Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 1/15 p. 10-14
  • Ihe Ọmụma Chineke Dị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Mkpa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ọmụma Chineke Dị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Mkpa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ihe Ọmụma Chineke”
  • Owuwe Ihe Ubi Hiri Nne!
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Akwụkwọ Ọhụrụ Na-eme Ka Ihe Ọmụma Chineke Pụta Ìhè
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Inweta Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Inweta Ihe Ọmụma Ugbu a na Ruo Mgbe Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 1/15 p. 10-14

Ihe Ọmụma Chineke Dị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Mkpa

“Ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.”—ILU 2:5.

1. Gịnị mere a pụrụ iji kwuo na obi mmadụ bụ nkà ọrụ injinia magburu onwe ya nke Chineke?

IHE dị ka 5,600,000,000 obi mmadụ na-eti n’elu ala ugbu a. Kwa ụbọchị, obi gị na-eti 100,000 ugboro, na-asụpụtakwa ihe hà ka 7,600 lita nke ọbara banye n’usoro jikọtara obi na akwara bụ́ nke dị 100,000 kilomita. Ọ dịghị uru ahụ ọzọ nke na-arụsi ọrụ ike karịa nkà nke a nke ọrụ injinia Chineke.

2. Olee ụzọ ị ga-esi akọwa obi ihe atụ?

2 E nwekwara 5,600,000,000 obi ihe atụ na-arụ ọrụ n’elu ala. N’obi ihe atụ ka mmetụta uche anyị, nkwali anyị, na ọchịchọ anyị nile na-ebi. Ọ bụ isi iyi nke echiche anyị, nghọta anyị, ọchịchọ anyị. Obi ihe atụ pụrụ ịdị mpako ma ọ bụ dị umeala, nwee mgbarụ ihu ma ọ bụ nwee ihu ọchị, gbaa ọchịchịrị ma ọ bụ nwee ìhè.—Nehemaịa 2:2; Ilu 16:5; Matiu 11:29; Ọrụ 14:17; 2 Ndị Kọrint 4:6; Ndị Efesọs 1:16-18.

3, 4. Olee ụzọ e si eji ozi ọma ahụ erute n’obi dị iche iche?

3 Jehova Chineke pụrụ ịmata ihe dị n’obi mmadụ. Ilu 17:3 na-asị: “Ite e ji anụcha ihe dịịrị ọlaọcha, oké ọkụ dịkwaara ọlaedo: ma Onye na-anwa obi bụ Jehova.” Otú ọ dị, kama nanị ịmata ihe dị n’obi ọ bụla ma na-ekpe ikpe, Jehova na-eji Ndịàmà ya eme ihe n’iji ozi ọma ahụ erute n’obi ndị mmadụ. Nke a kwekọrọ n’okwu Pọl onyeozi, bụ́: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya. Hà ga-esikwa aṅaa kpọkuo Onye ahụ ha a ka ekweghị na Ya? ma hà ga-esi aṅaa kwere n’Onye ahụ ha a ka anụghị okwu Ya? ma hà ga-esi aṅaa nụ ma onye nkwusa anọghị? ma hà ga-esi aṅaa kwusaa, ma ọ bụrụ na e zigaghị ha? dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu, bụ́ ụkwụ ndị na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe!”—Ndị Rom 10:13-15.

4 Ọ masịwo Jehova izipụ Ndịàmà ya gaa n’akụkụ nile nke ụwa ‘izisa ozi ọma nke ezi ihe’ na ịchọta ndị nwere obi na-anabata ihe. Anyị dị ugbu a ihe karịrị 5,000,000—nkezi nke 1 Onyeàmà nye ihe dị ka 1,200 mmadụ n’elu ala. Iji ozi ọma ahụ ruo ọtụtụ ijeri ndị bi n’ụwa adịghị mfe. Ma Chineke na-atụzi ọrụ a site na Jisọs Kraịst, onye na-adọtakwa ndị nwere obi eziokwu. Ya mere, amụma e dekọrọ n’Aịsaịa 60:22 na-aghọ eziokwu: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: Mụ onwe m, Jehova ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.”

5. Gịnị bụ ihe ọmụma, gịnịkwa ka a pụrụ ikwu banyere amamihe ụwa?

5 Ugbu a bụ oge ahụ, otu ihe dokwara anya—ihe ọmụma dị ijeri ndị bi n’ụwa mkpa. N’ụzọ bụ isi, ihe ọmụma bụ ịmata ihe ndị bụ ezie a mụtara site n’ahụmahụ, nkiri anya, ma ọ bụ ọmụmụ ihe. Ụwa akwakọbawo ihe ọmụma dị ukwuu. E nwewo ọganihu n’akụkụ ndị dị ka ime njem, nlekọta ahụ ike, na nzirịta ozi. Ma ọ̀ bụ ihe ọmụma ụwa dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa n’ezie? Ọ dịghị ma ọlị! Agha, mmegbu, ọrịa, na ọnwụ anọgidewo na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti. Amamihe ụwa abụwo ọtụtụ mgbe ihe na-adịghị akwụ otu ebe.

6. N’ihe banyere ọbara, olee ụzọ ihe ọmụma Chineke si dị iche n’amamihe ụwa?

6 Iji maa atụ: Na narị afọ abụọ gara aga, ọ bụ omenala ịmịpụ ọbara dị ka ihe e chere na ọ bụ ọgwụgwọ ọrịa. A mịpụrụ ọbara George Washington, onye isi ala mbụ nke United States, ọtụtụ ugboro n’ime hour ndị ikpeazụ nke ndụ ya. N’otu mgbe ọ sịrị: “Hapụ m ka m nwụọ n’udo; apụghị m ịnọte aka.” O kwuru eziokwu, n’ihi na ọ nwụrụ n’ụbọchị ahụ kpọmkwem—December 14, 1799. Taa, kama ịmịpụ ọbara, a na-emesi ịmịnye ọbara n’ime ahụ mmadụ ike. Usoro abụọ ahụ ejupụtawo ná nsogbu ndị na-eweta ọnwụ. Otú ọ dị, n’oge ndị a nile, Okwu Chineke ekwuwo, sị: “Ka unu hapụ . . . ọbara.” (Ọrụ 15:29) Ihe ọmụma Chineke ziri ezi mgbe nile, bụrụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi, ọ dịkwa irè ruo n’oge a.

7. Olee ụzọ ezi ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ si dị iche n’amamihe ụwa n’ihe banyere ịzụ nwa?

7 Tụlee ihe atụ ọzọ nke amamihe ụwa a na-ejighị n’aka. Ruo ọtụtụ afọ, ndị ọkà mmụta akparamàgwà mmadụ akwadowo ịzụlite ụmụaka ime ihe masịrị ha, ma otu n’ime ndị nkwado ya mesịrị kweta na nke a bụ mmehie ihe. Òtù Edemede na Asụsụ nke Germany n’otu mgbe kwuru na ime ihe masịrị onye bụ “ma ọ dịkarịa ala ihe so kpata nsogbu anyị na-enweta ugbu a site n’aka ndị na-eto eto.” Amamihe ụwa pụrụ ịdị na-aṅagharị ihu na azụ dị ka ihe ikuku na-ebugharị, ma ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ ziri ezi anọgidewo bụrụ ihe a na-apụghị ịkwagharị akwagharị. Bible na-enye ndụmọdụ a haziri nke ọma n’ụzọ e si azụlite nwata. “Dọọ nwa gị aka ná ntị, ọ ga-emekwa ka i zuru ike; ee, ọ ga-enye mkpụrụ obi gị ihe ụtọ,” ka Ilu 29:17 na-ekwu. A ga-enye ụdị ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ n’ịhụnanya, n’ihi na Pọl dere, sị: “Ndị bụ́ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”—Ndị Efesọs 6:4.

“Ihe Ọmụma Chineke”

8, 9. Olee ụzọ ị ga-esi akọwa ihe Ilu 2:1-6 na-ekwu banyere ihe ọmụma nke dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa n’ezie?

8 Ọ bụ ezie na Pọl bụ onye gụrụ akwụkwọ, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eche na ya bụ onye maara ihe n’etiti unu n’oge a, ya ghọọ onye nzuzu, ka o wee ghọọ onye maara ihe. N’ihi na amamihe nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.” (1 Ndị Kọrint 3:18, 19) Nanị Chineke pụrụ inye ihe ọmụma dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa n’ezie. Banyere ya, Ilu 2:1-6 na-asị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ịtọrọ amamihe ntị gị n’ala, wee wezụga obi gị inwe nghọta; ee, ọ bụrụ na ọ bụ mmata ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị; ọ bụrụkwa na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta. N’ihi na Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ Ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta.”

9 Ndị ezi obi kwaliri na-arịba amamihe ama site n’iji ihe ọmụma Chineke na-enye eme ihe nke ọma. Ha na-ewezụga obi ha inwe nghọta, jiri nlezianya na-atụle ihe ndị ha na-amụta. N’ụzọ dị otú a, ha na-akpọku nghọta, ma ọ bụ ikike nke ịhụ otú akụkụ dị iche iche nke otu isiokwu si emetụta ibe ha. Ndị obi ha ziri ezi na-arụ ọrụ dị ka ha na-egwupụta ọlaọcha ma na-achọ akụ̀ zoro ezo. Ma gịnị bụ oké akụ̀ nke ndị nwere obi na-anabata ihe na-enweta? Ọ bụ “ihe ọmụma nke Chineke.” Gịnị ka nke ahụ bụ? Ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ bụ ihe ọmụma nke a na-achọta n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.

10. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nwee ahụ ike ime mmụọ?

10 Ihe ọmụma Chineke dị mma, na-adịgide adịgide, na-enye ndụ. Ọ na-akwalite ahụ ike ime mmụọ. Pọl gbara Timoti ume, sị: “Jide [usoro, NW] nke okwu na-enye ezi ndụ nke ị nụrụ n’ọnụ m, n’ime okwukwe na ịhụnanya nke dị n’ime Kraịst Jisọs.” (2 Timoti 1:13, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Asụsụ nwere usoro okwu. N’otu aka ahụ, “asụsụ dị ọcha” nke eziokwu Akwụkwọ Nsọ nwere “usoro nke okwu na-enye ezi ndụ,” ndị dabeere n’ụzọ bụ isi n’isiokwu Bible nke iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta site n’Alaeze ahụ. (Zefanaịa 3:9, NW) Ọ dị anyị mkpa iburu usoro nke a nke okwu na-enye ezi ndụ n’uche na n’obi. Ọ bụrụ na anyị ga-ezere ọrịa obi nke ihe atụ ma nọgide n’ahụ ike ime mmụọ, anyị aghaghị itinye Bible n’ọrụ ná ndụ anyị, na-ejikwa ihe ime mmụọ ndị Chineke na-ewepụta site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” eme ihe n’ụzọ zuru ezu. (Matiu 24:45-47; Taịtọs 2:2) Ka anyị na-echeta mgbe nile na iji nwee ezi ahụ ike ime mmụọ, ihe ọmụma Chineke dị anyị mkpa.

11. Gịnị bụ ụfọdụ ihe mere ihe ọmụma Chineke ji dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa?

11 Tụlee ihe ndị ọzọ mere ihe ọmụma Chineke ji dị ọtụtụ ijeri ụmụ mmadụ bi n’elu ụwa mkpa. Ha nile hà maara ụzọ ụwa na ụmụ mmadụ si bịa dịrị? Ee e, ha amaghị. Ihe nile a kpọrọ mmadụ hà maara ezi Chineke ahụ na Ọkpara ya? Mmadụ nile hà maara banyere ihe iseokwu nke Setan welitere gbasara ọbụbụeze Chineke na iguzosi ike n’ezi ihe nke ụmụ mmadụ? Ọzọkwa, ee e. Ndị mmadụ n’ozuzu ha hà maara ihe mere anyị ji na-aka nká, na-anwụkwa anwụ? Ọzọkwa, anyị ga-azarịrị ee e. Ihe nile bi n’ụwa hà maara na Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a nakwa na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ? Hà maara banyere ndị mmụọ ọjọọ? Ihe nile a kpọrọ mmadụ hà nwere ihe ọmụma a pụrụ ịtụkwasị obi banyere ụzọ a pụrụ isi nwee ndụ ezinụlọ nwere obi ụtọ? Ọzọkwa, ìgwè ihe a kpọrọ mmadụ hà maara na ndụ ọṅụ n’ime Paradaịs bụ nzube Onye Okike maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi? Azịza nye ajụjụ ndị a nile bụkwa ee e. Ya mere, n’ụzọ doro anya, ihe ọmụma Chineke dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa.

12. Olee ụzọ anyị pụrụ isi fee Chineke “n’ime mmụọ na eziokwu”?

12 Ihe ọmụma Chineke dịkwa ihe a kpọrọ mmadụ mkpa n’ihi ihe Jisọs kwuru n’ekpere n’anyasị ikpeazụ nke ndụ elu ala ya. Ọ ghaghị ịbụ na o metụwo ndị ozi ya n’ahụ ịnụ ka o kwuru, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Itinye ihe ọmụma dị otú ahụ n’ọrụ bụ nanị ụzọ anyị pụrụ isi fee Chineke n’ụzọ ọ na-anara. “Chineke bụ Mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye Ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu,” ka Jisọs kwuru. (Jọn 4:24) Anyị na-efe Chineke “n’ime mmụọ” mgbe obi nke jupụtara n’okwukwe na ịhụnanya kwaliri anyị. Olee ụzọ anyị si efe ya ‘n’eziokwu’? Site n’ịmụ Okwu ya na ife ya dị ka eziokwu ya e kpughere ekpughe—“ihe ọmụma Chineke”—si dị.

13. Olee otu ihe merenụ nke e dekọrọ n’Ọrụ 16:25-34, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na ya?

13 Ọtụtụ puku na-amalite ife Jehova kwa afọ. Ma, ọ̀ bụ iwu na a ga-eduziri ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible ruo ogologo oge, ka ọ̀ ga-ekwe omume ka ndị nwere obi eziokwu ruo ngwa ngwa n’ọnọdụ ime baptism? Ọ dị mma, tụlee ihe mere n’ọnọdụ onye nche ụlọ mkpọrọ na ezinụlọ ya nke e hotara n’Ọrụ 16:25-34. A tụworị Pọl na Saịlas mkpọrọ na Filipaị, ma n’etiti abalị, oké ala ọma jijiji meghere ụzọ nke ụlọ mkpọrọ ahụ. N’ihi iche na ndị nile nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ agbalagawo nakwa na a ga-ata ya ahụhụ nke ukwuu, onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ na-achọ igbu onwe ya mgbe Pọl gwara ya na ha nile nọ n’ebe ahụ. Pọl na Saịlas wee “gwa ya okwu Onyenwe anyị, ya na ndị nile nọ n’ụlọ ya.” Onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ na ezinụlọ ya bụcha ndị Jentaịl na-enweghị nzụlite ọ bụla nke Akwụkwọ Nsọ. Ma, n’otu abalị ahụ, ha ghọrọ ndị kwere ekwe. Tụkwasị na nke ahụ, “e wee mee ya baptism, ya onwe ya na ndị ya nile.” Ndị ahụ bụ ọnọdụ ndị a na-adịghị ahụkarị, ma a na-akụziri ndị ọhụrụ eziokwu ndị bụ isi, ha na-amụtakwa ihe ndị ọzọ ná nzukọ ọgbakọ. Ihe yiri nke ahụ kwesịrị ikwe omume taa.

Owuwe Ihe Ubi Hiri Nne!

14. N’ihi gịnị ka e ji nwee mkpa iduzi ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ọmụmụ Bible dị irè n’oge ka mkpirikpi?

14 Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na Ndịàmà Jehova pụrụ iduzi ọnụ ọgụgụ dị ukwuu karị nke ọmụmụ Bible dị irè n’oge ka mkpirikpi. E nwere ezi mkpa maka nke a. Dị ka ihe atụ, ná mba ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, a na-edenye aha ụmụ mmadụ n’akwụkwọ ndị na-echere maka ọmụmụ Bible. Otu ihe ahụ dịkwa n’ebe ndị ọzọ. N’otu obodo dị na Dominican Republic, Ndịàmà ise nwere ọtụtụ ndị chọrọ ọmụmụ ihe nke na ha apụghị iduzi ọmụmụ ihe ahụ nile. Gịnị ka ha mere? Ha gbara ndị nwere mmasị ume ịbịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma debanye aha n’akwụkwọ ndepụta ndị na-echere maka ọmụmụ Bible. Ọnọdụ dị otú ahụ dị n’ọtụtụ ebe gburugburu ụwa.

15, 16. Gịnị ka e nyeworo iji gbasaa ihe ọmụma Chineke ngwa ngwa karị, gịnịkwa bụ eziokwu ụfọdụ banyere ya?

15 Ókèala ndị buru ibu—ubi dị ukwuu maka owuwe ihe ubi—na-emeghepụrụ ndị Chineke. Ọ bụ ezie na Jehova, “Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ,” na-ezipụkwu ndị ọrụ, a ka nwere ọtụtụ ihe a ga-eme. (Matiu 9:37, 38) Ya mere, iji gbasaa ihe ọmụma Chineke ngwa ngwa, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” ewepụtawo ihe nke na-enye ihe ọmụma bụ isi n’ụzọ dị nkenke ka ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible wee nwee ọganihu ime mmụọ n’ihe ọmụmụ ọ bula. Ọ bụ mbipụta ọhụrụ nke a pụrụ ịmụzu ngwa ngwa n’ọmụmụ Bible ebe obibi—ma eleghị anya n’ọnwa ole na ole. Ọ pụkwara ịdị mfe iburu ya n’akpa anyị, pọọsụ anyị, ma ọ bụ ọbụna n’akpa uwe anyị! Ọtụtụ narị puku ndị zukọrọ ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” nke Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ ịnata akwụkwọ ọhụrụ nke a dị 192 peji a kpọrọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.

16 Ndị edemede n’ala dị iche iche kwadebere ihe nke e ji nlezianya chịkọta ọnụ maka akwụkwọ Ihe Ọmụma. Ya mere o kwesịrị ịdọrọ mmasị ndị si mba nile. Ma ọ̀ ga-adị anya tupu e wepụta akwụkwọ ọhụrụ nke a n’asụsụ ndị mmadụ gburugburu ụwa? Ee e, n’ihi na a pụrụ ịsụgharị akwụkwọ dị 192 peji ngwa ngwa karịa akwụkwọ ndị ka ukwuu. Ka ọ na-erule October 1995, Kọmitii Ihe Odide nke Òtù Na-achị Isi akwadowo ka a sụgharịa akwụkwọ a site na Bekee gaa n’ihe karịrị 130 asụsụ.

17. Ihe ndị dị aṅaa ga-eme ya ka ọ dị mfe iji akwụkwọ Ihe Ọmụma eme ihe?

17 Isi ihe ndị dị n’isiakwụkwọ ọ bụla nke akwụkwọ Ihe Ọmụma kwesịrị inyere ndị a na-eduziri ọmụmụ ihe aka inwe ọganihu ime mmụọ dị ngwa. Akwụkwọ ahụ na-ewepụta eziokwu Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ na-ewuli elu. Ọ dịghị ekwu ọtụtụ okwu banyere ozizi ụgha. Ido anya nke asụsụ na nkọwapụta ya nwere ezi izu kwesịrị ime ya ihe dị mfe iji akwụkwọ a duzie ọmụmụ Bible ma nyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe ọmụma Chineke. E wezụga akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e hotara, e nwere akụkụ Bible ndị a rụtụrụ aka nke onye a na-eduziri ọmụmụ ihe pụrụ ịkwadebe maka nkwurịta okwu ahụ. A pụrụ ịgụ ndị a n’oge ọmụmụ ihe ahụ dị ka oge kwere, ọ bụ ezie na ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị ya iwebata ihe ndị ọzọ ndị pụrụ ime ka isi ihe ndị ahụ ghara ido anya. Kama, ndị na-eduzi ọmụmụ Bible kwesịrị ịgbalị ịghọta na ịkọwara onye a na-eduziri ọmụmụ ihe ihe akwụkwọ ahụ na-anwapụta n’isiakwụkwọ ọ bụla. Nke a pụtara na onye nkụzi ahụ aghaghị ịmụ ihe nke ọma, ka isi ihe ndị dị na ya wee doo anya nke ọma n’uche ya.

18. Aro ndị dị aṅaa ka a tụrụ banyere iji akwụkwọ Ihe Ọmụma mee ihe?

18 Olee ụzọ akwụkwọ ahụ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi pụrụ isi mee ka ọrụ ime ndị na-eso ụzọ gaa ngwa ngwa? A pụrụ ịmụcha akwụkwọ nke a dị 192 peji na nwa oge nta, “ndị e doro ịnata ndụ ebighị ebi” kwesịkwara inwe ike ịmụta ihe zuru ezu site n’ọmụmụ ya iji mee nraranye nye Jehova, e wee mee ha baptism. (Ọrụ 13:48) Ya mere ka anyị jiri akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ mee ihe nke ọma n’ozi anyị. Ọ bụrụ na onye a na-eduziri ọmụmụ Bible agatewo aka n’ịmụ akwụkwọ ọzọ, ọ pụrụ ịbụ ihe ezi uche dị na ya ịmụcha ya. Ma ọ bụghị otú ahụ, a na-atụ aro ka ọmụmụ Bible gafere n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Mgbe a mụchara mbipụta ọhụrụ nke a, a dịghị atụ aro ka a malite ịmụrụ onye ahụ a na-eduziri ihe akwụkwọ ọzọ. Ndị natara eziokwu pụrụ ime ka ihe ọmụma ha zuo ezu site n’ịbịa nzukọ nke Ndịàmà Jehova nakwa site n’ịgụ Bible na mbipụta ndị Kraịst dị iche iche n’onwe ha.—2 Jọn 1.

19. Tupu a malite iduzi ọmụmụ ihe n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, gịnị mere o ji bụrụ ihe enyemaka ịtụleghachi peji nke 175 ruo 218 n’akwụkwọ Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị?

19 Ebumnuche e ji dee akwụkwọ Ihe Ọmụma bụ inyere mmadụ aka ịza ajụjụ nile ndị okenye na-eso ndị nkwusa a na-emebeghị baptism, bụ́ ndị chọrọ ka e mee ha baptism dị ka Ndịàmà Jehova, tụleghachi. Ya mere, tupu ị gbanweere ndị ị na-eduziri ọmụmụ Bible akwụkwọ banye ná mbipụta ọhụrụ nke a, a na-atụ aro ka i jiri hour ole na ole tụleghachi peji nke 175 ruo 218 nke akwụkwọ bụ́ Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị.a Nke a ga-enyere gị aka imesi azịza nye ajụjụ ndị ahụ ike n’oge ọmụmụ Bible n’ime akwụkwọ Ihe Ọmụma.

20. Gịnị ka ị na-eme atụmatụ iji akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi eme?

20 Ndị mmadụ n’ebe nile kwesịrị ịnụ ozi ọma ahụ. Ee, ihe ọmụma Chineke dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa, Jehova nwekwara Ndịàmà ya ime ka a mara ya. Ugbu a anyị nwere akwụkwọ ọhụrụ nke Nna anyị nke eluigwe nyeworo site n’aka ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche. Ị̀ ga-eji ya eme ihe iji zie eziokwu ma weta nsọpụrụ nye aha nsọ Jehova? Obi abụọ adịghị ya na Jehova ga-agọzi gị ka ị na-etinye mgbalị ọ bụla ime ka ọtụtụ nweta ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?

◻ Olee otú ị ga-esi kọwaa obi ihe atụ?

◻ Gịnị bụ ihe ọmụma Chineke?

◻ N’ihi gịnị ka ihe ọmụma Chineke ji dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa?

◻ Akwụkwọ ọhụrụ dị aṅaa ka e nwere, oleekwa ụzọ i si eme atụmatụ iji ya eme ihe?

[Foto dị na peeji nke 11]

E nwere ọtụtụ ihe mere ihe ọmụma Chineke ji dị ọtụtụ ijeri ndị bi n’ụwa mkpa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya