Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 2/1 p. 19
  • “Ụlọ Elu Dị Ike Ka Aha Jehova Bụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ụlọ Elu Dị Ike Ka Aha Jehova Bụ”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ha Ka Dị Ndụ!
  • Ikike nke Ekpere
  • Dabere Na Mmụọ Chineke N’ime Ihe Banyere Mgbanwe Ndị A Na-enwe Ná Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • “Kụziere M Ime Uche Gị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Jehova—‘Onye Na-emere Ndị Ya Ụzọ Mgbapụ’ n’Oge Baịbụl
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Mmehie Eze Devid Mere
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 2/1 p. 19

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

“Ụlọ Elu Dị Ike Ka Aha Jehova Bụ”

ANYỊ na-ebi n’oge ndị a na-ejighị n’aka. Ndụ anyị nke yiri ihe e ji n’aka pụrụ ịgbanwe n’otu abalị, na mberede kwa ụfọdụ achọtawo onwe ha n’oke nsogbu tupu ha amara ihe na-emenụ. Ihe ize ndụ pụrụ ịbịa site n’ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye mwakpo na-eme ihe ike, ọdachi meere onwe ya, ma ọ bụ ajọ ọrịa. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, olee ebe onye Kraịst pụrụ ichigharịkwuru mgbe ndụ ya nọ n’ihe ize ndụ?

David, onye ozi ala ọzọ nke bi n’otu n’ime alaka nke Watch Tower Society mụtara azịza nye ajụjụ ahụ site n’otu ahụmahụ na-atụ ụjọ. Dị ka onye na-akwọ ụgbọ ala, ọ pụrụ n’otu isi ụtụtụ ije bute ndị ọrụ Betel na-agba moto abịa (ndị ọrụ na-ebighị n’ime alaka). Ọchịchịrị ka gbara. O butewo Rosalía wee na-agafe ụlọ ọrụ ndị uwe ojii mgbe ọ nụrụ ụda égbè nke mbụ.

Ihe meziri ngwa ngwa. Ọ nụrụ ụda nke ihe yiri nnukwute egbu ọkụ wee chọpụta na ikuku si n’otu n’ime taya ya na-apụ. Na mberede ọ hụrụ onye soja nke guzo n’etiti ụzọ ma tụdo ya égbè n’ihu. Ihe atọ mere n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’otu mgbe ahụ: Ọtụtụ mgbọ égbè gbajasịrị akụkụ ụgbọ Jeep ahụ, gbarisịa window ya; David na Rosalía hulatara ala; onye soja ahụ gbara égbè n’enyo ihu moto otú ọ ga-esi nweta isi mmadụ.

Ka a nọ na-awụ ụgbọ Jeep ahụ mgbọ, David jiri breki ruo n’ókè ọ pụrụ ime ka ọ ka hulatakwara ala. Ma David ma Rosalía chere na ha gaje ịnwụ. Ha kpekuru Jehova ekpere n’olu dara ụda, na-arịọ ya ka o lekọta ha. Rosalía kwuru n’ikpeazụ na ya nọ na-eche n’oge ndị ahụ otú ezinụlọ ya ga-esi meghachi omume mgbe ha nụrụ banyere ọnwụ ya!

Ha Ka Dị Ndụ!

Ụda égbè na mgbawasị nke enyo mesịrị kwụsị, David wee leruo Rosalía anya. Mgbe ọ hụrụ otu ntakịrị ntụpọ ọbara n’azụ ya, ụjọ tụrụ ya nke ukwuu. Ma otu mpekere enyo nke fepụrụ, ọ bụghị mgbọ égbè liri onwe ya n’ebe ahụ. Ikpere Rosalía na-agba ọbara n’ebe ndị enyo na-adakasị adakasị merụrụ ya ahụ, ma e wezụga nke ahụ o yiri ka ọ dịghị ihe mere ya.

Ndị ikom yi uwe agha ndị kere ákwà ọcha bịara n’ebe ụgbọ Jeep ahụ nọ wee gwa ha ka ha chịlie aka elu wee pụta. Otu n’ime ha nke yiri ka ọ ka ndị ọzọ n’ọkwá legidere otu onye soja anya wee sị: “A gwara unu ka unu ghara ịgba ndị nkịtị égbè.” Onye soja ahụ mere ngọpụ ụfọdụ na-asị na ya nụrụ ụda égbè ụfọdụ wee chee na o sitere n’ụgbọ Jeep ahụ.

Mgbe David mere ka a mata ya na Rosalía dị ka Ndịàmà Jehova, mmeghachi omume ha dị mma. Ọ kọwara ihe ọ nọ na-eme, ma ndị soja ahụ ka chọkwara ijide ha. O yiri ka ndị agha ụfọdụ hà chọrọ iweghara ọchịchị n’ike n’isi ụtụtụ ụbọchị ahụ, ndị soja ndị a na-achọkwa iweghara ụlọ ọrụ ndị uwe ojii mgbe David na Rosalía ji ụgbọ Jeep ahụ gafere.

Ụjọ tụrụ Rosalía nke ukwuu ma o ji obi ike nọrọ jụụ ka David nọ na-arịọ ka a hapụ ha. E mesịrị hapụ ha ka ha laa​—⁠n’ejighị ụgbọ Jeep ahụ. Ha gaje iji ụkwụ gaa n’okporo ámá dị nso wee gbaa bọs laghachi n’alaka, ebe ngalaba na-elekọta ndị ahụ na-adịghị lekọtara Rosalía.

Ikike nke Ekpere

David mụtara ihe site n’ahụmahụ ahụ​—⁠eledala ikike nke ekpere sitere n’ezi obi anya, echefukwala mgbe ọ bụla na mmadụ iji obi ike mee ka a mata ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova na-abụkarị ihe nchebe. Ọ pụrụ ịbụ eziokwu n’ụzọ nkịtị na “ulo elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọọ n’elu.”​—⁠Ilu 15:29; 18:10; Ndị Filipaị 4:6.

[Ebe e si nweta foto Dị na peeji 19]

Fotografía de Publicaciones Capriles, Caracas, Venezuela

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya