N’ihi nke a, ndị ọzọ na-ezerekarị ha ezere. N’ihi umengwụ ha, ha na-akpatara onwe ha ịbụ ndị e wezụgara n’etiti ọha mmadụ.

Nkịta Dị Ndụ ka ọ bụ Ọdụm Nwụrụ Anwụ?

Ma anyị pụrụ ịbụ ndị na-emeso onwe anyị ihe n’ụzọ enweghị ebere sitekwa n’iguzobe ụkpụrụ ndị dịbigara elu ókè. Onye ahụ e hotara n’elu nke kwuru okwu banyere ịma ọrụ kwuru na anyị pụrụ inwe ihe mgbaru ọsọ nke “ụkpụrụ izu okè nke a na-apụghị inwetazu.” Ọ sịrị na ihe na-esi na ya apụta bụ “itinye onwe anyị n’obi mgbawa na ndakpọ olileanya.” Onye ụkpụrụ izu okè pụrụ inwe ezi nhazi ma mara ọrụ, ma ọ dịghị mgbe ọ ga-enwe obi ụtọ n’ezie. Mgbe oge na-aga, nanị ihe ọ na-enweta bụ obi mgbawa.

Ọ bụrụ na anyị na-achọ inwe ụkpụrụ izu okè, ọ dị mma ka anyị cheta na “ọ dịịrị nkịta dị ndụ mma karịa ọdụm nwụrụ anwụ.” (Eklisiastis 9:4) Ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị egbu onwe anyị n’ụzọ nkịtị site ná nchụso izu okè nke a na-apụghị irute na ya, ma anyị pụrụ imerụ onwe anyị ahụ nke ukwuu site n’ajọ ike ọgwụgwụ. Otu akwụkwọ kwuru na nke a gụnyere “enwekwaghị ume n’anụ ahụ, mmetụta uche, ime mmụọ, ọgụgụ isi, na ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya.” (Job Stress and Burnout) Ime onwe anyị ka anyị ghara inwekwa ume site n’ịchụso ihe mgbaru ọsọ a na-apụghị irute bụ n’ezie imeso onwe anyị ihe n’egosighị ebere, ọ na-emesịkwa napụ anyị obi ụtọ.

Na-emeso Onwe Gị Ezi Ihe

Cheta: “Onye na-emeso mkpụrụ obi ya ezi ihe ka onye ebere bụ.” (Ilu 11:17) Anyị na-emeso onwe anyị ezi ihe mgbe anyị setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ ezi uche dị na ha bụ́ ndị a pụrụ irute, na-eburu n’uche na Chineke obi ụtọ ahụ, bụ́ Jehova, maara ebe ike anyị ruru. (Abụ Ọma 103:​8-⁠14) Obi ga-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị onwe anyị kwa amata ịkpa ókè ndị a wee “na-anụ ọkụ n’obi,” na-adabere n’ike anyị nile, iji mezuo ibu ọrụ anyị nile nke ọma.​—⁠Ndị Hibru 4:11; 2 Timoti 2:15; 2 Pita 1:10.

Otú ọ dị, a na-enwe mgbe nile ihe ize ndụ nke ịga ná nsọtụ nke ọzọ​—⁠imere onwe anyị ebere karị. Echezọla nzaghachi Jisọs nye aro onyeozi Pita tụrụ, “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị,” mgbe, n’ezie, a chọrọ ọrụ site ná mkpebi siri ike. Echiche Pita dị ize ndụ nke ukwuu nke na Jisọs sịrị: “Gaa n’azụ m, Setan: ị bụ ihe na-eme ka m maa n’ọnyà: n’ihi na ị dịghị atụkwasị uche gị n’ihe Chineke, kama ọ bụ n’ihe mmadụ.” (Matiu 16:​22, 23) Imeso mkpụrụ obi anyị ezi ihe adịghị enye ohere maka ehighị aka n’anya, àgwà ichebigara onwe onye echiche ókè. Nke ahụ pụkwara ịnapụ anyị obi ụtọ nile. Ezi echiche, ọ bụghị ịnụbiga ọkụ n’obi ókè, bụ ihe dị anyị mkpa.​—⁠Ndị Filipaị 4:5.

Na-emeso Ndị Ọzọ Ezi Ihe

Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii n’ụbọchị Jisọs yiri ka ha chere na ha maara ọrụ ma nwee nhazi n’ụzọ dị elu. Banyere ụzọ ofufe ha, A Dictionary of the Bible na-ekwu, sị: “E ji usoro irighiri ụkpụrụ nduzi gbaa ihe ọ bụla e nyere n’iwu na Bible gburugburu. E nyeghị ohere ọ bụla maka ọnọdụ ndị na-agbanwe agbanwe; nrubeisi zuru ezu nye Iwu ahụ n’akụkụ ya nile bụ ihe a chọrọ n’enweghị ngọpụ ọ bụla n’aka onye Juu ọ bụla . . . A mụbara okwu iwu dị iche iche ruo mgbe okpukpe ghọrọ azụmahịa, ndụ bụrụkwa ibu arọ a na-apụghị ibuli ebuli. E wedara ụmụ mmadụ ala ịbụ ígwè ọrụ nkịtị nke omume. A pịnyụrụ ụda olu nke akọ na uche; ike ndụ nke okwu Chineke ahụ bụ nke e mere ka ọ ghara ịdị ike, werekwa ọtụtụ iwu na-enweghị ọgwụgwụ menyụọ ya.”

Ka a sịkwa ihe mere Jisọs Kraịst ji katọọ ha n’ihi nke a. “Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu,” ka o kwuru, “tụkwasị ha n’ubu mmadụ; ma ha onwe ha achọghị iji otu mkpịsị aka ha wezụga ha.” (Matiu 23:4) Ndị okenye na-ahụ n’anya na-ezere ibokwasị ìgwè atụrụ ahụ ibu arọ site n’ịmụba ụmụ irighiri ụkpụrụ iwu na ụkpụrụ nduzi. Ha na-emeso ìgwè atụrụ Chineke ezi ihe site n’ịgbaso ihe nlereanya obi ọma, nke na-enye ume ọhụrụ, nke Kraịst Jisọs.​—⁠Matiu 11:​28-⁠30; Ndị Filipaị 2:​1-⁠5.

Ọbụna mgbe ibu ọrụ nke ime nhazi mụbara, ndị okenye na-enye nlekọta agaghị echezọ eziokwu ahụ bụ na ha na-emeso ndị mmadụ ihe​—⁠ndị Chineke hụrụ n’anya. (1 Pita 5:2, 3, 7; 1 Jọn 4:​8-⁠10) Ọ dịghị mgbe ha ga-eji ọrụ n’aka n’ọrụ ma ọ bụ usoro ime nhazi nke na ha ga-echezọ ọkwá ha bụ isi dị ka ndị na-azụ atụrụ, ndị nlekọta, na ndị nchebe nke ìgwè atụrụ ahụ.​—⁠Ilu 3:3; 19:22; 21:21; Aịsaịa 32:​1, 2; Jeremaịa 23:​3, 4.

Dị ka ihe atụ, itinyebiga uche ókè n’usoro ime ihe na ndekọ ọnụ ọgụgụ, pụrụ ime ka e chezọọ ichebara ndị mmadụ echiche. Chee echiche banyere onye na-anya bọs nke chere na ọrụ ya bụ isi bụ ịgbaso usoro ime njem ya nke ọma n’agbanyeghị ihe merenụ. Ọchịchọ isi n’otu ebe ọ na-agbaru ruo n’ebe nke ọzọ ọ na-agbaru n’oge e nyere kpọmkwem pụrụ irikpu ya. N’ụzọ dị mwute, n’echiche nke ya, ndị njem bụ ihe mgbochi. Ha adịghị eme ihe ngwa ngwa, a hazighịkwa ha ahazi, na-erutekwa n’azụ oge n’ebe bọs na-akwụsị kpọmkwem mgbe ọ na-achọ ịpụ. Kama icheta na isi ihe dum dị n’ọrụ ya bụ ije ozi maka mkpa nke ndị njem, ọ na-ahụ ha dị ka ihe mgbochi nye ịrụ ọrụ ya dị ka onye maara ọrụ, wee na-ezere ha.

Ichebara Onye Ọ Bụla Echiche

Ọchịchọ enweghị ọmịiko maka ime ihe dị ka onye maara ọrụ na-emekarị ka e leghara mkpa ndị mmadụ anya. A pụrụ ịhụ ndị na-adịghị ike karị, ndị na-amaghị ọrụ, dị ka ihe ndọghachi azụ. Mgbe nke a mere, ihe ndị dị njọ pụrụ ibilite. Dị ka ihe atụ, n’obodo oge ochie nke Grik bụ Sparta, a na-ekpughepụ ụmụaka na-adịghị ike ma na-arịa ọrịa ka ha nwụọ. Ha agaghị abụ ndị soja siri ike, maara ọrụ, bụ́ ndị ga-echebe obodo siri ike, nke maara ọrụ. “Mgbe a mụrụ nwa,” ka onye ọkà ihe ọmụma ụwa bụ Bertrand Russell kwuru, “nna ya na-ekute ya n’ihi ndị okenye ezinụlọ ya ka e nyochaa ya: ọ bụrụ na ahụ siri ya ike, a na-enyeghachi ya nna ya ka ọ zụọ; ma ọ dịghị otú ahụ, a na-atụnye ya n’olulu mmiri miri emi.”​—⁠History of Western Philosophy.

Ikwesi olu ike na ịkpọ obi nkụ, ọ bụghị obi ụtọ, na-esite n’ọnọdụ obi ọjọọ dị otú a. (Tụlee Eklisiastis 8:9.) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị ọchịchị Sparta chere na ha na-eme nke ọma n’akụkụ nke ịma ọrụ, ma akparamagwa ha egosighị ọmịiko ma ọ bụ obi ọma ọ bụla. Ụzọ ha abụghị ụzọ Chineke. (Abụ Ọma 41:1; Ilu 14:21) N’ụzọ dị iche, ndị nlekọta n’ọgbakọ ndị Kraịst na-echeta na atụrụ nile nke Chineke dị oké ọnụ n’anya ya, na-emesokwa nke ọ bụla n’ime ha ezi ihe. Ha na-eche ọ bụghị nanị maka 99 ndị nwere ahụ ike kamakwa maka otu nke na-adịghị ike ma ọ bụ nke nwere nsogbu mmetụta uche.​—⁠Matiu 18:​12-⁠14; Ọrụ 20:28; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:​14, 15; 1 Pita 5:7.

Nọrọ Ìgwè Atụrụ ahụ Nso

Ndị okenye na-anọ ígwè atụrụ ha na-elekọta anya nso. Otú ọ dị, nnyocha ndị ọgbara ọhụrụ banyere ụzọ azụmahịa pụrụ ịtụ aro na ka e wee rụọ ọrụ n’ụzọ kasị mma onye nwe ọrụ ma ọ bụ onye nlekọta kwesịrị ịkpapụtụ ndị ọ na-elekọta iche. Otu onye nnyocha kọwara ihe dị iche iche otu onye agha ụgbọ elu nwetara mgbe ọ nọ ndị nọ n’okpuru ya nso ma ọ bụ mgbe ọ nọpụrụ iche site n’ebe ha nọ: “Mgbe o so ndị ọrụ [ya] nwee mmekọrịta chiri anya, ha yiri ka ha na-anọ ná ntụkwasị obi karị wee ghara ịdị na-echegbu onwe ha karị maka ịdị irè nke ngalaba ha dị iche iche. Ozugbo ọ nọpụụrụ onwe ya karị ma na-eleru ihe anya karị, ndị nlekọta nọ n’okpuru ya na-amalite ichegbu onwe ha ma ọ̀ dị ihe na-agahie . . . wee na-etinye nchegbu ha nile n’ilerukwu anya n’ọrụ ha. N’ihi ya, e nwere ịrị elu pụtara ihe n’ịrụ ọrụ nke ọma n’ìgwè ndị agha ahụ.”​—⁠Understanding Organizations.

Otú ọ dị, ọgbakọ ndị Kraịst abụghị nzukọ ndị agha. Ndị okenye ndị Kraịst na-elekọta ọrụ ndị ọzọ na-eme onwe ha ka ha yie Jisọs Kraịst. Ọ nọ ndị na-eso ụzọ ya nso mgbe nile. (Matiu 12:​49, 50; Jọn 13:​34, 35) Ọ dịghị mgbe o jiri nchegbu ha gwurie egwu iji mee ka ha rụkwuo ọrụ nke ọma karị. O wulitere nkekọ ndị siri ike nke ya na ndị na-eso ụzọ ya inwerịta nchegbu na ntụkwasị obi otu onye n’ebe ibe ya nọ. Nkekọ chiri anya ndị siri ike nke mmetụta dị nro ka e ji mara ndị na-eso ụzọ ya. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:​7, 8) Mgbe e nwere ịdị nso dị otú a, ìgwè atụrụ obi dị ụtọ, nke ịhụnanya maka Chineke kwaliri n’ụzọ zuru ezu, ga-azaghachi nke ọma ná nduzi n’abụghị ná mmanye, ha ga-emekwa ihe nile ha nwere ike ime n’iji obi ha jeere ya ozi.​—⁠Tụlee Ọpụpụ 35:21.

Ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ na-akọwapụta ọtụtụ àgwà ndị Kraịst ndị dị ka obi ụtọ na ịhụnanya maka òtù ụmụnna. (Matiu 5:3-⁠12; 1 Ndị Kọrint 13:​1-⁠13) Ná ntụnyere, nanị ole na ole kọwapụtara mkpa nke ịrụ ọrụ dị ka onye maara ọrụ. O doro anya na e nwere mkpa maka ezi nhazi. Ndị Chineke abụwo mgbe nile ndị a haziri ahazi. Ma, dị ka ihe atụ, chee echiche ọtụtụ ugbo ndị so dee abụ ọma si kọwaa ndị na-ejere Chineke ozi dị ka ndị nwere obi ụtọ. Abụ Ọma nke 119, nke kwuru ọtụtụ ihe banyere iwu, ihe ncheta, na ụkpụrụ nile nke Jehova, na-amalite, sị: “Ndị ihe na-agara nke ọma [“obi ụtọ,” NW] ka ndị zuru okè n’ụzọ Jehova bụ, ndị na-ejegharị n’iwu Jehova. Ndị ihe na-agara nke ọma [“obi ụtọ,” NW] ka ndị na-echebe ihe àmà ya nile bụ, ndị na-ewere obi ha nile chọọ ya.” (Abụ Ọma 119:​1, 2) Ị̀ pụrụ iru ihe ịma aka nke ịbụ ma onye nwere nhazi na onye obi ụtọ?

[Foto dị na peeji nke 28]

“Armillary sphere”​—⁠ihe ọrụ oge gboo e ji anọchite anya oké ihe dị okirikiri nile nke eluigwe

[Foto dị na peeji nke 31]

Jehova, dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ na-ahụ n’anya, abụghị nanị Chineke nke usoro kamakwa nke obi ụtọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Garo Nalbandian

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya