Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 12/15 p. 30
  • Ị̀ Na-echeta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-echeta?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Gbalịa Ịdị Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ọ Mụtara Ihe n’Ihe Ndị O Mejọrọ
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Mụtara Ihe n’Ihe Ndị O Mejọrọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 12/15 p. 30

Ị̀ Na-echeta?

Ịgụ mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche ọ̀ tọwo gị ụtọ? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-amasị gị icheta ihe ndị a na-esonụ:

◻ N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike ná ndị Jehova họọrọ iduzi ndị ya?

Jehova na-ahọrọ ndị mmadụ maka ibu ọrụ ụfọdụ bụ́ ndị nwere àgwà ndị dị mkpa iji duzie ndị ya n’ụzọ ọ chọrọ ka ha gaa n’otu oge kpọmkwem.—8/15, peji nke 14.

◻ Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ Jona?

Jona chere banyere onwe ya gabiga ókè, cheekwa banyere ndị ọzọ n’ụzọ dị nnọọ nta. Anyị pụrụ ịmụta ihe n’aka Jona site n’ịghara idebe onwe anyị na mmetụta onwe onye anyị n’ọnọdụ mbụ.—8/15, peji nke 19.

◻ N’ụzọ dị aṅaa ka a pụrụ isi kwuo na “ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ”? (Ilu 18:10)

Ịgbaba n’aha Chineke na-egosipụta ịtụkwasị Jehova obi. (Abụ Ọma 20:1; 122:4) Ọ pụtara ịkwado ọbụbụeze ya, ịkwalite iwu na ụkpụrụ ya nile, inwe okwukwe ná nkwa ya, na inye ya ofufe a na-ekewaghị ekewa. (Aịsaịa 50:10; Ndị Hibru 11:6)—9/1, peji nke 10.

◻ Olee otú ụzọ Pọl si gbaa àmà n’ihu ndị oké ozu si bụrụ ihe nlereanya nye anyị?

N’ịgwa Eze Agrịpa okwu, Pọl jiri akọ mee ihe, na-emesi isi ihe ndị ya na Agrịpa kwekọrọ ọnụ ike. N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị imesi akụkụ ndị dị mma nke ozi ọma ahụ ike, na-ekwusi okwu ike banyere olileanya ndị anyị na ndị mmadụ nwekọrọ ọnụ. (1 Ndị Kọrint 9:22)—9/1, peji nke 31.

◻ Olee ndị na-erite uru site na ndidi Jehova?

N’ihi ndidi Jehova, taa a na-enyekwu ọtụtụ nde ohere ịbụ ndị a zọpụtara ‘n’ụbọchị Jehova’ na-abịanụ. (2 Pita 3:9-15) Ndidi ya na-enyekwa onye ọ bụla n’ime anyị ohere ‘iwere egwu na ịma jijiji rụpụta nzọpụta nke onwe anyị.’ (Ndị Filipaị 2:12)—9/15, peji nke 20.

◻ Olee ókè nsụgharị Bible Septuagint baruru n’uru?

Nsụgharị a keere òkè n’ụzọ pụtara ìhè n’ịgbasa ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na Alaeze ya, nakwa Jisọs Kraịst dị ka Eze ya. Site na Septuagint ahụ, a tọrọ ntọala bara uru maka ndị Juu na ndị Jentaịl na-asụ asụsụ Grik na narị afọ mbụ ịnakwere ozi ọma Alaeze ahụ.—9/15, peji nke 30.

◻ Gịnị ka ilu banyere nwa mmefu ahụ na-akụziri anyị banyere Chineke?

Nke mbụ, na Jehova bụ onye “nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 34:6) Nke abụọ, na ọ bụ “onye na-agbaghara mmehie” mgbe mgbanwe obi na-enye ihe ndabere maka ime ebere. (Abụ Ọma 86:5)—10/1, peji nke 12, 13.

◻ Olee mgbe a ga-emezu ọnọdụ udo ahụ e kwere nkwa ya n’Aịsaịa 65:21-25?

Dị ka ndị na-efe Jehova n’ịdị n’otu n’ime paradaịs ime mmụọ taa, ndị ahụ e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ahụ nọ ugbu a na-enweta udo nke Chineke na-enye. (Jọn 10:16) Udo dị otú ahụ ga-adịrịkwa banye n’ime Paradaịs nkịtị, mgbe ‘a ga-eme ihe Chineke na-achọ n’ụwa nile, ọbụna dị ka e si eme ya n’eluigwe.’ N’oge ahụ okwu Aịsaịa onye amụma ga-emezu n’ụzọ zuru ezu. (Matiu 6:10)—10/15, peji nke 24.

◻ N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ji eme ememe mgbaafọ agbamakwụkwọ ma ha anaghị eme ememe ụbọchị ọmụmụ?

Bible adịghị egosi alụmdi na nwunye dị ka ihe n’ezighị ezi. Ma ndị Kraịst hà họọrọ ime ememe mgbaafọ agbamakwụkwọ bụ kpam kpam okwu aka ha, n’ichetaghachi ọṅụ nke ihe omume ahụ nakwa ná mkpebi ha ịrụ ọrụ maka ihe ịga nke ọma dị ka di na nwunye. Otú ọ dị, nanị ememe ncheta ọmụmụ ndị e dekọrọ na Bible bụ nke ndị ọgọ mmụọ, e jikọtakwara ha na ihe atụ dị iche iche nke obi ọjọọ.—10/15, peji nke 30, 31.

◻ N’ihe atụ Pọl nke e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 3:12, 13, gịnị ka “ọkụ” ahụ na-anọchite anya ya, gịnịkwa ka ndị Kraịst nile kwesịrị ịmara?

Ọ dị ọkụ anyị nile na-eche ihu ná ndụ—ule nke okwukwe anyị. (Jọn 15:20; Jemes 1:2, 3) A ga-anwale onye ọ bụla anyị na-akụziri eziokwu. Ọ bụrụ na anyị akụzie ihe n’ụzọ na-erijughị afọ, ọ pụrụ ịrụpụta ihe ndị dị mwute, dị ka Pọl dọrọ aka ná ntị. (1 Ndị Kọrint 3:15)—11/1, peji nke 11.

◻ Olee otú Noa ‘na Chineke si yịkọọ na-ejegharị’? (Jenesis 6:9)

Noa na Chineke yịkọrọ na-ejegharị n’echiche nke na o mere ihe Chineke gwara ya mee. N’ihi ịrara ndụ ya nye ime uche Chineke, Noa nwere mmekọrịta na-ekpo ọkụ, nke chiri anya n’ebe Chineke nọ.—11/15, peji nke 10.

◻ Ohere ndị dị aṅaa ghere oghe nye anyị n’ihi amaghị kpọmkwem oge maka ịbọ ọ́bọ̀ Chineke n’isi ndị ajọ omume?

Nke a na-enye anyị ohere igosi na anyị hụrụ Jehova n’anya n’ezie ma chọọ ijegharị n’ụzọ ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ na-egosikwa na anyị na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke ma tụkwasị obi n’ụzọ o si edozi okwu. Ọzọkwa, nke a na-enye aka ime ka anyị nọrọ na nche ma mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ. (Matiu 24:42-44)—11/15, peji nke 18.

◻ Gịnị ka inwe okwukwe “n’aha Ọkpara Chineke” pụtara? (1 Jọn 5:13)

Nke a pụtara irube isi n’ihe nile Kraịst nyere n’iwu, gụnyere iwu ya nke ‘ịhụrịta ibe anyị n’anya.’ (Jọn 15:14, 17) Ịhụnanya na-achọ imere ndị ọzọ ihe ọma. Ọ na-ewepụ ajọ mbunobi nile nke agbụrụ, okpukpe, na nke ọha na eze.—12/1, peji nke 6.

◻ N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji bụrụ ndị ‘a kpọrọ asị’? (Matiu 10:22)

A kpọwo Ndịàmà Jehova asị n’ụzọ na-ezighị ezi n’ihi otu ihe ahụ mere e ji kpagbuo ndị Kraịst oge mbụ. Nke mbụ, Ndịàmà Jehova na-eme ihe kwekọrọ na nkwenkwe okpukpe ha n’ụzọ mere ka ụfọdụ ghara inwe mmasị n’ebe ha nọ. Nke abụọ, ha abụwo ndị e boro ebubo ụgha dị iche iche—ụgha ndị pụtara ìhè na nkọwa ndị a hịgharịrị ahịgharị nke nkwenkwe ha.—12/1, peji nke 14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya