Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • kl isi 17 p. 160-169
  • Chọta Ịnọ ná Ntụkwasị Obi n’Etiti Ndị Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chọta Ịnọ ná Ntụkwasị Obi n’Etiti Ndị Chineke
  • Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “OHU AHỤ KWESỊRỊ KA A TỤKWASỊ YA OBI, NKE NWEKWARA UCHE”
  • “NRI N’OGE YA”
  • “YIKWASỊNỤ ỊHỤNANYA”
  • EBE ỊNỌ NÁ NTỤKWASỊ OBI
  • NỌRỌ NÁ NTỤKWASỊ OBI N’ETITI NDỊ JEHOVA
  • Ihe Mere O Ji Dị Gị Mkpa Ịdị Na-aga Nzukọ Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Na-echetanụ Ndị Na-edu Ndú n’Etiti Unu”
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ka E Wulie Ọgbakọ Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Olee Otú Jehova Si Eduzi Nzukọ Ya?
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
kl isi 17 p. 160-169

Isi nke 17

Chọta Ịnọ ná Ntụkwasị Obi n’Etiti Ndị Chineke

1, 2. Olee otú ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ si dị ka nke ndị bi n’ógbè ebe ajọ ifufe tikpọsịrị?

KA E were na ajọ ifufe etikpọsịwo ebe i bi. E bibiri ụlọ gị, ihe onwunwe gị nile fukwara. Nri dị ụkọ. Ọnọdụ ahụ yiri nke olileanya na-adịghị ya. Mgbe ahụ, ihe enyemaka ndị a na-atụghị anya ha ewee rute. E butere nri na uwe n’ụba. E wuuru gị ụlọ ọhụrụ. N’ezie ị ga-enwe ekele maka onye wetara ihe ndị a.

2 Ihe yiri nke ahụ na-ewere ọnọdụ taa. Dị ka ajọ ifufe ahụ, nnupụisi Adam na Iv kpatara oké mbibi nye agbụrụ mmadụ. Ebe obibi Paradaịs nke ihe a kpọrọ mmadụ furu. Kemgbe ahụ, ọchịchị nile nke mmadụ adawo n’inye ndị mmadụ nchebe pụọ n’agha, mpụ, na ikpe na-ezighị ezi. Okpukpe emewo ka agụụ ezigbo nri ime mmụọ na-agụgbu ọtụtụ ìgwè mmadụ. Otú ọ dị, n’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, Jehova Chineke na-enye nri, uwe, na ndo ugbu a. Olee otú o si na-eme nke ahụ?

“OHU AHỤ KWESỊRỊ KA A TỤKWASỊ YA OBI, NKE NWEKWARA UCHE”

3. Olee otú Jehova si enye ihe maka ihe a kpọrọ mmadụ, dị ka e gosiri n’ihe atụ dịgasị aṅaa?

3 A na-esitekarị n’ụzọ a haziri ahazi ekesa ihe enyemaka, n’otu aka ahụ Jehova emewokwa ndokwa ihe ime mmụọ maka ndị ya. Dị ka ihe atụ, ndị Israel bụbu “mkpọkọta Jehova” ruo ihe dị ka 1,500 afọ. N’etiti ha e nwere ndị jere ozi dị ka ụzọ Chineke isi kụzie Iwu ya. (1 Ihe Emere 28:8; 2 Ihe Emere 17:​7-⁠9) Na narị afọ mbụ O.A., Jehova wepụtara nzukọ ndị Kraịst. E hiwere ọgbakọ dị iche iche, ha rụkwara ọrụ n’okpuru nduzi nke otu òtù na-achị isi nke ndị ozi na ndị okenye mejupụtara. (Ọrụ 15:​22-⁠31) N’otu aka ahụ taa, Jehova na-emeso ndị mmadụ ihe site n’otu ìgwè a haziri ahazi. Olee otú anyị si mara nke a?

4. Ònye ghọworo “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” n’oge ndị a, oleekwa ụzọ e si na-ewepụta ihe ime mmụọ ndị Chineke na-enye?

4 Jisọs kwuru na n’oge ọnụnọ ya n’ike Alaeze, a ga-ahụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ka ọ na-enye ‘ihe e ji azụ ahụ n’oge ya’ maka ụmụazụ Ya. (Matiu 24:​45-⁠47) Mgbe e chiri Jisọs echichi dị ka Eze eluigwe na 1914, olee ndị ghọrọ “ohu” a? N’ezie ọ bụghị ndị ụkọchukwu nke Krisendọm. N’akụkụ ka ukwuu, ha na-azụ ìgwè atụrụ ha okwu nrafu ndị kwadoro ọchịchị mba ha dị iche iche n’Agha Ụwa Mbụ. Ma ìgwè nke ezi ndị Kraịst bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ Chineke tee mmanụ nọ na-ekesa ezigbote nri ime mmụọ bụ́ ndị bịara n’oge ha, ha bụkwa akụkụ nke ihe Jisọs kpọrọ “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32) Ndị Kraịst a e tere mmanụ kwusara Alaeze Chineke kama ikwusa ọchịchị ụmụ mmadụ. N’ihi ya, n’afọ ndị na-agafenụ ọtụtụ nde nke “atụrụ ọzọ” ahụ nwere obi ezi omume esonyerewo “ohu” ahụ e tere mmanụ n’ikpe ezi okpukpe. (Jọn 10:16) N’iji “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” na Òtù Na-achị Isi ya nke oge a eme ihe, Chineke na-eduzi ndị ya a haziri ahazi inye ndị nile chọrọ nri, uwe, na ndo ime mmụọ.

“NRI N’OGE YA”

5. Ọnọdụ ime mmụọ dị aṅaa dị n’ụwa taa, gịnịkwa ka Jehova na-eme banyere nke a?

5 Jisọs sịrị: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.” (Matiu 4:4) Ma, n’ụzọ dị mwute, ihe ka nnọọ ukwuu ná ndị mmadụ adịghị aṅa ntị n’ihe ndị na-esite n’ọnụ Chineke. Dị ka onye amụma Jehova bụ́ Emọs bu ụzọ kwuo, e nwere “oké ụnwụ n’ala, ọ bụghị oké ụnwụ nke nri, ọ bụghịkwa akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ nke ịnụ okwu nile nke Jehova.” (Emọs 8:11) Ọbụna ndị ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu na-anwụ n’agụụ ime mmụọ. Ka o sina dị, ihe Jehova chọrọ bụ ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:​3, 4) N’ihi ya, ọ na-enye nri ime mmụọ n’ụba. Ma olee ebe a pụrụ inweta ya?

6. Olee otú Jehova siworo zụọ ndị ya nri n’ụzọ ime mmụọ n’oge ndị gara aga?

6 N’akụkọ ihe mere eme nile, Jehova ekesaworo ndị ya nri ime mmụọ dị ka otu ìgwè. (Aịsaịa 65:13) Dị ka ihe atụ, ndị nchụàjà Israel chịkọtara ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka maka izi ha ihe n’ìgwè n’Iwu Chineke. (Deuterọnọmi 31:​9, 12) N’okpuru nduzi òtù na-achị isi, ndị Kraịst narị afọ mbụ haziri ọgbakọ dị iche iche ma na-enwe nzukọ maka izi ihe na agbamume nke mmadụ nile. (Ndị Rom 16:5; Faịlimọn 1, 2) Ndịàmà Jehova na-agbaso ụkpụrụ nke a. E ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ịbịa nzukọ ha nile.

7. Olee njikọ dị n’etiti ịgachi nzukọ ndị Kraịst anya na ihe ọmụma na okwukwe?

7 Otú ọ dị, ị pụrụ ịmụtaworị ọtụtụ ihe n’ọmụmụ ihe onwe onye gị nke Bible. Ma eleghị anya ọ dịwo onye nyeere gị aka. (Ọrụ 8:​30-⁠35) Ma a pụrụ iji okwukwe gị tụnyere osisi nke ga-akpọnwụ ma nwụọ ma ọ bụrụ na e lekọtaghị ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’ihi ya, ị ghaghị ịnata nri ime mmụọ kwesịrị ekwesị. (1 Timoti 4:6) Nzukọ ndị Kraịst na-enye usoro ihe omume na-aga n’ihu n’ihu nke nkụzi a haziri iji nye gị nri ime mmụọ ma nyere gị aka ịnọgide na-eto n’okwukwe ka ị na-amụba n’ihe ọmụma nke Chineke.​—⁠Ndị Kọlọsi 1:​9, 10.

8. N’ihi gịnị ka e ji na-agba anyị ume ịga nzukọ Ndịàmà Jehova?

8 Nzukọ ndị ahụ na-emezu nzube ọzọ dị oké mkpa. Pọl dere sị: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị.” (Ndị Hibru 10:​24, 25) Okwu Grik a sụgharịrị “ịkpasu” pụkwara ịpụta “ịmụcha.” Otu ilu Bible na-asị: “Ígwè na-amụcha ígwè; otú a ka mmadụ na-amụcha ihu enyi ya.” (Ilu 27:17) Anyị nile nwere mkpa nke ịbụ ndị a nọgidere ‘na-amụcha.’ Nrụgide ndị a na-enwe kwa ụbọchị site n’ụwa pụrụ ime ka okwukwe anyị nyụọ nkọ. Mgbe anyị bịara nzukọ ndị Kraịst, a na-enwe mgbanwerịta nke agbamume. (Ndị Rom 1:​11, 12) Ndị òtù ọgbakọ na-agbaso okwu ịdọ aka ná ntị Pọl onyeozi ịdị ‘na-akasirịta ibe anyị obi, na-ewulirịtakwa ibe anyị elu dị ka ụlọ,’ ihe ndị dị otú ahụ na-amụchakwa okwukwe anyị. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:11) Ịnọ ya mgbe nile ná nzukọ ndị Kraịst na-egosikwa na anyị hụrụ Chineke n’anya ma na-enye anyị ohere dị iche iche ito ya.​—⁠Abụ Ọma 35:18.

“YIKWASỊNỤ ỊHỤNANYA”

9. Olee otú Jehova siworo setịpụ ihe nlereanya n’igosipụta ịhụnanya?

9 Pọl dere, sị: “Yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ ihe nkekọ nke izu okè.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Jehova ejiwo amara nye anyị uwe nke a. N’ụzọ dị aṅaa? Ndị Kraịst pụrụ igosipụta ịhụnanya n’ihi na ọ bụ otu n’ime mkpụrụ mmụọ nsọ Jehova bụ́ ndị Chineke na-enye. (Ndị Galetia 5:​22, 23) Jehova n’onwe ya gosipụtara ịhụnanya kasịnụ site n’izite Ọkpara ọ mụrụ nanị ya ka anyị wee nwee ike inwe ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Ngosipụta nke a kasị elu nke ịhụnanya nyere ihe ilereanya maka anyị igosipụta àgwà nke a. “Ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otú a,” ka Jọn onyeozi dere, “anyị onwe anyị jikwa ụgwọ ịhụrịta onwe anyị n’anya.”​—⁠1 Jọn 4:11.

10. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site ‘n’òtù dum nke ndị bụ ụmụnna’?

10 Gị ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-enye gị ohere magburu onwe ya igosipụta ịhụnanya. N’ebe ahụ ị ga-ezute ọtụtụ ụdị mmadụ dị iche iche. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-enwe mmetụta nke onye a na-adọta n’ebe ọtụtụ n’ime ha nọ ozugbo. Otú ọ dị, mmadụ dị n’iche n’iche ọbụna n’etiti ndị na-efe Jehova. Ma eleghị anya n’oge gara aga ị na-ezere nnọọ ndị gị na ha na-enwekọghị otu ihe ndị na-amasị unu ma ọ bụ àgwà dị iche iche. Ma, ndị Kraịst gaje ‘inwe ịhụnanya maka òtù dum nke ndị bụ ụmụnna.’ (1 Pita 2:17, NW) Ya mere, mee ya ihe mgbaru ọsọ gị ịmata ndị nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze​—⁠ọbụna ndị afọ ndụ ha, ụdị mmadụ ha, agbụrụ, ma ọ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ ha pụrụ ịdị iche na nke gị. O yikarịrị ka ị ga-achọpụta na onye nke ọ bụla nwere àgwà nke na-adọrọ mmasị bụ́ nke ọ kasị mma na ya.

