Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 3/15 p. 15-20
  • Jiri Nghọta Na Ime Ka Mmadụ Kwenye Na-ezi Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Nghọta Na Ime Ka Mmadụ Kwenye Na-ezi Ihe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Bụrụ Onye Na-ege Ntị nke Ọma
  • Abamuru nke Ịdị Mfe
  • Iji Ajụjụ Eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè
  • Ihe Atụ Ndị Na-eru n’Obi
  • Iji Nkà Na-agụ Akwụkwọ Nsọ
  • Ṅomie Onye Ozizi Ahụ Bụ́ Ọkà
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • “Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ na O Jighị Ihe Atụ”
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Jiri Ihe Atụ Na-akụzi Ihe
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • “Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ Na O Jighị Ihe Atụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 3/15 p. 15-20

Jiri Nghọta Na Ime Ka Mmadụ Kwenye Na-ezi Ihe

“Obi onye maara ihe na-eme ka ọnụ ya gosi nghọta, ọ na-etinyekwa ime ka mmadụ kwenye n’egbugbere ọnụ ya abụọ.”—ILU 16:23, NW.

1. N’ihi gịnị ka izi Okwu Chineke ji gụnye ihe karịrị nanị inye ihe ọmụma?

NZUBE anyị dị ka ndị ozizi nke Okwu Chineke abụghị nanị ime ka uche ndị anyị na-amụrụ ihe nwee ihe ọmụma kamakwa obi ha. (Ndị Efesọs 1:18) Ya mere izi ihe na-agụnye ihe karịrị nanị inye ihe ọmụma. Ilu 16:23 na-asị: “Obi onye maara ihe na-eme ka ọnụ ya gosi nghọta, ọ na-etinyekwa ime ka mmadụ kwenye n’egbugbere ọnụ ya abụọ.”

2. (a) Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ime ka mmadụ kwenye? (b) Olee otú ọ ga-esi ekwe ndị Kraịst nile omume ịbụ ndị ozizi na-eme ka mmadụ kwenye?

2 N’ezie Pọl onyeozi tinyere ụkpụrụ a n’ọrụ, n’ọrụ izi ihe ya. Mgbe ọ nọ na Kọrint, “ọ na-ekwukwa okwu n’ụlọ nzukọ ụbọchị izu ike nile n’otu n’otu, wee na-eme ka ndị Juu na ndị Grik kwenye.” (Ọrụ 18:4) Dị ka otu akwụkwọ sị kwuo, okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ ‘ime ka mmadụ kwenye’ pụtara “ime ka e nwee mgbanwe nke uche site ná mmetụta nke ntụgharị uche ma ọ bụ ntụle nke omume.” Site n’iji arụmụka ndị na-eme ka mmadụ kwenye mee ihe, Pọl kpaliri ndị mmadụ ịgbanwe nnọọ ụzọ ha si eche echiche. Ikike o nwere ime ka mmadụ kwenye dị nnọọ egwu nke na ndị iro ya tụrụ ya ụjọ. (Ọrụ 19:24-27) Otú o sina dị, izi ihe Pọl abụghị ngosipụta nke ikike mmadụ. Ọ gwara ndị Kọrint, sị: “Okwu m na ihe m kwusara abụghịkwa n’okwu amamihe, ime ka mmadụ kwenye, kama ha bụ ná ngosi nke Mmụọ Nsọ na nke ike: ka okwukwe unu wee ghara ịdị n’amamihe mmadụ, kama n’ike nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 2:4, 5) Ebe ndị Kraịst nile nwere enyemaka nke mmụọ Jehova Chineke, ha nile pụrụ ịghọ ndị ozizi na-eme ka mmadụ kwenye. Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ka anyị leba anya n’usoro izi ihe ụfọdụ dị irè.

Bụrụ Onye Na-ege Ntị nke Ọma

3. N’ihi gịnị ka nghọta ji dị mkpa mgbe anyị na-ezi ndị ọzọ ihe, oleekwa otú anyị pụrụ isi ruo n’obi nke onye a na-amụrụ Bible?

3 Usoro izi ihe mbụ na-agụnye, ọ bụghị ikwu okwu, kama ige ntị. Dị ka a rịbara ama n’Ilu 16:23, iji bụrụ ndị na-eme ka mmadụ kwenye anyị aghaghị inwe nghọta. N’ezie Jisọs ghọtara ndị o ziri ihe. Jọn 2:25 na-asị: “Ya onwe ya maara ihe dị n’ime mmadụ.” Ma olee otú anyị pụrụ isi mara ihe dị n’obi ndị anyị na-ezi ihe? Otu ụzọ bụ site n’ịbụ onye na-ege ntị nke ọma. Jemes 1:19 na-asị: “Ma ka mmadụ ọ bụla bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu.” N’eziokwu, ọ bụghị mmadụ nile na-adị njikere ikwupụta obi ha. Ka obi na-esi ndị anyị na-amụrụ Bible ike banyere ezi mmasị anyị nwere n’ebe ha nọ, ha pụrụ inwe mmasị karị ikwupụta ezi mmetụta ha. Ajụjụ ndị e ji obiọma na nghọta jụọ pụrụ inyere anyị aka mgbe mgbe iru n’obi ma ‘dọpụta’ okwu ndị dị otú ahụ.—Ilu 20:5.

4. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-aghaghị iji bụrụ ndị na-ege ntị nke ọma?

4 Ọ dị mkpa karịsịa na ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ga-abụ ndị na-ege ntị nke ọma. Nanị mgbe ahụ ka ha pụrụ n’ezie ‘ịmata otú ha na-aghaghị ịza mmadụ nile ọ bụla.’ (Ndị Kọlọsi 4:6) Ilu 18:13 na-adọ aka ná ntị, sị: “Onye na-azaghachi okwu tupu ọ nụ, uche gbagọrọ agbagọ na ọnọdụ ihere ka ọ bụụrụ ya.” N’otu oge ụmụnna nwoke abụọ nwere ezi ebumnobi nyere otu nwanna nwanyị ndụmọdụ banyere omume ụwa n’ihi na ọ bịaghị nzukọ ụfọdụ. O wutere nwanna nwanyị ahụ nke ukwuu na ha ajụghị ya ihe mere ọ na-ejibeghị bịa nzukọ. Ọ nọ na-agbake site n’ahụ a wara ya n’oge na-adịbeghị anya. Lezie ka o si dị mkpa na anyị ga-ege ntị tupu anyị ana-enye ndụmọdụ!

5. Olee otú ndị okenye pụrụ isi dozie esemokwu ndị na-ebilite n’etiti ụmụnna?

5 Nye ndị okenye, izi ihe na-agụnyekarị inye ndị ọzọ ndụmọdụ. N’ebe a kwa, ọ dị mkpa ịbụ onye na-ege ntị nke ọma. Ige ntị dị mkpa karịsịa mgbe esemokwu bilitere n’etiti ndị Kraịst ibe anyị. Nanị mgbe ha gesịrị ntị ka ndị okenye pụrụ iṅomi ‘Nna, bụ́ Onye na-ekpe ikpe n’eleghị mmadụ anya n’ihu.’ (1 Pita 1:17) A na-enwekarị oké mkpali mmetụta uche n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, onye okenye kwesịkwara iburu ndụmọdụ nke Ilu 18:17 n’uche: “Onye ezi omume n’anya ndị ikpe ka onye ahụ bụ nke buru ụzọ kpee ọnụ ya; ma mmadụ ibe ya abịa gwupụta ala okwu ya.” Onye ozizi dị irè ga-ege mmadụ abụọ ahụ ntị. Site n’ikpe ekpere, ọ na-enye aka ime ka e nwee ọnọdụ dị jụụ. (Jemes 3:18) Ọ bụrụ na e nwee oké mkpali mmetụta uche, ọ pụrụ ịtụ aro ka nwanna nke ọ bụla kọsara ya kpọmkwem nchegbu ya, kama ha abụọ ịnọ na-abarịta mba. Site n’ịjụ ajụjụ ndị kwesịrị ekwesị, onye okenye ahụ pụrụ ime ka ihe ndị a na-ekwu doo anya. N’ọtụtụ ọnọdụ, ihe na-akpata esemokwu na-abụ enweghị ezi nkwurịta okwu, ọ bụghị obi ilu. Ma ọ bụrụ na e mebiwo ụkpụrụ Bible, onye ozizi na-ahụ n’anya pụziri iji nghọta nye ntụziaka, ebe ọ bụ na ọ nụwo site n’ọnụ mmadụ abụọ ahụ.

Abamuru nke Ịdị Mfe

6. Olee otú Pọl na Jisọs si setịpụ ihe nlereanya n’iji ịdị mfe na-ezi ihe?

6 Ime ka ihe dị mfe bụ nkà izi ihe ọzọ bara uru. N’eziokwu, anyị chọrọ ka ndị a na-amụrụ Bible ‘nwee ike ịghọta, ha na ndị nsọ nile, ihe bụ obodobo na ogologo na ịdị elu na omimi’ nke eziokwu ahụ. (Ndị Efesọs 3:18) E nwere akụkụ nke ozizi Bible ndị na-adọrọ mmasị ma na-abụkarị ihe ịma aka. (Ndị Rom 11:33) Otú o sina dị, mgbe Pọl mere nkwusa nye ndị Grik, o lekwasịrị anya n’ozi ahụ dị mfe nke ‘Kraịst a kpọgideworo n’elu osisi ịta ahụhụ.’ (1 Ndị Kọrint 2:1, 2, NW) N’otu aka ahụ, Jisọs mere nkwusa n’ụzọ doro anya ma na-akpali akpali. O ji okwu dị mfe mee ihe n’Ozizi Elu Ugwu ya. Ma, ụfọdụ n’ime eziokwu ndị kasị gbaa ọkpụrụkpụ e kwutụrụla dị na ya.—Matiu, isi nke 5-7.

7. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ihe dị mfe mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Bible?

7 N’otu aka ahụ anyị pụrụ ime ka ihe dị mfe mgbe anyị na-ezi ihe n’ọmụmụ Bible. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ilekwasị anya ‘n’ihe ndị kasị mkpa.’ (Ndị Filipaị 1:10, NW) Mgbe anyị na-akọwa isiokwu ndị siri ike nghọta, anyị kwesịrị ịgbalị iji okwu ndị doro anya na-akọwa ha. Anyị kwesịrị ilekwasị anya n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị bụ́ isi kama ịnwa ịgụ na ịtụle akụkụ Bible nile e zoro aka na ha n’ime mbipụta ahụ. Nke a na-achọ ime ezi nkwadebe n’aka anyị. Ọ dị anyị mkpa izere iji nkọwa karịrị akarị bogbuo onye anyị na-amụrụ ihe, ghara ikwe ka okwu ndị na-adịchaghị mkpa dọpụ uche anyị. Ọ bụrụ na onye anyị na-amụrụ ihe nwere ajụjụ na-emetụtaghị ihe ọmụmụ ahụ kpọmkpem, anyị pụrụ iji akọ tụọ arọ ka a tụlee ya mgbe ihe ọmụmụ ahụ gasịrị.

Iji Ajụjụ Eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè

8. Olee otú Jisọs si jiri ajụjụ mee ihe n’ụzọ dị irè?

8 Nkà izi ihe ọzọ bara uru na-agụnye ịjụ ajụjụ ndị dị irè. Jisọs Kraịst ji ajụjụ mee ihe n’ụzọ sara mbara n’izi ihe ya. Dị ka ihe atụ, Jisọs jụrụ Pita, sị: “Gịnị bụ uche gị, Saịmọn? ndị eze ụwa, site n’aka ole ndị ka ha na-anara ụtụ ahịa ma ọ bụ ụtụ n’isi mmadụ? n’aka ụmụ ha, ma ọ bụ n’aka ndị ọbịa? Ma mgbe ọ sịrị, N’aka ndị ọbịa, Jisọs sị ya, Ya mere ụmụ ha pụrụ n’ime ya.” (Matiu 17:24-26) Dị ka Ọkpara a mụrụ nanị ya nke Onye ahụ a na-efe n’ụlọ nsọ, iwu ejighị Jisọs n’ezie ịtụ ụtụ isi ụlọ nsọ. Ma Jisọs mere ka a ghọta eziokwu a site n’iji ajụjụ mee ihe n’ụzọ dị irè. Jisọs si otú a nyere Pita aka iru mkpebi kwesịrị ekwesị, na-adabere n’ihe Pita marawororị.

9. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ajụjụ na-eme ihe n’oge anyị na-eduzi ọmụmụ Bible?

9 Anyị pụrụ iji ajụjụ mee ihe n’ụzọ dị irè n’oge anyị na-eduzi ọmụmụ Bible. Ọ bụrụ na onye anyị na-amụrụ ihe enye azịza na-ezighị ezi, ọ pụrụ ịbụrụ anyị ihe na-adọrọ adọrọ inye azịza nke ziri ezi, ma ọ̀ ga-echeta ihe ọmụma ahụ n’ezie? Mgbe mgbe ọ na-akasị mma ịgbalị iduru onye ahụ anyị na-amụrụ ihe ruo ná nkwubi okwu ziri ezi site n’ịjụ ajụjụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ na-esiri ya ike ịghọta ihe mere o kwesịrị iji jiri aha Chineke na-eme ihe, anyị pụrụ ịjụ, sị, ‘Aha gị ọ̀ dị gị mkpa? . . . N’ihi gịnị? . . . Olee otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na mmadụ ajụ ịkpọ gị aha gị? . . . Ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na Chineke na-achọ ka anyị na-akpọ ya aha aka ya?’

10. Olee otú ndị okenye pụrụ isi jiri ajụjụ mee ihe mgbe ha na-enyere ndị nwere nsogbu mmetụta uche aka?

10 Ndị okenye pụkwara iji ajụjụ mee ihe n’ụzọ dị mma mgbe ha na-azụ ìgwè atụrụ ahụ. Ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ abụrụwo ndị ụwa Setan nyere nsogbu n’ụzọ mmetụta uche, ha pụkwara inwe mmetụta nke ịbụ ndị na-adịghị ọcha na ndị a na-enweghị ike ịhụ n’anya. Onye okenye pụrụ isoro onye dị otú ahụ tụgharịa uche site n’ịsị: ‘Ọ bụ ezie na ị sịrị na ị na-enwe mmetụta nke ịbụ onye na-adịghị ọcha, olee mmetụta Jehova na-enwe n’ebe ị nọ? Ọ bụrụ na Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya kwere ka Ọkpara ya nwụọ ma nye ihe mgbapụta maka gị, nke ahụ ọ́ pụtaghị na Chineke hụrụ gị n’anya?’—Jọn 3:16.

11. Ọrụ dị aṅaa ka ajụjụ ndị na-akpali echiche na-arụ, oleekwa otú a pụrụ isi jiri ha mee ihe n’ikwu okwu n’ihu ọha?

11 Ajụjụ ndị na-akpali echiche bụ usoro izi ihe ọzọ bara uru. A dịghị atụ anya ka ndị na-ege ntị zaa ha n’olu dara ụda kama ọ na-enyere ha aka ịtụgharị uche n’okwu. Ndị amụma oge ochie jụrụ ajụjụ ndị dị otú ahụ mgbe mgbe iji mee ka ndị na-ege ha ntị chee echiche n’ụzọ miri emi. (Jeremaịa 18:14, 15) Jisọs ji ajụjụ ndị na-akpali echiche mee ihe n’ụzọ dị irè. (Matiu 11:7-11) Ajụjụ ndị dị otú ahụ na-adị irè karịsịa n’ikwu okwu n’ihu ọha. Kama ịgwa nnọọ ndị na-ege ntị na ha aghaghị iji mkpụrụ obi ha dum na-eje ozi iji mee ka obi dị Jehova ụtọ, ọ pụrụ ịdị irè karị ịjụ, sị, ‘Ọ bụrụ na anyị adịghị eji mkpụrụ obi anyị dum eje ozi anyị n’ezie, obi ọ̀ ga-adị Jehova ụtọ?’

12. Gịnị bụ abamuru dị n’ịjụ ajụjụ njụta echiche?

12 Ajụjụ njụta echiche bara uru n’ịchọpụta ma onye a na-amụrụ Bible ò kwenyere n’ihe ọ na-amụ n’ezie. (Matiu 16:13-16) Onye a na-amụrụ ihe pụrụ ịza n’ụzọ ziri ezi na ịkwa iko dị njọ. Ma gịnị ma ị gaa n’ihu na-eji ajụjụ ndị dị ka, Olee otú i si ele ụkpụrụ omume ọma Chineke anya n’onwe gị? Ị̀ na-eche na o nwere ọtụtụ ihe mgbochi? Ị̀ ga-asị na ọ dị ihe o mere n’ezie ma ị gbasoro ụkpụrụ Chineke ma ọ bụ na ị gbasoghị ha?

Ihe Atụ Ndị Na-eru n’Obi

13, 14. (a) Gịnị ka inye ihe atụ pụtara? (b) N’ihi gịnị ka ihe atụ ndị dị mma ji adị irè?

13 Ụzọ ọzọ e si eru n’obi ndị na-ege ntị na ndị a na-amụrụ Bible bụ site n’ihe atụ ndị dị irè. Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ihe atụ” pụtara n’ụzọ nkịtị “idebe n’akụkụ ma ọ bụ idokọ ọnụ.” Mgbe ị na-enye ihe atụ, ị na-akọwa ihe site ‘n’idebe ya n’akụkụ’ ihe yiri ya. Dị ka ihe atụ, Jisọs jụrụ, sị: “Anyị ga-esi aṅaa tụnyere alaeze Chineke? ma ọ bụ n’ilu gịnị ka anyị ga-atụ ya?” N’ịza ya, Jisọs hotara mkpụrụ mustard ahụ a maara nke ọma.—Mak 4:30-32.

14 Ndị amụma Chineke ji ọtụtụ ihe atụ ndị bụ ịgba mee ihe. Mgbe ndị Asiria, bụ́ ndị jeworo ozi dị ka ngwá ọrụ Chineke ji mee ihe n’inye ụmụ Israel ahụhụ, malitere ịrụ arụrụala jọgburu onwe ya, Aịsaịa ji ihe atụ a kpughee mpako ha: “Anyụike, ọ̀ ga-aja onwe ya n’ahụ onye ji ya egbu ihe? ma ọ bụ mma nkwọ, ọ̀ ga-eme onwe ya ukwuu megide onye na-akwọ ya?” (Aịsaịa 10:15) Mgbe ọ na-ezi ndị ọzọ ihe, Jisọs ji ihe atụ mee ihe n’otu aka ahụ n’ụzọ sara mbara. A kọrọ na “a sị na O jighị ilu Ọ dịghị agwa ha okwu.” (Mak 4:34) Ihe atụ ndị dị mma na-adị irè n’ihi na ha na-eru ma n’uche ma n’obi. Ha na-ekwe ka ndị na-ege ntị nara ihe ọmụma ọhụrụ ngwa ngwa site n’iji ihe ndị ha marawororị nke ọma na-atụnyere ya.

15, 16. Gịnị ga-eme ka ihe atụ dị irè karịsịa? Nyegasịa ihe atụ.

15 Olee otú anyị pụrụ isi jiri ihe atụ ndị na-eru n’obi n’ezie na-eme ihe? Nke mbụ, ihe atụ aghaghị ikwekọ n’ihe a na-akọwa n’ụzọ ezi uche dị na ya. Ọ bụrụ na ntụnyere ahụ adabaghị adaba n’ezie, ihe atụ ahụ ga-adọpụ uche ndị na-ege ntị kama ime ka ha ghọta ihe. N’otu mgbe, otu onye ọkà okwu nwere ezi ebumnobi nwara igosi ịnọ n’okpuru nke ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ n’ebe Jisọs Kraịst nọ site n’iji ha tụnyere nkịta kwesịrị ntụkwasị obi e ji mere enyi. Ma ntụnyere dị otú ahụ na-eweda n’ala ò kwesịrị ekwesị n’ezie? Bible na-enye otu echiche ahụ n’ụzọ na-adọrọ mmasị ma nwee ùgwù karị. O ji 144,000 ụmụazụ Jisọs e tere mmanụ tụnyere “nwanyị a na-alụ ọhụrụ nke a chọworo ya mma nye di ya.”—Mkpughe 21:2.

16 Ihe atụ na-akasị adị irè mgbe ha metụtara ndụ ndị mmadụ. Ihe atụ Netan banyere nwa atụrụ ahụ e gburu egbu metụrụ Eze Devid n’obi n’ihi na ọ hụrụ atụrụ n’anya, ebe ọ bụ na o jewo ozi dị ka onye ọzụzụ atụrụ n’oge ntorobịa ya. (1 Samuel 16:11-13; 2 Samuel 12:1-7) Ọ bụrụ na ọ bụ oké ehi ka e ji maa atụ ahụ, o nwere ike ọ gaghị adịtụdị irè otú ahụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, ihe atụ ndị metụtara nkà mmụta sayensị ma ọ bụ ihe ndị na-edoghị anya a kọrọ n’akụkọ pụrụ ịbụ ihe ndị na-ege anyị ntị na-agaghị ejicha kpọrọ ihe. Jisọs wetara ihe atụ ya site n’ihe ndị a na-ahụ ná ndụ kwa ụbọchị. O kwuru okwu banyere ihe nkịtị ndị dị ka oriọna, anụ ufe nke eluigwe, na urodi nke ubi. (Matiu 5:15, 16; 6:26, 28) Ndị nụrụ okwu Jisọs pụrụ ịkọ ihe ndị ahụ n’ụzọ dị mfe.

17. (a) Na gịnị ka ihe atụ anyị pụrụ ịdabere? (b) Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ihe atụ ndị e ji mee ihe n’akwụkwọ anyị kwekọọ n’ọnọdụ nke ndị anyị na-amụrụ ihe?

17 N’ozi anyị, anyị nwere ọtụtụ ohere iji ihe atụ ndị dị mfe ma dị irè na-eme ihe. Na-ahụ ihe na-aganụ. (Ọrụ 17:22, 23) Ikekwe ihe atụ pụrụ ịdabere n’ụmụntakịrị, ebe obibi, ọrụ, ma ọ bụ ihe omume ntụrụndụ nke onye na-ege ntị. Ma ọ bụ anyị pụrụ iji ihe anyị maara n’onwe anyị banyere onye a na-amụrụ Bible meziwanye ihe atụ ndị e nyeworo anyị n’akwụkwọ anyị na-amụ. Were, dị ka ihe atụ, ihe atụ ahụ dị irè e ji mee ihe na paragraf nke 14 nke isiakwụkwọ nke 8 n’akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. O metụtara nna na-ahụ n’anya bụ́ onye onye agbata obi ya kwutọrọ. Anyị pụrụ ichetụ echiche banyere otú anyị pụrụ isi mee ka ihe atụ ahụ kwekọọ n’ọnọdụ nke onye anyị na-amụrụ Bible nke bụkwa nne ma ọ bụ nna n’onwe ya.

Iji Nkà Na-agụ Akwụkwọ Nsọ

18. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji gbalịsie ike ịbụ ndị na-agụ ihe were were?

18 Pọl gbara Timoti ume, sị: “Na-aṅa ntị ọgụgụ akwụkwọ gị na ịdụ ọdụ gị na ozizi gị.” (1 Timoti 4:13) Ebe Bible bụ ntọala nke ozizi anyị, ọ bara uru inwe ike ịgụ ya n’ụzọ na-aga were were. Ndị Livaị nwere ihe ùgwù nke ịgụrụ ndị Chineke Iwu Mosis. Hà kpọhiere okwu n’ọgụgụ ihe dị otú ahụ ma ọ bụ jiri otu ụda olu na-agụ ya? Ee e, Bible na-ekwu na Nehemaịa 8:8, sị: “Ha wee gụọ n’akwụkwọ ahụ, bụ́ n’iwu Chineke, gụpụta ya nke ọma, wee mee ka a mata isi ya, ha wee ghọta ọgụgụ ya.”

19. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ anyị ka mma?

19 Ụfọdụ ndị ikom bụ́ ndị Kraịst na-ekwu okwu were were adịghị eme nke ọma mgbe a bịara n’ịgụ ihe. Olee otú ha pụrụ isi mee ka ịgụ ihe ha ka mma? Site n’ịdị na-amụ ịgụ ihe. Ee, site n’ịgụ ihe ugboro ugboro n’olu dara ụda ruo mgbe ha nwere ike ịgụ ihe were were. Ọ bụrụ na e nwere kaseti Bible a na-ege ege n’asụsụ gị, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ige ntị n’imesi echiche okwu ike na mgbanwe olu nke onye ahụ na-agụ ya ma rịba ama otú e si akpọpụta aha na okwu ndị a na-adịghị ahụkebe. Ndị nwere New World Translation n’asụsụ ha pụkwara irite uru n’ihe enyemaka ya n’ịkpọpụta okwu. Site n’ịmụ ịgụ ihe, a pụrụ ọbụna iji ntụsara ahụ kpọọ aha ndị dị ka Maha-shalal-hash-baz.—Aịsaịa 8:1.

20. Olee otú anyị pụrụ isi ‘rịba ozizi anyị ama’?

20 Dị ka ndị Jehova, lee ihe ùgwù anyị nwere ịbụ ndị e ji eme ihe dị ka ndị ozizi! Ka onye ọ bụla n’ime anyị jirizie ibu ọrụ ahụ kpọrọ ihe. Ka anyị ‘rịba onwe anyị na ozizi anyị ama.’ (1 Timoti 4:16) Anyị pụrụ ịbụ ezi ndị ozizi site n’ịbụ ndị na-ege ntị nke ọma, site n’ime ka ihe dị mfe, site n’ịjụ ajụjụ ndị jupụtara ná nghọta, site n’iji ihe atụ ndị dị irè na-eme ihe, na site n’iji nkà na-agụ akwụkwọ nsọ. Ka anyị nile rite uru site n’ọzụzụ Jehova na-enye site ná nzukọ ya, n’ihi na nke a pụrụ inyere anyị aka inwe “ire nke ndị mmụta.” (Aịsaịa 50:4) Site n’iji ngwá ọrụ nile e wepụtara maka ozi anyị, nke gụnyere broshuọ, kaseti ndị a na-ege ege, na kaseti vidio na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu, anyị pụrụ ịmụta iji nghọta na ime ka mmadụ kwenye na-ezi ihe.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Olee otú ịbụ ndị na-ege ntị nke ọma pụrụ isi nyere anyị aka n’izi ihe anyị?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Pọl na Jisọs n’iji ịdị mfe na-ezi ihe?

◻ Ụdị ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ iji mee ihe mgbe anyị na-ezi ndị ọzọ ihe?

◻ Ụdị ihe atụ ndị dị aṅaa kasị adị irè?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi mee ka nkà anyị dị ka ndị na-agụ ihe n’ihu ọha ka mma?

[Foto dị na peeji nke 16]

Ezi onye ozizi na-ege ntị iji ghọta ihe

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Jisọs wetara ihe atụ ya site n’ihe ndị a na-ahụ ná ndụ kwa ụbọchị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya