Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g21 nke 3 p. 14-15
  • Gịnị Mere Ịmata ma È Nwere Onye Kere Ihe Niile Ji Dị Mkpa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Ịmata ma È Nwere Onye Kere Ihe Niile Ji Dị Mkpa?
  • Teta!—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị ga na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ
  • Ị ga-enweta ezigbo ndụmọdụ ndị ga na-abara gị uru kwa ụbọchị
  • Ị ga-amata azịza ajụjụ ndị ị na-ajụ
  • Ị ga-enwe olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu
  • Chineke Ọ̀ Dị? Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịma ma Ọ̀ Dị?
    Teta!—2015
  • Olee Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Baịbụl Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Baịbụl Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Malite Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2021
g21 nke 3 p. 14-15
Ebe mmadụ atọ na-ele anụmanụ ndị nọ n’elu osisi.

Gịnị Mere Ịmata ma È Nwere Onye Kere Ihe Niile Ji Dị Mkpa?

Gịnị mere ịmata azịza ajụjụ a ji dị mkpa? Ọ bụrụ na ihe ndị a e kwurula emeela ka i kweta na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile dị adị, o nwere ike ịbụ na ị ga-achọ ileba anya n’ihe ndị gosiri na o ji mmụọ nsọ ya mee ka e dee Baịbụl. Ọ bụrụkwa na i kweta na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu, lee uru ndị ị ga-erite:

Ị ga na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ

IHE BAỊBỤL KWURU: “[Chineke] na-eme ka mmiri si n’eluigwe zooro unu, na-eme ka mkpụrụ unu kụrụ na-amị n’oge ya n’uju, na-enye unu nri hiri nne, na-emekwa ka unu na-enwe obi ụtọ.”​—Ọrụ Ndịozi 14:17.

IHE Ọ PỤTARA: Ihe niile dị n’ụwa a ndị na-eme ka ndụ na-atọ gị ụtọ bụ onyinye si n’aka Onye kere ihe niile. Obi ga na-atọkwu gị ụtọ maka onyinye ndị a ma ị mata na Onye nyere gị ha ji gị kpọrọ ihe.

Ị ga-enweta ezigbo ndụmọdụ ndị ga na-abara gị uru kwa ụbọchị

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ị ga-aghọta ihe bụ́ ezi omume na ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ, ya bụ, ihe niile dị mma mmadụ kwesịrị ịna-eme.”​—Ilu 2:9.

IHE Ọ PỤTARA: Ebe ọ bụ Chineke kere gị, ọ ma ihe ndị ga na-eme gị obi ụtọ. Ọ bụrụ na ị mụọ Baịbụl, ị ga-amụta ihe ndị ga-abara gị uru ugbu a.

Ị ga-amata azịza ajụjụ ndị ị na-ajụ

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ị ga-amụtakwa banyere Chineke.”​—Ilu 2:5.

IHE Ọ PỤTARA: Ị mata na e nwere Onye kere ihe niile, ị ga-enwe ike ịmata azịza ajụjụ ndị dị ka: Gịnị ka o bu n’obi kee mmadụ? Gịnị mere ahụhụ ji ju ebe niile? Gịnị na-eme anyị ma anyị nwụọ? Ị ga-ahụ azịza ajụjụ ndị a na Baịbụl.

Ị ga-enwe olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu

IHE BAỊBỤL KWURU: “Jehova kwuru, sị, ‘Ama m nnọọ ihe m na-echere unu. Ọ bụ ka udo dịrị unu, ọ bụghị ka ọdachi dakwasị unu. M chọrọ ka ihe dịrị unu ná mma n’ọdịnihu nakwa ka unu nwee olileanya.’”​—Jeremaya 29:11.

Lee vidio ndị a na jw.org: Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu? nakwa Uche Ònye Ka E Dere na Baịbụl? Ị ga-ahụ ha ma ị gaa n’ebe a na-achọ ihe na jw.org. Denye “Baịbụl na-ekwu eziokwu” ma ọ bụ “onye e dere uche ya na Baịbụl.”

IHE Ọ PỤTARA: Chineke kwere nkwa na ọ ga-eme ka ihe ọjọọ, ahụhụ, na ọnwụ kwụsị n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na obi esie gị ike na nkwa ndị Chineke kwere ga-emezu, ọ ga-eme ka i jiri obi ike na-edi nsogbu ndị na-abịara gị kwa ụbọchị.

Uru ụfọdụ ndị riterela n’ihi na ha kweere na e nwere onye kere ihe niile

Cyndi.

“Ọ na-atụ m n’anya ma m hụ ọtụtụ ụzọ Chineke si enyere anyị aka ná ndụ. Ọ na-enyere anyị aka ịma ihe ndị anyị ga-ebute ụzọ ná ndụ, otú anyị ga-esi na-edozi esemokwu, na otú anyị ga-esi bụrụ enyi ya.”​—Cyndi. O bi n’Amerịka.

Elise.

“Ndụ m dị na-atọ m ezigbo ụtọ n’ihi na m kweere na Chineke. Ikwere na Chineke na-eme ka ike ghara ịna-agwụ m n’ihi na e nwere ọtụtụ ọmarịcha ihe ndị m ga-amụtakwu banyere ya, banyere ihe ndị o kere, nakwa banyere Okwu ya.” ​—Elise. O bi na Frans.

Peter.

“Ime ihe Onye kere anyị na-akụziri anyị na Baịbụl na-eme ka m na-enwekwu obi ụtọ. Ọ na-eme ka m ghara ịna-akatọkarị ndị ọzọ, ka m na-echebakwuru ndị ọzọ echiche, nakwa ka ihe m nwere na-ejukwu m afọ. O nyekwarala m aka ịbụ ezigbo nna.”​—Peter. O bi na Nedalandz.

Liz.

“N’oge mbụ, m na-ebi ndụ gbalụ gbalụ. Naanị ihe m na-eme bụ iri nri, ihi ụra, na ịgba mbọ ka m ruo n’ebe m na-arụ ọrụ n’oge. Ndụ anaghị atọ m ụtọ mgbe ahụ. Ma ugbu a, achọpụtala m na ndụ bụ onyinye mara ezigbo mma. Anyị kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ ma jiri ya kpọrọ ihe.”​—Liz. O bi n’Estonia.

Adrien.

“M na-echegbukarị onwe m. Ma ịmara na e nwere mgbe ihe ọjọọ, mmegbu, na ahụhụ ga-akwụsị na-enyere m aka.”​—Adrien. O bi na Frans.

Ị chọọ ịmata otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị dị mkpa ná ndụ, lee vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya