-
Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ka Ị Ghara Ịkwụsị Ịmụ Baịbụl?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 12
Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ka Ị Ghara Ịkwụsị Ịmụ Baịbụl?
Ịmụ Baịbụl bara uru. Ma, ọ naghị adịcha mfe mgbe niile. Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịna-eche ma ọ̀ ga-adịkwara gị mfe ịmụrụ Baịbụl na-aga. Gịnị mere o ji bụrụ na mbọ ọ bụla ị gbara ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl efughị ọhịa? Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ịmụ ya n’agbanyeghị na ọ dịchaghị mfe?
1. Gịnị mere ịmụ Baịbụl ji baa uru?
Baịbụl sịrị na “okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” (Ndị Hibru 4:12) Baịbụl bara uru n’ihi na o kwuru ihe Chineke na-eche gbasara gị, kwuokwa na Chineke hụrụ gị n’anya. Baịbụl na-akụziri gị ọtụtụ ihe ma na-eme ka ndụ gị ka mma. Ọ na-emekwa ka i nwee olileanya. Nke ka nke bụ na ọ ga-enyere gị aka ka ị bụrụ enyi Jehova. Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl, ọ ga-eme ka ị na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ.
2. Gịnị mere ịmara uru Baịbụl bara ji dị mkpa?
Eziokwu ndị dị na Baịbụl yiri akụ̀ bara ezigbo uru. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị, sị: “Zụta eziokwu, erekwala ya.” (Ilu 23:23) Ọ bụrụ na anyị ana-echeta mgbe niile na eziokwu dị na Baịbụl bara uru, anyị ga-agba mbọ na-amụ ihe mgbe niile, ọ bụrụgodị na e nwere ihe ndị na-eme ka o siere anyị ike.—Gụọ Ilu 2:4, 5.
3. Olee otú Jehova ga-esi nyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl?
Ebe ọ bụ na Jehova, onye kere ihe niile na onye pụrụ ime ihe niile, bụ enyi gị, ọ chọrọ inyere gị aka ka ị mụta gbasara ya. O nwere ike ime ka ‘i nwee mmasị ime ihe, nyekwa gị ike i ji eme ya.’ (Gụọ Ndị Filipaị 2:13.) N’ihi ya, mgbe ọ bụla ọ dị gị ka ị gaghị amụli ihe ma ọ bụ na ị gaghi emeli ihe ị mụtara, o nwere ike inyere gị aka. O nwere ike inyekwu gị ume ga-enyere gị aka ịna-amụ Baịbụl n’agbanyeghị mmegide ma ọ bụ ihe ọ bụla na-eme ka o siere gị ike ịmụ ya. Na-arịọ Jehova mgbe niile n’ekpere ka o nyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl.—1 Ndị Tesalonaịka 5:17.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe ga-eme ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl a sịgodị na ị naghị enwe ohere ma ọ bụ na ndị ọzọ na-enye gị nsogbu ka ị kwụsị ịmụ ya. Chọpụta otú Jehova ga-esi nyere gị aka ka ị mụrụ ya na-aga.
4. Mee ka ọmụmụ ihe gị bụrụ ihe kacha gị mkpa
Mgbe ụfọdụ, mere nke a mere nke ọzọ nwere ike mee ka o yie ka anyị enweghịzi ohere anyị ga-eji na-amụ Baịbụl. Ma, gịnị nwere ike inyere anyị aka? Gụọnụ Ndị Filipaị 1:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee ụfọdụ ihe ndị i chere “ka mkpa” ná ndụ?
Olee otú ị ga-esi gosi na Baịbụl ị na-amụ bụ ihe kacha gị mkpa?
Ọ bụrụ na ị wụnye ájá na bọket ma tinyewe okwute na ya, okwute ndị ahụ agaghị aba
Ma ọ bụrụ na i tinyechaa okwute ndị ahụ na bọket tupu wụnyewe ya ájá, ọ ga-afọ obere ka ájá ahụ niile banyechaa na ya. Otú ahụ ka ọ ga-adịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ “ihe ndị ka mkpa” ka ị na-ebu ụzọ eme ná ndụ gị. Ị ga-emecha ha, nweekwa ohere ị ga-eji eme ihe ndị ọzọ
Ịmụ Baịbụl ga-eme ka anyị mara Chineke ma na-efe ya, si otú ahụ gosi na anyị ma na ọ bụ ya kwesịrị ịna-eduzi anyị. Gụọnụ Matiu 5:3. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee uru anyị ga-erite ma anyị mee ka ịmụ Baịbụl buru ihe kacha anyị mkpa?
5. Na-amụ Baịbụl ọ bụrụgodị na a na-emegide gị
Mgbe ụfọdụ, ndị ọzọ nwere ike ime ihe ga-eme ka ị kwụsị ịmụ Baịbụl. Chọpụta otú udị ihe ahụ si mee Francesco. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Na vidio a, gịnị ka ndị enyi Francesco na mama ya mere mgbe ọ gwara ha ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl?
Olee uru o ritere maka na ọ kwụsịghị ịmụ Baịbụl?
Gụọnụ 2 Timoti 2:24, 25. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú obi dị ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị gbasara ihe ị na-amụ?
Olee ihe ebe a kwuru i kwesịrị ime ma e nwee onye obi na-adịghị mma maka na ị na-amụ Baịbụl? Maka gịnị?
6. Tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere gị aka
Ka anyị na-abịarukwu Jehova nso, ime ihe dị ya mma ga na-agụkwu anyị agụụ. Ma, ọ ka nwere ike ịna-esitụrụ anyị ike ịhapụ ihe na-adịghị mma anyị na-eme ma mewe ihe dị ya mma. Mgbe ọ bụla o siiri gị ike otú ahụ, ike agwụla gị. Jehova ga-enyere gị aka. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Na vidio a, olee ihe ndị Jim kwụsịrị ime iji mee ihe dị Jehova mma?
Gịnị masịrị gị n’akụkọ ya?
Gụọnụ Ndị Hibru 11:6. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka Jehova ga-emere ndị “na-achọsi ya ike,” ya bụ, ndị na-agbasi mbọ ike ka ha mata ya, na-emekwa ihe dị ya mma?
Gịnị ka ihe a na-akụziri gị gbasara otú obi na-adị Jehova ma ọ hụ mbọ ị na-agba ịmụ Baịbụl?
MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere i ji na-amụ Baịbụl.
Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?
NCHỊKỌTA
Ịmụ Baịbụl mgbe niile anaghị adịcha mfe, ma ịmụ ya nwere ike ime ka ị na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Jehova ga-akwụ gị ụgwọ ma ị tụkwasị ya obi mgbe niile.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Gịnị mere na i jighị eziokwu ndị dị na Baịbụl egwu egwu?
Ebe ọ bụ na ‘ị chọpụtala ihe ndị ka mkpa,’ gịnị ka i kwesịrị ime?
Gịnị mere i kwesịrị iji na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị ịmụ Baịbụl?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe anọ nyeerela ọtụtụ ndị aka iji oge ha na-eme ihe bara uru.
“Otú Ị Ga-esi Jiri Oge Gị Na-eme Ihe Bara Uru” (Teta!, Febụwarị 2014)
Chọpụta otú Jehova si nyere otu nwaanyị aka mgbe di ya na-aghọtaghị ihe mere o ji kpebie ife Chineke.
Chọpụta uru otu nwoke ritere maka na nwunye ya tachiri obi.
Ndị mmadụ na-ekwu na Ndịàmà Jehova na-eme ka iro dịrị n’ezinụlọ. Ihe a ha na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu?
“Ndịàmà Jehova Hà Na-etisa Ezinụlọ Ka Ha Na-eme Ka Ezinụlọ Dịrị n’Udo?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)
-
-
Otú Anyị Ga-esi Na-ekpebi Ime Ihe Dị MmaNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 35
Otú Anyị Ga-esi Na-ekpebi Ime Ihe Dị Mma
Anyị niile nwere ihe dị iche iche anyị kwesịrị ikpebi. Ọtụtụ n’ime mkpebi ndị a nwere ike ịbara anyị uru ma ọ bụ ghọọ anyị ahịa. Ha nwekwara ike ime ka anyị na Jehova dịrị ná mma ma ọ bụkwanụ gharazie ịdị ná mma. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ikpebi ebe anyị ga-ebi, ihe anyị ga-eji na-akpa afọ anyị, ma ànyị ga-alụ di ma ọ bụ ma ànyị ga-alụ nwaanyị. Ikpebi ihe dị mma nwere ike ime ka anyị na-enwe obi ụtọ ma na-eme ihe Jehova chọrọ.
1. Olee otú Baịbụl nwere ike isi nyere gị aka ịna-ekpebi ihe dị mma ị ga-eme?
Tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme, rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Mụọkwa Baịbụl ka ị mata otú o si ele ihe ị chọrọ ikpebi anya. (Gụọ Ilu 2:3-6.) Mgbe ụfọdụ, Jehova na-enye iwu kwuru hoo haa ihe a ga-eme. Ọ dị otú a, ihe kacha mma ị ga-eme bụ ime ihe ahụ o kwuru.
Ma, gịni ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na e nweghị iwu doro anya dị na Baịbụl kwuru ihe ị ga-eme? Jehova ka ga-enyere gị aka ịma ‘ụzọ i kwesịrị iso.’ (Aịzaya 48:17) Olee otú ọ ga-esi enyere gị aka? Ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nwere ike inyere gị aka. Ihe ndị a Baịbụl kwuru bụ eziokwu ndị na-enyere anyị aka ịmata otú Chineke si ele ihe anya na otú o si eche echiche. Ọtụtụ mgbe, anyị na-amata otú Chineke si ele otu ihe anya ma anyị gụọ ebe ụfọdụ na Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị achọpụta otú Jehova si ele ihe anya, ọ ga-enyere anyị aka ikpebi ihe ga-adị ya mma.
2. Olee ihe ndị i kwesịrị ichebara echiche tupu i kpebie ihe ị ga-eme?
Baịbụl sịrị na “onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.” (Ilu 14:15) Ihe a pụtara na tupu anyị ekpebie ihe ọ bụla, anyị kwesịrị ịnọdụ ala chebara ya echiche. Ka ị na-echebara ya echiche, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe Baịbụl kwuru ga-enyere m aka ịma ihe m ga-eme? Olee ihe m ga-ekpebi ga-eme ka obi ruo m ala? Olee otú ihe a m chọrọ ikpebi ga-esi gbasa ndị ọzọ? Nke ka nke, ihe a m chọrọ ikpebi, ọ̀ ga-eme Jehova obi ụtọ?’—Diuterọnọmi 32:29.
Jehova nwere ikike ịgwa anyị ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na anyị amara iwu Chineke na ihe ndị o kwuru na Baịbụl, kpebiekwa ịna-eme ha, anyị si otú ahụ azụ akọnuche anyị. Akọnuche bụ ihe Chineke kenyere anyị n’ahụ́ nke na-agwa anyị ihe dị mma na ihe na-adịghị mma. (Ndị Rom 2:14, 15) Anyị ga na-ekpebi ihe dị mma ma ọ bụrụ na anyị azụọ akọnuche anyị nke ọma.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụtakwuo otú ihe dị iche iche Baịbụl kwuru nakwa akọnuche anyị si enyere anyị aka ma e nwee ihe anyị chọrọ ikpebi.
3. Kwere ka Baịbụl nyere gị aka mgbe ị chọrọ ikpebi ihe
Olee otú ihe dị iche iche Baịbụl kwuru nwere ike isi nyere anyị aka ikpebi ihe? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka Jehova hapụrụ anyị ka anyị na-emere onwe anyị?
Gịnị mere Jehova ji hapụ anyị ka anyị na-ekpebiri onwe anyị ihe anyị ga-eme?
Olee ihe o nyere anyị ga-enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe ga-akacha baara anyị uru?
Unu chọọ ịhụ otu n’ime ihe ndị Baịbụl kwuru nwere ike ịbara anyị uru, gụọnụ Ndị Efesọs 5:15, 16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’otú unu ga-esi ‘jiri oge unu na-eme ihe kacha mkpa’ n’ihe gbasara . . .
ịna-agụchi Baịbụl anya.
ịbụ ezigbo di ma ọ bụ ezigbo nwunye, ịbụ ezigbo nne ma ọ bụ ezigbo nna, nakwa ịbụ ezigbo nwa.
ịna-aga ọmụmụ ihe.
4. Zụọ akọnuche gị ka o nyere gị aka ịna-ekpebi ime ihe dị mma
O nwere ike ịdịrị anyị mfe ịma ihe anyị ga-eme n’ihe ndị Baịbụl nyere iwu a kapịrị ọnụ gbasara ha. Ma, gịnị ka anyị ga-eme ma a bịa n’ihe ndị Baịbụl na-enyeghị iwu ọ bụla gbasara ha? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee ihe ndị nwanna nwaanyị anyị lere na vidio a mere iji zụọ akọnuche ya na iji kpebie ihe ga-eme Jehova obi ụtọ?
Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịgwa ndị ọzọ ka ha kpebiere anyị ihe anyị kwesịrị ikpebi? Gụọnụ Ndị Hibru 5:14. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Ọ bụ eziokwu na ịhapụ ndị ọzọ ka ha kpebiere anyị ihe nwere ike yie ihe dị mfe ime, gịnị ka anyị kwesịrị ịmata n’onwe anyị?
Olee ihe ndị anyị nwere, ndị ga-enyere anyị aka ịna-azụ akọnuche anyị ka anyị nwee ike ịna-ekpebi ime ihe dị mma?
Akọnuche anyị na-enyere anyị aka ikpebi ihe dị mma otú ahụ map na-enyere mmadụ aka ikpebi ụzọ ọ ga-esi
5. Hapụ ndị ọzọ ka ha mee ihe akọnuche ha gwara ha
Ihe otu onye kpebiri ime nwere ike ịdị iche n’ihe onye ọzọ kpebiri ime. Olee otú anyị ga-esi hapụ ndị ọzọ ka ha mee ihe akọnuche ha gwara ha? Chegodị gbasara ihe atụ abụọ a:
Ihe atụ nke mbụ: Otu nwanna nwaanyị itecha ntecha na-amasị gafere ọgbakọ ọzọ ma chọpụta na itecha ntecha na-ewe ọtụtụ ụmụnna nwaanyị nọ na ya iwe.
Gụọnụ Ndị Rom 15:1 na 1 Ndị Kọrịnt 10:23, 24. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka nwanna nwaanyị ahụ nwere ike ikpebi ime n’ihi ihe amaokwu ndị a kwuru? Olee otú ị ga-esi eme ihe amaokwu ndị a kwuru ma ọ bụrụ na akọnuche onye gị na ya nọ anabataghị ya ime ihe ndị akọnuche gị nabatara gị ime?
Ihe atụ nke abụọ: Otu nwanna kpebiri na ya agaghị na-aṅụ mmanya na-aba n’anya n’agbanyeghị na ọ ma na Baịbụl ekwughị na ịṅụru ya n’ókè bụ ihe ọjọọ. Ma mgbe ọ gara otu oriri, ọ hụrụ ụmụnna ndị ọzọ ka ha na-aṅụ mmanya na-aba n’anya.
Gụọnụ Ekliziastis 7:16 na Ndị Rom 14:1, 10. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ị ga-esi eme ihe amaokwu ndị a kwuru ma ọ bụrụ na ị hụ ka ndị ọzọ na-eme ihe akọnuche gị na-anabataghị?
Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe dị mma?
1.Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ikpebi ihe ị ga-eme.—Jems 1:5.
2.Mee nchọnchọ na Baịbụl nakwa n’akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ka ị mata ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ahụ ị chọrọ ikpebi. I nwekwara ike ịjụ Ndị Kraịst ma nke a na-akọ ihe ha chere.
3.Chee gbasara ihe ihe ahụ ị chọrọ ikpebi nwere ike ime akọnuche gị nakwa akọnuche ndị ọzọ.
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na i kwesịrị ime ihe ọ bụla ị chọrọ ime n’ihi na o nweghị onye ihe ị na-eme gbasara.
Gịnị mere anyị kwesịrị iji chee gbasara otú ihe anyị chọrọ ime ga-adị Chineke na ndị ọzọ?
NCHỊKỌTA
Ihe ga-eme ka anyị kpebie ihe dị mma bụ ibu ụzọ chọpụta otú Jehova ga-esi ele ihe ahụ anya, cheekwa ma ihe ahụ ọ̀ ga-abara ndị ọzọ uru ka ọ̀ ga-emebiri ha ihe.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe ndị na-amasị Jehova?
Olee otú ị ga-esi zụọ akọnuche gị?
Olee otú ị ga-esi gosi na ị na-ahapụ ndị ọzọ ka ha mee ihe akọnuche ha gwara ha?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Gịnị ka anyị ga-eme ka ihe ndị anyị na-ekpebi ime mee ka anyị na Chineke dịrịkwuo ná mma?
“Mee Mkpebi Ndị Na-ewetara Chineke Otuto” (Ụlọ Nche, Eprel 15, 2011)
Chọpụtakwuo otú Jehova si akụziri anyị ihe.
Chọpụta ihe ndị nyeere otu nwoke aka ikpebi otu ihe siiri ya ike ikpebi.
Chọpụtakwuo otú anyị nwere ike isi mee ihe dị Jehova mma mgbe ọ na-enyeghị iwu a kapịrị ọnụ gbasara otu okwu.
“Iwu Bible Ọ̀ Dị Gị Mkpa n’Ihe Nile?” (Ụlọ Nche, Disemba 1, 2003)
-