Ị Pụrụ Imeri Ihe Mgbochi Ndị A!
ỤGBỌ elu buru nnọọ ibu pụrụ iburu ọtụtụ narị mmadụ na ọtụtụ tọn ngwongwo fegoro elu. Olee otú nnukwute ụgbọ elu dị otú ahụ pụrụ isi si n’ala felie? N’ụzọ dị mfe, site n’iji ike mbuli mee ihe.
Mgbe ụgbọ elu ahụ ji oké ọsọ na-agba n’okporo ụzọ mfeli, ikuku na-ekwofe ma n’elu ma n’okpuru nku ya abụọ rọgọrọ arọgọ. Nke a na-emepụta ike mbuli. Mgbe e mepụtara ike mbuli zuru ezu, ụgbọ ahụ pụrụ inwere onwe ya pụọ n’ala ma fee efe. Otú ọ dị, ụgbọ elu jubigara ókè apụghị imepụta ike mbuli zuru ezu iji felie elu.
Anyị onwe anyị kwa pụrụ ijubiga ókè. Ọtụtụ narị afọ gara aga, Eze Devid kwuru na ‘ajọ omume ya dị ka ibu arọ nye ya.’ (Abụ Ọma 38:4) N’otu aka ahụ, Jisọs Kraịst dọrọ aka ná ntị megide ịbụ onye e ji nchegbu nke ndụ bogbuo. (Luk 21:34) Echiche na mmetụta ndị na-adịghị ewuli elu pụrụ ibogbu anyị ruo n’ókè nke na ọ pụrụ iyi ihe siri ike “ife n’elu.” À na-ebogbu gị n’ụzọ dị otú ahụ? Ma ọ bụ ì nwewo ahụmahụ nke ihe mgbochi ụfọdụ nye inwekwu ọganihu ime mmụọ? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị pụrụ inye aka?
Ike Ọ̀ Na-agwụ Gị?
Ike ọgwụgwụ—mkpesa a na-anụkarị taa—pụrụ ịghọ ihe mgbochi nke uche, ọbụna nye ụfọdụ ndị Jehova. Ndị na-eto eto karịsịa nwere ọnọdụ uche nke iwezụga ihe omume ụfọdụ dị ka ndị na-atụ ọbọ. Nzukọ ndị Kraịst hà na-adị gị otú ahụ mgbe ụfọdụ? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị pụrụ ime iji mee ka ọbịbịa ị na-abịa nzukọ bụrụ nke na-akpali akpali?
Isonye n’ihe a na-eme bụ ụzọ ya. Pọl degaara nwa okoro bụ́ Timoti akwụkwọ, sị: “Na-anwa onwe gị ka i wee ruo nsọpụrụ Chineke: n’ihi na ọnwụnwa nke ahụ bara uru nye ihe nta; ma nsọpụrụ Chineke bara uru nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndụ, ma nke ndụ ugbu a, ma nke gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:7, 8) Akwụkwọ banyere mmega ahụ ga-agwụ ike ma baa uru dị nta ma ọ bụrụ na anyị adịghị anwale mmega ahụ ndị ọ tụrụ aro ha. A haziri nzukọ nile nke ndị Kraịst imega uche anyị, ọ ga-emekwa otú ahụ ma anyị kwadebe ma kere òkè. Isonye otú a ga-eme ka nzukọ na-enyeghachi ụgwọ ọrụ karị, na-adọrọkwa mmasị.
N’akụkụ nke a, otu nwa agbọghọ bụ́ onye Kraịst aha ya bụ Mara sịrị: “Ma mụ akwadebeghị nzukọ, ha adịghị amasị m. Ma, mgbe m buworo ụzọ kwadebe, uche na obi m na-anakwerekarị ihe. Nzukọ ndị ahụ na-abawanye uru, m na-enwekwa olileanya ịza ajụjụ.”
Ịmụta ige ntị ga-enyekwa aka. Ige ntị n’egwú dị mma dị mfe ma na-atọ ụtọ ozugbo. Ma ọ bụghị afọ ojuju nile na-abịa ozugbo ahụ. Anyị na-enweta afọ ojuju site n’usoro ihe omume nzukọ nanị ma anyị gee ntị nke ọma n’ihe a na-ekwu. Otu onye Kraịst aha ya bụ Rachel rịbara ama, sị: “Mgbe ọkà okwu na-adịghị ekpo ọkụ, ọ dị m mkpa itinyekwu nnọọ uche. Ụkpụrụ m na-agbaso bụ, ‘Ka okwu ahụ na-adịghị adọrọ mmasị karị, otú ahụ ka m nwere mkpa itinyekwu uche karị.’ . . . M na-eleru akụkụ akwụkwọ nsọ anya n’ụzọ pụrụ iche, na-agbalị irite uru kasịnụ a pụrụ irite na ha.” Ọ dị anyị mkpa inye onwe anyị ọzụzụ, dị ka Rachel, iji gee ntị. Akwụkwọ Ilu na-asị: “Nwa m, ṅaa ntị n’amamihe m; tọọ ntị gị n’ala nye nghọta m.”—Ilu 5:1.
Ihe ọmụma ụfọdụ e nyere ná nzukọ pụrụ iyitu ihe nkwughachi. Nke a dị mkpa! Ihe ncheta dị ndị ohu nile nke Chineke mkpa. Anụ ahụ na-ezughị okè, ya na ọchịchọ mkpafu ya na ike ncheta gbara ọrụ, nwere mkpa maka enyemaka nile ọ pụrụ inweta. Pita onyeozi ‘gaje ichetara ndị kwere ekwe ibe ya ihe ụfọdụ, ọ bụ ezie na ha matara ha, e mewokwa ka ha guzosie ike n’eziokwu ahụ.’ (2 Pita 1:12) Jisọs kọwakwara na “odeakwụkwọ ọ bụla . . . yiri mmadụ nke bụ nna nwe ụlọ, onye na-esi n’akụ̀ ya atụpụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.” (Matiu 13:52) Otú a, ọ bụ ezie na nzukọ anyị na-ewepụta echiche Akwụkwọ Nsọ ndị a mabu, ma ọ bụ ‘akụ̀ ochie,’ a na-enwe mgbe nile ‘akụ̀ ọhụrụ’ ụfọdụ ga-atọ anyị ụtọ.
Ikpebisi ike irite uru kasịnụ site ná nzukọ pụrụ ịrụpụta ezi ike mbuli ime mmụọ. “Ngọzi na-adịrị ndị bụ ogbenye n’ime mmụọ ha,” ka Jisọs sịrị. (Matiu 5:3) Àgwà dị otú ahụ n’ebe nri ime mmụọ dị mma dị bụ́ nke a na-enye ná nzukọ ga-ekpochapụ ike ọgwụgwụ.—Matiu 24:45-47.
Ihe Nlereanya Ọjọọ Ọ̀ Na-akụda Gị Obi?
Àgwà nke otu onye n’ọgbakọ gị ọ̀ kpasuwo gị iwe? Ma eleghị anya i chewo sị, ‘Olee otú nwanna pụrụ isi kpaa àgwà otú ahụ ma ka nọrọ n’ezi nguzo?’ Echiche ndị dị otú ahụ pụrụ ịrụ ọrụ dị ka ihe mgbochi nke uche, na-ekpu anyị ìsì n’uru nke mkpakọrịta dị ụtọ anyị na ndị Chineke pụrụ inwe.—Abụ Ọma 133:1.
Ma eleghị anya ụfọdụ ndị òtù ọgbakọ dị na Kọlọsi nwere nsogbu yiri nke ahụ. Pọl gbara ha ume, sị: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta.” (Kọlọsi 3:13) Pọl matara na ụfọdụ ndị Kraịst na Kọlọsi pụrụ ịkpajọwo àgwà wee si otú ahụ nye ndị ọzọ ezi ihe mere ha ga-eji taa ụta. Ya mere anyị ekwesịghị inwe ijuanya na-enweghị isi ma ọ bụrụ na mgbe ụfọdụ otu àgwà ndị Kraịst akọọ otu n’ime ụmụnna anyị nwoke ma ọ bụ nwanyị. Jisọs nyere ndụmọdụ dị mma n’idozi nsogbu ndị siri ike. (Matiu 5:23, 24; 18:15-17) Ma n’oge ka ukwuu, anyị pụrụ nanị ịnagide erughị eru dị iche iche nke ndị kwere ekwe ibe anyị ma gbaghara ha. (1 Pita 4:8) N’ezie, ime ihe n’ụzọ dị otú ahụ pụrụ ịbara anyị onwe anyị na ndị ọzọ uru. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?
“Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ; ọ bụkwa ịma mma ya ịgabiga njehie,” ka Ilu 19:11 na-ekwu. Lee ka o si ka mma ịgbaghara kama ikwere ka iwe na ibu esemokwu n’obi mụbaa! Salvador, bụ́ okenye e ji mmụọ ịhụnanya ya mara, sịrị: “Mgbe nwanna mejọrọ m ma ọ bụ kwuo ihe obi ọjọọ, m na-ajụ onwe m: ‘Olee otú m pụrụ isi nyere nwanna m aka? Olee otú m pụrụ isi zere ịtụfu mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke mụ na ya?’ M na-eche mgbe nile banyere otú o si dị mfe ikwu ihe na-ezighị ezi. Ọ bụrụ na mmadụ ekwuo okwu n’echeghị echiche, ihe ngwọta kasị mma ga-abụ ya ilo ihe o kwuru ma malite n’isi. Ma nke ahụ adịghị ekwe omume, ya mere m na-ewere nzọụkwụ ọzọ nke kasị mma ma leghara okwu ahụ anya. M na-agụ ya nnọọ ná ntiwapụ nke anụ ahụ na-ezughị okè kama ịbụ ngosipụta nke ihe nwanna m bụ n’ezie.”
Ị pụrụ iche na ime nke a ka mfe n’ọnụ karịa n’omume. Ma ọtụtụ ihe dabeere n’ụzọ anyị si eduzi echiche anyị. “Ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị ịhụnanya, . . . na-agụkọnụ ihe ndị a,” ka Pọl dụrụ ọdụ ya. (Ndị Filipaị 4:8) “Kwesịrị ịhụnanya” pụtara n’ụzọ nkịtị “na-akpali ịhụnanya.” Jehova chọrọ ka anyị gụkọọ ihe dị mma n’ime ndị mmadụ, ilekwasị anya n’ihe nke na-akpali ịhụnanya kama ibu iwe n’obi. Ya onwe ya na-enye anyị ihe nlereanya kasịnụ n’akụkụ nke a. Ọbụ abụ ahụ chetaara anyị nke a, na-asị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Ja, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?”—Abụ Ọma 103:12; 130:3.
N’eziokwu, n’oge ụfọdụ àgwà nke otu nwanna pụrụ ịbụ ihe mmechuihu, ma ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ime ndị ofufe ibe anyị bụ ihe nlereanya magburu onwe ha nke ibi ndụ ndị Kraịst. Ọ bụrụ na anyị echeta nke a, dị ka Devid anyị ga-enwe obi ụtọ ‘ikele Jehova nke ukwuu, tookwa Ya n’etiti ọtụtụ mmadụ.’—Abụ Ọma 109:30.
Ịbụ Onyeàmà Ò Yiri Ihe Sibigara Ike Ókè?
Ọ bụ ihe mwute na n’ihi ihe mgbochi ọzọ nke uche, ụfọdụ amalitebeghị ito Jehova. Ọtụtụ ndị ikom na-abụghị Ndịàmà Jehova na-egbo mkpa ezinụlọ ha na ọbụna na-akwado nwunye ha n’ozi ndị Kraịst dị ka ibu ọrụ ha. Ha nwere omume enyi, nweekwa ike inwe mmasị n’ọgbakọ, ma ha na-ala azụ ịghọ ndị ohu Chineke raara onwe ha nye. Gịnị na-ejighachi ha azụ?
Otu nsogbu pụrụ ịbụ na ndị a bụ di na-ahụ ka ndị nwunye ha ji ọrụ ọchịchị Chineke n’aka nke ukwuu wee na-eche na ịbụ Onyeàmà na-ewe oké ihe. Ma ọ bụ ma eleghị anya ha na-atụ egwu na ọ dịghị mgbe ha pụrụ itinye aka n’ọrụ nkwusa ụlọ n’ụlọ. Site n’echiche ha, ibu ọrụ nile ahụ yiri ka ọ na-ekpuchi ngọzi ndị dị ya. Gịnị na-akpata ihe mgbochi ahụ nke uche? Ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị a na-amụrụ Bible na-amụta ma na-etinye eziokwu ahụ n’ọrụ nwayọọ nwayọọ. Ma ndị di na-ekweghị ekwe na-amata nnọọ nke ọma ibu ọrụ nile nke ndị Kraịst tupu ha ewulite mkpali ịnakwere ha.
Manuel, onye nọbu n’ọnọdụ a, na-akọwa, sị: “Ruo afọ iri, m so nwunye m na-aga mgbakọ na nzukọ. N’ikwu eziokwu, mkpakọrịta Ndịàmà na-atọ m ụtọ karịa nke ndị ụwa, obi na-adịkwa m ụtọ inyere ha aka mgbe m nwere ike. Ịhụnanya jupụtara n’etiti ha na-amasị m. Ma echiche nke ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ nnukwute ihe mgbochi nye m, egwu tụkwara m na ndị ọrụ ibe m ga-eji m eme ihe ọchị.
“Nwunye m nweere m ndidi nke ukwuu, n’adịghị mgbe ọ nwara ịmanye m ịmụ Bible. Ya na ụmụ anyị ‘mere nkwusa’ n’ụzọ bụ isi site n’ihe nlereanya ọma ha. José, otu okenye n’ọgbakọ, zụlitere mmasị pụrụ iche n’ebe m nọ. Echere m na ọ bụ agbamume ya mesịrị mee ka m malite ịmụsi ihe ike. Mgbe e mesịrị m baptism, achọpụtara m na ihe mgbochi bụ isi bụ ihe mgbochi nke uche. Ozugbo m kpebiri ijere Jehova ozi, enwetara m enyemaka ya n’imeri egwu m nile.”
Olee otú ndị nwunye na ndị okenye bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi nyere ndị bụ́ di dị ka Manuel aka imeri ihe mgbochi nke uche ha? Ọmụmụ Bible pụrụ iwulite obi ekele na ọchịchọ ime uche Chineke. N’ezie, ihe ọmụma dị mma nke Akwụkwọ Nsọ bụ ihe ndabere maka inwe okwukwe na obi ike n’ihe a na-ele anya ya n’ọdịnihu.—Ndị Rom 15:13.
Gịnị ga-agba ndị dị otú ahụ bụ́ di ume ịnakwere ọmụmụ Bible? Ọtụtụ mgbe, ọbụbụenyi nke ya na nwanna na-aghọta ihe n’ọgbakọ pụrụ ịbụ ihe na-ekpebi ya. Ma eleghị anya onye okenye ma ọ bụ nwanna ọzọ nweworo ahụmahụ pụrụ ịga mata di ahụ. Ozugbo e guzobere ezi mmekọrịta, ihe dị ya mkpa pụrụ ịbụ nanị ka mmadụ kwuo ka o duziere ya ọmụmụ ihe. (1 Ndị Kọrint 9:19-23) N’ime oge ahụ, nwunye dị akọ bụ́ onye Kraịst pụrụ iso di ya na-ekweghị ekwe na-ekerịta ọkpụrụkpụ anụ ime mmụọ, na-amata na o yighị ka ọ ga-azaghachi ná nrụgide.—Ilu 19:14.
Dị ka Manuel mụtara site n’ahụmahụ, ozugbo mmadụ nwetara ume ime mmụọ, ihe mgbochi ndị yiri ugwu na-adị nnọọ ka ugwu mkpu. Jehova na-enye ndị chọrọ ife ya ume. (Aịsaịa 40:29-31) N’ike Chineke na site ná nkwado nke Ndịàmà tozuru okè, a pụrụ iwepụ ihe mgbochi nile. Ọrụ ụlọ n’ụlọ pụrụ isi otú a ghọọ ihe na-adịkwaghị atụcha egwu, ndị ọrụ ibe gị agharakwa ịbụcha ihe ịsọ ihere, ka ije ozi site n’obi dum na-adọrọwanye mmasị.—Aịsaịa 51:12; Ndị Rom 10:10.
Nọgide Na-aga n’Ihu
O kwere omume imeri ihe mgbochi ndị dị ka atọ anyị tụleworo. Mgbe ụgbọ elu feliri, a na-achọ ike kasị ukwuu site n’injin ya nile nakwa uche a na-ekewaghị ekewa nke ndị ọrụ ụgbọ elu. N’oge a na-efeli, injin na-aṅụ mmanụ dị nnọọ ukwuu karịa n’oge ọ bụla ọzọ nke ufe ahụ. N’otu aka ahụ, iji merie echiche na mmetụta ndị na-adịghị ewuli elu chọrọ mgbalị kasị ukwuu na ntinye uche n’ihe. Ịmalite amalite pụrụ ịbụ akụkụ kasị sie ike, ebe inwe ọganihu na-aka mfe ozugbo a maliteworo njem.—Tụlee 2 Pita 1:10.
A na-anọgide na-aga n’ihu site n’itinye agbamume Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ngwa ngwa. (Abụ Ọma 119:60) Anyị pụrụ ijide n’aka na ọgbakọ ga-achọ inye aka. (Ndị Galetia 6:2) Otú ọ dị, nke kasị mkpa bụ nkwado nke Jehova Chineke. Dị ka Devid kwuru, “onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ, kwa ụbọchị ka Ọ na-eburu anyị ibu.” (Abụ Ọma 68:19) Mgbe anyị buturu onwe anyị ibu arọ n’ekpere, ibu anyị na-akawanye mfe.
Mgbe ụfọdụ, ụgbọ elu na-ahapụ ọnọdụ ihu igwe gbachiri agbachi ma na-achọ izo mmiri, fefere mkpụkọta urukpuru, ma febanye n’ígwé jupụtara n’ìhè anyanwụ. Anyị onwe anyị pụkwara ịhapụ echiche ndị na-adịghị ewuli elu. Site n’enyemaka Chineke, anyị pụrụ ịgafere mkpụkọta urukpuru ahụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, ma na-egbukepụ na gburugburu ọnọdụ gbachapụrụ agbachapụ, nke obi ụtọ, nke ezinụlọ Jehova zuru ụwa ọnụ nke ndị na-efe ofufe.
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Site n’enyemaka Jehova, anyị pụrụ imeri ihe mgbochi ndị nke uche