Ịchọ Akụ̀ Zoro Ezo
NA 1848 a chọtara ọlaedo n’Ogige Ịkwọ Osisi nke Sutter dị na California, U.S.A. Ka ọ na-erula 1849, ọtụtụ puku mmadụ na-enubata n’ebe ahụ na-enwe olileanya ịba ọgaranya ngwa ngwa, ọchịchọ inweta ọlaedo nke kasị ukwuu e nwere n’akụkọ ihe mere eme nke United States ebiriwo ọkụ. N’ime otu afọ, ọdụ ụgbọ mmiri kasị nso, bụ́ San Francisco, sitere n’otu obere obodo ghọọ nnukwu obodo nke 25,000 mmadụ bi n’ime ya. Olileanya nke inweta akụ na ụba na mberede ghọrọ ihe ndọrọ dị ike.
Eze Solomọn nke Israel oge ochie maara otú ụmụ mmadụ na-esi eji ike ha nile egwu ala maka akụ̀ zoro ezo, o zokwara aka na nke a mgbe o dere, sị: “Ee, ọ bụrụ na ọ bụ mmata ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.”—Ilu 2:3-5.
Ị pụrụ iji ọlaedo na ọlaọcha mee ọtụtụ ihe, ma ị pụrụ iji mmata na nghọta mee ọtụtụ ihe karị. Ndị a ga-enyere gị aka ime mkpebi ziri ezi, dozie nsogbu, nwee ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye, ma nweta obi ụtọ. (Ilu 2:11, 12) N’otu aka ahụ, ezi ihe ọmụma na amamihe ga-enyere gị aka ịmara Onye Okike gị, ghọta nzube ya nile, rubekwara ya isi ma na-eme ihe na-atọ ya ụtọ. Ọlaedo apụghị inye gị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a.
Ihe Bible kwuru bụ eziokwu: “Amamihe bụ ndò dị ka ego bụ ndò, ma abamuru nke ihe ọmụma bụ nke a: na amamihe na-echebe ndụ nke onye nwe ya.” (Eklisiastis 7:12, New International Version) Ọ bụ ezie na ọtụtụ na-arọ nrọ ịba ọgaranya na mberede, lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya karị imepe Bible ma gwupụta nghọta, mmata, ihe ọmụma, na amamihe, ndị bụ ezi akụ na ụba.