11. N’ihi gịnị ka ndịrịta iche n’ọdịdị mmadụ n’etiti ndị Jehova na-ekwesịghị iji nyee gị nsogbu n’uche?

11 Ọ dịghị mkpa ka ndịrịta iche nke ọdịdị mmadụ n’ọgbakọ nyee gị nsogbu. Iji maa atụ, were ya na ọtụtụ ụgbọ ala na-agba gị n’akụkụ n’okporo ụzọ. Ọ bụghị ha nile na-aga n’otu ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ, ha nile anọghịkwa n’otu ọnọdụ. Ụfọdụ agbawo ọtụtụ maịlụ, ma dị ka gị, ndị ọzọ ka malitere amalite. Ma, n’agbanyeghị ọdịiche a nile, ha nile na-agba n’ụzọ ahụ. Ọ bụ otu ihe n’ebe ndị mejupụtara ọgbakọ nọ. Ọ bụghị ha nile na-azụlite àgwà dị iche iche nke ndị Kraịst n’otu ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ ahụ. Ọzọkwa, ọ bụghị ha nile nọ n’otu ọnọdụ n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ ná mmetụta uche. Ụfọdụ anọwo na-efe Jehova ruo ọtụtụ afọ; ndị ọzọ ka malitere amalite. Ma, ha nile na-agba n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ ebighị ebi, bụrụ ‘ndị e mere ka ha zuo okè n’otu uche ahụ na n’otu izu ahụ.’ (1 Ndị Kọrint 1:10) Ya mere, chọọ ebe ndị nọ n’ọgbakọ dị ike, ọ bụghị ebe ndị ha na-adịghị ike. Ime nke ahụ ga-eme ka obi kpoo gị ọkụ, n’ihi na ị ga-achọpụta na Chineke nọnyeere ndị a n’ezie. Ọ bụkwa n’ebe a n’ezie ka ị chọrọ ịnọ.​—⁠1 Ndị Kọrint 14:25.

12, 13. (a) Ọ bụrụ na onye nọ n’ọgbakọ emejọọ gị, gịnị ka ị pụrụ ime? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịghara ibu iwe n’obi?

12 Ebe ọ bụ na mmadụ nile ezughị okè, mgbe ụfọdụ otu onye n’ọgbakọ pụrụ ikwu ma ọ bụ mee ihe nke ga-akpasu gị iwe. (Ndị Rom 3:23) Jemes onye na-eso ụzọ ji ezi uche dee, sị: “Anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na onye ọ bụla asụghị ngọngọ n’okwu, onye ahụ bụ nwoke tozuru okè.” (Jemes 3:2) Olee otú ị ga-esi meghachi omume ma mmadụ mejọọ gị? Otu ilu Bible na-asị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ; ọ bụkwa ịma mma ya ịgabiga njehie.” (Ilu 19:11) Inwe ezi uche pụtara ịhụ ihe gabiga ihe dị n’elu elu n’otu ọnọdụ, ịghọta ihe ndị na-apụtachaghị ìhè kpatara mmadụ ji kwuo okwu ma ọ bụ mee ihe n’otu ụzọ kpọmkwem. Ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ime anyị na-eji ezi uche dị ukwuu eme ihe n’ịgọpụrụ ụzọ ndị nke anyị hiere. Gịnị mere anyị agaghị eji ya ghọta ma kpuchie ezughị okè nke ndị ọzọ?​—⁠Matiu 7:​1-⁠5; Ndị Kọlọsi 3:13.

13 Echezọla mgbe ọ bụla na anyị aghaghị ịgbaghara ndị ọzọ ma ọ bụrụ na anyị onwe anyị ga-enweta mgbaghara Jehova. (Matiu 6:​9, 12, 14, 15) Ọ bụrụ na anyị nọ n’eziokwu ahụ, anyị ga-emeso ndị ọzọ n’ụzọ ịhụnanya. (1 Jọn 1:6, 7; 3:14-⁠16; 4:20, 21) Ya mere, ọ bụrụ na i zute nsogbu n’ebe onye nọ n’ọgbakọ nọ, lụso ibu iwe n’obi ọgụ. Ọ bụrụ na i yikwasịrị ịhụnanya, ị ga-agbalịsi ike idozi nsogbu ahụ, ị gaghị egbukwa oge ịrịọ mgbaghara ma ọ bụrụ na ọ bụ gị chọworo okwu.​—⁠Matiu 5:23, 24; 18:15-⁠17.

14. Olee àgwà ndị anyị kwesịrị iyikwasị?

14 Uwe ime mmụọ anyị kwesịrị ịgụnye àgwà ndị ọzọ e jikọrọ ha na ịhụnanya n’ụzọ chiri anya. Pọl dere, sị: “Yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.” Àgwà ndị a, ndị ịhụnanya chịkọtara ha nile, bụcha akụkụ nke “mmadụ ọhụrụ” na-asọpụrụ Chineke. (Ndị Kọlọsi 3:​10, 12) Ị̀ ga-etinye mgbalị iji yikwasị onwe gị uwe n’ụzọ dị otú a? Karịsịa ma ọ bụrụ na i yikwasị onwe gị ịhụnanya ụmụnna ka ị ga-enwe akara e ji amata ndị na-eso ụzọ Jisọs, n’ihi na ọ sịrị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”​—⁠Jọn 13:35.

EBE ỊNỌ NÁ NTỤKWASỊ OBI

15. Olee otú ọgbakọ si dị ka ndo?

15 Ọgbakọ na-ejekwa ozi dị ka ndo, ebe mgbaba dị nchebe ebe i nwere ike inwe mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi. N’ime ya ị ga-ahụ ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị na-agbalịsi ike ime ihe ziri ezi n’anya Chineke. Ọtụtụ n’ime ha ewepụsịwo otu ụdị omume na àgwà ọjọọ ndị ahụ ị pụrụ ịdị na-agba mgba imeri. (Taịtọs 3:3) Ha pụrụ inyere gị aka, n’ihi na a gwara anyị ka anyị ‘na-eburịta ibu na-anyị ibe anyị.’ (Ndị Galetia 6:2) Dị ka a tụrụ anya ya, ịgbaso ụzọ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi bụ n’ụzọ bụ isi ibu ọrụ nke gị. (Ndị Galetia 6:5; Ndị Filipaị 2:12) Ma, Jehova enyewo ọgbakọ ndị Kraịst dị ka ụzọ magburu onwe ya isi nweta enyemaka na nkwado. N’agbanyeghị otú nsogbu gị bụruru ihe isi ike, i nwere ihe nkwado bara uru​—⁠ọgbakọ na-ahụ n’anya nke ga-akwụnyere gị n’oge ahụhụ ma ọ bụ ịnọ n’ụkọ.​—⁠Tụlee Luk 10:​29-⁠37; Ọrụ 20:35.

16. Enyemaka dị aṅaa ka ndị okenye na-enye?

16 N’etiti ndị ga-agbata inye gị nkwado, e nwere ‘onyinye n’ụdị mmadụ’​—⁠ndị okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta ọgbakọ a họpụtara ahọpụta, bụ́ ndị na-azụ ìgwè atụrụ ahụ n’ọchịchọ obi na n’ịnụ ọkụ n’obi. (Ndị Efesọs 4:​8, 11, 12; Ọrụ 20:28; 1 Pita 5:​2, 3) Banyere ha, Aịsaịa buru amụma, sị: “Otu onye ga-adịkwa ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara ná mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndo nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.”​—⁠Aịsaịa 32:2.

17. (a) Enyemaka dị aṅaa ka Jisọs chọsiri ike inye? (b) Ndokwa dị aṅaa ka Chineke kwere nkwa imere ndị ya?

17 Mgbe Jisọs nọ n’elu ụwa, nlekọta ịhụnanya nke ndị ndú okpukpe dị ụkọ n’ụzọ dị mwute. Ọnọdụ ndị ahụ kpaliri ya n’ụzọ miri emi, ọ chọsikwara ike inyere ha aka n’ụzọ ime mmụọ. Jisọs meere ha ebere n’ihi na “a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Lee ka nke a si akọwa ọnọdụ ọjọọ nke oge a nke ọtụtụ ndị na-edi nsogbu ndị na-akpata obi mgbawa ma ghara inwe onye ha ga-echigharịkwuru maka enyemaka na nkasi obi ime mmụọ! Ma ndị Jehova nwere enyemaka ime mmụọ, n’ihi na o kwere nkwa, sị: “M ga-emekwa ka ndị ọzụzụ atụrụ biliere ha, ndị ga-azụ ha: ha agaghị atụkwa egwu ọzọ, ha agaghị atụkwa ụjọ, a gaghị elekwa anya otu efu n’ime ha na o furu efu.”​—⁠Jeremaịa 23:4.

18. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji jekwuru onye okenye ma ọ bụrụ na enyemaka ime mmụọ adị anyị mkpa?

18 Mata ndị okenye a họpụtara n’ime ọgbakọ. Ha nwere ahụmahụ dị ukwuu n’itinye ihe ọmụma Chineke n’ọrụ, n’ihi na ha eruwo ihe ndị a chọrọ maka ndị nlekọta bụ́ ndị e setịpụrụ n’ime Bible. (1 Timoti 3:​1-⁠7; Taịtọs 1:​5-⁠9) Alala azụ ijekwuru otu n’ime ha ma ọ bụrụ na i nwere mkpa enyemaka ime mmụọ iji merie otu àgwà nke megidere ihe ndị Chineke chọrọ. Ị ga-achọpụta na ndị okenye na-agbaso okwu ịdọ aka ná ntị Pọl bụ́: “Na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi, na-enyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nweenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.”​—⁠1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8; 5:14.

NỌRỌ NÁ NTỤKWASỊ OBI N’ETITI NDỊ JEHOVA

19. Ngọzi dịgasị aṅaa ka Jehova tụkwasịworo n’isi ndị na-achọ ịnọ ná ntụkwasị obi n’ime nzukọ ya?

19 Ọ bụ ezie na anyị na-ebi ugbu a n’ọnọdụ ezughị okè, Jehova na-enye anyị nri, uwe, na ndo ime mmụọ. Otú ọ dị, anyị aghaghị ichere maka ụwa ọhụrụ Chineke o kwere ná nkwa iji nweta uru nile nke paradaịs nkịtị. Ma ndị bụ akụkụ nke nzukọ Jehova na-anụ ụtọ ịnọ ná ntụkwasị obi nke paradaịs ime mmụọ ugbu a. Banyere ha, Ezikiel buru amụma, sị: “Ha ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ dịghịkwa onye ga na-eme ka ha maa jijiji.”​—⁠Ezikiel 34:28; Abụ Ọma 4:8.

20. Olee otú Jehova ga-esi kwụghachi ụgwọ maka ihe ọ bụla anyị pụrụ ịchụ n’àjà n’ihi ofufe ya?

20 Lee ka anyị pụrụ isi nwee obi ekele na Jehova na-eme ndokwa ịhụnanya nke ihe ime mmụọ site n’Okwu ya na nzukọ ya! Bịaruo ndị Chineke nso. Alala azụ n’egwu nke ihe ndị enyi ma ọ bụ ndị ikwu pụrụ iche banyere gị n’ihi ịnara ihe ọmụma Chineke. Ụfọdụ pụrụ ịkatọ ya n’ihi na ị na-esonyere Ndịàmà Jehova ma na-aga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma Chineke ga-akwụghachi gị ụgwọ ná mmaji ná mmaji maka àjà ọ bụla ị chụrụ n’ihi ofufe ya. (Malakaị 3:10) Ọzọkwa, Jisọs sịrị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke hapụrụ ụlọ, ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom, ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom, ma ọ bụ nne, ma ọ bụ nna, ma ọ bụ ụmụ, ma ọ bụ ubi, n’ihi m, na n’ihi ozi ọma nke m, ma ọ bụghị na ọ ga-anata [otu narị okpukpu] ugbu a n’oge a, ụlọ, na ụmụnne ndị ikom, na ụmụnne ndị inyom, na nne, na ụmụ, na ubi, ha na nsogbu; ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi n’oge nke na-abịa.” (Mak 10:​29, 30) Ee, n’agbanyeghị ihe ị hapụrụ n’azụ ma ọ bụ nke ị na-aghaghị ịnagide, ị pụrụ inweta mkpakọrịta dị ụtọ na ịnọ ná ntụkwasị obi ime mmụọ n’etiti ndị Chineke.

NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ

Ònye bụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche”?

Ndokwa dị aṅaa ka Jehova meworo iji zụọ anyị n’ụzọ ime mmụọ?

Olee otú ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst pụrụ isi nyere anyị aka?

[Foto dị na peeji nke 165]

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya